Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 4/1 p. 28-31
  • Ofufe Beal—Ọgụ A Lụrụ Iji Nweta Obi Ụmụ Israel

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ofufe Beal—Ọgụ A Lụrụ Iji Nweta Obi Ụmụ Israel
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Beal?
  • N’ihi Gịnị Ka O Ji Adọrọ Adọrọ nke Ukwuu?
  • Ha Jegharịrị n’Ọhụhụ Ụzọ, Ọ Bụghị n’Okwukwe
  • Ònye Meriri?
  • Ịdọ Aka ná Ntị Ndị Sitere n’Ofufe Beal
  • Ijidesi Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Anyị Ike
  • Chineke Ọ̀ Na-anakwere Ụdị Ofufe Nile?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ọ Kwadoro Ofufe Dị Ọcha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • A Matara Chi Nke Bụ́ Ezigbo Chi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ugbu A Bụ Oge Ime Ihe Ngwa Ngwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 4/1 p. 28-31

Ofufe Beal—Ọgụ A Lụrụ Iji Nweta Obi Ụmụ Israel

Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku afọ, a lụrụ ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ iji nweta obi mba Israel. Inwe egwu n’ihi nkwenkwe ụgha na ememe mmekọahụ n’otu akụkụ lụrụ ọgụ megide okwukwe na iguzosi ike n’ihe n’akụkụ nke ọzọ. Ọgụ ọnwụ na ndụ a mere ka ofufe Beal na ofufe Jehova sọrịta mpi.

MBA Israel hà ga-anọgidesi ike n’ikwesị ntụkwasị obi nye ezi Chineke ahụ, bụ́ onye mere ka ha si n’Ijipt pụta? (Ọpụpụ 20:2, 3) Ka hà ga-echigharịkwuru Beal, bụ́ chi ndị Kenean ji kpọrọ oké ihe, onye kwere nkwa ime ka ala ha na-eme nri?

Ọgụ ime mmụọ a, nke a lụrụ ọtụtụ puku afọ gara aga, metụtara anyị. N’ihi gịnị? ‘E dere ihe ndị a,’ ka Pọl onyeozi dere, “n’akwụkwọ nsọ ka ha wee bụrụ ihe ịdụ anyị ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo.” (1 Ndị Kọrint 10:11) Ịdọ aka ná ntị bụ́ isi e nwere site n’ọgụ a mere ihe akụkọ ga-abara anyị uru karị ma ọ bụrụ na anyị aghọta onye Beal bụ na ihe ofufe Beal gụnyere.

Ònye Bụ Beal?

Ụmụ Israel zutere Beal mgbe ha batara na Kenean, n’ihe dị ka afọ 1473 T.O.A. Ha hụrụ na ndị Kenean na-efe ọtụtụ chi bụ́ ndị dị nnọọ ka chi ndị Ijipt, ọ bụ ezie na ha nwere aha ndị dị iche na njimara ụfọdụ dị iche. Otú ọ dị, Bible doro Beal iche dị ka chi bụ́ isi nke ndị Kenean, ihe mgbe ochie a chọpụtara na-emesikwa ya ike na o nwere ọkwá dị elu. (Ndị Ikpe 2:11) Ọ bụ ezie na Beal abụghị chi kasị elu n’etiti chi ndị ha na-efe, ọ bụ chi ndị Kenean na-ejitụghị egwu egwu. Ha kwenyere na o nwere ike n’ebe mmiri ozuzo, ifufe, na igwe ojii dị nakwa na nanị ya pụrụ ịgbapụta ha—tinyere anụmanụ ha na ihe ọkụkụ ha—pụọ n’amụghị nwa na amịghị mkpụrụ ma ọ bụkwanụ ọnwụ. E wezụga nchebe Beal, Mot, bụ́ chi na-abọ ọ́bọ̀ nke Kenean, ga-ewetarịrị ọdachi n’isi ha.

Ofufe Beal na ememe mmekọahụ na-ayịkọ. Ọbụna ihe oyiyi okpukpe ndị e jikọrọ ha na Beal, dị ka ogidi na Asherim, nwechara ihe ndị na-enye echiche mmekọahụ. Ihe àmà na-egosi na ogidi ndị ahụ—nkume ma ọ bụ nkume ndị a tụrụ n’ụdị ihe oyiyi nke akụkụ ahụ e ji enwe mmekọahụ—nọchitere anya Beal, bụ́ akụkụ ahụ nwoke e ji enwe mmekọahụ. N’aka nke ọzọ, Asherim bụ ihe ndị e ji osisi mee ma ọ bụ osisi ndụ ndị nọchitere anya Ashera, bụ́ nwunye Beal, nọchitekwara anya akụkụ ahụ nwanyị.—1 Ndị Eze 18:19.

