Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 7/1 p. 3-4
  • Chineke Ọ̀ Na-anakwere Ụdị Ofufe Nile?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Na-anakwere Ụdị Ofufe Nile?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ofufe A Na-enyo Enyo n’Oge Ochie
  • Ofufe Dị Ọcha Aghọọ Ihe E Merụrụ Emerụ
  • Ofufe Beal—Ọgụ A Lụrụ Iji Nweta Obi Ụmụ Israel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ọ Kwadoro Ofufe Dị Ọcha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ugbu A Bụ Oge Ime Ihe Ngwa Ngwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ọ Gbachiteere Ofufe Chineke
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 7/1 p. 3-4

Chineke Ọ̀ Na-anakwere Ụdị Ofufe Nile?

CHINEKE kere mmadụ ka ọ na-enwe mkpa ime mmụọ—mkpa ife ofufe. Ọ bụghị ihe rịpụtara arịpụta. Ọ bụ akụkụ nke mmadụ site ná mmalite.

Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ihe a kpọrọ mmadụ emepụtwo ọtụtụ ụzọ e si efe ofufe, n’akụkụ kakwa ukwuu, ndị a emepụtabeghị ezinụlọ mmadụ nwere obi ụtọ, nke dị n’otu. Kama nke ahụ, a ka na-alụkwa agha ndị na-awụfu ọbara n’aha okpukpe. Nke a na-ewelite ajụjụ dị mkpa: Otú mmadụ si na-efe Chineke ọ̀ dị ihe o mere?

Ofufe A Na-enyo Enyo n’Oge Ochie

Mba oge ochie ndị biri n’Etiti Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-enye ihe atụ akụkọ ihe mere eme nke ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. Ọtụtụ fere chi a kpọrọ Beal. Ha fekwara Beal bụ́ ndị inyom, dị ka Ashera. Ofufe a na-efe Ashera gụnyere iji ogidi dị nsọ nke e kweere na ọ bụ ihe nnọchianya nke mmekọahụ eme ihe. Ndị ọkà n’ihe ndị e gwutere n’ala bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ógbè ahụ egwupụtawo ọtụtụ ihe oyiyi nke ụmụ nwanyị gba ọtọ. Ihe oyiyi ndị a, ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu, “na-egosi chi nwanyị nke nwere akụkụ ahụ e ji enwe mmekọahụ ndị pụtara nke ọma, na-ebuli ara ya elu,” ma “ikekwe na-anọchite anya . . . Ashera.” Otu ihe doro anya, ọtụtụ mgbe ofufe Beal rụrụ arụ nke ukwuu.

Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ofufe Beal gụnyere inwe oké mmekọahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-3) Shekem, bụ́ onye Kenean, dinara nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Daịna n’ike. N’agbanyeghị nke a, ọ bụ onye a na-elekwarị anya dị ka nwoke kasị nsọpụrụ n’ezinụlọ ya. (Jenesis 34:1, 2, 19) Mmekọahụ n’etiti ndị ikwu, ndina ụdị onwe, na idina anụmanụ bụ ihe a na-ahụkarị. (Levitikọs 18:6, 22-24, 27) Okwu Bekee ahụ bụ́ “sodomy,” omume nke ndị na-edina ụdị onwe ha, sitere n’aha obodo ukwu nke dịbu adị n’akụkụ ahụ nke ụwa. (Jenesis 19:4, 5, 28) Ofufe Beal gụnyekwara mwụfu ọbara. Leenụ, ndị na-efe Beal ofufe ga-atụba ụmụ ha n’ime ọkụ na-ere ere ná ndụ dị ka àjà nye chi ha! (Jeremaịa 19:5) Omume ndị a nile nwechara njikọ n’ozizi okpukpe. N’ụzọ dị aṅaa?

“Mmekpọ ọnụ, agụụ mmekọahụ na imeju oké ọchịchọ nke akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ndị Kenean,” ka Dr. Merrill Unger na-akọwa n’akwụkwọ ya bụ́ Archaeology and the Old Testament, “dị njọ karịa ebe ọ bụla ọzọ ná Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge ahụ. Njimara pụtakwara ìhè nke chi dị iche iche nke ndị Kenean, na ha enweghị omume ọma ma ọlị, aghaghị imewo ka ndị na-efe ha zụlite àgwà kasị njọ, gụnyekwa ọtụtụ n’ime omume ndị kasị akụda mmụọ n’oge ahụ, dị ka ịgba akwụna dị nsọ, [na] ịchụ ụmụntakịrị n’àjà.”

Chineke ọ̀ nakweere ofufe nke ndị Kenean? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ kụziiri ụmụ Israel otú ha ga-esi na-efe ya n’ụzọ dị ọcha. Banyere omume ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’elu, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu ewerela ihe ndị a nile merụọ onwe unu: n’ihi na e weere ihe ndị a nile mee ka mba nile rụọ arụ, bụ́ ndị Mụ onwe m na-achụpụ n’ihu unu: ala ahụ rụkwara arụ: M na-ewerekwa ajọ omume ya leta ya, ala ahụ na-agbọpụtakwa ndị bi n’ime ya.”—Levitikọs 18:24, 25.

Ofufe Dị Ọcha Aghọọ Ihe E Merụrụ Emerụ

Ọtụtụ ndị Israel anakwereghị echiche Chineke banyere ofufe dị ọcha. Kama nke ahụ, ha kwere ka ofufe Beal nọgide na-adị n’ala ha. N’oge na-adịghị anya a rabara ụmụ Israel n’ịnwa ịgwakọta ofufe Jehova na nke Beal. Chineke ọ̀ nakweere ụdị ofufe a a gwakọtara agwakọta? Tụlee ihe merenụ n’oge ọchịchị Eze Manase. O guzobere ebe ịchụàjà dị iche iche nye Beal, suree nwa ya nwoke n’ọkụ dị ka àjà, ma jiri igwe ojii tụọ isi ọma na isi ọjọọ. “Ọ dọbakwara arụsị a pịrị apị nke Ashera, bụ́ nke o mere, n’ụlọ ahụ nke Jehova sịrị . . . , N’ụlọ a . . . ka M ga-etinye aha m ruo mgbe ebighị ebi.”—2 Ndị Eze 21:3-7.

Ndị Manase na-achị gbasoro ihe nlereanya nke eze ha. N’ezie, o mere “ka ha sihie ụzọ ime ihe ọjọọ karịa mba ọzọ, bụ́ ndị Jehova kpochapụrụ n’ihu ụmụ Israel.” (2 Ndị Eze 21:9) Kama ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị nke ndị amụma Chineke nyere ugboro ugboro, Manase gburu ọchụ ruo n’ókè nke ime ka Jerusalem jupụta n’ọbara ndị aka ha dị ọcha. Ọ bụ ezie na Manase gbanwere n’ikpeazụ, nwa ya nwoke nke nọchiri ya, bụ́ Eze Emọn, tụteghachiri ofufe Beal.—2 Ndị Eze 21:16, 19, 20.

Ka oge na-aga, ndị ikom na-agba akwụna malitere ịrụ ọrụ n’ụlọ nsọ. Olee otú Chineke si lee ngosipụta nke ofufe Beal nke a anya? Site n’ọnụ Mosis, ọ dọwo aka ná ntị, sị: “Ewebatala onyinye e nyere nwanyị na-akwa iko, ma ọ bụ ihe e retara ná nkịta [nke yikarịrị ka ọ bụ onye na-ara otule], n’ụlọ Jehova, bụ́ Chineke gị, imezu nkwa ọ bụla: n’ihi na ihe arụ nke Jehova, bụ́ Chineke gị, ka ha abụọ bụkwa.”—Deuterọnọmi 23:17, 18, nkọwa ala ala peji NW.

Nwa nwa Manase, bụ́ Eze Josaịa, kpọchapụrụ ofufe Beal rụrụ arụ n’ụlọ nsọ ahụ. (2 Ndị Eze 23:6, 7) Ma ihe emebiela nke ukwuu. Ọ dịghị oké anya mgbe Eze Josaịa nwụsịrị, ikpere arụsị na-ewekwara ọnọdụ n’ụlọ nsọ Jehova ọzọ. (Ezikiel 8:3, 5-17) Ya mere Jehova mere ka eze Babilọn bibie Jerusalem na ụlọ nsọ ya. Eziokwu a dị mwute n’akụkọ ihe mere eme bụ ihe na-egosi na Chineke adịghị anakwere ụdị ofufe ụfọdụ. Gịnị banyere oge anyị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya