Ihe Mmụta Ndị Bara Uru Site n’Ala Nkwa Ahụ
ALA NKWA ahụ dị n’ihe ndekọ Bible pụrụ iche n’ezie. N’ógbè a dị nnọọ ntakịrị, anyị na-ahụ ụdị ọdịdị mbara ala dị iche iche nke ukwuu. N’ebe ugwu, e nwere ugwu ndị snow na-ekpuchi elu ha; n’ebe ndịda, ógbè ndị na-ekpo ọkụ. E nwere ala ndị dị larịị na-emepụta ihe, ógbè ọzara ndị tọgbọ chakoo, na ebe ugwu maka ubi na ìgwè anụ ndị na-ata nri.
Ịdị elu, ihu igwe, na ájá ya dịgasị iche iche na-eme ka e nwee ụdị osisi dị iche iche, na ihe ọkụkụ ndị ọzọ—tinyere ụfọdụ ndị na-eme nke ọma n’ógbè ndị jụrụ oyi nke ebe ugwu, ndị ọzọ bụ́ ndị na-eto n’ọzara ndị anwụ na-achasi ike na ha, nakwa ndị ọzọ na-eme nke ọma na mbara ala nwere ájá nkịtị ma ọ bụ ala dị larịị jupụtara n’okwute. Otu ọkà mmụta banyere ihe ọkụkụ na-eme atụmatụ na a pụrụ ịhụ ihe dị ka ụdị ihe ọkụkụ 2,600 dị iche iche n’ógbè ahụ! Ndị Israel mbụ jere nchọpụta n’ala ahụ hụrụ ihe àmà nke ikike mmepụta ihe ya ozugbo. Ha si n’otu ndagwurugwu weghachite otu ụyọkọ mkpụrụ vine buru ibu nke na a ghaghị iburu ya n’osisi e ji ebu ihe n’etiti ndị ikom abụọ! N’ụzọ kwesịrị ekwesị a kpọrọ ndagwurugwu ahụ Eshkọl, nke pụtara “Ụyọkọ [Mkpụrụ Vine].”a—Ọnụ Ọgụgụ 13:21-24.
Ma ka anyị lebakwuo anya ugbu a n’akụkụ ụfọdụ nke ọdịdị mbara ala nke ókèala a pụrụ iche, karịsịa nke akụkụ ebe ndịda.
Shephelah
Ụsọ osimiri ọdịda anyanwụ nke Ala Nkwa ahụ bụ ebe ya na Osimiri Mediterranean sọkọtara. Shephelah dị ihe dị ka 40 kilomita n’ịbatakwu n’ime. Okwu bụ́ “Shephelah” pụtara “Ebe Dị Ala Ala,” ma n’ezie ebe a bụ ógbè bụ ugwu ugwu, a pụkwara ịkpọ ya ebe dị ala nanị mgbe e ji ya tụnyere ugwu nile nke Juda nke dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ.
Lee anya na map e sepụtara akụkụ ya ụfọdụ n’ebe a ma rịba ama ebe Shephelah dị n’etiti ókèala ndị gbara ya gburugburu. Ugwu nile nke Juda dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ; ala dị larịị nke Filistia dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ. N’ihi ya, Shephelah jere ozi dị ka ógbè dị n’etiti, ihe mgbochi kewapụrụ ndị Chineke pụọ n’ebe ndị iro ha nke oge ochie nọ n’oge Bible. Ndị agha ọ bụla na-eme mwakpo site n’akụkụ ọdịda anyanwụ ga-agaferịrị Shephelah tupu ha enwee ike ịwakwasị Jerusalem, bụ́ isi obodo Israel.
Ihe dị otú ahụ mere na narị afọ nke itoolu T.O.A. Eze Hazael nke Siria, ka Bible na-akọ, “rịgoro, busoo Gat [ma eleghị anya n’ụsọ Shephelah] agha, were ya: Hazael wee chee ihu ya ịrịgo imegide Jerusalem.” Eze Jehoash jisiri ike kwụsị Hazael, jiri ụdị ihe dị iche iche bara uru sitere n’ụlọ nsọ ahụ na n’obí eze zụrụ ya. Ka o sina dị, ihe ndekọ a na-egosi na Shephelah dị oké mkpa n’ịnọ ná nchebe nke Jerusalem.—2 Ndị Eze 12:17, 18.
Anyị pụrụ ịmụta ihe bara uru site na nke a. Hazael chọrọ imeri Jerusalem, ma ọ ghaghị ibu ụzọ gafere Shephelah. N’otu aka ahụ, Setan bụ́ Ekwensu ‘na-achọ ilomi’ ndị ohu Chineke, ma ọtụtụ mgbe ọ ghaghị ibu ụzọ gafere ógbè siri ike nke dị n’etiti—nrapara ha rapaara n’ụkpụrụ dị iche iche nke Bible, dị ka ndị metụtara mkpakọrịta ọjọọ na ịhụ ihe onwunwe n’anya. (1 Pita 5:8; 1 Ndị Kọrint 15:33; 1 Timoti 6:10) Imebi ụkpụrụ Bible na-abụkarị nzọụkwụ mbụ gaa n’ime mmehie ndị dị oké njọ. Ya mere mee ka ógbè ahụ dị n’etiti nọgide na-anọ ná nchebe. Gbasoo ụkpụrụ Bible taa, ị gaghịkwa emebi iwu Chineke echi.
Ebe Ugwu nke Juda
Ebe ugwu nke Juda dị ma ị batụkwuo n’ime site na Shephelah. Nke a bụ ógbè bụ ugwu ugwu nke na-emepụta ezi ọka, mmanụ olive, na mmanya. N’ihi ịdị n’elu ya, Juda bụkwa ebe mgbaba magburu onwe ya. N’ihi ya, Eze Jotam wuru “ụlọ ukwu na ụlọ elu” n’ebe ahụ. N’oge nsogbu, ndị mmadụ pụrụ ịgbaga n’ebe ndị a maka nchebe.—2 Ihe Emere 27:4.
Jerusalem, nke a kpọkwara Zaịọn, bụ akụkụ dị ịrịba ama n’ebe ugwu nke Juda. Jerusalem yiri ebe nọ ná nchebe ebe ọ bụ na ndagwurugwu ndị dị mkpọda gbara ya gburugburu n’akụkụ atọ, e jikwa mgbidi atọ chebe akụkụ ebe ugwu, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme narị afọ mbụ bụ́ Josephus si kwuo. Ma ọ dị mkpa ka ebe mgbaba nwee ihe karịrị mgbidi na ngwá agha iji nọgide ná nchebe ya. Ọ ghaghịkwa inwe mmiri. Nke a dị mkpa n’oge mwakpo, n’ihi na ọ bụrụ na mmiri adịghị, a ga-amanye ndị amaala ya a nọchibidoro ịchịli aka elu ngwa ngwa.
Jerusalem na-enweta mmiri site n’Ọdọ Mmiri Nta nke Saịloam. Otú ọ dị, na narị afọ nke asatọ T.O.A., n’atụmanya nke mwakpo ndị Asiria, Eze Hezekaịa wuru mgbidi n’azụ mgbidi iji chebe Ọdọ Mmiri Nta nke Saịloam, na-eme ka ọ dịrị n’ime obodo ahụ. O gbochikwara mmiri iyi ndị na-adịghị n’ime obodo ahụ, ka ndị Asiria ahụ na-eme mwakpo wee nwee ihe isi ike ịchọtara onwe ha mmiri. (2 Ihe Emere 32:2-5; Aịsaịa 22:11) Ọ kwụsịghị n’ebe ahụ. Hezekaịa chọtara ụzọ isi mepeere mmiri ka ukwuu ụzọ ịbata kpọmkwem n’ime Jerusalem!
N’ihe a kpọworo otu n’ime ọrụ injinịa kasịnụ a rụrụ n’oge ochie, Hezekaịa gwuru ọwa mmiri site na mmiri iyi Gaịhọn garuo Ọdọ Mmiri Nta nke Saịloam.b N’inwe nkezi nke 1.8 mita n’ịdị elu, ọwa mmiri a dị 533 mita n’ogologo. Cheedị nnọọ banyere ya—ọwa mmiri nke dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara otu kilomita n’ogologo, nke a wara gafere n’okwute! Taa, ihe dị ka 2,700 afọ n’ihu, ndị na-eme nleta na Jerusalem pụrụ ịgafere n’ime ọrụ injinịa a magburu onwe ya, nke a na-akpọkarị ọwa mmiri Hezekaịa.—2 Ndị Eze 20:20; 2 Ihe Emere 32:30.
Mgbalị nile Hezekaịa mere iji chebe ma mụbaa mmiri Jerusalem na-enweta pụrụ ịkụziri anyị ihe bara uru. Jehova bụ “isi iyi nke mmiri na-enye ndụ.” (Jeremaịa 2:13) Echiche ya, bụ́ ndị dị n’ime Bible, na-akwado ndụ. Ọ bụ ya mere ọmụmụ Bible onwe onye ji dị mkpa. Ma ohere nke ịmụ ihe, na ihe ọmụma nke na-esi na ya apụta, agaghị anọkata bịara gị. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka i ‘gwuo ọwa mmiri,’ dị ka gafere n’usoro ime ihe gị nke juru eju kwa ụbọchị, iji mepụta ohere maka ya. (Ilu 2:1-5; Ndị Efesọs 5:15, 16) Ozugbo ị malitere, rapagidesie ike n’usoro ihe omume gị, na-ebute ọmụmụ ihe onwe onye gị ụzọ. Lezie anya ka ị ghara ikwe ka onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla napụ gị mmiri a dị oké ọnụ ahịa.—Ndị Filipaị 1:9, 10.
Ógbè Dị Iche Iche nke Ọzara
N’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ugwu nile nke Juda ka Ọzara Juda dị, nke a na-akpọkwa Jeshimọn, nke pụtara “Ọzara.” (1 Samuel 23:19) N’Osimiri Nnu ahụ, ógbè a kpọrọ nkụ nwere ndagwurugwu ndị jupụtara n’okwute na nkume ndị ọnụ ha dị jagajaga. N’ịkpọda ihe ruru 1,200 mita nanị n’ime 24 kilomita, e kpuchiri Ọzara Juda pụọ n’ikuku na-eweta mmiri ozuzo ndị si n’ebe ọdịda anyanwụ, n’ihi ya kwa ọ na-enweta nanị ntakịrị mmiri ozuzo. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọzara a bụ ebe a na-eziga ewu Ọpụpụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ a na-eme kwa afọ. Ọ bụkwa ebe Devid gbalagara pụọ n’aka Sọl. Jisọs buru ọnụ n’ebe a ruo 40 ụbọchị, Ekwensu nwaakwa ya mgbe nke ahụ gasịrị.—Levitikọs 16:21, 22; Abụ Ọma nke 63, ihe e dekwasịrị n’elu ya; Matiu 4:1-11.
Ọzara Peran dị ihe dị ka 160 kilomita n’akụkụ ndịda nke ebe ọdịda anyanwụ Ọzara Juda. Ọtụtụ n’ime ọmụma ụlọikwuu nke Israel n’oge njem ha were 40 afọ site n’Ijipt gaa n’Ala Nkwa ahụ dị n’ebe a. (Ọnụ Ọgụgụ 33:1-49) Mosis dere banyere ‘ọzara ukwu ahụ nke dị egwu, nke agwọ nke yiri ọkụ na akpị dị n’ime ya, na ala akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri na-adịghị ya.’ (Deuterọnọmi 8:15) Ọ bụ ihe ijuanya na ọtụtụ nde ndị Israel pụrụ ịlanarị! Ma, Jehova kwagidere ha.
Ka nke a bụrụ ihe ncheta na Jehova nwere ike ịkwagidekwa anyị, ọbụna n’ime ụwa a kpọrọ nkụ n’ụzọ ime mmụọ. Ee, anyị onwe anyị kwa na-ejegharị n’etiti agwọ na akpị, ọ bụrụgodị na ọ bụghị n’ụzọ nkịtị. Ọ pụrụ ịbụ na anyị aghaghị iso ndị mmadụ akọ na uche ha na-adịghị enye nsogbu banyere ịgbọpụta okwu yiri nsí ndị pụrụ imetọ echiche anyị n’ụzọ dị mfe wee mekọrịta ihe kwa ụbọchị. (Ndị Efesọs 5:3, 4: 1 Timoti 6:20) A na-aja ndị na-agbalịsi ike ijere Chineke ozi n’agbanyeghị ihe mgbochi ndị a mma. Ikwesị ntụkwasị obi ha bụ ihe àmà siri ike na Jehova na-akwagide ha n’ezie.
Ugwu Nile nke Kamel
Aha ahụ bụ́ Kamel pụtara “Ubi.” Ógbè a na-eme nri nke dị n’akụkụ ebe ugwu, nke dị ihe dị ka 50 kilomita n’ogologo, bụ nke e ji ubi vine, ubi olive, na osisi ndị na-amị mkpụrụ chọọ mma. Mkputamkpu ala a jupụtara n’ugwu bụ nke a na-apụghị ichezọ echezọ n’ịma mma ya. Aịsaịa 35:2 na-ekwu banyere “ịma mma nke Kamel” dị ka ihe atụ nke ebube mmepụta ihe nke ala Israel ahụ e weghachiri eweghachi.
Ụfọdụ ihe ndị dị ịrịba ama mere na Kamel. Ọ bụ n’ebe a ka Elaịja mara ndị amụma Beal aka, ebe ‘ọkụ Jehova dakwara’ dị ka ihe àmà nke nkarị Ya. Ọzọkwa, ọ bụ site n’elu Kamel ka Elaịja dọọrọ uche gaa ná ntakịrị igwe ojii ahụ nke ghọrọ oké mmiri ozuzo, si otú a na-eweta ụkọ mmiri ozuzo ahụ dị n’Israel ná njedebe n’ụzọ ọrụ ebube. (1 Ndị Eze 18:17-46) Onye nọchiri Elaịja, bụ́ Elaịsha, nọ n’Ugwu Kamel mgbe nwanyị Shunem bịara rịọ enyemaka ya maka nwa ya nwụrụ anwụ, bụ́ onye Elaịsha mesịrị kpọlite n’ọnwụ.—2 Ndị Eze 4:8, 20, 25-37.
Mkpọda ugwu nke Kamel ka nwere ubi ọma, ubi olive, na vine. N’oge opupu ihe ubi, okooko osisi magburu onwe ha na-ekpuchi mkpọda ugwu ndị a. “Isi gị nke dị n’elu gị dị ka Kamel,” ka Solomọn gwara nwa agbọghọ Shunem ahụ, ikekwe na-ezo aka n’ịma mma nke ntutu isi ya ma ọ bụ n’ụzọ isi ya mara mma si guzoro n’ụzọ mara mma n’olu ya.—Abụ nke Abụ 7:5.
Ịma mma nke e ji mara ugwu nile nke Kamel na-echetara anyị banyere ịma mma ime mmụọ nke Jehova nyeworo nzukọ ya nke oge a nke ndị na-efe ofufe. (Aịsaịa 35:1, 2) Ndịàmà Jehova na-ebi n’ezie n’ime paradaịs ime mmụọ, ha kwetakwara n’okwu Eze Devid, bụ́ onye dere, sị: “Ụdọ ọ̀tụ̀tụ̀ nile adaworo m n’ebe dị ụtọ; n’ezie ihe nketa m dị m ezi mma.”—Abụ Ọma 16:6.
N’ezie, e nwere ihe ịma aka ndị siri ike nke mba ime mmụọ Chineke nke taa ga-echerịrị ihu, ọbụna dị ka ndị Israel oge ochie nọgidere na-enweta mmegide site n’aka ndị iro Chineke. Ma, ezi ndị Kraịst adịghị mgbe ha na-eleghara ngọzi ndị Jehova nyeworo anya—gụnyere ìhè ahụ na-amụba amụba nke eziokwu Bible, òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, na ohere nke inweta ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs.—Ilu 4:18; Jọn 3:16; 13:35.
“Dị Ka Ubi Jehova A Gbara Ogige”
Ala Nkwa ahụ nke oge ochie na-adọrọ adọrọ n’anya. A kọwawo ya nke ọma dị ka “ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Jenesis 13:10; Ọpụpụ 3:8) Mosis kpọrọ ya ‘ezi ala, bụ́ ala iyi mmiri, na nke isi iyi na ogbu mmiri, na-apụta na ndagwurugwu na n’ugwu: ala nke ọka wheat na ọka barley, na osisi vine, na osisi fig, na pomegranate; ala nke osisi olive na-enye mmanụ, na nke mmanụ aṅụ; ala nke ọ bụghị n’ịdị ụkọ ka ị ga-eri nri n’ime ya; ọ dịghị ihe ọ bụla ga-akọ gị n’ime ya; ala nke nkume ya bụ ígwè, nke ị ga-egwupụtakwa ọla n’ugwu ya.’—Deuterọnọmi 8:7-9.
Ọ bụrụ na Jehova nwere ike inye ndị ya nke oge ochie ụdị ala obibi dị otú ahụ na-emepụta ihe, nke mara mma, n’ezie ọ pụrụ inye ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge a paradaịs dị ebube nke ga-agbasazu n’ụwa nile—na-enwe ugwu, ndagwurugwu, osimiri, na ọdọ mmiri dị iche iche. Ee, Ala Nkwa ahụ nke oge ochie na ọdịdị ya dịgasị iche iche bụ nanị ihe atụ nke paradaịs ime mmụọ nke Ndịàmà ya na-anụ ụtọ ya taa nakwa nke Paradaịs ọdịnihu nke ụwa ọhụrụ ahụ. N’ebe ahụ ka a ga-emezu nkwa ahụ e dere n’Abụ Ọma 37:29: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe Jehova nyere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ebe obibi ahụ bụ Paradaịs, lee ka ha ga-esi nwee obi ụtọ inyocha “ọnụ ụlọ” ya nile na ime otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E dekọrọ na otu ụyọkọ si n’ógbè a dị 12 kilogram n’ịdị arọ, ọzọ dịkwa ihe karịrị 20 kilogram.
b Mmiri iyi Gaịhọn dị kpọmkwem n’azụ ókèala ọwụwa anyanwụ Jerusalem. E zoro ya n’ime ọ́gbà; n’ihi ya, o yiri ka ndị Asiria amaghị na ọ dị.
[Map dị na peeji 4]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
GALILI
Ugwu Kamel
Osimiri Galili
SAMERIA
SHEPHELAH
Ugwu nile nke Juda
Osimiri Nnu
[Ebe E Si Nweta Foto]
NASA photo
[Map dị na peeji 4]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Shephelah ahụ bụ ihe mgbochi n’agbata ndị Chineke na ndị iro ha
MI 0 5 10
KM 0 8 16
Ala Dị Larịị nke Filistia
Shephelah
Ebe Ugwu nke Juda
Ọzara Juda
Ndagwurugwu Rift
Osimiri Nnu
Ala Amọn na Moab
[Map/Foto dị na peeji nke 5]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Ọwa mmiri Hezekaịa: 533 mita n’ogologo, nke a wara gafere n’okwute siri ike
Ndagwurugwu Tyropoeon
Saịloam
OBODO DEVID
Ndagwurugwu Kidron
Gaịhọn
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
N’Ọzara Juda, Devid chọrọ ebe mgbaba pụọ n’aka Sọl. Ka e mesịrị Ekwensu nwara Jisọs n’ebe a
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ugwu Kamel, ebe Elaịja menyere ndị amụma Beal ihere
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
“Jehova, bụ́ Chineke gị, na-eme ka ị baa n’ezi ala, bụ́ ala iyi mmiri, na nke isi iyi na ogbu mmiri, na-apụta na ndagwurugwu na n’ugwu.”—Deuterọnọmi 8:7