Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 4/15 p. 28-29
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • ‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Gbaghara Site n’Obi Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Na-agbaghara Mmehie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 4/15 p. 28-29

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Jisọs sịrị: “Ndị nile ọ bụla unu na-agbaghara mmehie ha, a gbagharawo ha nye ha; ndị nile ọ bụla unu na-ejide mmehie ha, e jidewo mmehie ha.” Okwu ndị a ọ̀ pụtara na ndị Kraịst pụrụ ịgbaghara mmehie?

Ọ dịghị ihe ndabere ọ bụla nke Akwụkwọ Nsọ e nwere maka ikwubi na ndị Kraịst n’ozuzu ha, ma ọ bụ ọbụna ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ, nwere ikike Chineke ịgbaghara mmehie. Ma, ihe Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na Jọn 20:23, nke e hotara n’elu, na-egosi na Chineke nyere ndị ozi ahụ ike ndị pụrụ iche n’akụkụ nke a. Okwu Jisọs n’ebe ahụkwa pụrụ imetụta ihe o kwuru na Matiu 18:18 banyere mkpebi ndị e mere n’eluigwe.

Ndị Kraịst pụrụ ịgbaghara mmehie ụfọdụ, n’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi nke e dekọrọ ná Ndị Efesọs 4:32: “Nwerịtanụ obi ọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwaara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.” N’ebe a Pọl na-ekwu banyere nsogbu onwe onye dị n’etiti ndị Kraịst, dị ka okwu a na-elezighị anya kwuo. Ha kwesịrị ịgbalị idozi okwu ndị a, na-agbagharịtara ibe ha. Cheta okwu Jisọs: “Ya mere ọ bụrụ na ị na-eche onyinye gị n’ihu Chineke n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na nwanne gị nwere ihe megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, laba, buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụ bịakwa chee onyinye gị.”—Matiu 5:23, 24; 1 Pita 4:8.

Otú ọ dị, ihe ndị gbara Jọn 20:23 gburugburu na-atụ aro na Jisọs na-ezo aka ná mmehie ndị dị oké njọ karị, dị ka ihe ọzọ ọ gwaziri otu ìgwè ndị a na-ege ya ntị kpọmkwem na-egosi. Ka anyị lee ihe kpatara ya.

N’ụbọchị a kpọlitere ya n’ọnwụ, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya n’ọnụ ụlọ a kpọchiri akpọchi na Jerusalem. Akụkọ ahụ na-asị: “Ya mere Jisọs sịrị ha ọzọ, Udo dịrị unu: dị ka Nna m ziteworo m, otú a ka Mụ onwe m na-ezigakwa unu. Mgbe O kwusịrị nke a, O kusa ha ume, sị ha, Naranụ Mmụọ Nsọ: ndị nile ọ bụla unu na-agbaghara mmehie ha, a gbagharawo ha nye ha; ndị nile ọ bụla unu na-ejide mmehie ha, e jidewo mmehie ha.”—Jọn 20:21-23.

O yiri ka ndị na-eso ụzọ a kpọtụrụ aha bụ n’ụzọ bụ isi ndị ozi ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. (Tụlee amaokwu nke 24.) Site n’ikusa ha ume na ịsị, “Naranụ Mmụọ Nsọ,” Jisọs n’ụzọ ihe atụ mere ka ha mara na n’oge na-adịghị anya a ga-awụkwasị ha mmụọ nsọ. Jisọs gara n’ihu na-ekwu na ha ga-enwe ikike n’ihe metụtara mgbaghara mmehie. N’ụzọ ezi uche dị na ya, e jikọrọ okwu ya abụọ ọnụ, otu na-eduje n’ọzọ.

Iri ụbọchị ise site ná mbilite n’ọnwụ ya, n’ụbọchị Pentikọst, Jisọs wụpụrụ mmụọ nsọ. Gịnị ka nke ahụ rụzuru? Otu ihe bụ na ndị ahụ natara mmụọ ahụ bụ ndị a mụghachiri ọzọ dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke na-enwe olileanya nke ịbụ ndị ga-eso Kraịst chịa achịa n’eluigwe. (Jọn 3:3-5; Ndị Rom 8:15-17; 2 Ndị Kọrint 1:22) Ma mwụpụ nke mmụọ ahụ mere ihe karịrị nke ahụ. Ụfọdụ ndị natara ya nwetara ike ịrụ ọrụ ebube. Site na nke ahụ ụfọdụ pụrụ ịsụ asụsụ mba ọzọ ndị ha na-amaghị. Ndị ọzọ pụrụ ibu amụma. Ndị ọzọkwa pụrụ ịgwọ ndị ọrịa ma ọ bụ kpọlite ndị nwụrụ anwụ gaa ná ndụ.—1 Ndị Kọrint 12:4-11.

Ebe ọ bụ na okwu Jisọs na Jọn 20:22 zoro aka ná mwụpụ nke a nke mmụọ nsọ n’ahụ ndị na-eso ụzọ ya, okwu ndị o jikọrọ ya na ya banyere ịgbaghara mmehie yiri ka ọ pụtara na Chineke esitewo n’ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ nye ndị ozi ahụ ike pụrụ iche ịgbaghara mmehie ma ọ bụ ijide mmehie.—Lee Ụlọ Nche March 1, 1949 (Bekee), peji nke 78.

Bible enyeghị anyị akụkọ zuru ezu nke oge nile ndị ozi ahụ jiri ụdị ikike ahụ mee ihe, o dekọghịkwa ọnọdụ ọ bụla mgbe ha jiri onyinye ịrụ ọrụ ebube sụọ asụsụ ọzọ, iji buo amụma, ma ọ bụ iji gwọọ ọrịa.—2 Ndị Kọrint 12:12; Ndị Galetia 3:5; Ndị Hibru 2:4.

Otu ọnọdụ nke metụtara ikike ndị ozi nwere ịgbaghara mmehie ma ọ bụ ijide mmehie metụtara Ananaịas na Safaịra, bụ́ ndị gwara mmụọ nsọ okwu ụgha. Pita, bụ́ onye nụrụ ka Jisọs kwuru ihe anyị gụrụ na Jọn 20:22, 23, kpughere Ananaịas na Safaịra. Pita bu ụzọ gwa Ananaịas okwu, bụ́ onye nwụrụ ozugbo ahụ. Mgbe Safaịra mesịrị bata ma nọgide n’okwu ụgha ahụ, Pita kwupụtara mkpebi ikpe ya. Pita agbagharaghị mmehie ya kama o kwuru, sị: “Lee, ụkwụ nke ndị liri di gị dị n’ọnụ ụzọ, ha ga-ebupụkwa gị.” Ya onwe ya kwa nwụrụ ozugbo ahụ.—Ọrụ 5:1-11.

N’oge a Pita onyeozi jiri ikike pụrụ iche gosipụta otu njigide e jigidere mmehie, ihe ọmụma sitere n’ọrụ ebube na Chineke agaghị agbaghara mmehie nke Ananaịas na Safaịra. O yikwara ka ndị ozi ahụ ha nwere nghọta karịrị ike mmadụ n’okwu ndị ha ji n’aka na a gbagharawo mmehie ná ndabere nke àjà Kraịst. Ya mere ndị ozi ahụ mmụọ nsọ nyere ike pụrụ ikwupụta mgbaghara ma ọ bụ njide mmehie.a

Nke a abụghị ikwu na ndị okenye nile e ji mmụọ nsọ tee mmanụ laa azụ n’oge ahụ nwere ụdị ikike ọrụ ebube ahụ. Anyị pụrụ ịhụ nke ahụ site n’ihe Pọl onyeozi kwuru banyere nwoke ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ dị na Kọrint. Pọl asịghị, ‘M gbagharawo mmehie nwoke ahụ’ ma ọ bụ ọbụna, ‘Amaara m na a gbagharawo nwoke ahụ mmehie ya n’eluigwe, ya mere nabataghachinụ ya.’ Kama nke ahụ, Pọl gbara ọgbakọ ahụ nile ume ịgbaghara onye Kraịst nke a a kpọbataghachiri ma gosi ya ịhụnanya. Pọl gbakwụnyere, sị: “Onye ọ bụla unu weere amara gbaghara ya ihe ọ bụla, mụ onwe m werekwara amara gbaghara ya.”—2 Ndị Kọrint 2:5-11.

Ozugbo a kpọbataghachiri nwoke ahụ n’ime ọgbakọ, ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị nile bụ́ ndị Kraịst pụrụ ịgbaghara n’echiche nke ịghara iburu ya iwe n’obi n’ihi ihe o meworo. Otú ọ dị, ọ ghaghị iburu ụzọ chegharịa ma bụrụ onye a kpọbataghachiri. Olee otú nke a ga-esi mee?

E nwere mmehie ndị dị oké njọ nke ndị okenye ọgbakọ na-aghaghị ilebara anya, dị ka izu ohi, ịgha ụgha, ma ọ bụ ajọ omume rụrụ arụ. Ha na-agbalị ịgbazi ndị dị otú ahụ mere ihe ọjọọ olu na ịdọ ha aka ná ntị, na-akpali ha ichegharị. Ma ọ bụrụ na mmadụ na-eme mmehie dị oké njọ n’enweghị nchegharị, ndị okenye a na-eji nduzi Chineke nke ịchụpụ onye ajọ omume ahụ eme ihe. (1 Ndị Kọrint 5:1-5, 11-13) Ihe Jisọs kwuru na Jọn 20:23 emetụtaghị ụdị ọnọdụ ndị ahụ. Ndị okenye a enweghị onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ, dị ka ikike ịgwọ ndị na-arịa ọrịa nkịtị ma ọ bụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ; onyinye ndị ahụ mezuru nzube ha na narị afọ mbụ ma gwụsịa. (1 Ndị Kọrint 13:8-10) Ọzọkwa, ndị okenye taa enweghị ikike sitere n’aka Chineke ịgbaghara mmehie dị oké njọ n’echiche nke ikwu na onye mere mmehie dị oké njọ dị ọcha n’anya Jehova. Ụdị mgbaghara a aghaghị ịbụ ná ndabere nke àjà mgbapụta ahụ, ọ bụkwa nanị Jehova pụrụ ịgbaghara ná ndabere ahụ.—Abụ Ọma 32:5; Matiu 6:9, 12; 1 Jọn 1:9.

Dị ka ọ dị n’ọnọdụ nke nwoke ahụ nọ na Kọrint oge ochie, mgbe onye mere mmehie dị oké njọ jụrụ ichegharị, a ghaghị ịchụpụ ya. Ọ bụrụ na o mesịa chegharịa ma na-arụ ọrụ ndị kwesịrị nchegharị, ọ pụrụ inweta mgbaghara Chineke. (Ọrụ 26:20) N’ọnọdụ dị otú ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-enye ndị okenye ihe mere ha ga-eji ekwere na Jehova n’ezie agbagharawo onye mmehie ahụ. Mgbe ahụ, ozugbo a kpọbataghachiri onye ahụ, ndị okenye pụrụ inyere ya aka n’ụzọ ime mmụọ ịkwụrụsi ike n’okwukwe. Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ pụrụ ịgbaghara n’otu ụzọ ahụ ndị Kraịst nọ na Kọrint si gbaghara nwoke ahụ a chụpụrụ bụ́ onye a kpọbataghachiri laa azụ n’oge ahụ.

N’ime ihe n’ụzọ dị otú a, ndị okenye adịghị emepụta ụkpụrụ ikpe ikpe nke onwe ha. Ha na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ma na-agbasochi nzọụkwụ nke Akwụkwọ Nsọ nke Jehova setịpụrụ anya. N’ihi ya, mgbaghara ma ọ bụ enweghị mgbaghara ọ bụla n’akụkụ nke ndị okenye ga-abụ n’echiche nke okwu Jisọs dị na Matiu 18:18: “N’ezie asị m unu, Ka ha hà, bụ́ ihe unu ga-eke agbụ n’elu ụwa, a ga-eke ha n’eluigwe: ka ha hà kwa, bụ́ ihe unu ga-atọpụ n’elu ụwa, a ga-atọpụ ha n’eluigwe.” Omume ha ga-egosipụta nanị otú Jehova si ele ihe anya dị ka e dere ya na Bible.

N’ihi nke a, ihe Jisọs kwuru, dị ka e dekọrọ na Jọn 20:23, emegideghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ, kama ọ na-egosi na ndị ozi ahụ nwere ikike pụrụ iche n’ihe metụtara mgbaghara, n’ikwekọ n’ọrụ ha pụrụ iche n’oge mmalite nke ọgbakọ ndị Kraịst.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọbụna tupu Jisọs anwụọ ma nye ihe mgbapụta ahụ, o nwere ikike ikwu na a gbagharawo mmehie mmadụ.—Matiu 9:2-6; tụlee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke June 1, 1995.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya