Akụkọ Ọma Dị n’Ihu!
ỌNA-EWUTE anyị nile mgbe ọ bụla anyị natara akụkọ ọjọọ nke metụtara anyị. N’aka nke ọzọ, anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe akụkọ ọma bịara—ozi na-enye ọṅụ maka anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ n’anya. Ma mgbe akụkọ ọjọọ metụtara ndị ọzọ n’abụghị anyị, a na-enwekarị ọchịchọ nke ịchọ ịmata ihe na-emenụ; ọbụna ụfọdụ na-enwe ọṅụ ịnụ banyere ihe ndabara ọjọọ nke ndị ọzọ. Nke a pụrụ ịbụ n’otu akụkụ ihe kpatara akụkọ ọjọọ ji aga nnọọ ahịa!
Ná mmalite Agha Ụwa nke Abụọ, e nwere ihe atụ doro anya nke mmasị jọgburu onwe ya nke ụfọdụ ndị nwere n’ọdachi. Otu nnukwute ụgbọ agha mmiri nke dị 10,000 tọn, bụ́ Graf Spee, bụ nke kasị baa uru n’ìgwè ụgbọ mmiri ndị Germany na 1939. Ruo ọtụtụ izu ụgbọ agha mmiri a anọwo na-ebibi ihe nke ukwuu n’etiti ụgbọ mmiri ndị ahịa nke Mba Ndị Jikọrọ Aka n’oké osimiri Ndịda Atlantic na nke India. N’ikpeazụ, nnukwute ụgbọ agha mmiri atọ nke Britain chụkwudoro ma busoo Graf Spee ahụ agha, na-akpata ọnwụ nke ndị mmadụ ma na-amanye ụgbọ mmiri ahụ ịgbara nwayọọ nwayọọ banye n’ọdụ ụgbọ mmiri Uruguay bụ́ Montevideo maka idozi ya. Gọọmenti Uruguay nyere iwu ka ụgbọ agha mmiri ahụ laghachi n’osimiri ozugbo, ma ọ bụghị ya a ga-ejichi ya. Ya mere agha kpụ ọkụ n’ọnụ nke òtù abụọ na-ahaghị nhata yiri ka ọ na-aga ịmalite.
Mgbe ha nụrụ banyere nke a, otu ìgwè ndị oji ego achụ ego nọ na United States gbazitere otu ụgbọ elu, n’ọnụ ahịa nke ihe dị ka $2,500 maka otu onye, iji fega Uruguay ije kirie agha ahụ nke a ga-awụfu ọbara dị ukwuu na ya. N’adịghị ka ha tụrụ anya ya, a lụghị agha ahụ. Adolf Hitler nyere iwu ka e bepuo oghere n’okpuru Graf Spee ahụ. Ọtụtụ puku mmadụ bụ́ ndị gbakọtara n’ọnụ mmiri ahụ na-atụ anya ikiri agha mmiri kpụ ọkụ n’ọnụ, kama nke ahụ, hụrụ, nụkwa oké ụda ntiwa nke Graf Spee ahụ ji mie mmiri, n’ịbụ nke ìgwè ndị ọrụ ya bepụrụ ala ya. Onye isi ụgbọ mmiri ahụ gburu onwe ya site n’ịgba onwe ya égbè n’isi.
N’agbanyeghị ọ̀tụ̀tụ̀ obi ọjọọ ụfọdụ nke ụfọdụ ndị nwere, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ekwenye na ha nwere mmasị n’akụkọ ọma karịa n’akụkọ ọjọọ. Ọ̀ bụ na i cheghị otú ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere akụkọ ihe mere eme ji dekọọ akụkọ ọjọọ dị ukwuu ma dekọọ akụkọ ọma dị nnọọ nta? Ọ̀ dị mgbe a pụrụ ịgbanwe ọnọdụ ahụ?
Ihe Ndị Kpatara Akụkọ Ọjọọ Nile
Bible na-akọ banyere mgbe ọ bụ nanị akụkọ ọma ka e nwere. Akụkọ ọjọọ bụ ihe a na-amaghị ama, ihe a na-adịghị anụ maka ya. Mgbe Jehova Chineke rụzuru ọrụ okike ya nile, e doziri mbara Ụwa ka mmadụ na anụ ọhịa nụ ụtọ ya. Ihe ndekọ nke Jenesis na-akọrọ anyị, sị: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.”—Jenesis 1:31.
Ọdịdị nke akụkọ ọjọọ na-adịghị adịteghị oké anya ka e kesịrị mmadụ. Tupu Adam na Iv amụọ nwa ọ bụla, a kọrọ akụkọ ọjọọ banyere nnupụisi megide Chineke na ndokwa ya dị n’usoro nke eluigwe na ala nke ihe ọma. Otu nwa mmụọ nke nwere ọkwá dị elu ghọrọ onye na-agba ọkwá ya a tụkwasịrị obi mgba okpuru ma nwee ihe ịga nke ọma n’ịkpali mmadụ abụọ mbụ isonyere ya n’ụzọ nnupụisi ya, nke ịgba mgba okpuru.—Jenesis 3:1-6.
Ụba nke akụkọ ọjọọ nke ihe a kpọrọ mmadụ hụworo malitere n’oge ahụ. Ka a sịkwa ihe mere ịkpa nkata aghụghọ, nghọgbu, ụgha, ihe ndị na-abụghị eziokwu, na ihe ndị bụtụ eziokwu jiworo pụta nnọọ ìhè n’akụkọ ọjọọ ndị nupụtaworo n’ụwa kemgbe ahụ. Jisọs Kraịst kwuru kpọmkwem na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu ka ụta ahụ nile dịịrị dị ka onye malitere akụkọ ọjọọ, na-agwa ndị ndú okpukpe nke oge Ya, sị: “Unu onwe unu sitere na nna unu, bụ́ ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ site na mbụ, o guzoghịkwa n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ bụla ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu ihe si n’ihe nke aka ya pụta: n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.”—Jọn 8:44.
