Iwu Kraịst
“Anọ m n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ.”—1 NDỊ KỌRINT 9:21.
1, 2. (a) Olee otú a gaara esi gbochie ọtụtụ n’ime ihie ụzọ nke ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Gịnị ka Krisendọm na-amụtaghị site n’akụkọ ihe mere eme nke okpukpe ndị Juu?
“NDỊ mmadụ na gọọmenti dị iche iche amụtabeghị ihe ọ bụla site n’akụkọ ihe mere eme, ma ọ bụ jiri ụkpụrụ ndị e si na ya nweta mee ihe.” Ọ bụ ihe onye Germany bụ́ onye ọkà ihe ọmụma na narị afọ nke 19 kwuru. N’ezie, a kọwawo otú akụkọ ihe mere eme nke ụmụ mmadụ si aga dị ka “njem nzuzu,” ọtụtụ mmehie ihe na ọdachi ndị jọgburu onwe ha, ndị a gaara egbochiworị ọtụtụ n’ime ha a sị na ihe a kpọrọ mmadụ dị nnọọ njikere ịmụta ihe site n’ihie ụzọ ndị gara aga.
2 Otu ọjụjụ ahụ a jụrụ ịmụta ihe site n’ihie ụzọ ndị gara aga na-apụta ná ntụle a na-atụle iwu Chineke. Jehova Chineke ji ọbụna iwu ka mma—iwu Kraịst—dochie anya Iwu Mosis. Ma, ndị ndú Krisendọm, ndị na-azọrọ ịkụzi na ibi ndụ kwekọrọ n’iwu a, amụtabeghị ihe site n’ajọ nzuzu nke ndị Farisii. Ya mere Krisendọm ahịgharịwo ma metọọ iwu Kraịst dị nnọọ ka okpukpe ndị Juu mere Iwu Mosis. N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, ka anyị tụlee iwu a n’onwe ya—ihe ọ bụ, ndị ọ na-achị na ụzọ o si achị ha, na ihe mere ka ọ dị iche n’ebe Iwu Mosis dị. Mgbe ahụ anyị ga-atụle otú Krisendọm siworo metọọ ya. Ka anyị si otú a mụta ihe site n’akụkọ ihe mere eme ma rite uru site na ya!
Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
3. Nkwa dị aṅaa ka Jehova kwere banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ?
3 Ònye ma e wezụga Jehova Chineke nwere ike imeziwanye Iwu zuru okè? Ọgbụgba ndụ Iwu Mosis ahụ zuru okè. (Abụ Ọma 19:7) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova kwere nkwa, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, . . . mgbe Mụ na ụlọ Israel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ: ọ bụghị dị ka ọgbụgba ndụ ahụ si dị nke Mụ na ndị bụ nna ha gbara.” E dere Iwu Iri ahụ—isi sekpụ ntị n’Iwu Mosis ahụ—n’elu mbadamba nkume. Ma banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Jehova kwuru, sị: “M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka M ga-edekwasị ya.”—Jeremaịa 31:31-34.
4. (a) Olee Israel nke so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) Olee ndị ọzọ nọ n’okpuru iwu Kraịst ma e wezụga Israel ime mmụọ?
4 Ole ndị ka a ga-akpọbata n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ a? N’ezie ọ bụghị “ụlọ Israel” nkịtị, bụ́ ndị jụrụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ a. (Ndị Hibru 9:15) Ee e, “Israel” ọhụrụ a ga-abụ “Israel nke Chineke,” mba nke ndị Israel ime mmụọ. (Ndị Galetia 6:16; Ndị Rom 2:28, 29) “Oké ìgwè mmadụ” si ná mba nile bụ́ ndị ga-achọkwa ife Jehova ga-emesịa sonyere ntakịrị ìgwè a nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. (Mkpughe 7:9, 10; Zekaraịa 8:23) Ọ bụ ezie na ha esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, iwu jikwa ndị a. (Tụlee Levitikọs 24:22; Ọnụ Ọgụgụ 15:15.) Dị ka “otu ìgwè atụrụ” n’okpuru “otu Onye ọzụzụ atụrụ,” ha nile ga-anọ “n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ,” dị ka Pọl onyeozi dere. (Jọn 10:16; 1 Ndị Kọrint 9:21) Pọl kpọrọ ọgbụgba ndụ ọhụrụ a “ọgbụgba ndụ ka mma.” N’ihi gịnị? Otu bụ na ọ dabeere ná nkwa ndị e mezuru kama ịbụ n’onyinyo nke ihe ndị gaje ịbịa.—Ndị Hibru 8:6; 9:11-14.
5. Gịnị bụ nzube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, gịnịkwa mere ọ ga-eji gaa nke ọma?
5 Gịnị bụ nzube nke ọgbụgba ndụ a? Ọ bụ iwepụta mba nke ndị eze na ndị nchụàjà iji gọzie ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Ọpụpụ 19:6; 1 Pita 2:9; Mkpughe 5:10) Ọgbụgba ndụ Iwu Mosis ahụ adịghị mgbe o wepụtara mba a n’echiche kasị zuo ezu, n’ihi na Israel n’ozuzu ha nupụrụ isi wee tụfuo ohere ha. (Tụlee Ndị Rom 11:17-21.) Otú ọ dị, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ aghaghị ịga nke ọma, n’ihi na e jikọtara ụdị iwu dị nnọọ iche. Ọ̀ dị iche n’ụzọ dịgasị aṅaa?
Iwu nke Inwe Onwe
6, 7. Olee otú iwu Kraịst si enye nnwere onwe dị ukwuu karịa ka Iwu Mosis nyere?
6 Ugboro ugboro a na-ejikọta iwu Kraịst na nnwere onwe. (Jọn 8:31, 32) E zoro aka n’ebe ọ dị dị ka “iwu nke inwe onwe onye” na “iwu zuru okè, bụ iwu nke inwe onwe.” (Jemes 1:25; 2:12) N’ezie, nnwere onwe nile n’etiti ụmụ mmadụ bụ nke a kpaara ókè. N’agbanyeghị nke ahụ, iwu a na-enye nnwere onwe ka nnọọ ukwuu karịa nke bu ya ụzọ, bụ́ Iwu Mosis. N’ụzọ dị aṅaa?
7 Otu bụ na ọ dịghị onye a na-amụnye n’okpuru iwu Kraịst. Ihe ndị dị ka agbụrụ na ebe a mụrụ mmadụ adịghị mkpa. Ezi ndị Kraịst na-eji onwe ha ahọrọ n’ime obi ha ịnakwere yoke nke irube isi n’iwu a. N’ime otú a, ha na-ahụ na ọ bụ yoke na-adịghị egbu mgbu, ibu dị mfe. (Matiu 11:28-30) E kwuwerị, a hazikwara Iwu Mosis ahụ ịkụziri mmadụ na ọ na-eme mmehie ma nwee oké mkpa nke àjà mgbapụta iji gbapụta ya. (Ndị Galetia 3:19) Iwu Kraịst na-akụzi na Mesaịa ahụ abịawo, jiri ndụ ya kwụọ ụgwọ mgbapụta ahụ, wee meghee ụzọ ka a tọhapụ anyị ná mmegbu ọjọọ nke mmehie na ọnwụ! (Ndị Rom 5:20, 21) Iji rite uru, ọ dị anyị mkpa ‘inwe okwukwe’ n’àjà ahụ.—Jọn 3:16.
8. Gịnị ka iwu Kraịst na-agụnye, ma gịnị mere ibi ndụ kwekọrọ na ya na-ejighị chọọ iburu ọtụtụ narị ntụzi n’isi?
8 ‘Inwe okwukwe’ na-agụnye ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Kraịst. Nke ahụ na-agụnye irube isi n’iwu Kraịst nile. Nke a ọ̀ pụtara iburu ọtụtụ narị iwu na ntụzi n’isi? Ee e. Ọ bụ ezie na Mosis, bụ́ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ochie ahụ, deturu Iwu Mosis, Jisọs, bụ́ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, edetughị otu mkpụrụ iwu. Kama nke ahụ, o biri ndụ kwekọrọ n’iwu a. Site n’ụzọ ndụ ya zuru okè, ọ tọgbọrọ ihe nlereanya ka mmadụ nile gbasoo. (1 Pita 2:21) Ikekwe ọ bụ ya mere e ji zoo aka n’ofufe nke ndị Kraịst oge mbụ dị ka “Ụzọ.” (Ọrụ 9:2; 19:9, 23; 22:4; 24:22) Nye ha, e nyere ihe atụ nke iwu Kraịst ná ndụ Kraịst. Iṅomi Jisọs bụ irube isi n’iwu a. Ịhụnanya siri ike ha nwere n’ebe ọ nọ pụtara na e dere iwu a n’ezie n’ime obi ha, dị ka e buru n’amụma. (Jeremaịa 31:33; 1 Pita 4:8) Onye na-erubekwa isi n’ihi ịhụnanya adịghị eche na a na-emegbu ya—ihe ọzọ mere a pụrụ iji kpọọ iwu Kraịst “iwu nke inwe onwe onye.”
