Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/15 p. 21-24
  • Olee Ndị Bụ́ Ndị Maccabee?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị Bụ́ Ndị Maccabee?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ntiwapụ nke Ọdịbendị Ndị Gris
  • Nrụrụ Aka nke Ndị Nchụàjà
  • Antiochus Emee Ihe
  • Ndị Maccabee Emeghachi Omume
  • E Nwetaghachi Ụlọ Nsọ Ahụ
  • Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Akarịa Ime Nsọ Nsọ
  • Ndị Hasmon na Ihe Ha Hapụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Eze Abụọ Na-alụ Ọgụ
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ìhè Eweta Ọgbọ Ọchịchịrị ná Njedebe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ndị Kraịst Oge Gboo n’Oge A Na-asụ Asụsụ Grik n’Ọtụtụ Ebe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/15 p. 21-24

Olee Ndị Bụ́ Ndị Maccabee?

NYE ọtụtụ ndị, oge nke ndị Maccabee yiri ihe na-enye ihe ọmụma banyere oge dịrị n’agbata mgbe e dechara akwụkwọ ndị ikpeazụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru na ọbịbịa Jisọs Kraịst. Ọbụna dị ka a na-ekpughe nkọwa ụfọdụ mgbe a na-enyocha ihe na-enye ihe ọmụma nke na-adị n’ụgbọelu mgbe ọ kụkasịchara, a pụrụ inweta nghọta ụfọdụ site n’ilebakwu anya n’oge ndị Maccabee—bụ́ nke mgbanwe na nnwogha nye mba ndị Juu.

Olee ndị bụ́ ndị Maccabee? Hà si aṅaa metụta okpukpe ndị Juu tupu ọbịbịa Mesaịa ahụ e buru n’amụma?—Daniel 9:25, 26.

Ntiwapụ nke Ọdịbendị Ndị Gris

Alexander Onye Ukwu meriri ókèala ndị sitererịị na Gris ruo India (336-323 T.O.A.). Alaeze ya nke sara mbara bụ otu ihe kpatara mgbasa nke ụzọ ndụ ndị Gris—asụsụ na ọdịbendị ndị Gris. Ndị ọfịsa na usuu ndị agha Alexander lụrụ ndị inyom obodo ndị ahụ, na-akpata ngwakọta nke ọdịbendị ndị Gris na nke ndị mba ọzọ. Mgbe Alexander nwụsịrị, ndị ọchịagha ya kere alaeze ya n’etiti onwe ha. Ná mmalite nke narị afọ nke abụọ T.O.A., Antiochus nke Atọ nke usoro ọchịchị Seleucid nke ndị Gris dị na Siria napụrụ Israel n’aka ndị Ptolemy Gris nke Ijipt. Olee otú ọchịchị ndị Gris si metụta ndị Juu nọ n’Israel?

Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ede, sị: “Ebe ọ bụ na ndị Juu apụghị izere mmekọrịta ha na ndị agbata obi ha nakwewooro ụzọ ndụ ndị Gris, ha apụghịkwa ọbụna izere iso ụmụnne ha ndị nọ n’ala ọzọ na-emekọrịta ihe, ịnakwere ọdịbendị ndị Gris na ụzọ iche echiche ndị Gris bụ ihe a na-apụghị izere ezere. . . . Nanị ịdị ndụ n’oge ọchịchị Gris gụnyere ịnakwere ọdịbendị ndị Gris!” Ndị Juu zawara aha ndị Gris. Ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche, ha nakweere omenala na ejiji ndị Gris. Ike dị aghụghọ nke ịnakwere ihe nọ na-arị elu.

Nrụrụ Aka nke Ndị Nchụàjà

N’etiti ndị Juu ndị mmetụta nke ndị Gris kasị nwee ike n’ahụ ha bụ ndị nchụàjà. Nye ọtụtụ n’ime ha, ịnakwere ọdịbendị ndị Gris pụtara ikwe ka okpukpe ndị Juu gaa n’ihu ka oge n’aga. Otu onye Juu dị otú ahụ bụ Jason (nke a na-akpọ Joshua n’asụsụ Hibru), nwanne nwoke nke onyeisi nchụàjà bụ́ Onias nke Atọ. Ka Onias nọ n’Antiọk, Jason nyere ndị ọchịchị Gris ngarị. N’ihi gịnị? Iji kpalie ha ịhọpụta Jason dị ka onyeisi nchụàjà n’ọnọdụ Onias. Onye ọchịchị Seleucid nke Gris bụ́ Antiochus Epiphanes (175-164 T.O.A.) naara onyinye ahụ ozugbo. Ndị ọchịchị Gris etinyetụbeghị aka n’òtù ndị isi nchụàjà nke ndị Juu, ma ego dị Antiochus mkpa maka njem agha. Obi dịkwa ya ụtọ inwe onye ndú bụ́ onye Juu, bụ́ onye ga-akwalitesikwu nnakwere ọdịbendị ndị Gris ike n’ụzọ dị irè. N’ihi arịrịọ Jason, Antiochus mere Jerusalem obodo ndị Gris (polis). Jason wukwara ụlọ egwuregwu ebe ndị Juu na-eto eto na ọbụna ndị nchụàjà sọrịtara mpi n’egwuregwu.

Mgba okpuru kpatara mgba okpuru. Afọ atọ mgbe e mesịrị, Menelaus, onye ọ pụrụ ịbụworị na ọ nọghị n’usoro ndị nchụàjà, nyere ngarị ka elu, Jason gbapụkwara. Iji kwụọ Antiochus ụgwọ, Menelaus weere nnukwu ego site n’ebe ndebe ego nke ụlọ nsọ. Ebe ọ bụ na Onias nke Atọ (bụ́ onye gbagara n’Antiọk) kwuru okwu megide nke a, Menelaus mere ndokwa ka e gbuo ya.

Mgbe a gbasara asịrị na Antiochus anwụọla, Jason kpọọrọ otu puku ndị ikom lọta Jerusalem ná mgbalị iji naghara Menelaus onyeisi nchụàjà. Ma Antiochus anwụbeghị. N’ịnụ banyere ihe Jason mere nakwa banyere ọgba aghara ndị dị n’etiti ndị Juu megide ụkpụrụ ya nke ịnakwere ọdịbendị ndị Gris, Antiochus meghachiri omume n’iwe.

Antiochus Emee Ihe

N’akwụkwọ ya bụ́ The Maccabees, Moshe Pearlman na-ede, sị: “Ọ bụ ezie na ihe ndekọ ndị ahụ edochaghị anya, o yiri ka Antiochus ò kwubiri na inye ndị Juu nnwere onwe okpukpe abụwo ihie ụzọ ọchịchị. Nye ya, nnupụisi kasị ọhụrụ na Jerusalem amalitewo, ọ bụghị site n’ebumnobi okpukpe kpam kpam kama site n’omume ịkwado ndị Ijipt nke jupụtara na Judia, e kwuwokwa okwu dị ize ndụ banyere echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị a kpọmkwem n’ihi na nanị ndị Juu, n’etiti ndị ya nile, chọworo ma bụrụ ndị e nyere ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke nnwere onwe okpukpe. . . . Nke a, ka o kpebiri, na a ga-akwụsị.”

Onye Israel ọnụ na-eru n’okwu nakwa ọkà mmụta bụ́ Abba Eban na-achịkọta ihe sochirinụ: “N’ụzọ na-esochi ibe ha ngwa ngwa n’afọ ndị 168 na 167 [T.O.A.], e gbuchapụrụ ndị Juu, a kwakọọrọ ihe ndị dị n’Ụlọ Nsọ ahụ, a machibidoro okpukpe ndị Juu iwu. Ibi úgwù ghọrọ ihe na-eweta ntaramahụhụ ọnwụ, dịkwa ka idebe Ụbọchị Izu Ike. Mkparị kasị ukwuu bịara na December 167, mgbe, site n’iwu Antiochus, e wuru otu ebe ịchụàjà nye Zeus n’Ụlọ Nsọ ahụ, a chọkwara ka ndị Juu chụọ anụ ezì n’àjà—ihe na-adịghị ọcha n’ezie n’iwu ndị Juu—nye chi ndị Gris.” N’oge a, Menelaus na ndị Juu ndị ọzọ nakwerewooro ọdịbendị ndị Gris nọgidere n’ọkwá ha, na-eje ozi n’ụlọ nsọ e merụziri emerụ.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị Juu nakweere ọdịbendị ndị Gris, otu ìgwè ọhụrụ ndị kpọrọ onwe ha ndị Hasid—ndị na-eme nsọ nsọ—gbara ume nrubeisi sikwuru ike nye Iwu Mosis. N’ịbụ ndị na-asọzi ndị nchụàjà ahụ nakwerewooro ọdịbendị ndị Gris oyi, ndị nkịtị nọzi na-adụnyere ndị Hasid úkwù karị. Oge nke ịnwụ n’ihi okwukwe weere ọnọdụ ka a manyere ndị Juu ná mba ahụ dum ịnakwere omenala na àjà dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ ma ọ bụ ha anwụọ. Akwụkwọ apọkrịfa nke ndị Maccabee na-enye ọtụtụ ihe ndekọ nke ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka ndị họọrọ ọnwụ karịa imebi okwukwe ha.