Ịgba akwụna n’ụlọ nsọ na ịchụ ụmụaka n’àjà bụ akụkụ ndị ọzọ pụtara ìhè nke ofufe Beal. (1 Ndị Eze 14:23, 24; 2 Ihe E Mere 28:2, 3) Akwụkwọ bụ́ The Bible and Archaeology na-ekwu, sị: “N’ụlọ nsọ ndị Kenean e nwere ndị ikom na ndị inyom na-agba akwụna (ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ‘e doro nsọ’), a kwakwara ajọ iko n’ụdị ya nile. [Ndị Kenean] kwenyere na n’ụzọ ụfọdụ ememe ndị a mere ka ihe ọkụkụ na ìgwè anụmanụ ha baa ụba.” Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, nke ahụ bụ ihe e ji mee ka o yie ihe ziri ezi n’ụzọ okpukpe, ọ bụ ezie na obi abụọ adịghị ya na omume rụrụ arụ dị otú ahụ masịrị ọchịchọ anụ ahụ nke ndị ahụ na-efe ofufe. Oleezi otú Beal si rata obi ụmụ Israel?

N’ihi Gịnị Ka O Ji Adọrọ Adọrọ nke Ukwuu?

Ikekwe ọtụtụ ndị Israel họọrọ ikpe okpukpe chọrọ ihe dị nta n’aka ha. N’ife Beal, e mere ka ha nwere onwe ha pụọ n’idebe Iwu ahụ, dị ka Ụbọchị Izu Ike na ọtụtụ ihe ndị na-egbochi omume rụrụ arụ. (Levitikọs 18:2-30; Deuterọnọmi 5:1-3) Ikekwe ọganihu ndị Kenean nwere n’ụzọ ihe onwunwe mere ka ndị ọzọ kwenyesie ike na ọ dị mkpa ime ka obi jụrụ Beal.

Òkwù arụsị ndị Kenean, bụ́ ndị a maara dị ka ebe ndị dị elu, ndị dịkwa n’ugwu ndị jupụtara n’osisi ndụ, aghaghị imewo ka e nwee ọnọdụ na-adọrọ adọrọ nye ememe nke ala imepụta ihe ndị ahụ e mere n’ebe ahụ. N’oge na-adịghị anya, ịga n’ebe nsọ Kenean ezughịrị ụmụ Israel; ha wuru ọbụna nke ha. “Ha onwe ha wee wuokwara onwe ha ebe dị elu, na ogidi, na Asherim, n’elu ugwu ọ bụla dị elu, na n’okpuru osisi ndụ ọ bụla.”—1 Ndị Eze 14:23; Hosea 4:13.

Ma nke mbụ bụ na ofufe Beal na-eme ihe na-amasị anụ ahụ. (Ndị Galetia 5:19-21) Ọ bụghị nanị n’ihi ọchịchọ maka ụba ihe ọkụkụ na ìgwè anụmanụ ka ha ji eme omume ndị ahụ na-atọ anụ ahụ ụtọ. E buliri mmekọahụ elu. Ọtụtụ ihe oyiyi e gwupụtara n’ala, bụ́ ndị nwere akụkụ ahụ e ji enwe mmekọahụ e mere ka ha bufee ibu, bụ́ ndị na-egosipụta mkpali mmekọahụ, na-agba akaebe banyere nke a. Iri oriri, ịgba egwú, na egwú kpaliri akparamàgwà rụrụ arụ.

Anyị pụrụ iji anya nke uche hụ ebe a na-eme ya ná mmalite oge mgbụsị akwụkwọ. N’ebe mara nnọọ mma site n’okike, n’ịbụ ndị afọ jubigara ókè n’ihi oriri na ndị mmanya kpaliri, ndị ahụ na-efe ofufe agbawa egwú. E zubere ka ịgba egwú nke ala imepụta ihe ha kpọtee Beal site n’ịnọ nkịtị nke oge okpomọkụ ya ka e wee jiri mmiri ozuzo gọzie ala ahụ. Ha na-agba ogidi ihe oyiyi nke akụkụ ahụ e ji enwe mmekọahụ na Asherim ndị ahụ gburugburu. Mmegharị ahụ ha, karịsịa nke ndị akwụna ụlọ nsọ ahụ, na-akpali agụụ mmekọahụ. Egwú ahụ na ndị na-ekiri ha na-akpalikwu ha. Ma eleghịkwa anya, mgbe ha gbasịrị egwú, ndị ahụ gbara egwú na-abanye n’ime ụlọ ndị dị n’ụlọ Beal maka inwe mmekọahụ rụrụ arụ.—Ọnụ Ọgụgụ 25:1, 2; tụlee Ọpụpụ 32:6, 17-19; Emọs 2:8.

Ha Jegharịrị n’Ọhụhụ Ụzọ, Ọ Bụghị n’Okwukwe

Ọ bụ ezie na ụdị ofufe ahụ na-akpali mmekọahụ dọtara ọtụtụ ndị, egwu kwagakwara ụmụ Israel n’ofufe Beal. Ka ụmụ Israel tụfuru okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ, egwu ndị nwụrụ anwụ, egwu banyere ọdịnihu, na inwe mmasị n’ebe anwansi dị dubara ha ná mgbaasị, bụ́ nke n’aka nke ya, gụnyere ememe ndị kasị rụọ arụọ. Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia na-akọwa otú ndị Kenean si sọpụrụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ dị ka akụkụ nke ofufe ndị nna ochie, sị: “E mere ememe okpukpe . . . n’ili ezinụlọ ma ọ bụ n’ikpo ájá nke ebe ndị e liri ozu bụ́ nke jupụtara n’ịṅụbiga mmanya ókè na inwe mmekọahụ (ikekwe idina onye ikwu) nke e chere na ndị ahụ nwụrụ anwụ so ekere òkè na ha.” Ikere òkè n’omume mgbaasị rụrụ arụ ndị dị otú ahụ kewapụkwuru ụmụ Israel n’ebe Chineke ha, bụ́ Jehova nọ.—Deuterọnọmi 18:9-12.

Arụsị dị iche iche—na ememe okpukpe ndị so ha—dọtakwara ụmụ Israel bụ́ ndị họọrọ ijegharị n’ọhụhụ ụzọ kama ịbụ n’okwukwe. (2 Ndị Kọrint 5:7) Ọbụna mgbe ha hụsịrị ọrụ ebube ndị pụtara ìhè site n’aka a na-adịghị ahụ anya nke Jehova, ọtụtụ ndị Israel bụ́ ndị siworo n’Ijipt pụta chere na ọ dị ha mkpa inwe ihe a na-ahụ anya nke ga na-echetara ha banyere Chineke. (Ọpụpụ 32:1-4) N’otu aka ahụ, ụfọdụ n’ime ụmụ ha chọkwara ife ihe a na-ahụ anya ofufe, dị ka arụsị nke Beal.—1 Ndị Eze 12:25-30.

Ònye Meriri?

Ọgụ ahụ a lụrụ iji nweta obi ụmụ Israel kpọtụrụ ruo ọtụtụ narị afọ, site n’oge ha rutere n’ala dị larịị nke Moab nwa ntakịrị oge tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ ruo n’oge a chụgara ha Babilọn. Ọnọdụ ọma e nwere yiri ka ọ na-aga ihu na azụ. Mgbe ụfọdụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị Israel guzosiri ike n’ihe nye Jehova, ma mgbe mgbe ha chigharikwuru Beal. Otu isi ihe kpatara nke a bụ mkpakọrịta ha so ndị na-ekpere arụsị bi ha gburugburu nwee.

Mgbe e merisịrị ha n’agha, ndị Kenean ji ụzọ dị aghụghọ karị lụọ ọgụ. Ha so ụmụ Israel biri ma gbaa ndị meriri ha ume ka ha weghara chi dị iche iche nke ala ahụ. Ndị ikpe nwere obi ike dị ka Gideọn na Samuel guzogidere omume a. Samuel gbara ndị ahụ ume, sị: “Wezụganụ chi nile nke ndị ala ọzọ . . . , dozie obi unu ịbịakwute Jehova, feekwanụ nanị Ya ofufe.” Ruo oge ụfọdụ, ụmụ Israel ṅara ntị n’agbamume Samuel, ha “wee wezụga Bealim na Ashtarọt, fee nanị Jehova ofufe.”—1 Samuel 7:3, 4; Ndị Ikpe 6:25-27.