Ka ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-amụba, akụkọ ọjọọ sooro ya na-amụba. N’ezie, nke a apụtaghị na ọ dịghị oge e nwere ọṅụ na obi ụtọ, n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ná ndụ ndị na-akpata ọṅụ. Ma, ihe ndị na-akpata nsogbu na mwute apụtawo ìhè n’ime ọgbọ nile nke ihe a kpọrọ mmadụ rute ugbu a.
Ọ dị ihe ọzọ bụ isi kpatara ọnọdụ a dị mwute. Nke ahụ bụ ọchịchọ anyị ketara eketa maka ime ihe ọjọọ na ọdachi. Jehova n’onwe ya rụtụrụ ihe a a na-apụghị izere ezere nke na-akpata akụkọ ọjọọ aka site n’ikwu, sị: “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.”—Jenesis 8:21.
Gịnị Kpatara Ịrị Elu nke Akụkọ Ọjọọ?
Otú ọ dị, ọ dị ihe kpatara akụkọ ọjọọ jiworo rịa elu na narị afọ nke 20 a. A kọwapụtara ihe a kpatara ya n’ụzọ doro anya n’ime Bible, bụ́ nke buru amụma na ihe a kpọrọ mmadụ bụ́ ndị nọ na narị afọ nke 20 gaje ịbanye n’oge pụrụ iche nke a maara dị ka “mgbe ikpeazụ” ma ọ bụ “mgbe ọgwụgwụ.” (2 Timoti 3:1; Daniel 12:4) Amụma Bible na ngụkọ oge nke Bible na-eme ka a mata “mgbe ọgwụgwụ,” bụ́ nke malitere na 1914. Maka ihe àmà sara mbara nke Akwụkwọ Nsọ banyere nke a, biko lee isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Mgbe ikpeazụ ahụ gaje ịmalite site n’ihe omume nke ga-eji aka ya mee ka akụkọ ọjọọ dị n’ụwa rịa elu. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ nchụda nke Setan bụ́ Ekwensu na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe. Ị pụrụ ịgụ maka nkọwa a doro anya nke mmụba a na-apụghị izere ezere nke akụkọ ọjọọ ná Mkpughe 12:9, 12: “E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya. . . . Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”
Ya mere n’ime oge ọ bụla fọdụrụnụ tupu mgbe ikpeazụ ahụ abịa ná njedebe ha, anyị pụrụ ịtụ anya ka akụkọ ọjọọ gaa n’ihu na ọbụna mụbaa.
Ọ Gaghị Adị Otú ahụ Mgbe Nile
N’ụzọ na-enye ndị bi n’ụwa obi ụtọ, ọnọdụ ọjọọ nke na-akpata ntiwapụ nke taa nke akụkọ ọjọọ agaghị adị mgbe nile. N’ezie, anyị pụrụ iji obi ike kwuo na mgbe akụkọ ọjọọ ga-adịru agaghị adịte anya. Ọnọdụ ahụ abụghị nke olileanya na-adịghị na ya, n’agbanyeghị ihe pụrụ iyi ọnọdụ dịnụ. Ọgwụgwụ nke akụkọ ọjọọ nile dị nso, ọ ghaghịkwa ịbịa n’oge a kara aka nke Chineke.
Anyị pụrụ ijide nke a n’aka n’ihi na e buru amụma na mgbe ikpeazụ ahụ ga-abịa ná njedebe ma ọ bụ gwụsịa ná mbibi Chineke ga-ebibi na mwepụ ọ ga-ewepụ ihe nile na-akpata akụkọ ọjọọ. Ọ ga-ewepụ ndị ajọ mmadụ na-akpalite esemokwu, bụ́ ndị jụrụ ịgbanwe ma chigharịa n’ụzọ ọjọọ ha. Nke a ga-abịa ná njedebe n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ nke a mazuuru dị ka agha nke Amagedọn. (Mkpughe 16:16) Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-eme ka Setan bụ́ Ekwensu na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya ghara ịrụkwa ọrụ. Mkpughe 20:1-3 na-akọwa okike e kere Setan agbụ, bụ́ onye malitere akụkọ ọjọọ nile: “M wee hụ mmụọ ozi ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-eji mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya, ya na oké mkpọrọ. O wee jide dragọn ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye bụ́ Ekwensu na Setan, o wee kee ya agbụ [otu puku afọ], wee tụba ya n’ime abyss ahụ, mechie ya, kaakwa ya akara n’elu ya, ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ.”
Mgbe ihe omume ndị a dị ịrịba ama gasịrị, oge nke akụkọ ọma nke a na-enwetụbeghị ihe dị ka ya ga-abịara ụwa na ndị bi n’ime ya. Ndị a bi n’ime ya ga-agụnye ọtụtụ nde mmadụ ndị lanarịworo agha ikpeazụ nke Amagedọn na ọtụtụ ijeri mmadụ ndị a ga-esi n’ụra ọnwụ ha na-ehi n’ime ili kpọlite. A kọwara akụkọ ọma a kasị akụkọ ọma nile n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible: “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
Ị̀ pụrụ iji uche chee banyere oge obi ụtọ ahụ? Ọ bụ n’ezie ọdịnihu dị ebube ebe akụkọ ọjọọ na-adịkwaghị. Ee, akụkọ ọjọọ nile ga-agwụsịworị, a gaghị anụkwa ya ọzọ. Mgbe ahụ akụkọ ọma ga-achị dị ka eze, ọ ga-ejupụtakwa ruo mgbe nile ebighị ebi.