Ha Zukọrọ Dị Ka Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto
ENYERE ndị Jehova Chineke nke oge ochie iwu ka ha “na-aṅụrị nanị ọṅụ” mgbe ha zukọrọ maka ofufe. (Deuterọnọmi 16:15) Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” nke 1995/1996 n’ezie enyewo Ndịàmà Jehova ezi ihe ndị mere ha ga-eji na-enwe ọṅụ.
Kemgbe usoro mgbakọ a malitere, ha ewulitela okwukwe. Ha egosiwokwa otú a ga-esi achọta ọṅụ n’ime ụwa nke ọṅụ na-adịghị. Ka anyị tụlee mgbakọ ahụ otu ụbọchị otu mgbe.
‘Toonụ Jehova . . . Tegharịanụ Egwú Ọṅụ!’
Isiokwu ahụ dị n’elu nke ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ dabeere n’Abụ Ọma 149:1, 2. Okwu bụ́ “Anyị Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Tie Mkpu Ọṅụ” nyochara nkọwa nke amụma dị n’Aịsaịa isi nke 35. O mezuru n’Israel oge ochie ma karịsịa n’ụbọchị anyị site ná mweghachi nke ndị na-efe Jehova ofufe n’ụba na ahụ ike n’ime paradaịs ime mmụọ. N’ihi ya, ndị bịara mgbakọ nwere ihe mere ha ga-eji eti mkpu ọṅụ banyere ihe Chineke zubeworo maka ndị ya na paradaịs ime mmụọ na n’ime Paradaịs a na-ahụ anya na-abịanụ bụ́ nke dị nnọọ nso.
Okwu bụ́ isi bụ́, “Ndị E Doro Iche Dị Ka Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto n’Ụwa Nile,” zara ajụjụ bụ́: Gịnị na-edo anyị iche pụọ n’ụwa nke a? Ọ bụ ịdị n’otu n’ofufe anyị na-efe Jehova. N’agbanyeghị ebe Ndịàmà Jehova bi n’elu ala a, ha na-ekwu ma na-ezi otu ihe. Ha na-aṅụrịkwa ọṅụ ná nzube dị ebube nke Jehova ido aha nsọ ya nsọ na iwepụ ọbụbụeze ya n’ụta site n’Alaeze ya. Otú ọ dị, olee otú Jehova si na-enyere anyị aka inwe ọnọdụ ná nzube ya? O nyewo anyị eziokwu nke Okwu ya dị nsọ n’aka idebe. Chineke enyewo anyị mmụọ nsọ ya. O jiriwo òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ na ndokwa maka ofufe dị ọcha gọzie anyị. Ezinụlọ anyị dị ná mba nile na-enyere anyị aka iji oké ọṅụ nke obi na-ejere Jehova ozi.
“Ịnọpụ Iche, n’Enweghịkwa Ntụpọ Site n’Ụwa” mesiri ike mkpa ọ dị izere ntụpọ nke ile mmadụ anya n’ihu na ịkpa ókè nke ọkwá. (Jemes 2:5-9) Ndị ụfọdụ nwere ike isoro nanị ndị ha na ha nwere otu ụdị ọnọdụ ma ọ bụ ndị nweruru ego ka ha na-akpakọrịta, na-eleghara ndị Kraịst ibe ha dara ogbenye ma ọ bụ ndị ọ na-adịghị otú ọ hà ha anya. Ndị ọzọ pụrụ imelara ndị nwere ọnọdụ ibu ọrụ n’ọgbakọ ihe. Ha na-echezọ na ihe ùgwù kasị ukwuu onye ọ bụla pụrụ inwe bụ nke ịbụ Onyeàmà Jehova. Ya mere, anyị agaghị ekwe ka ọchịchọ ụwa tetọọ anyị ma kpaghasịa udo nke ọgbakọ.—2 Pita 3:14.
Okwu bụ́ “Àdị M Njikere Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?” gosipụtara na ọtụtụ na-abanye n’alụmdi na nwunye ọkụ ọkụ. Ụfọdụ na-alụ di ma ọ bụ nwunye iji gbanahụ ọnọdụ siri ike dị n’ebe obibi ma ọ bụ n’ihi na ndị ọgbọ ha na-alụ di ma ọ bụ nwunye. Otú ọ dị, ezi ihe ndị e nwere maka alụmdi na nwunye gụnyere inwekọrịta ọchịchọ ịchụso ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke, ezi ịhụnanya, mkpa maka mkpakọrịta onye ibe na nchebe, na ọchịchọ ịzụlite ụmụ. Ọzụzụ ime mmụọ dị oké mkpa ná nkwadebe maka alụmdi na nwunye. Tinyere ihe ndị ọzọ, e nwere mkpa nke iwulite àgwà ndị a na-achọsi ike site n’iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ. Ọ bụkwa ihe amamihe ịchọpụta ma onye ahụ a chọrọ ịlụ ọ̀ na-enye ihe àmà nke iso Jehova na-enwe ezi mmekọrịta ma na-eji nkwanye ùgwù na-emeso ndị ọzọ omume. Ịchọ ndụmọdụ site n’aka ndị Kraịst tozuru okè bụkwa ihe amamihe.—Ilu 11:14.
Okwu a na-enye nghọta bụ nke isiokwu ya bụ “Ndị Mụrụ Ụmụ Bụ́ Ndị Na-achọta Obi Ụtọ n’Ụmụ Ha” sochiri. Oge a mụrụ nwa na-abụkarị oge oké ịṅụrị ọṅụ. Otú ọ dị, ịmụ ụmụ na-ewetakwa oké ibu ọrụ. (Abụ Ọma 127:3) N’ihi ya, ọ dị mkpa na a kụziiri ụmụ ịhụ Jehova n’anya. Ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime nke a site n’ịgwa ụmụ ha banyere Jehova mgbe nile na itinye ụkpụrụ ndị dị n’Okwu ya n’ọrụ n’ime ezinụlọ.
Ụbọchị nke mbụ nke mgbakọ ahụ ji ihe ịtụnanya bịa ná njedebe—mwepụta nke broshuọ ọhụrụ ahụ bụ́ Jehovah’s Witnesses and Education. Ọ na-akọwa n’ụzọ doro anya na Ndịàmà “na-agba ndị ha na-eto eto ume ịrụsi ọrụ ike na iji ọrụ ndị e kenyere ha n’ụlọ akwụkwọ kpọrọ ihe.” Akwụkwọ a na-akọwakwa ihe dị ịrịba ama nke klas ịmụ ka e si agụ na ka e si ede nke Ndịàmà Jehova duziworo ruo ọtụtụ afọ na Nigeria, Mexico, na mba ndị ọzọ rụpụtaworo. Broshuọ ahụ kwesịrị inyere ndị nkụzi aka ịhụ na anyị weere agụmakwụkwọ dị ka ihe dị oké mkpa.
“Na-achụ Àjà, Bụ́ Otuto, Nye Chineke Mgbe Nile”
Isiokwu ahụ e hotara n’elu nke ụbọchị nke abụọ dabeere ná Ndị Hibru 13:15. Usoro ihe omume nke ụtụtụ nyere usoro isiokwu dabeere ‘n’Ịza Òkù A Na-akpọ Maka Inye Jehova Otuto.’ Afọ ndụ abụghị ihe mgbochi n’ịza òkù a. Abụ Ọma 148:12, 13 na-agba ụmụ okorobịa, ụmụ agbọghọ, ndị agadi, na ụmụntakịrị ume inye Jehova otuto. Ọtụtụ ndị ohu Jehova na-enwe ọṅụ enwewo ike ịmụba otuto ha na-enye. N’ụwa nile, ihe karịrị 600,000 na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa oge nile, ma ọ bụ ozi ọsụ ụzọ. Ihe karịrị 15,000 na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, ihe rukwara 15,000 nọ n’ozi Betel.
“Iji Iguzosi Ike n’Ihe Na-esoro Nzukọ Jehova Na-eje Ozi” bụ okwu gosiri na nguzosi ike n’ihe dị ndị ohu Chineke mkpa. Iguzosi ike n’ihe nye Jehova pụtara ịrapara n’ebe ọ nọ site ná nraranye siri ike nke na ọ na-arụ ọrụ ka gọm siri ike. Iguzosi ike n’ihe chọrọ n’aka anyị izere ịmara ụma na-emebi iwu Bible, ma ndị ọzọ ha na-ahụ anyị ma ọ bụ na ha adịghị ahụ anyị. Ọ chọkwara n’aka anyị iji iguzosi ike n’ihe na-akwado ozizi Bible ndị dị na magazin Ụlọ Nche na Teta! nakwa nri ime mmụọ ndị ọzọ nile nke Watch Tower Society na-enye. Okwu baptism sochiri okwu a. Lee ọṅụ e nwere mgbe ndị a gaje ime baptism nyere ihe àmà nke nraranye ha nye Jehova!
Okwu nke Hosea 4:1-3 setịpụrụ ụkpụrụ maka okwu nke ehihie bụ́ “Ịdị Mma Ka Ọ̀ Bụ Omume Ọjọọ—Olee nke Ị Na-achụso?” Ọ bụ ezie na echiche ụwa banyere ịdị mma akawo njọ, ndị Kraịst aghaghị “ịnụ ọkụ n’obi” iji chụsoo omume ọma. (2 Pita 1:5) Nke a na-amalite site n’otú mmadụ si eche echiche. Ọ bụrụ na echiche ya dị mma, ọ ga-ekwu okwu ndị dị ọcha, dị mma, ma na-ewuli elu, ọ ga-agbalịsikwa ike ịkwụwa aka ya ọtọ ná mmeso ọ na-emeso ndị ọzọ. Ịchụso ịdị mma gụnyekwara ịgbalị inwe nghọta na ọmịiko n’ebe onye Kraịst ibe anyị nọ, bụ́ onye na-ata ahụhụ mkpagbu ma ọ bụ ịda mbà n’obi.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.
Okwu ọzọ bụ́, “Nọrọ ná Nche Megide Ọnyà Nile nke Ekwensu,” dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị megide ikpughe onwe ha nye mmetụta nile nke ndị mmụọ ọjọọ. N’akụkụ ịgwọ ọrịa, ọ dị ndị Kraịst mkpa ịmụrụ anya banyere ụzọ ndị e ji eme ihe, dị ka e kwube o rebe, ndị nwetụrụ ihe anwansi. N’aka nke ọzọ, ihe onye ọ bụla na-eme iji lekọta ahụ ike anụ ahụ ya bụ okwu aka ya.
Ụbọchị nke abụọ ji ihe ịtụnanya na-enye ọṅụ bịa ná njedebe—mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ na-aba n’akpa uwe bụ́ nke e mepụtara iji nyere ndị nwere obi eziokwu aka ịga n’ihu n’ime nraranye na baptism. A kpọrọ akwụkwọ ọhụrụ a dị 192 peji Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Akwụkwọ Ihe Ọmụma a na-ewepụta eziokwu n’ụzọ na-ewuli elu. Ọ dịghị elekwasị anya n’ịkatọ ozizi ụgha. Asụsụ ya doro anya na nkọwapụta ya nwere ezi izu kwesịrị ime ka ọ dịrị mfe iji akwụkwọ ahụ na-eduzi ọmụmụ Bible ma nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ọmụma Chineke nke na-enye obi ụtọ.
“Ka Obi Tọọ Unu Ụtọ, Tegharịakwanụ Egwú Ọṅụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”
Okwu ndị a sitere n’Aịsaịa 65:18 bụ isiokwu nke ụbọchị nke atọ nke mgbakọ ahụ. Mmezu nke amụma Bible na-ezo aka na 1914 dị ka afọ ajọ usoro ihe a banyere n’oge ọgwụgwụ ya. Ya mere, usoro isiokwu ahụ nke isiokwu ya bụ “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto n’Oge Ọgwụgwụ nke Usoro Ihe A” jigidere uche ndị na-ege ntị. Ndị ọkà okwu gosiri otú ọtụtụ ijeri si na-adaba ná mmụọ anyaukwu na ime ihe ike nke ụwa. Ka oge na-aga, ha ga-aba n’ikpe dị ka akụkụ nke ụwa nke Setan na-achị. N’ihi ya, ugbu a bụ oge ime nhọrọ. Olee akụkụ anyị ga-achọ ịnọ? Ànyị chọrọ ife Jehova ma kwadoo ọbụbụeze ya, ka ànyị gaje ikwere ka Setan na-achị anyị site n’ime ihe na-atọ ya ụtọ? Anyị nile kwesịrị iwere nguzo anyị n’ụzọ pụtara ìhè n’akụkụ Jehova.
Okwu ihu ọha nke mgbakọ ahụ bụ́, “Nye Eze nke Mgbe Ebighị Ebi Otuto!” nyere ndị nile na-ege ntị ihe dị mkpa ha ga-echebara echiche. Ọ bụ ezie na echiche nke ebighị ebi yiri ihe karịrị nghọta nke ụmụ mmadụ na-adịghị ike, Jehova ghọtazuru ya. “Jehova bụ Eze ruo mgbe nile ebighị ebi,” ka onye ọbụ abụ ahụ bụrụ. (Abụ Ọma 10:16) Eze a nke mgbe ebighị ebi emegheworo ihe a kpọrọ mmadụ ụzọ maka inweta ndụ ebighị ebi site n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 17:3) “Ee, anyị bụ́ mmadụ na-eme mmehie pụrụ inweta ndụ ebighị ebi site ná nkụzi Chineke na okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs,” ka onye ọkà okwu ahụ kwuru.
Ka mgbakọ ahụ na-aga ná mmechi, e wuliri ndị bịaranụ elu site n’okwu ikpeazụ, nke isiokwu ya bụ “Iji Ọṅụ Na-eto Jehova Site n’Ụbọchị Ruo n’Ụbọchị.” Ọ bụ ihe na-eme obi ụtọ inweta akụkọ nke ịga n’ihu nke ọrụ ime ndị na-eso ụzọ n’elu ụwa dum. A kpalikwara ndị bịara mgbakọ ‘ịgọzi Jehova kwa ụbọchị, tookwa aha ya ruo mgbe nile ebighị ebi.’—Abụ Ọma 145:2.
Omume mmekpọ ọnụ ndị a na-apụghị ikwu n’ọnụ na-anapụ ụwa ọṅụ. Ka o sina dị, ndị nwere okwukwe zuru ezu n’ebe Jehova nọ pụrụ inwe ọṅụ Chineke. Ya mere, dị ka òtù ụmụnna ụwa nile, Ndịàmà Jehova pụrụ ikwughachi okwu ndị a na-esonụ nke Abụ Ọma 35:27, 28: “Ka ha tie mkpu ọṅụ, ṅụrịakwa ọṅụ, bụ́ ndị ezi omume m na-atọ ụtọ: ka ha na-asịkwa mgbe nile, Jehova dị ukwuu, onye udo ohu Ya na-atọ Ya ụtọ. Ire m ga na-ekwu okwu, dị ka onye na-atụgharị uche, banyere ezi omume Gị, banyekwara otuto Gị ogologo ụbọchị nile.”
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ezinụlọ dị iche iche ga-erite uru site na broshuọ ahụ bụ́ “Jehovah’s Witnesses and Education”
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ “Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi,” na-ewepụta eziokwu Bible n’ụzọ na-ewuli elu
[Foto dị na peeji nke 9]
E mere ọtụtụ ndị baptism ná ngosipụta nke nrara ha nye Jehova
[Foto dị na peeji nke 9]
Ihe nkiri bụ́ “Ịsọpụrụ Ndị Ruru Eru Nọ n’Afọ Agadi Ha” kpaliri ndị bịara mgbakọ nke ukwuu