Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
‘E Meghewo Ọnụ Ụzọ Dị Ukwuu nke A Ga-eji Rụsie Ọrụ Ike’ na Cuba
PỌL onyeozi bụ onye nkwusa pụrụ iche nke ozi ọma Alaeze Chineke. O jiri ohere ọ bụla soro ndị ọzọ kerịta nkwa Onye Okike nke ndụ ebighị ebi maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Mgbe ọ na-eleta Efesọs oge ochie, Pọl matara ọnọdụ ndị ọhụrụ nke ga-enye ya ohere inyere ọbụna ọtụtụ mmadụ karị aka. O kwuru, sị: “M ga-anọgide n’Efesọs . . . ; n’ihi na e megheworo m ọnụ ụzọ dị ukwuu nke a ga-ejikwa rụsie ọrụ ike.”—1 Ndị Kọrint 16:8, 9.
Ndịàmà Jehova nọ na Cuba ahụwokwa onwe ha n’ọnọdụ ndị ọhụrụ. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị edebabeghị aha ha n’akwụkwọ, Ndịàmà nwere ike ugbu a isoro ndị amaala ibe ha kerịta olileanya Bible ha n’ihu ọha. Na nso nso a, gọọmenti Cuba kwupụtara ezi mmasị n’ikwe ka òtù okpukpe dị iche iche dịrị n’enweghị ihe mgbochi. President Castro akpọwo aha Ndịàmà Jehova n’ihu ọha dị ka òtù okpukpe nke ya na gọọmenti Cuba na-enwe mmekọrịta dịwanyere mma ugbu a.
Ọnọdụ ọhụrụ a emegheworo Ndịàmà “ọnụ ụzọ dị ukwuu nke a ga-ejikwa rụsie ọrụ ike.” Dị ka ihe atụ, na nso nso a Ndịàmà Jehova meghere otu ụlọ ọrụ na Cuba, bụ́ nke na-enyere ha aka iduzi ọrụ nkwusa ha ná mba ahụ. Ihe karịrị 65,000 Ndịàmà na-enyere ndị mmadụ aka ịmụ na ịghọta Bible. Ha na-eji akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, dị ka magazin Ụlọ Nche na Teta! eme ihe. Ọtụtụ ndị Cuba bụ́ ndị nwere obi ezi omume na-erite uru site n’isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible.
Ndịàmà ahụ na-enwechikwa nzukọ anya n’ìgwè nta dị iche iche n’àgwàetiti ahụ nile. Mgbe ụfọdụ ha na-enweta ọbụna ihe ùgwù nke inwe mgbakọ ndị ka ukwuu n’ìgwè nke nwere ihe dị ka 150 mmadụ. Ha nwere ekele n’ezie maka ikike ha nwetaworo site n’aka ndị ọchịchị Cuba, nke na-enye ha ohere isoro ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị na-ezukọ, na-abụrụ Chineke abụ otuto, na-ekpekọkwa ekpere ọnụ.
Na nso nso a e nwere Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke” n’ihe karịrị 1,000 ugboro nanị n’ime ngwụsị izu atọ. Otu akụkọ na-ekwu na “ịdị n’usoro, àgwà ziri ezi, na udo” pụtara ìhè ná mgbakọ nke ọ bụla. Ndị ọchịchị jara Ndịàmà mma n’okwu a.
N’ụwa nile, ezi ndị Kraịst na-agbalịsi ike imezu iwu Chineke nyere ha ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. N’otu mgbe ahụ, ha na-agbalịsi ike ijigide mmekọrịta udo ha na ndị isi gọọmenti. (Taịtọs 3:1) Ndịàmà Jehova na-agbaso ndụmọdụ nke Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Ya mere ihe mbụ m na-adụsi ọdụ ike bụ, ka a na-arịọ arịrịọ, kpeekwa ekpere, rịọkwa arịrịọ a na-arịọrọ ndị ọzọ, keleekwa ekele, n’ihi mmadụ nile; n’ihi ndị eze na ndị nile nọ n’ọnọdụ dị elu; ka anyị wee biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile.”—1 Timoti 2:1, 2.