Nkasi Obi Na Agbamume—Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Nke Nwere Ọtụtụ Akụkụ
IHE ka ọtụtụ n’ime anyị enwewo oge ndị anyị chere na anyị dara ogbenye gabiga ókè—ọ bụchaghị inwe ego dị nta kama inwe mmụọ dị ala. Anyị nọ n’enweghị olileanya, ọbụna daa mbà n’obi n’ụzọ dị ukwuu. Ma, n’oge ndị dị otú ahụ anyị pụrụ nnọọ inwe ihe dị oké ọnụ ahịa nke pụrụ ịdịrị anyị mma nke ukwuu. ‘Ihe ahụ dị oké ọnụ ahịa’ bụ agbamume.
N’ime Bible e ji otu okwu Grik ahụ mee ihe maka “gbaa ume” na “kasie obi.” Okwu abụọ ahụ na-enye echiche nke inye obi ike, ike, ma ọ bụ olileanya. N’ihi ya, n’ụzọ doro anya, mgbe anyị na-enwe mmetụta nke adịghị ike ma ọ bụ nkụda mmụọ, nkasi obi na agbamume bụ kpọmkwem ihe ndị dị anyị mkpa. Olee ebe a pụrụ ịchọta ha?
Bible na-emesi anyị obi ike na Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi nile.” (2 Ndị Kọrint 1:3) Ọ na-agwakwa anyị na “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị.” (Ọrụ 17:27) Ya mere a pụrụ inweta nkasi obi na agbamume. Ka anyị tụlee akụkụ anọ ndị Jehova na-esikarị enye agbamume.
Site n’Iso Chineke Nwee Mmekọrịta Onwe Onye
Isi iyi kachasị ukwuu nke nkasi obi bụ iso Jehova Chineke nwee mmekọrịta onwe onye. Na ụdị mmekọrịta dị otú ahụ ọbụna ga-ekwe omume bụ ihe na-agba ume. E kwuwerị, olee onye ọchịchị ụwa ga-anabata òkù fon anyị ma ọ bụ nke ga-egosipụta mmasị onwe onye ná nsogbu anyị nile? Jehova dị ike nke ukwuu karịa otú ụmụ mmadụ dị otú ahụ dị. Ma, ọ dị umeala n’obi—dị njikere nke ukwuu imeso ụmụ mmadụ dị ala, ndị na-ezughị okè, ihe. (Abụ Ọma 18:35) Jehova ọbụna ebutewo ụzọ n’igosi anyị ịhụnanya. Jọn nke Mbụ 4:10 na-asị: “N’ime nke a ka ịhụnanya dị, ọ bụghị na anyị onwe anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ na Ya onwe ya hụrụ anyị n’anya, wee zite Ọkpara Ya ka Ọ bụrụ ihe ịjụrụ Ya obi banyere mmehie anyị.” Ọzọkwa, Jehova ji ịhụnanya na-adọta anyị n’ebe Ọkpara ya nọ.—Jọn 6:44.
Ị̀ zaghachiwo ma chọọ nkasi obi n’isoro Chineke bụrụ enyi? (Tụlee Jemes 2:23.) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i nwere otu ezi enyi ị hụrụ n’anya, ọ̀ bụ na ọ́ bụghị ihe obi ụtọ isoro onye ahụ nọrọ nanị unu abụọ, na-akparịta banyere nchekasị na nchegbu nile unu, olileanya na ọṅụ nile unu? Jehova na-akpọ gị òkù ka gị na ya mee otu ihe ahụ. O kwughị ogologo oge ị pụrụ isoro ya kwuruo okwu n’ekpere—ọ na-aṅakwa ntị n’ezie. (Abụ Ọma 65:2; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Jisọs kpere ekpere n’ụzọ chiri anya, sitekwa n’obi. N’ezie, tupu ọ họrọ ndị ozi 12 ya, o kpere ekpere ogologo abalị nile.—Luk 6:12-16; Ndị Hibru 5:7.
Site n’oge ruo n’oge, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike nanị ya na Jehova ịnọ. Nanị ịnọrọ jụụ n’elu window ma ọ bụ ime mkpagharị pụrụ ịbụ ohere dị mma imeghere Jehova obi anyị n’ekpere. Ime otú ahụ pụrụ ịbụ oké isi iyi nke ahụ efe na nkasi obi. Ọ bụrụ na anyị nwere akụkụ ụfọdụ nke ihe ndị Jehova kere ndị anyị ga na-ekiri ka anyị nọ na-atụgharị uche—ọ bụrụgodị nanị otu mpaghara eluigwe, osisi ma ọ bụ nnụnụ ụfọdụ—anyị pụrụ ịchọta n’ime ha ihe ncheta na-akasi obi nke ịhụnanya na nchegbu Jehova maka anyị.—Ndị Rom 1:20.
Site n’Ọmụmụ Ihe Onwe Onye nke Okwu Chineke
Otú ọ dị, ọ bụ site n’ọmụmụ ihe onwe onye nke Bible ka anyị na-amata àgwà Jehova nile n’ezie. Ugboro ugboro, Bible na-ekpughe Jehova ịbụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere.” (Ọpụpụ 34:6; Nehemaịa 9:17; Abụ Ọma 86:15) Ọchịchọ ịkasi ndị ohu ya nọ n’elu ala obi bụ otu akụkụ nke ọdịdị Jehova.
Dị ka ihe atụ, tụlee okwu Jehova ndị dị n’Aịsaịa 66:13: “Dị ka onye nke nne ya na-akasi obi, otú a ka Mụ onwe m ga-akasi unu obi.” Jehova mere ịhụnanya nke nne maka ụmụ ya ịbụ nke iji onwe onye achụ àjà na nke na-eguzosi ike n’ihe. Ọ bụrụ na ị hụtụla nne nke na-ahụ n’anya ka ọ na-akasi nwa ya merụrụ ahụ obi, ị ga-amara ihe Jehova bu n’obi mgbe ọ na-ekwu na ya ga-akasi ndị ya obi.
Ọtụtụ ihe ndekọ Bible na-egosi ebe nkasi obi dị otú ahụ nọ n’ọrụ. Mgbe ajọ Eze Nwanyị Jezebel jiri ọnwụ yie onye amụma bụ́ Elaịja egwu, ọ tụrụ ụjọ ma gbaa ọsọ maka ndụ ya. O nweghị olileanya ọ bụla nke na o jere ije otu ụbọchị zuru ezu n’ime ọzara, dị ka ihe àmà na-egosi n’ejighị mmiri ma ọ bụ ihe oriri ọ bụla. Ná nhụjuanya Elaịja gwara Jehova na ya chọrọ ịnwụ. (1 Ndị Eze 19:1-4) Gịnị ka Jehova mere iji kasie onye amụma ya obi ma gbaa ya ume?
Jehova abaraghị Elaịja mba maka inwe mmetụta nke ịnọ nanị ya, abaghị n’ihe, na ịtụ ụjọ. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, onye amụma ahụ nụrụ “olu nta nke dị ezi nwayọọ.” (1 Ndị Eze 19:12) Ọ bụrụ na ị gụọ 1 Ndị Eze isi nke 19, ị ga-ahụ otú Jehova si kasie Elaịja obi, mejụọ ya obi, ma wulie okwukwe ya. Nkasi obi a abụghị n’elu elu. Ọ bamiri n’ime obi Elaịja nke nọ ná nchegbu, na-agba onye amụma ahụ ume ịga n’ihu. (Tụlee Aịsaịa 40:1, 2.) N’oge na-adịghị anya, ọ laghachiri n’ọrụ ya.
N’otu aka ahụ, Jisọs Kraịst na-akasi ụmụazụ ya na-eguzosi ike n’ihe obi ma na-agba ha ume. N’ezie, Aịsaịa buru amụma banyere Mesaịa ahụ, sị: “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova . . . [ezitewo] m ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, . . . ịkasi ndị nile na-eru újú obi.” (Aịsaịa 61:1-3) N’oge ndụ ya, Jisọs mere ka o doo anya na okwu ndị a mezuru n’ahụ ya. (Luk 4:17-21) Ọ bụrụ na i nwee mkpa nke nkasi obi, tụgharịa uche ná mmeso dị nro, nke ịhụnanya, Jisọs mesoro ndị nwere ihe mgbu ma nọrọ ná mkpa. N’ezie, iji nlezianya mụọ Bible bụ oké isi iyi nke nkasi obi na agbamume.
Site n’Ọgbakọ
N’ọgbakọ ndị Kraịst, ihe ndị dị oké ọnụ ahịa bụ́ nkasi obi na agbamume na-egbukepụ n’ọtụtụ akụkụ. E nyere Pọl onyeozi mmụọ nsọ ide, sị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi, wulirịtakwa ibe unu elu dị ka ụlọ.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:11) Olee otú a pụrụ isi chọta nkasi obi na agbamume ná nzukọ ọgbakọ?
N’ezie, anyị na-eje nzukọ ndị Kraịst n’ụzọ bụ isi iji bụrụ ndị “Chineke ziworo ihe,” iji nata ntụziaka banyere ya na ụzọ ya nile. (Jọn 6:45) Ntụziaka dị otú ahụ bụ nke e zubere ịbụ nke na-agba ume ma na-akasi obi. N’Ọrụ 15:32, anyị na-agụ, sị: “Judas na Saịlas . . . wee were ọtụtụ okwu kasie ụmụnna ahụ obi, meekwa ka obi ha guzosie ike.”
Ì nwetụwo ahụmahụ nke ije nzukọ ndị Kraịst mgbe ị nwere ịda mbà n’obi ma nwee mmetụta ka mma mgbe ị na-alọta ụlọ? Ikekwe ihe e kwuru n’otu okwu, n’otu azịza, ma ọ bụ n’ekpere metụrụ gị n’obi ma nye gị nkasi obi na agbamume ahụ dị mkpa. Ya mere ahapụla nzukọ ndị Kraịst.—Ndị Hibru 10:24, 25.
Iso ụmụnna nwoke na nwanyị anyị na-akpakọrịta n’ozi na n’oge ndị ọzọ pụkwara inwe mmetụta yiri nke ahụ. N’asụsụ Hibru ọtụtụ ngwaa ndị pụtara “ikekọta ọnụ” mesịrị na-ezokwa aka ‘n’ike’ ma ọ bụ “wusie ike”—echiche pụtara ìhè na ya wee bụrụ na ihe na-esi ike karị mgbe e kekọtara ha ọnụ. Ụkpụrụ a bụkwa eziokwu n’ọgbakọ. A na-akasi anyị obi, na-agba anyị ume, ee, na-ewusi anyị ike, site n’ịkpakọ ọnụ. A na-ekekọkwa anyị ọnụ site n’ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ kasị sie ike.—Ndị Kọlọsi 3:14.
Mgbe ụfọdụ ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi nke ụmụnna anyị nwoke ma ọ bụ nwanyị n’ime mmụọ na-agba anyị ume. (1 Ndị Tesalọnaịka 3:7, 8) Mgbe ụfọdụ ọ bụ ịhụnanya ha na-egosi. (Faịlimọn 7) Mgbe ụfọdụkwa ọ bụ nanị ịrụkọ ọrụ ọnụ, ụkwụ na ụkwụ, mgbe anyị nọ na-agwa ndị ọzọ okwu banyere Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na ị na-enwe mmetụta nke adịghị ike ma nọrọ ná mkpa nke agbamume mgbe a bịara n’ozi, gịnị mere na ị gaghị eme ndokwa isoro onye nkwusa Alaeze mere okenye karị ma ọ bụ nwere ahụmahụ karị rụọ ọrụ? O yiri ka ị ga-enweta nkasi obi dị ukwuu n’ime otú ahụ.—Eklisiastis 4:9-12; Ndị Filipaị 1:27.
Site n’Aka “Ohu ahụ Kwesịrị Ka A Tụkwasị Ya Obi, nke Nwekwara Uche”
Ònye na-ahazi akụkụ ndị na-akasi obi nke ofufe anyị? Jisọs họpụtara otu òtù ọ kpọrọ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” maka inye ‘nri ime mmụọ n’oge ya.’ (Matiu 24:45) Na narị afọ mbụ O.A., ìgwè ndị Kraịst a e tere mmanụ amalitelarị ọrụ. Òtù ndị okenye na-achị isi nọ na Jerusalem zigaara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi nke ntụziaka na nduzi. Gịnị ka ọ na-arụpụta? Bible dekọrọ otú ọgbakọ dị iche iche si meghachi omume n’ebe otu n’ime ụdị akwụkwọ ozi ahụ dị: “Mgbe ha gụsịrị ya, ha ṅụrịa n’ihi nkasi obi dị ya.”—Ọrụ 15:23-31.
N’otu aka ahụ, n’ụbọchị ikpeazụ ndị a dị oké egwu, ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche na-enye nri ime mmụọ nke na-enye ndị Jehova oké nkasi obi na agbamume. Ị̀ na-ekere òkè ná nri ahụ? A pụrụ inweta ya n’ụzọ dị mfe n’ime akwụkwọ ọgụgụ e biri ebi ndị òtù ohu ahụ na-eme ka e nwee n’ụwa nile. Magazin Ụlọ Nche na Teta! tinyere akwụkwọ, broshuọ, na traktị ndị Watch Tower Society na-ebipụta ewetaworo ọtụtụ ndị na-agụ ha nkasi obi.
Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị dere, sị: “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ụmụnna anyị nwoke na nwanyị chọrọ ime ihe ziri ezi, ma ọtụtụ mgbe ha na-agbaso nkụda mmụọ, egwu, na mmetụta na ha apụghị inyere onwe ha aka mgba. Isiokwu ndị dị n’akwụkwọ anyị dị iche iche na-enyere ọtụtụ ndị aka inwetaghachi ike ịchịkwa ndụ na mmetụta uche ha. Isiokwu ndị ahụ na-enyekwa ndị okenye ihe buru ibu karịa agbamume elu ọnụ ha ga-enye.”
Jiri akwụkwọ ndị sitere n’aka òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Magazin, akwụkwọ, na mbipụta ndị ọzọ na-abịa n’oge ha pụrụ inyere anyị aka ịchọta nkasi obi mgbe ihe siri ike. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ nke inye onye dara mbà n’obi agbamume, jiri ihe ọmụma sitere n’Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’ime akwụkwọ ndị a mee ihe. A na-eji nlezianya ede isiokwu ndị a, ọtụtụ mgbe, mgbe ọtụtụ izu ma ọ bụ ọnwa nke ime nnyocha tara akpụ, ọmụmụ ihe, na ekpere gasịrị. Ndụmọdụ ahụ dabeere na Bible, bụrụ nke a nwaleworo, bụrụkwa eziokwu. Ụfọdụ achọpụtawo na ọ na-enye nnọọ aka isoro onye na-enwe nkụda mmụọ gụọ otu isiokwu ma ọ bụ abụọ kwesịrị ekwesị. Nke a pụrụ ịrụpụta nkasi obi na agbamume dị ukwuu.
Ọ bụrụ na ị chọta ihe ndị dị oké ọnụ ahịa, ị̀ ga-ezochi ha, ka ị̀ ga-esoro ndị ọzọ kerịta ụfọdụ akụ̀ na ụba ahụ n’ụzọ mmesapụ aka? Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị ịbụ isi iyi nke nkasi obi na agbamume nye ụmụnna gị ndị nwoke na nwanyị nọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị na-ewuli elu kama ịdị na-akwada akwada, na-aja mma kama ịdị na-akatọ akatọ, na-eji “ire nke ndị mmụta” ekwu okwu kama iji ‘ndụpu nke mma agha ndị a na-echeghị eche,’ ị pụrụ ime ka e nwee ọdịiche ná ndụ ndị ọzọ. (Aịsaịa 50:4; Ilu 12:18) N’ezie, o yiri ka a ga-ele gị anya n’onwe gị dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa—isi iyi nke ezi nkasi obi na agbamume!
[Igbe dị na peeji nke 20]
Nkasi Obi Maka Ndị Nọ ná Mkpa
ỌTỤTỤ ekwuwo okwu banyere otú isiokwu ụfọdụ nke Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! siworo mee ka mmekọrịta onwe onye nke ha na Jehova mie emie karị. Otu onye kwuru, sị: “Mgbe m gụsịrị isiokwu a, ọ dị m ka Jehova n’ike na ebube ya nile o so m nọrọ kpọmkwem n’ebe ahụ. Enwere m mmetụta na ọ bụ onye dị adị n’ezie.” Akwụkwọ ozi ọzọ kwuru, sị: “A gbanwewo obi na uche anyị n’ụzọ dị ịrịba ama n’otú anyị si ele Jehova anya nke na anyị abụkwaghị ụdị mmadụ ndị anyị bụ na mbụ. O yiri ka ọ dị onye hichara enyo anya anyị, ugbu a kwa anyị pụrụ ịhụ ihe nile nke ọma.”
Ụfọdụ detara akwụkwọ iji kwuo otú magazin ndị ahụ si enyere ha aka idozi nsogbu ma ọ bụ ihe ịma aka dị iche iche kpọmkwem, si otú a na-emesi ha obi ike banyere mmasị onwe onye nke Jehova nwere n’ebe ha nọ. Otu onye na-agụ ha si otú a tinye ya: “Unu emeela nke ukwuu n’imeghachikwa ka anyị hụ ókè Jehova na-echeru echiche maka ndị ya ma na-ahụ ha n’anya.” Otu nwanyị na Japan bụ́ onye nwa ya nwụnahụrụ kwuru nke a banyere isiokwu Teta! ndị e dere banyere okwu ahụ, sị: “Ịdị omimi nke ebere Chineke si n’ime peji ndị ahụ na-awụpụta, ebekwara m ákwá nke ukwuu. Etinyewo m isiokwu ndị a n’ebe m pụrụ ịgụ ha ozugbo mgbe ọ bụla m nwere mmetụta nke enweghị obi ụtọ na nke ịnọ nanị m.” Otu nwanyị ọzọ na-eru újú dere, sị: “Isiokwu Ụlọ Nche na Teta! na broshuọ ahụ bụ́ “Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ” enyewo m ike ahụ dị m mkpa iji die oge iru újú m.”
Akwụkwọ Nsọ bụ isi iyi bụ isi nke nkasi obi. (Ndị Rom 15:4) Ụlọ Nche na-arapagidesi ike na Bible dị ka ihe ndabere ya, otú a kwa ka magazin ya na ya na-agakọ, bụ́ Teta! na-eme. N’ihi nke a, akwụkwọ ndị a abụrụwo ihe nkasi obi na agbamume nye ndị na-agụ ha.
[Foto dị na peeji nke 23]
Chineke nke nkasi obi nile bụkwa Onye Na-anụ ekpere