Ndị Maccabee Emeghachi Omume

Imebiga ihe ókè nke Antiochus kpaliri ọtụtụ ndị Juu ịlụ ọgụ maka okpukpe ha. Na Modiʼin, bụ́ ebe ugwu ọdịda anyanwụ Jerusalem na nso obodo Lod nke oge a, a kpọpụtara onye nchụàjà aha ya bụ́ Mattathias n’etiti obodo. Ebe ọ bụ na ndị obodo ahụ na-asọpụrụ Mattathias, onye nnọchianya eze nwara ime ka o kwenye ikere òkè n’àjà ndị ọgọ mmụọ—iji zọpụta ndụ ya na iji setịpụ ihe nlereanya nye ndị fọdụrụnụ n’obodo ahụ. Mgbe Mattathias jụrụ, onye Juu ọzọ pụtara, dị njikere imebi okwukwe ya. N’ịbụ onye ọnụma juru obi, Mattathias weere ihe agha gbuo ya. N’ịbụ ndị mmeghachi omume n’ụzọ ihe ike nke agadi nwoke a na-enyeghị ọnụ okwu, ndị agha Gris meghachiri omume n’ụzọ dị nwayọọ. N’oge na-adịghị anya, Mattathias egbuwokwa onye ọfịsa Gris ahụ. Ụmụ ise Mattathias na ndị bi n’obodo ahụ meriri ndị agha Gris ahụ tupu ha enwee ike ịlụrụ onwe ha ọgụ.

Mattathias tiri mkpu, sị: ‘Onye ọ bụla nke na-anụrụ Iwu ahụ ọkụ n’obi soro m.’ Iji zere mmegwara, ya na ụmụ ya ndị ikom gbalagara n’ógbè ebe ugwu. Ka okwu ihe ha mere gbasakwara, ndị Juu (gụnyere ọtụtụ ndị Hasid) sonyeere ha.

Mattathias họpụtara nwa ya bụ́ Judah ịbụ onyeisi ọrụ agha. Ikekwe n’ihi ikike Judah nwere n’ibu agha, a kpọrọ ya Maccabee, nke pụtara “hama.” A kpọrọ Mattathias na ụmụ ya ndị ikom ndị Hasmon, bụ́ aha e si n’obodo bụ́ Heshmọn ma ọ bụ site ná nna ochie a gụrụ aha ahụ nweta. (Joshua 15:27) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Judah Maccabee ghọrọ onye a ma ama n’oge nnupụisi ahụ, a bịaziri na-akpọ ezinụlọ ahụ dum ndị Maccabee.

E Nwetaghachi Ụlọ Nsọ Ahụ

N’afọ mbụ nke nnupụisi ahụ, Mattathias na ụmụ ya ndị ikom haziliri ìgwè ndị agha dị nta. N’ihe karịrị otu ugboro, ndi agha Gris wakporo ìgwè ndị agha Hasid n’Ụbọchị Izu Ike. Ọ bụ ezie na ha nwere ike ịlụrụ onwe ha ọgụ, ha agaghị emebi Ụbọchị Izu Ike. Ya mere, e gburu ndị mmadụ n’ìgwè. Mattathias—onye a na-elezi anya dị ka onyeisi okpukpe—guzobere iwu nke nyere ndị Juu ohere ịlụrụ onwe ha ọgụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ọ bụghị nanị na iwu a kwanyere nnupụisi ahụ ọkụ kamakwa o setịpụrụ ụkpụrụ n’okpukpe ndị Juu nke inye ndị ndú okpukpe ohere ime ka iwu ndị Juu kwekọọ n’ọnọdụ ndị na-agbanwe agbanwe. Talmud na-egosipụta nke a n’okwu o mesịrị kwuo, bụ́: “Ha mee ka otu Ụbọchị Izu Ike gharakwa ịdị nsọ ka ha wee nwee ike ido ọtụtụ Ụbọchị Izu Ike nsọ.”—Yoma 85b.

Mgbe nna ya meworo agadi nwụsịrị, Judah Maccabee ghọrọ onye ndú a na-adịghị agbagha agbagha nke nnupụisi ahụ. N’ịchọpụta na ya enweghị ike imeri ndị iro ya n’ọgụ ihu na ihu, ọ tụpụtara usoro ndị ọhụrụ, dị ka agha okpuru nke oge a. Ọ wakporo ndị agha Antiochus n’ebe ndị ha na-apụghị iji usoro ndị ha na-ejikarị echebe onwe ha eme ihe. Site n’otu ọgụ gaa n’ọzọ, Judah si otú a nwee ike imeri ndị agha hiri nne nke ukwuu karịa nke ya.

N’ịbụ ndị ihe ịma aka ndị si n’ime na ike na-arị elu nke Rom chere ihu, ndị ọchịchị Alaeze Ukwu Seleucid echegbughị onwe ha banyere ịhụ na e debere iwu ndị megidere ndị Juu. Nke a megheere Judah ụzọ ịga n’ihu ná mwakpo ya ruo kpọmkwem n’ọnụ ụzọ ámá Jerusalem. Na December 165 T.O.A. (ma ọ bụ ikekwe 164 T.O.A.), ya na ndị agha ya weghaara ụlọ nsọ ahụ, mee ka arịa ya dị ọcha, ma raraghachi ya nye—kpọmkwem afọ atọ mgbe e merụsịrị ya. Ndị Juu na-echeta ihe omume a kwa afọ n’oge Hanukkah, bụ́ ememe nraranye.

Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Akarịa Ime Nsọ Nsọ

E mezuwo nzube e ji nupụ isi. E wepụwo mmachibido ndị a machibidoro ikpe okpukpe ndị Juu. E weghachiwo ofufe na ịchụ àjà n’ụlọ nsọ ahụ. N’ịbụ ndị nwere afọ ojuju ugbu a, ndị Hasid hapụrụ òtù agha Judah Maccabee ma laghachi n’ebe obibi ha. Ma Judah nwere echiche ndị ọzọ. O nwere ndị agha a zụrụ nke ọma, ya mere gịnị ma o jiri ya guzobe steeti ndị Juu nke kwụụrụ onwe ya? Ihe ndị metụtara okpukpe nke kpatara nnupụisi ahụ bụzi ndị e ji mkpali ndọrọ ndọrọ ọchịchị dochie. Ya mere ndọga ahụ gara n’ihu.

N’ịchọ nkwado n’ọgụ ya megide ọchịchị ndị Seleucid, Judah Maccabee sooro Rom nwee nkwekọrịta. Ọ bụ ezie na e gburu ya n’ọgụ na 160 T.O.A., ụmụnne ya ndị nwoke lụụrụ ọgụ ahụ gaa n’ihu. Nwanne nwoke Judah bụ́ Jonathan mere ihe ndị dị aṅaa nke mere na ndị ọchịchị Seleucid kwenyere ná nhọpụta a họpụtara ya dị ka onyeisi nchụàjà na onye ọchịchị na Judia, ọ bụ ezie na ọ ka nọ n’okpuru ịchịisi ha. Mgbe a ghọgburu, jide, ma gbuo Jonathan dị ka ihe atụmatụ otu onye Siria rụpụtara, nwanne ya nwoke bụ́ Simeon—onye ikpeazụ n’ụmụnne Maccabee—weghaara ọchịchị. N’okpuru ịchịisi Simeon, e wepụrụ akụkụ ikpeazụ nke ọchịchị ndị Seleucid (na 141 T.O.A.). Simeon mere ka nkekọ ha na Rom dịghachi ọhụrụ, ndị ndú ndị Juu nabatakwara ya dị ka onye ọchịchị na onyeisi nchụàjà. E si otú a guzobe usoro ndị ọchịchị Hasmon kwụụrụ onwe ya, n’aka ndị Maccabee.

Ndị Maccabee guzobeghachiri ofufe n’ụlọ nsọ ahụ tupu ọbịbịa Mesaịa. (Tụlee Jọn 1:41, 42; 2:13-17.) Ma dị nnọọ ka e mebiri obi ike e nwere n’òtù ndị nchụàjà site n’ihe ndị nchụàjà nakweere ọdịbendị ndị Gris mere, a kwakwuru ya aka ọbụna n’okpuru ndị Hasmon. N’ezie, ịchịisi sitere n’aka ndị nchụàjà ji ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpọrọ ihe kama ịbụ nke sitere n’aka eze nke sitere n’eriri Devid kwesịrị ntụkwasị obi, ewetaghịrị ndị Juu ezi ngọzi.—2 Samuel 7:16; Abụ Ọma 89:3, 4, 35, 36.

[Foto dị na peeji nke 21]

Mattathias, bụ́ nna Judah Maccabee, tiri mkpu, sị: ‘Onye ọ bụla nke na-anụrụ Iwu ahụ ọkụ n’obi soro m’

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mattathias na-arịọ ndị Juu gbara ọsọ ndụ arịrịọ/The Doré Bible Illustrations/Dover Publications

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya