‘M̀ Dị Chineke Mkpa?’
“M̀DỊ Mkpa? Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere M?” Otú ahụ ka isiokwu nke edemede pụtara na magazin bụ́ Christianity Today na-ekwu. “Ihe dị ukwuu n’ọrụ m dị ka onye na-ede ihe ehibewo isi ná nsogbu nke ihe mgbu,” ka Philip Yancey, bụ́ onye dere edemede ahụ na-ekwu. “M na-abịaghachi mgbe mgbe n’otu ajụjụ ahụ, dị ka m na-arụ ọnyá ochie nke na-alachabeghị aka. M na-ege ndị na-agụ akwụkwọ m ntị, akụkọ nhụjuanya ha na-anwapụta obi abụọ m nile.”
Ma eleghị anya gị onwe gị kwa echewo banyere mmasị Chineke nwere ná ndụ gị. Oo, ị pụrụ ịma ihe dị na Jọn 3:16, nke na-asị na “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya.” Ma ọ bụ ị pụrụ ịgụworị Matiu 20:28, nke na-asị na Jisọs bịara “ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” Ma ị pụrụ ịjụ sị, ‘Chineke ọ̀ na-arịba m ama? Ọ̀ na-eche banyere m dị ka mmadụ?’ E nwere ezi ihe mere anyị ga-eji ekwere na ọ na-eme otú ahụ, dị ka anyị ga-ahụ.