Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
“Ihe Nile I Nyere n’Iwu Bụ Eziokwu”
NWA oge tupu ọnwụ ya, Mosis gbara ndị Israel ume ka ha rube isi n’ihe nile Jehova nyere n’iwu. Ọ sịrị: “Tụkwasị obi unu n’okwu nile nke mụ onwe m na-agbara unu àmà taa; nke unu ga-enye ụmụ unu n’iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a. N’ihi na ọ bụghị ihe efu ka ọ bụ n’ebe unu nọ; n’ihi na nke a bụ ndụ unu.”—Deuterọnọmi 32:46, 47.
Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, ọbụ abụ ahụ mere ka mkpa nke nkụzi Chineke pụta ìhè mgbe ọ sịrị: “Gị onwe gị nọ nso, Jehova; ọzọ, ihe nile I nyere n’iwu bụ eziokwu.” (Abụ Ọma 119:151) Na narị afọ mbụ, Jisọs n’onwe ya tụrụ aka n’abamuru nke “okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:4) N’okpuru nduzi Chineke kwa, Pọl onyeozi dere na “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru.”—2 Timoti 3:16.
N’ụzọ doro anya, Jehova Chineke na-atụ anya n’aka ndị na-efe ya ofufe ka ha chebara ozi dum a na-ezi anyị n’ime Okwu ya echiche nke ọma. Ọ dịghị akụkụ ọ bụla dị n’ime Bible nke na-abaghị uru. Nke ahụ bụ otú Ndịàmà Jehova si eche banyere Okwu Chineke, dị ka e mere ihe atụ ya n’ahụmahụ na-esonụ sitere Mauritius.
Mazi D—— bi n’otu ime obodo dịpụrụ adịpụ, ebe ọ bụ onye nche abalị. Ruo ogologo oge, ọ nọwo jiri ezi obi na-achọ ezi ụzọ isi fee Chineke ofufe. N’anyasị n’oge nche ya, ọ malitere ịgụ Bible. Ka oge na-aga ọ gụchawo ya. Ọ mụtara na aha Chineke bụ Jehova—aha pụtara ọtụtụ ugboro na Bible Hindi ya. Ọ chọpụtara na akwụkwọ Mkpughe na-akpali mmasị pụrụ iche.
Mgbe ahụ ọ jụrụ onwe ya ma e nwere okpukpe nke na-agbaso Bible n’ozuzu ya. Ọ chọpụtara na okpukpe ndị ọ maara na-agbaso, ma ọ karịsịa, nanị akụkụ ụfọdụ nke Bible. Okpukpe ụfọdụ nakweere Akwụkwọ Nsọ Hibru ma jụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Okpukpe ndị ọzọ na-eleghara Akwụkwọ Nsọ Hibru anya, na-ewere nanị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dị ka nke bara uru dị irè.
Otu ụbọchị Mazi D—— hụrụ otu di na nwunye ka mmiri na-ama ha ma kpọbata ha izere mmiri n’ụlọ ya. Ha bụ Ndịàmà Jehova. Onye nke bụ nwunye ji akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!a Ozugbo Mazi D—— rịọrọ ha maka akwụkwọ ahụ. Ndịàmà ahụ chere na ihe metụtara okwu amụma nke Mkpughe ga-esiri ya oké ike ịghọta, ya mere ha nyere ya mbipụta ọzọ kama nke ahụ. Ma Mazi D—— siri ọnwụ inweta akwụkwọ Mkpughe.
Mgbe o nwetara akwụkwọ nke ya, ọ gụrụ akwụkwọ ahụ ngwa ngwa. Mgbe ahụ ọ nakweere isoro Ndịàmà Jehova nwee ọmụmụ Bible. Ngwa ngwa eziokwu bụ na Ndịàmà na-ewere Bible dum n’ihe dị oké ọnụ ahịa metụrụ ya n’obi. Ọ malitere ịbịachi nzukọ anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, ebe e ji nlezianya na-amụ ma Akwụkwọ Nsọ Hibru ma Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ugbu a ọ bụ onye nkwusa Alaeze na onye òtù e mere baptism nke ọgbakọ ndị Kraịst.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.