Mgbe Sọl na Devid chịsịrị, Solomọn malitere ịchụrụ chi ndị ala ọzọ àjà n’afọ ndị ikpeazụ ya. (1 Ndị Eze 11:4-8) Ndị eze ọzọ nke Israel na Juda mekwara otu ihe ahụ wee kwenyere Beal. Otú o sina dị, ndị amụma na ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Elaịja, Elaịsha, na Josaịa, butere ụzọ n’ịlụ ọgụ megide ofufe Beal. (2 Ihe E Mere 34:1-5) Ọzọkwa, n’oge a nile nke akụkọ ihe mere eme nke Israel, e nwere ndị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova. Ọbụna n’oge Ehab na Jezebel, mgbe ofufe Beal nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu, puku mmadụ asaa jụrụ ‘igbu ikpere nye Beal.’—1 Ndị Eze 19:18.

N’ikpeazụ, mgbe ndị Juu si n’ebe a chụgara ha na Babilọn lọta, e kwuteghị okwu ọzọ banyere ofufe Beal. Dị ka ndị ahụ e zoro aka na ha n’Ezra 6:21, ha nile ‘kewapụrụ onwe ha n’ịrụ arụ nke mba nile nke ala ahụ iso ha, ịchọ Jehova, bụ́ Chineke Israel.’

Ịdọ Aka ná Ntị Ndị Sitere n’Ofufe Beal

Ọ bụ ezie na ofufe Beal akwụsịwo eri mgbe, e nwere otu ihe jikọrọ okpukpe ndị Kenean ahụ na ọha mmadụ nke oge a—ibuli mmekọahụ elu. O yiri ka ihe ụrà dị iche iche nke omume rụrụ arụ dị kpọmkwem n’ikuku anyị na-ekuru. (Ndị Efesọs 2:2) “Anyị na-emegide ike a na-adịghị ahụ anya nke na-achịkwa ụwa ọchịchịrị a, na ndị ozi ime mmụọ bụ́ ndị sitere kpọmkwem n’isi ụlọ ọrụ nke ihe ọjọọ,” ka Pọl na-adọ aka ná ntị.—Ndị Efesọs 6:12, Phillips.

‘Ike a a na-adịghị ahụ anya’ nke Setan na-akwalite mmekọahụ rụrụ arụ iji na-eme ndị mmadụ ohu n’ụzọ ime mmụọ. (Jọn 8:34) N’ụwa taa nke ndị mmadụ na-eme ihe masịrị ha, a dịghị enwe mmekọahụ a na-achịkwaghị achịkwa dị ka ememe nke ala imepụta ihe, kama, dị ka ụzọ mmadụ si eme ihe na-atọ ya ụtọ ma ọ bụ ihe masịrị ya. Mkpọsa ya na-arụgidekwa arụgide otú ahụ. Site ná ntụrụndụ, egwú, na ime mkpọsa, ozi dị iche iche nke mmekọahụ na-ejupụta n’echiche ndị mmadụ. Mwakpo a na-emetụtakwa ndị ohu Chineke. N’ezie, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst bụ ndị dabara n’omume ndị dị otú ahụ. Nanị site n’ịnọgide na-ajụ echiche a rụrụ arụ ka onye Kraịst ga-esi nọgide na-adị ọcha.—Ndị Rom 12:9.

Ndịàmà na-eto eto nọ n’ihe ize ndụ karịsịa, ebe ọ bụ na ọtụtụ ihe ha nwere ike ịhụta dị ka ihe na-adọrọ adọrọ bụ ndị a na-egosipụta n’ụzọ na-akpali mmekọahụ. Nke ka njọ, ha aghaghị iguzogide mmetụta nke ndị na-eto eto ndị ọzọ bụ́ ndị na-akwali ha. (Tụlee Ilu 1:10-15.) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị abanyewo ná nsogbu ná nnọkọ ndị buru ibu. Dị ka ọ dị n’ofufe Beal n’oge ochie, egwú, ịgba egwú, na ihe ndọrọ mmekọahụ bụ ngwakọta na-egbu egbu.—2 Timoti 2:22.

“Gịnị ka okorobịa ga-eji mee ka ụzọ ya dị ọcha?” ka ọbụ abụ ahụ jụrụ. “Ọ bụ n’ilezi ya anya dị ka okwu [Jehova] si dị,” ka ọ zaghachiri. (Abụ Ọma 119:9) Dị nnọọ ka Iwu Chineke gwara ụmụ Israel ka ha zere iso ndị Kenean kpachie anya, otú ahụ ka Bible na-eme ka anyị mara ihe ize ndụ ndị dị ná mkpakọrịta amamihe na-adịghị na ya. (1 Ndị Kọrint 15:32, 33) Onye Kraịst na-eto eto na-egosipụta ntozu okè ya mgbe ọ na-ajụ ihe nwere ike ịdọrọ adọrọ n’ụzọ anụ ahụ ma bụrụ ihe ọ maara na ọ bụ omume na-emerụ ahụ. Dị ka Elaịja kwesịrị ntụkwasị obi, anyị apụghị ikwe ka ịba ụba nke echiche na-ewu ewu na-emere anyị mkpebi.—1 Ndị Eze 18:21; tụlee Matiu 7:13, 14.

Ịdọ aka ná ntị ọzọ metụtara enweghị okwukwe, “mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu.” (Ndị Hibru 12:1) O yiri ka ọtụtụ ndị Israel hà ka kweere na Jehova, ma ha legaara Beal anya dị ka chi nke ga-echebe ihe ọkụkụ ha ma nye ha ihe ndị na-akpa ha kwa ụbọchị. Ikekwe ha chere na ụlọ nsọ Jehova nke dị na Jerusalem dị nnọọ anya nakwa na idebe iwu ya nile bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Ofufe Beal achọghị oké ihe, o nyekwara ha ohere—ha pụrụ ọbụna ịnọ n’elu ụlọ ha suree ihe nsure ọkụ nye Beal. (Jeremaịa 32:29) Eleghị anya, ha dabara n’ofufe Beal nanị site n’ikere òkè n’ememe ya ụfọdụ ma ọ bụkwanụ site n’ịchụrụ Beal àjà n’aha Jehova.

Olee otú anyị pụrụ isi tụfuo okwukwe anyị ma jiri nke nta nke nta wezụga onwe anyị n’ebe Chineke ahụ dị ndụ nọ? (Ndị Hibru 3:12) Anyị pụrụ iji nwayọọ nwayọọ kwụsị inwe ekele anyị nweburu maka nzukọ na mgbakọ dị iche iche. Àgwà dị otú ahụ na-egosi enweghị obi ike n’onyinye Jehova na-enye ‘nri ime mmụọ n’oge ya.’ (Matiu 24:45-47) N’ịbụ ndị e si otú a mee ka anyị gharakwa inwe ike, anyị pụrụ ịhapụ ‘aka anyị ji okwu nke ndụ’ ahụ ma ọ bụ ọbụna na-enwe obi abụọ, ikekwe na-adaba ná nchụso ihe onwunwe ma ọ bụ omume rụrụ arụ.—Ndị Filipaị 2:16, NW; tụlee Abụ Ọma 119:113.

Ijidesi Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Anyị Ike

Obi abụọ adịghị ya na a na-alụ ọgụ iji nweta obi ndị mmadụ taa. Ànyị ga-eguzosi ike n’ihe nye Jehova ka ànyị ga-aghọ ndị ibi ndụ rụrụ arụ nke ụwa a dọpụrụ uche ha? Ọ dị mwute ikwu na dị nnọọ ka a dọtara ụmụ Israel n’omume na-asọ oyi nke ndị Kenean, a dọtawo ndị ikom na ndị inyom ụfọdụ bụ́ ndị Kraịst ime omume ndị na-eme ihere.—Tụlee Ilu 7:7, 21-23.

A pụrụ izere ọdịda ime mmụọ dị otú ahụ ma ọ bụrụ na, dị ka Mosis, anyị ‘anọgidesie ike, dị ka anyị na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.’ (Ndị Hibru 11:27) N’ezie, anyị aghaghị ‘ịgbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ.’ (Jud 3) Ma site n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke anyị na ụkpụrụ ya nile, anyị pụrụ ilepụ anya n’oge ahụ mgbe ofufe ụgha ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi. Dị nnọọ ka ofufe Jehova meriri ofufe Beal, otú ahụ anyị pụrụ ijide n’aka na n’oge na-adịghị anya “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.

[Foto dị na peeji nke 31]

Mkpọmkpọ ebe nke ogidi ndị dị na Gezea bụ́ ndị e ji mee ihe n’ofufe Beal

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 28]

Musée du Louvre, Paris

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya