Ìhè Eweta Ọgbọ Ọchịchịrị ná Njedebe
ỤWA nke Jisọs Kraịst na ndị ozi ya dị nnọọ iche pụọ na nke oge Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ndị na-agụ Bible bụ́ ndị na-amaghị nke a pụrụ iwere ya na e nwere ndịgide nke mmekọrịta ọha mmadụ na okpukpe malite n’oge onye amụma bụ́ Malakaị ruo n’oge onye so dee Oziọma bụ́ Matiu, na-aghọta n’ụzọ na-edochaghị anya ihe mere na 400 afọ dị n’etiti ha.
Malakaị, akwụkwọ ikpeazụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ihe ka ọtụtụ na Bible nke oge a, ji mweghachi nke ihe fọdụrụ ná ndị Israel n’ala ha mgbe a tọhapụsịrị ha ná ndọta n’agha na Babilọn wee mechie. (Jeremaịa 23:3) A gbara ndị Juu raara onwe ha nye ume ichere ụbọchị ikpe Chineke iji kpochapụ ihe ọjọọ n’ụwa ma webata Ọgbọ Mesaịa. (Malakaị 4:1, 2) Ka ọ dịgodị n’oge ahụ, Peasia nọ na-achị. Ndị agha Peasia bi ebi na Juda ji ike agha hụ na a nọ na-enwe udo ma na-ahụ na e debere iwu nile nke eze.—Tụlee Ezra 4:23.
Otú ọ dị, ala ndị a kpọrọ aha n’ime Bible anọgideghị na-adị n’udo n’ime narị afọ anọ nile ahụ sochiri. Ọchịchịrị na ọgba aghara ime mmụọ malitere ịwabata. Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa gbara aghara n’ihi ime ihe ike, iyi ọha egwu, mmegbu, echiche okpukpe ndị gabigara ókè, nkà ihe ọmụma ịkọ nkọ, na ọdịiche ọdịbendị.
E dere Matiu, bụ́ akwụkwọ mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, n’ọgbọ dị iche. Ndị agha Rom jiri ike agha hụ na e debere Pax Romana, ma ọ bụ Udo nke Rom. Ndị na-atụ egwu Chineke nọ na-echesi ọbịbịa nke Mesaịa ahụ ike iji wepụ ịta ahụhụ, ọchịchị aka ike, na ịda ogbenye, na ịmụkwasị ìhè ná ndụ, ọganihu, na ịdị jụụ. (Tụlee Luk 1:67-79; 24:21; 2 Timoti 1:10.) Ka anyị lerukwuo anya ná mmetụta dị ike ndị kpụzigharịrị ọha mmadụ ndị Juu na narị afọ ndị dị tupu ọmụmụ Jisọs Kraịst.
Ndụ Ndị Juu n’Oge Ndị Peasia
Mgbe mkpọsa Saịrọs nke tọhapụrụ ndị Juu ná ndọta n’agha nke Babilọn, na 537 T.O.A. gasịrị, otu ìgwè ndị Juu na ndị sonyeere ha na-abụghị ndị Juu siri na Babilọn pụọ. Ndị a fọdụrụnụ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe laghachiri n’ókèala nke obodo ukwu ndị e bibiri ebibi na ala tọgbọrọ chakoo. Ndị Edọm, ndị Finisia, ndị Sameria, ebo dị iche iche nke Arebia, na ndị ọzọ ewerewo ụfọdụ n’ime ókèala Israel saburu mbara. Ihe fọrọ na Juda na Benjamin ghọrọ ógbè Juda n’oge nke ọchịchị ndị nnọchianya eze nke ndị Peasia nke a kpọrọ Abar Nahara (Ofe Osimiri).—Ezra 1:1-4; 2:64, 65.
N’okpuru ọchịchị ndị Peasia, Juda malitere inwe “oge mgbasapụ na mmụba ụba mmadụ,” ka akwụkwọ bụ́ The Cambridge History of Judaism na-ekwu. Ọ gara n’ihu ikwu banyere Jerusalem, sị: “Ndị ọrụ ugbo na ndị njem ala nsọ wetara onyinye dị iche iche, Ụlọ Nsọ na obodo bara ọgaranya, akụ̀ na ụba ha dọtakwara ndị ahịa na ndị ọrụ aka sitere mba ndị ọzọ.” Ọ bụ ezie na ndị Peasia na-ekwe nnọọ ka ọchịchị na okpukpe e nwere n’ógbè dịrị, ụtụ isi siri ike, bụrụkwa ndị a pụrụ nanị iji ọla ndị dị oké ọnụ ahịa kwụọ.—Tụlee Nehemaịa 5:1-5, 15; 9:36, 37; 13:15, 16, 20.
Afọ ndị ikpeazụ nke Alaeze Ukwu Peasia bụ nnọọ oge oké ọgba aghara, nke e ji nnupụisi nke ndị nọchiri anya eze kaa akara. Ọtụtụ ndị Juu tinyere aka n’imegide ọchịchị n’akụkụ Ụsọ Osimiri Mediterranean, e wee gbaara ha ụgbọ nwa mkpị gaa n’ime ime ebe ugwu, na Hyrcania nke dị n’Osimiri Caspian. Otú ọ dị, o yiri ka ntaramahụhụ ahụ nke ndị Peasia emetụtaghị ihe ka ukwuu ná ndị Juda.
Oge Ndị Gris
Aleksanda Onye Ukwu wakwasịrị Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa dị ka agụ na 332 T.O.A., ma mmasị maka ihe ndị e si Gris bubata eburularị ya ụzọ ruo. (Daniel 7:6) N’ịchọpụta na ọdịbendị ndị Gris bara uru n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, o leziri anya malite ime ka alaeze ya na-agbasawanye agbasawanye nakwere ọdịbendị nke ndị Gris. Grik ghọrọ asụsụ mba nile. Ọchịchị Aleksanda nke na-anọteghị anya kwalitere ịhụnanya maka arụmụka aghụghọ, ịnụ ọkụ n’obi maka egwuregwu, na mmasị n’ihe ndị mara mma. Nwayọọ nwayọọ, ọbụna ọdịnala ndị Juu bụ nke echiche nke ndị Gris nọchiri.
Ka ọnwụ Aleksanda gasịrị na 323 T.O.A., ndị nọchiri ya na Siria na Ijipt bụ ndị mbụ weere ọkwá ndị ahụ nke Daniel onye amụma kpọrọ “eze Ugwu” na “eze nke Ndịda.” (Daniel 11:1-19) N’oge ọchịchị “eze nke Ndịda” nke Ijipt, bụ́ Ptolemy II Philadelphus (285-246 T.O.A.), a malitere ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Koine, bụ́ asụsụ Grik a na-asụ n’oge ahụ. E mesịrị kpọọ nsụgharị nke a Septuagint. E hotara ọtụtụ amaokwu sitere ná nsụgharị nke a n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Asụsụ Grik ghọrọ ihe magburu onwe ya iji nye ụwa nke nọ ná mgbagwoju anya na n’ọchịchịrị ime mmụọ nkọwa dị iche iche na-enye nghọta.
Mgbe Antiochus IV Epiphanes ghọsịrị eze nke Siria na onye ọchịchị nke Palestine (175-164 T.O.A.), ọ fọrọ nke nta ka e jiri mkpagbu nke gọọmenti kwadoro kpochapụ okpukpe ndị Juu. E ji iyi egwu nke ọnwụ manye ndị Juu ịjụ Jehova Chineke na ịchụ àjà nye nanị chi dị iche iche nke Gris. Na December 168 T.O.A., e wukwasịrị otu ebe ịchụàjà nke ndị ọgọ mmụọ n’elu oké ebe ịchụàjà Jehova n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, a nọkwa n’elu ya chụọ àjà dị iche iche nye Zeus nke Olympus. Ndị ikom nwere obi ike bụ́ ndị si n’ime obodo ma bụrụ ndị ọ wụrụ akpata oyi n’ahụ jikọrọ aka ọnụ n’okpuru idu ndú nke Judas Maccabaeus wee lụọ agha kpụ ọkụ n’ọnụ ruo mgbe ha weghaara Jerusalem. A raraghachiiri ụlọ nsọ ahụ nye Chineke, n’ụbọchị ọ gbakwara afọ atọ ka e metọsịrị ya, a maliteghachiri àjà ndị a na-achụ kwa ụbọchị.
N’ime ihe fọdụrụ n’oge ndị Gris, ndị si n’ógbè ndị Juda ji ike ike chọọ ịgbatị ala ha ruo n’ókèala ya ochie. E ji ike agha ha nwetara ọhụrụ mee ihe n’ụzọ asọpụrụghị Chineke iji mma agha tọghata ndị agbata obi ha bụ́ ndị ọgọ mmụọ. Ma, nchepụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ndị Gris nọgidere na-achị obodo ukwu na obodo nta dị iche iche.
N’ime oge a, ndị na-azọ ọkwá onye isi nchụàjà na-abụkarị ndị rụrụ arụ. Ịkpa nkata aghụghọ, ogbugbu mmadụ, na aghụghọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị tere ọkwá ha unyi n’ihu. Ka mmụọ dị n’etiti ndị Juu ghọwanyere nke asọpụrụghị Chineke, otú a ka egwuregwu ndị Gris ghọwanyere nke na-ewu ewu. Lee ka o si bụrụ ihe na-atụ n’anya ịhụ ndị nchụàjà bụ́ ndị na-eto eto ka ha na-eleghara ọrụ ha anya iji kere òkè n’egwuregwu ndị ahụ! Ndị Juu na-eme egwuregwu ọbụna nyefere onwe ha n’ịwa ahụ na-egbu mgbu iji ghọọ “ndị a na-ebighị úgwù” iji zere mmechuihu mgbe ha gba ọtọ soro ndị ibe ha bụ́ ndị Jentaịl na-asọ mpi.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 7:18.
Mgbanwe Ndị E Nwere n’Okpukpe
Ná mmalite nke afọ ndị sochiri ndọta n’agha ahụ, ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi guzogidere ngwakọta nke echiche na nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ na ezi okpukpe ahụ e kpughere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Akwụkwọ bụ́ Esta, nke e dere mgbe ihe karịrị 60 afọ nke mmekọrịta chiri anya nke ha na Peasia gasịrị, enweghị otu mkpụrụ ihe ọ bụla metụtara okpukpe Zoroaster n’ime ya. Ọzọkwa, a dịghị achọta mmetụta ọ bụla nke okpukpe Peasia nke a n’ime akwụkwọ Bible ndị bụ́ Ezra, Nehemaịa, ma ọ bụ Malakaị, bụ́ ndị e dechara n’akụkụ mbụ nke oge ndị Peasia (537-443 T.O.A.).
Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta kwenyere na n’akụkụ ikpeazụ nke oge ndị Peasia, ọtụtụ ndị Juu malitere ịnakwere ụfọdụ n’ime echiche nke ndị na-efe Ahura Mazda, chi bụ isi nke Peasia. Nke a na-apụta ìhè na nkwenkwe na nkweta ndị a ma ama nke ndị Essene. N’uche ndị Juu, e jikọtara okwu Hibru nkịtị maka nkịta ọhịa, ihe ndị ọzọ e kere eke na-ebi n’ọzara, na nnụnụ ndị na-apụta n’abalị ha na ajọ mmụọ na lilith ndị dị n’akụkọ ifo ndị Babilọn na Peasia.
Ndị Juu malitere ile echiche ndị ọgọ mmụọ anya n’ụzọ dị iche. Echiche nke eluigwe, hell, mkpụrụ obi, Okwu ahụ (Logos), na amamihe, ha nile nweziri ihe ndị ọhụrụ ha pụtara. Ọ bụrụkwa na, dị ka e si kụzie n’oge ahụ, na Chineke nọ n’ebe dị anya nke ukwuu nke na ọ dịkwaghị agwa mmadụ okwu, ọ dị ya mkpa inwe ndị ngabita. Ndị Gris kpọrọ ndị mmụọ a bụ́ ndị ngabita na ndị nchebe daimon. Ebe ha nakwerewooro echiche ahụ bụ́ na daimon (ndị mmụọ ọjọọ) pụrụ ịdị mma ma ọ bụ dị njọ, e kpughere ndị Juu n’ụzọ dị mfe nye nchịkwa nke ndị mmụọ ọjọọ.
Mgbanwe bara uru metụtara ofufe nke ógbè ahụ. E wuru ụlọ nzukọ dị iche iche ngwa ngwa dị ka ebe ọgbakọ ndị Juu ndị dị gburugburu ebe ahụ na-ezukọta maka izi ihe okpukpe na ife ofufe. A maghị kpọmkwem mgbe, ebe, na otú ụlọ nzukọ ndị Juu si malite. Ebe ọ bụ na ha gboro mkpa nke ndị Juu nọ n’ala ndị dị anya maka ofufe mgbe ha na-apụghị ịga n’ụlọ nsọ ahụ, e kwetara n’ọha na e guzobere ụlọ nzukọ dị iche iche n’oge ndọta n’agha ma ọ bụ mgbe ọ gasịrị. N’ụzọ dị ịrịba ama, ha ghọrọ ebe ndị mara mma nye Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ịnọ ‘kwusaa ịdị mma nile nke Chineke, Onye na-akpọpụta ndị mmadụ n’ọchịchịrị baa n’ìhè ya dị ebube.’—1 Pita 2:9.
Okpukpe Ndị Juu Gụnyere Ìgwè Ndị Nwere Echiche Dị Iche Iche
Na narị afọ nke abụọ T.O.A., ìgwè ndị nwere echiche dị iche iche malitere ịpụta. Ha abụghị òtù okpukpe dịgasị iche iche. Kama nke ahụ, ha bụ ntakịrị òtù dị iche iche nke ndị ụkọchukwu ndị Juu, ndị ọkà ihe ọmụma, na ndị na-anụrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọkụ n’obi bụ́ ndị chọrọ inwe mmetụta n’ahụ ndị ahụ na ịchịkwa mba ahụ, ha nile n’aha okpukpe ndị Juu.
Ndị Sadusii ahụ a dọbanyeworo na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ n’ụzọ ka ukwuu ndị aka ji akụ̀ ọnụ na-eru n’okwu, ndị e ji mmekọrịta akọ ha nke mba na mba mara kemgbe nnupụisi nke ndị òtù Hasmon gasịrị n’etiti narị afọ nke abụọ T.O.A. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nchụàjà, ọ bụ ezie na ụfọdụ bụ ndị o ji ego achụ ego na ndị nwere ala. Ka ọ na-erule oge a mụrụ Jisọs, ihe ka ọtụtụ ná ndị Sadusii nwere mmasị karị n’ọchịchị ndị Rom na-achị Palestine n’ihi na ha chere na ọ ka kwụsie ike, yiekwa ka ọ ga-ejigide ọnọdụ dịnụ. (Tụlee Jọn 11:47, 48.) Ọnụ ọgụgụ dị ala karị (ndị na-eso ụzọ Herọd) kwenyere na ọchịchị nke ezinụlọ Herọd ga-aka kwesị echiche mba ahụ. Ka o sina dị, ndị Sadusii achọghị ka mba ahụ dịrị n’aka ndị Juu na-anụbiga ọkụ n’obi ókè ma ọ bụ ikwe ka onye ọ bụla ọzọ ma e wezụga ndị nchụàjà na-achịkwa ụlọ nsọ ahụ. Nkwenkwe ndị Sadusii adịghị anabata echiche ọhụrụ, bụrụ nke dabeere n’ụzọ bụ isi ná nkọwa ha nke ihe odide Mosis, ma gosipụta mmegide ha na-emegide ịrọ òtù ahụ dị ike nke ndị Farisii. (Ọrụ 23:6-8) Ndị Sadusii jụrụ amụma dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ Hibru dị ka ịkọ nkọ. Ha kụziri na akwụkwọ akụkọ ihe mere eme, abụ uri, na ilu nke Bible esiteghị n’ike mmụọ nsọ, bụrụkwa ndị na-adịghị mkpa.
Ndị Farisii malitere n’oge ndị Gris dị ka mmeghachi omume dị ike megide ọdịnala ndị Gris na-emegide ndị Juu. Otú ọ dị, ka ọ na-erule oge Jisọs, ha bụ ndị ntọghata na ndị nkụzi kpọrọ ekwo nkụ, na-arapagidesi ike n’ọdịnala, na-agbaso iwu, dị mpako, ndị ezi omume n’anya onwe ha bụ́ ndị chọrọ ịchịkwa mba ahụ site n’izi ihe a na-enye n’ụlọ nzukọ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha sitere n’ọkwá etiti ma ledaa ndị nkịtị anya. Jisọs lere ihe ka ọtụtụ ná ndị Farisii anya dị ka ndị hụrụ ego n’anya bụ́ ndị na-achọ ọdịmma onwe ha, ndị na-enweghị obi ebere, na-egosipụta omume ihu abụọ. (Matiu, isi nke 23) Ha nakweere Akwụkwọ Nsọ Hibru nile dabere ná nkọwa ha ma were ọdịnala ha a na-edeghị ede dị ka nke ya na ya hà ma ọ bụ nke karịrị ya. Ha sịrị na ọdịnala ha dị iche iche bụ “ogige gbara Iwu ahụ gburugburu.” Otú ọ dị, kama ịbụ ogige, ọdịnala ha mere ka Okwu Chineke ghara ịdị irè ma gbagwojuo ọha na eze anya.—Matiu 23:2-4; Mak 7:1, 9-13.
Ndị Essene bụ ndị kwere n’ihe omimi bụ́ ndị o doro anya na ha biri n’ógbè ole na ole dịpụrụ adịpụ. Ha weere onwe ha dị ka ezi ndị Israel fọdụrụnụ, ndị ji ịdị ọcha na-echere ịnabata Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ndị Essene biri ndụ ntụgharị uche nke ịnapụ onwe onye ihe ụtọ nile n’ụzọ ime nsọ nsọ, ọtụtụ n’ime nkweta ha yiri nnọọ echiche nke ndị Peasia na ndị Gris.
Ndị Zealot dịgasị iche iche ndị hụbigara mba ha n’anya ókè, bụ́ ndị ọ bụ okpukpe na-akwali, lere onye ọ bụla nke nọchiiri ndị Juu ụzọ ịghọ mba kwụụrụ onwe ya anya ọjọọ dị ka onye iro. E jiriwo ha tụnyere ndị òtù Hasmon, ha na-amasịkarịkwa ụmụ okorobịa nwere echiche ndị dị elu, ndị nwere mmasị n’ime ihe ndị dị ize ndụ. N’ịbụ ndị e lere anya dị ka ndị o ji égbè aga na-egbu mmadụ ma ọ bụ dị ka ndị agha mmegide, ha lụrụ agha nzuzo nke mere ka ụzọ ime obodo na ámá dị iche iche dị ize ndụ ma mee ka ịchị obi n’aka dị n’oge ahụ ka njọ.
N’Ijipt, nkà ihe ọmụma ndị Gris nwere ọganihu n’etiti ndị Juu bi n’Alexandria. Site n’ebe ahụ ọ gbasara ruo Palestine, ruokwa ndị Juu gbasara nke ukwuu na Diaspora. Ndị Juu na-eme nchepụta bụ́ ndị dere Apọkrịfa na ihe odide ndị ọzọ nke ndị Juu a na-amaghị ndị dere ha kọwara ihe odide nile nke Mosis dị ka okwu ihe atụ ndị na-edoghị anya, ndị na-adịghị akpali akpali.
Tupu oge ndị Rom eruo, mgbasa ọdịbendị ndị Gris agbanweela Palestine kpam kpam n’ụzọ mmekọrịta ọha mmadụ, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na nkà ihe ọmụma. Okpukpe ndị Juu nke dabeere na Bible abụrụwo nke e ji okpukpe ndị Juu dochie, bụ́ ngwakọta nke echiche ndị Babilọn, Peasia, na nke ndị Gris ndị e ji ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ tigwaa. Otú ọ dị, n’ozuzu ha, ndị Sadusii, ndị Farisii, na ndị Essene mejupụtara ihe na-erughị pasent 7 nke mba ahụ. Ndị a nwụdere n’ime ọgba aghara nke òtù ndị a dị ike bụ ìgwè ndị Juu nkịtị, ‘ndị a na-esogbu, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’—Matiu 9:36.
Ọ bụ n’ime ụwa ahụ gbara ọchịchịrị ka Jisọs Kraịst batara. Ịkpọ òkù ya nke na-emesi obi ike na-enye nkasi obi: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.” (Matiu 11:28) Lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali ịnụ ka o kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Ìhè nke ụwa”! (Jọn 8:12) Nkwa ya na-akasi obi bụkwa ihe obi ụtọ n’ezie: “Onye na-eso m agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe Ìhè nke ndụ.”—Jọn 8:12.
[Foto dị na peeji nke 26]
Jisọs gosiri na ndị ndú okpukpe bụ ndị Juu nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ
[Foto dị na peeji nke 28]
Mkpụrụ ego nke bu onyinyo Antiochus IV (Epiphanes)
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.