Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 6/1 p. 3-4
  • Ị̀ Bụ Onye E Nwere Mbunobi Megide?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Bụ Onye E Nwere Mbunobi Megide?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mbunobi Pụrụ Imerụ Ahụ
  • Ịkpọasị Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ịkpọasị Bụ Ọrịa, Ì Bu Ya?
    Teta!—2020
  • Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ịkpọasị na Ịkpa Ókè Olee Ihe Ndị Na-akpata ha?
    Teta!—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 6/1 p. 3-4

Ị̀ Bụ Onye E Nwere Mbunobi Megide?

GỊNỊ ka ime ihe ike agbụrụ, ịkpa ókè agbụrụ, mkpapụ iche, nkewa, na mgbukpọ nke agbụrụ nwekọtara ọnụ? Ha nile bụ ihe na-esite n’àgwà gbasara ebe nile nke mmadụ—mbunobi!

Gịnị bụ mbunobi? Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-akọwa ya dị ka “echiche e nwere n’ewepụtaghị oge ma ọ bụ nlezianya iji kpee ikpe n’ụzọ ziri ezi.” Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị nwere omume nke ibu ụzọ buru ihe n’obi ruo n’ókè ụfọdụ. Ikekwe ị pụrụ iche banyere ọnọdụ dị iche iche mgbe i kpebiri ihe n’amaghị ihe nile bụ eziokwu banyere ya. Bible wepụtara ọdịiche dị n’etiti ụdị àgwà mbunobi ahụ na ụzọ Jehova Chineke na-esi ekpe ikpe. Ọ na-asị: “Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.”—1 Samuel 16:7.

Mbunobi Pụrụ Imerụ Ahụ

Obi abụọ adịghị ya na onye ọ bụla abụrụla onye mmadụ nwere echiche na-ezighị ezi banyere ya n’otu mgbe. (Tụlee Eklisiastis 7:21, 22.) N’ozuzu ya, anyị nile bụ ndị e nwere mbunobi megide. Otú ọ dị, mgbe e wepụrụ ya ngwa ngwa, o yiri ka echiche e bu n’obi ga-akpata mmerụ ahụ dị nta ma ọ bụrụdị na ọ ga-akpata. Ọ bụ nzụlite nke ụdị echiche ndị ahụ pụrụ ịkpata mmerụ ahụ. Ọ pụrụ iduhie anyị ikwenyere ụgha. Dị ka ihe atụ, n’okpuru mmetụta nke mbunobi, ụfọdụ ndị n’ezie na-ekwenye na mmadụ pụrụ ịdị anyaukwu, umengwụ, nzuzu, ma ọ bụ mpako nanị n’ihi isonyere otu ìgwè okpukpe, agbụrụ, ma ọ bụ mba.

N’ọtụtụ ọnọdụ ụdị echiche na-ezighị ezi dị otú ahụ na-eduje n’imeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ na-adịghị mma, n’ụzọ mkparị, ma ọ bụ ọbụna n’ụzọ ime ihe ike. Ọtụtụ nde mmadụ atụfuwo ndụ ha ná mgbuchapụ, mgbukpọ nke agbụrụ, igbu ndị agbụrụ ọzọ, na ụdị ndị ọzọ nke mbunobi gafere ókè.

N’elu ụwa nile, gọọmenti dị iche iche alụsowo mbunobi ọgụ site n’ime ka e nwee ikike a na-agaghị emebi emebi nke nnwere onwe, ịnọ ná ntụkwasị obi, na ịha nhata. Ọ bụrụ na ị gụọ ụkpụrụ iwu ma ọ bụ ozuzu nke iwu ndị bụ isi nke obodo gị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ahụta otu ahịrịokwu ma ọ bụ ndezigharị e mepụtara iji chebe ikike nke ụmụ amaala nile, n’agbanyeghị agbụrụ ha, ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, ma ọ bụ okpukpe ha. Ma, mbunobi na ịkpa ókè jupụtara ebe nile n’ụwa.

Ị̀ bụ onye e nwere mbunobi megide? À sịwo na ị bụ onye anyaukwu, onye umengwụ, onye nzuzu, ma ọ bụ onye mpako nanị n’ihi agbụrụ gị, afọ ndụ gị, ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị gị, mba gị, ma ọ bụ nkwenkwe okpukpe gị? À na-ajụ inye gị ohere maka agụmakwụkwọ kwesịrị ekwesị, ọrụ, ebe obibi, na ozi a na-ejere ọha n’ihi mbunobi? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú ị pụrụ isi anagide ya?

[Foto dị na peeji nke 3]

Ịzụlite mbunobi na-eme ka e nwee ịkpọasị agbụrụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nina Berman/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya