Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 6/1 p. 3-4
  • Ịkpọasị Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkpọasị Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ GBASARA ONYE Ọ BỤLA N’IME ANYỊ
  • Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ịkpọasị Bụ Ọrịa, Ì Bu Ya?
    Teta!—2020
  • Ị̀ Bụ Onye E Nwere Mbunobi Megide?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Njedebe nke Ajọ Mbunobi
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 6/1 p. 3-4

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: OLEE MGBE ỊKPỌASỊ NA-AGAGHỊ ADỊKWA N’ỤWA?

Ịkpọasị Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

E NWERE otu nwoke aha ya bụ Jonathan. A mụrụ ya n’Amerịka, ma nne na nna ya bụ ndị Koria. Ọ sịrị na mgbe ya bụ nwata, ndị mmadụ kpọrọ ya asị maka na onye hụrụ ya ga-ama na ya bụ onye Koria. O mechara ghọọ dọkịta n’otu obodo dị n’ebe ugwu Alaska, n’Amerịka. N’obodo ahụ, ọtụtụ ndị ọ na-agwọ ọrịa yikwara ndị Koria. O chere na o nweghị onye ga-akpọkwa ya asị n’ebe ahụ ọ gara biri.

Ma, ihe ọ na-atụghị anya ya mere otu ụbọchị mgbe ọ na-agwọ otu nwaanyị ọrịa. Nwaanyị ahụ dị afọ iri abụọ na ise. Mgbe nwaanyị ahụ nwetara onwe ya, lee Jonathan anya n’ihu ma hụ na ọ bụ onye Koria, ọ kpọrọ ya iyi. Ihe a nwaanyị ahụ mere bụ ihe a kụziiri ya kemgbe ọ dị obere. A kụziiri ya ka ọ kpọọ ndị Koria asị. Ihe a nwaanyị ahụ mere wutere Jonathan. Nke a mere ka ọ ghọta na mgbalị niile ahụ o mere ka ọ nọrọ n’ebe ọ na-enweghị onye ga-akpọ ya asị kụrụ afọ n’ala.

Ihe a mere Jonathan na-egosi anyị na o nweghị ebe ịkpọasị na-adịghị. E nwere ike ikwu na ebe ọ bụla ndị mmadụ nọ, a ga-enwerịrị ndị kpọrọ ibe ha asị.

N’agbanyeghị na ịkpọasị zuru ebe niile, ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ dịghị mma. Oleezi otú ihe a ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ dịghị mma si ju ebe niile? Ọ ga-abụ na ihe kpatara ya bụ na imerime ndị na-ekwu na ịkpọasị adịghị mma chere na hanwa akpọghị ndị ọzọ asị. Gịnwakwanụ? Ì so ná ndị chere na ha akpọghị ndị ọzọ asị?

GỊNỊ BỤ ỊKPỌASỊ?

Ọ na-esiri ndị na-eme nchọpụta ike ịkọwa ihe bụ́ ịkpọasị. Ụfọdụ na-ekwu na “ọ bụ ịkpaso mmadụ àgwà ọjọọ ma ọ bụ iburu onye ahụ ihe ọjọọ n’obi n’ihi ebe ma ọ bụ agbụrụ onye ahụ si.” Ndị ọzọ na-ekwu na ihe na-akpata ịkpọasị bụ “amachaghị ndị ndị mmadụ bụ,” ya emezie ka “e lewe ha anya ọjọọ.” N’agbanyeghị otú e si kọwaa ịkpọasị, mmadụ nwere ike ịkpọ onye ọzọ asị n’ihi agbụrụ ya, otú ọ hà, asụsụ ya, okpukpe ya, ma ọ bụkwanụ n’ihi na ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. N’eziokwu, o nweghị ihe na-enweghị ike ime ka ndị mmadụ kpọọ ndị ọzọ asị.

Ọ GBASARA ONYE Ọ BỤLA N’IME ANYỊ

Ma ànyị kwere ma ànyị ekweghị, ọ naghị adịrị anyị mfe ịmata na anyị kpọrọ ndị ọzọ asị n’obi anyị. Baịbụl kwuru ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ.” (Jeremaya 17:9) N’ihi ya, obi anyị nwere ike ịghọgbu anyị, anyị echee na o nwetụdịghị ndị anyị kpọrọ asị. Ma ọ bụkwanụ anyị nwere ike iche na o nwere ezigbo ihe mere anyị ji kpọọ ụfọdụ ndị asị.

Ọ bụrụ na ọ bụ gị ka ndị a na-abịakwute n’abalị, olee ihe obi gị ga-agwa gị?

Dị ka ihe atụ, weregodị ya na ị na-aga n’ụzọ n’abalị, gị ahụ ụmụ okorobịa abụọ ndị na-abịakwute gị. Ị hụtụbeghị ụmụ okorobịa ahụ mbụ, ha gbara agba, ọ dịkwa gị ka ò nwere ihe otu onye n’ime ha ji n’aka.

Ị̀ ga-ekwu n’obi gị na ụmụ okorobịa ahụ na-abịa ime gị ihe ọjọọ? Ọ bụ eziokwu na ihe ndị mere gị n’oge gara aga nwere ike ime ka i chee na agwọ dị n’akịrịka. Ma ọ̀ bụ ihe ndị ahụ ga-eme ka i kwuo na ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị ọjọọ? Ajụjụ ọzọ ka mkpa bụ, Olee agbụrụ ma ọ bụ obodo ị ga-eche na ụmụ okorobịa ahụ si? Ihe ọ bụla ị zara ga-egosi ihe dị gị n’obi. O nwere ike igosi na o nwere ndị ị kpọrọ asị n’obi gị.

Ọ bụrụ na anyị agwa onwe anyị eziokwu, anyị ga-ekweta na o nwere ndị anyị kpọrọ asị n’obi anyị, ọ bụrụgodị na anyị akpọchaghị ha asị otú ndị ọzọ kpọrọ ha. Baịbụl kwuru ihe mere ụmụ mmadụ ji akpọkarị ụfọdụ ndị asị. Ọ sịrị: “Mmadụ na-ele anya n’elu ahụ.” (1 Samuel 16:7, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ihe a Baịbụl kwuru gbasara anyị niile. Ọ bụ ya na-emekarị ka anyị na-akpọ ndị ọzọ asị. Ma ajụjụ bụzi, Ò nwere mgbe anyị ga-akwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị? Ò nwere mgbe ịkpọasị na-agaghịzi adị n’ụwa?

ỊKPỌASỊ DỊ EBE NIILE

Kanada: “N’agbanyeghị na a na-ekwu na mmadụ niile hà, e tiekwa iwu dị iche iche kwuru ka a ghara imegbu ndị ọ bụla, ihe na-ebenụ ka na-ebe ná mba a. A ka nwere ndị kpọrọ ndị na-abụghị ndị agbụrụ ha asị.”—Òtù Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị A Na-emegbu Emegbu Ọsọ Enyemaka kwuru nke a ná nnọkọ ha nwere na Kanada, n’afọ 2012.

Yurop: “Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ọkara ndị bi na Yurop chere na o nweghị ezigbo ihe a na-eme ka a kwụsị ịkpa ókè n’obodo ha.”—E dere ihe a n’akwụkwọ e bipụtara n’afọ 2011 nke a kpọrọ Intolerance, Prejudice and Discrimination: A European Report.

Afrịka: “A ka kpọrọ ụmụ nwaanyị asị ma na-emesi ha ike n’ọtụtụ mba n’Afrịka.”—Òtù Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị A Na-emegbu Emegbu Ọsọ Enyemaka dere ihe a n’akwụkwọ ha bipụtara n’afọ 2012.

Nipọl: “O nweghị ihe e ji ndị Dalit, ya bụ, ndị a sịrị na ha bụ ndị a jụrụ ajụ kpọrọ, a na-emegbukarịkwa ha n’ihe niile.”—E dere ihe a n’akwụkwọ e bipụtara n’afọ 2012 nke a kpọrọ Human Rights Watch World Report.

Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop: “A na-emegbu ndị Roma bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Yurop, a kpọkwara ndị nke bi ná mba ndị ọzọ asị. O nwedịghị onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ ịgbatara ha ọsọ enyemaka.”—E dere ihe a n’akwụkwọ e bipụtara na Septemba 4, 2010 nke a kpọrọ The Economist.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya