Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” nke Ndịàmà Jehova
Ụbọchị atọ na-akwụghachi ụgwọ nke nkụzi Bible na-echere gị. Ebe e mere ndokwa maka ihe karịrị 90 mgbakọ na Nigeria nanị, o yikarịrị ka a ga-enwe mgbakọ nke na-adịghị anya n’ebe i bi. Nọrọ ya mgbe usoro ihe omume ga-eji olu ụtọ malite na 9:20 n’ụtụtụ Friday.
Usoro ihe omume nke ụtụtụ Friday ga-enwe okwu nnabata nakwa okwu bụ́ isi, “Ndị E Doro Iche Dị Ka Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto n’Ụwa Nile.” N’ehihie, usoro ihe omume ahụ ga-elekwasị anya ná ndị ntorobịa, ndị mụrụ ụmụ, na agụmakwụkwọ. “Àdị M Njikere Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?” bụ okwu ọtụtụ ga-achọ ịnụ. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ige ntị nke ọma n’okwu bụ́ “Ndị Mụrụ Ụmụ Bụ́ Ndị Na-achọta Obi Ụtọ n’Ụmụ Ha.” Usoro ihe omume ehihie ga-eji okwu bụ́ “Agụmakwụkwọ—Jiri Ya Nye Jehova Otuto” mechie. Ihe a tụlere kwesịrị inyere ndị ntorobịa aka ịdị na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ.
Usoro ihe omume ụtụtụ Saturday ga-enwe baptism, a ga-enyekwa ndị ruru eru ịbụ ndị e mere baptism ohere ime nke ahụ. N’ehihie, a ga-ekwu okwu n’ezoghị ọnụ banyere otú Setan siworo jiri ọchịchọ inwe mmekọahụ mata ndị mmadụ n’ọnyà site n’oge gboo. A ga-enwekwa okwu dị ike bụ́ “Nọrọ ná Nche Megide Ọnyà Nile nke Ekwensu.” Usoro ihe omume ụbọchị ahụ ga-emechi site n’okwu dị mkpa bụ́ “Ihe Mere Ihe Ọmụma Chineke Ji Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa.”
Ụtụtụ Sunday, usoro isiokwu a kpọrọ “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto n’Oge Ọgwụgwụ nke Usoro Ihe A” ga-elekwasị anya n’ihe omume ga-eme ka ụwa mee mkpatụ nke na-eche anyị ihu. Ọ ga-emesi ike ịdị ngwa nke ịgbaba n’ebe nchebe tupu mmalite nke “mkpagbu ukwu” ahụ nke Jisọs Kraịst kwuru okwu banyere ya, dị ka e dekọrọ na Matiu 24:21.
Usoro ihe omume ụtụtụ Sunday ga-eji ihe nkiri dị mkpa nke bụ́ “Ịsọpụrụ Ndị Ruru Eru Nọ n’Afọ Agadi Ha” mechie. Mgbe ahụ, n’ehihie, a ga-ekwu okwu ihu ọha bụ́ “Nye Eze nke Mgbe Ebighị Ebi Otuto!” Ọ ga-abụ ihe bụ isi a ga-emesi ike ná mgbakọ ahụ.
Mee ndokwa ugbu a ịga. Iji chọta ebe dịkarịsịrị ebe i bi nso, kpọtụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova n’ógbè gị, ma ọ bụ degara ndị na-ebipụta magazin nke a akwụkwọ. Mbipụta nke Teta! October 8, 1995, ga-edepụtasị ebe ndị a ga-enwe ha na Nigeria.