9. Gịnị bụ nnọọ ihe kasị mkpa n’iwu Kraịst, oleekwa ụzọ iwu a si metụta iwu ọhụrụ?
9 Ọ bụrụ na ịhụnanya dị mkpa n’Iwu Mosis, ọ bụ ihe kasị mkpa n’iwu ndị Kraịst. Ya mere iwu Kraịst na-agụnye iwu ọhụrụ—ndị Kraịst ga-enwe ịhụnanya iji onwe onye achụ àjà maka ibe ha. Ha ga-ahụ n’anya dị ka Jisọs hụrụ; o ji ọchịchọ obi tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya. (Jọn 13:34, 35; 15:13) Ya mere a pụrụ ikwu na iwu Kraịst bụ ọbụna ngosipụta ka mma nke ọchịchị Chineke karịa otú Iwu Mosis bụ. Dị ka magazin a meworo ka ọ pụta ìhè na mbụ: “Ọchịchị Chineke bụ ịchịisi nke Chineke; Chineke bụ ịhụnanya; n’ihi ya ọchịchị Chineke bụ ịchịisi site n’ịhụnanya.”
Jisọs na Ndị Farisii
10. Olee otú izi ihe Jisọs si dị iche na nke ndị Farisii?
10 Ya bụrụ otú ahụ ọ bụghị ihe ijuanya na Jisọs na ndị ndú okpukpe ndị Juu nke oge ya kwatara. “Iwu zuru okè, bụ iwu nke inwe onwe” abatatụghị ma ọlị n’uche ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii. Ha gbalịrị ịchịkwa ndị ahụ site n’iwu nduzi ndị mmadụ mere. Ozizi ha ghọrọ nke mmegbu, nke nkatọ, nke na-adịghị mma. N’ụzọ dị nnọọ iche, ozizi Jisọs na-ewuli elu ma baa uru nke ukwuu! Ọ ghọtara ọnọdụ ndị dịnụ ma leba anya ná mkpa na nchegbu ndị mmadụ nwere n’ezie. O ziri ihe n’ụzọ dị mfe ma jiri ezi mmetụta, na-eji ihe atụ ndị sitere ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị ma na-eji ikike nke Okwu Chineke eme ihe. N’ihi ya, “ibobo ozizi Ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ.” (Matiu 7:28) Ee, izi ihe Jisọs ruru ha n’obi!
11. Olee otú Jisọs si gosi na e kwesịrị ijiworị ezi uche na ebere tinye Iwu Mosis ahụ n’ọrụ?
11 Kama ịtụkwasịkwu iwu nduzi n’elu Iwu Mosis, Jisọs gosiri otú ndị Juu kwesịrị isiworị na-etinye Iwu ahụ n’ọrụ eri oge—n’ezi uche na ebere. Cheta, dị ka ihe atụ, mgbe nwanyị na-arịa oruru ọbara bịakwutere ya. Dị ka Iwu Mosis si kwuo, onye ọ bụla nwanyị ahụ metụrụ aka ga-aghọ onye na-adịghị ọcha, ya mere o kwesịghị n’ezie iso ìgwè mmadụ na-emekọ! (Levitikọs 15:25-27) Ma ọ na-achọsi ike ka a gwọọ ya nke na ọ gabigara n’etiti ìgwè mmadụ ahụ wee metụ uwe Jisọs aka. Oruru ọbara ahụ kwụsịrị ozugbo. Ọ̀ baara ya mba maka imebi Iwu ahụ? Ee e; kama nke ahụ, ọ ghọtara ajọ ọnọdụ ya wee gosipụta ụkpụrụ kachasịnụ n’Iwu ahụ—ịhụnanya. N’ọmịiko ọ sịrị ya: “Nwa m nwanyị, okwukwe gị azọpụtawo gị; laa n’udo, si n’ajọ ọrịa gị nwee ahụ dị ike.”—Mak 5:25-34.
Iwu Kraịst Ọ̀ Na-enye Ohere Mmadụ Ime Otú Masịrị Ya?
12. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na Kraịst na-enye mmadụ ohere ime otú masịrị ya? (b) Gịnị na-egosi na imepụta ọtụtụ iwu na-eduje n’imepụta ọtụtụ ụzọ isi zere iwu?
12 Ànyị kwesịziri ikwubi na n’ihi na iwu Kraịst bụ nke “inwe onwe,” na ọ na-enye ohere mmadụ ime otú masịrị ya, ebe ndị Farisii, ji ọdịnala ha nile a na-edeghị ede, ma ọ dịghị ihe ọzọ kpaara àgwà ndị mmadụ ókè n’ụzọ siri ike? Ee e. Usoro iwu ndị e nwere taa na-egosi ọtụtụ mgbe na ka a na-enwekwu iwu, otú a ka ndị mmadụ na-achọtakwu ụzọ isi zere ha.a N’oge Jisọs, ịba ụba nke iwu ndị Farisii kpaliri ịchọ ụzọ isi zere ha, ịrụ ọrụ ndị ịhụnanya na-adịghị na ha iji mezuo iwu, na ịzụlite ọdịdị ezi omume onwe onye a na-ahụ anya iji zochie ịrụ arụ dị n’ime.—Matiu 23:23, 24.
13. N’ihi gịnị ka iwu Kraịst ji arụpụta ụkpụrụ omume dị elu karịa usoro iwu ọ bụla e dere ede?
13 Iwu Kraịst, n’ụzọ dị iche, adịghị akwado ụdị omume ndị ahụ. N’ezie, irube isi n’iwu nke dabeere n’ịhụnanya maka Jehova na nke a na-erubere isi site n’iṅomi ịhụnanya iji onwe onye achụ àjà nke Kraịst nwere maka ndị ọzọ na-arụpụta ụkpụrụ àgwà dị nnọọ elu karịa otú ịgbaso usoro iwu e guzobere na-arụpụta. Ịhụnanya adịghị achọ ụzọ isi zere iwu; ọ na-egbochi anyị ime ihe ndị dị njọ ndị ọ pụrụ ịbụ na usoro iwu amachibidoghị hoo haa. (Lee Matiu 5:27, 28.) N’ihi ya, iwu Kraịst ga-akpali anyị imere ndị ọzọ ihe—igosi mmesapụ aka, ile ọbịa, na ịhụnanya—n’ụzọ iwu ọ bụla e guzobere na-apụghị ime ka anyị mee.—Ọrụ 20:35; 2 Ndị Kọrint 9:7; Ndị Hibru 13:16.
14. Mmetụta dị aṅaa ka ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Kraịst nwere n’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ?
14 Ruo n’ókè ndị òtù ya biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Kraịst, ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ nwere mmetụta na-ekpo ọkụ, nke ịhụnanya, nke a pụrụ ikwu na o nweghị omume emeghị mgbanwe, ikpe ndị ọzọ ikpe, na nke ihu abụọ ndị jupụtara nnọọ n’ụlọ nzukọ ndị nke oge ahụ. Ndị nọ n’ọgbakọ ọhụrụ ndị a aghaghị ịchọpụtaworị n’eziokwu na ha na-ebi ndụ dị ka “iwu nke inwe onwe onye” si dị!
15. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime mgbalị ndị mbụ Setan mere iji merụọ ọgbakọ ndị Kraịst?
15 Otú ọ dị, ọ na-agụsi Setan agụụ ike isite n’ime merụọ ọgbakọ ndị Kraịst, dị nnọọ ka o merụworo mba Israel. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị banyere ndị ikom yiri agụ ndị ‘ga-ekwu ihe ndị na-eduhie mmadụ ụzọ’ ma megbuo ìgwè atụrụ Chineke. (Ọrụ 20:29, 30) Ọ ghaghị ịgbaso ndị okpukpe ndị Juu mgba, bụ́ ndị chọrọ iji ịbụ ohu nye Iwu Mosis, bụ́ nke e debezuworo n’ime Kraịst, gbanwere nnwere onwe ka ukwuu nke iwu Kraịst. (Matiu 5:17; Ọrụ 15:1; Ndị Rom 10:4) Mgbe onye ikpeazụ n’ime ndị ozi ahụ nwụrụ, e nwekwaghị ihe mgbochi megide ụdị ndapụ n’ezi ofufe ahụ. Ya mere ịrụ arụ gbasara.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:6, 7.
Krisendọm Emetọọ Iwu Kraịst
16, 17. (a) Ọdịdị dịgasị aṅaa ka mmerụ weere na Krisendọm? (b) Olee otú iwu Chọọchị Katọlik si kwalite echiche gbagọrọ agbagọ banyere mmekọahụ?
16 Dị ka ọ dị n’okpukpe ndị Juu, ịrụ arụ malitere inwe ihe karịrị otu ọdịdị na Krisendọm. Ya onwe ya kwa dabara n’ozizi ụgha na omume rụrụ arụ. Mgbalị ya nile kwa ichebe ìgwè atụrụ ya pụọ ná mmetụta ndị si n’èzí ọtụtụ mgbe bibiri ihe ọ bụla fọdụrụnụ n’ezi ofufe. Iwu ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị mụbara ọsọ ọsọ.
17 Chọọchị Katọlik abụrụwo ndị kasị n’imepụta ọtụtụ iwu chọọchị. Iwu ndị a gbagọrọ agbagọ karịsịa n’okwu ndị metụtara mmekọahụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ Sexuality and Catholicism si kwuo, chọọchị nakweere nkà ihe ọmụma Gris nke ndị Stoik, bụ́ nke na-enyo ụdị ihe ụtọ nile enyo. Chọọchị malitere ịkụzi na ihe ụtọ nile nke mmekọahụ, gụnyere mmekọrịta alụmdi na nwunye nke dị otú o kwesịrị, bụ mmehie. (Tụlee Ilu 5:18, 19.) E kwuru na mmekọahụ bụ maka ọmụmụ, ọ gwụla. Ya mere iwu chọọchị katọrọ ụdị ọ bụla nke mgbochi afọ ime dị ka mmehie dị oké njọ, mgbe ụfọdụ na-achọ ọtụtụ afọ nke ime ọpịpịa. Ọzọkwa, a machibidoro ndị ụkọchukwu ịlụ nwunye, iwu nke rụpụtaworo mmekọahụ rụrụ arụ dị ukwuu, gụnyere imetọ ụmụaka.—1 Timoti 4:1-3.
18. Gịnị si ná mmụba nke iwu chọọchị pụta?
18 Ka iwu chọọchị na-amụba, a chịkọtara ha n’akwụkwọ n’akwụkwọ. Ndị a malitere ikpuchi na ịkarị Bible. (Tụlee Matiu 15:3, 9.) Dị ka okpukpe ndị Juu, okpukpe Katọlik atụkwasịghị ihe odide na-abụghị nke okpukpe obi ma were ihe dị ukwuu n’ime ya dị ka ihe iyi egwu. N’oge na-adịghị anya echiche a gabigara nnọọ ịdọ aka ná ntị ezi uche dị na ya nke Bible nyere n’okwu ahụ. (Eklisiastis 12:12; Ndị Kọlọsi 2:8) Jerome, bụ́ onye na-ede akwụkwọ chọọchị na narị afọ nke anọ O.A., tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na m nwee akwụkwọ ụwa ọzọ ma ọ bụ gụọ ha, agọnarịwo m gị.” Ka oge na-aga chọọchị malitere inyocha akwụkwọ—ọbụna ndị e dere n’isiokwu ndị na-emetụtaghị okpukpe. N’ihi ya a katọrọ onye nnyocha mbara igwe nke narị afọ nke 17, bụ́ Galileo, maka ide na ụwa na-aga anyanwụ gburugburu. Ọnwụ chọọchị na-esi ịbụ o kwuchaa o bie n’ihe nile—ọbụna n’okwu ndị metụtara nkà nnyocha mbara igwe—ga-emesị mebie okwukwe e nwere na Bible.
19. Olee otú ebe obibi ndị mọnk si kwalite ọchịchị aka ike na-adịghị agbanwe agbanwe?
19 Chọọchị ime iwu gara n’ihu n’ebe obibi ndị mọnk, bụ́ ebe ndị mọnk kewapụrụ onwe ha n’ụwa a iji bie ndụ ịnapụ onwe onye ihe. Ihe ka ukwuu n’ebe obibi ndị mọnk Katọlik rapagidere ‘n’Ụkpụrụ Nduzi nke St. Benedict.’ Abbot (okwu e si n’okwu Aramaic maka “nna” nweta) nwere ikike ọchịchị kasị ukwuu. (Tụlee Matiu 23:9.) Ọ bụrụ na onye mọnk natara onyinye site n’aka ndị mụrụ ya, abbot ga-ekpebi ma ọ bụ onye mọnk ahụ ka ọ̀ bụ onye ọzọ kwesịrị ịnata ya. E wezụga ịkatọ okwu ndị rụrụ arụ otu ụkpụrụ nduzi machibidoro ụmụ obere mkparịta ụka na njakịrị nile iwu na-ekwu, sị: “Ọ dịghị onye na-eso ụzọ ga-ekwu ụdị ihe ndị ahụ.”
20. Gịnị na-egosi na okpukpe Protestant kwalitekwara ọchịchị aka ike Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị?
20 Okpukpe Protestant, nke chọrọ ịgbanwe imebiga ihe ókè Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke okpukpe Katọlik, n’oge na-adịghị anya ghọkwara ndị ọkà n’imepụta iwu aka ike ndị na-enweghị mgbakwasị ụkwụ n’iwu Kraịst. Dị ka ihe atụ, e mesịrị kpọọ onye bụ isi na-eme mgbanwe bụ́ John Calvin “ome iwu nke Chọọchị ahụ e dozigharịrị edozigharị.” O ji ọtụtụ iwu siri ike chịa Geneva bụ́ nke “Ndị Okenye,” ndị Calvin kwuru na “ọrụ” ha bụ “ilekọta ndụ onye ọ bụla,” hụrụ na e debere. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 1:24.) Chọọchị nwere ikike n’ụlọ ndị ọbịa ma nye iwu n’isiokwu nkwurịta okwu ndị a nabatara. E nwere ntaramahụhụ siri ike maka mmejọ ndị dị ka ịgụ egwú na-enweghị isi ma ọ bụ ite egwú.b
Ịmụta Ihe Site ná Njehie nke Krisendọm
21. Mmetụta dị aṅaa ka omume Krisendọm nke ‘ịgabiga ihe e deworo n’akwụkwọ’ nweworo n’ozuzu ya?
21 Iwu na ụkpụrụ ndị a nile hà arụwo ọrụ iji chebe Krisendọm pụọ n’ịrụ arụ? Ha mere nnọọ ihe dị iche! Taa Krisendọm ekewasịala gaa n’ọtụtụ narị ịrọ òtù, malite ná ndị na-agbasobiga iwu ókè ruo ná ndị na-agbachi nnọọ nkịtị n’omume ọjọọ. Ha nile, n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ, ‘agabigala ihe e deworo n’akwụkwọ,’ na-ekwe ka echiche mmadụ chịa ìgwè atụrụ ahụ ma gbochie iwu Chineke.—1 Ndị Kọrint 4:6.
22. N’ihi gịnị ka ndapụ nke Krisendọm na-apụtaghị njedebe nke iwu Kraịst?
22 Otú ọ dị, akụkọ ihe mere eme nke iwu Kraịst abụghị nke ọdachi. Ọ dịghị mgbe Jehova Chineke ga-ekwe ka ụmụ mmadụ nkịtị kpochapụ iwu Chineke. Iwu ndị Kraịst na-arụ nnọọ ọrụ taa n’etiti ezi ndị Kraịst, ndị a nwekwara oké ihe ùgwù nke ibi ndụ kwekọrọ na ya. Ma mgbe e nyochasịrị ihe okpukpe ndị Juu na Krisendọm jiworo iwu Chineke mee, anyị pụrụ nnọọ ịjụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị, ‘Olee otú anyị ga-esi bie ndụ kwekọrọ n’iwu Kraịst ma na-ezere ọnyà nke imebi Okwu Chineke site n’echiche na ụkpụrụ nduzi ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-emebi nnọọ nzube nke iwu Chineke kpọmkwem? Olee echiche ziri ezi nke iwu Kraịst kwesịrị ịkụbanye n’ime anyị taa?’ Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a N’ụzọ dị ukwuu ọ bụ ndị Farisii kpatara ụdị okpukpe ndị Juu e nwere taa, ya mere ọ bụghị ihe ijuanya na okpukpe ndị Juu ka na-achọ ụzọ isi zere ọtụtụ n’ime iwu Ụbọchị Izu Ike ya ndị a gbakwụnyere. Dị ka ihe atụ, onye jere ileta ụlọ ọgwụ okpukpe ọdịnala ndị Juu n’Ụbọchị Izu Ike pụrụ ịchọpụta na ígwè mbugo na-eji aka ya akwụsị n’okpukpu ụlọ elu ọ bụla ka ndị o bu nwee ike izere ịrụ “ọrụ” mmehie nke ịpị bọtịn ígwè mbugo aka. Ụfọdụ ndị dọkịta bụ́ ndị okpukpe ndị Juu na-eji ink ga-ehichapụ n’ụbọchị ole na ole edepụta ọgwụgwọ a ga-enye onye ọrịa. N’ihi gịnị? Mishnah na-agụnye ide ihe dị ka “ọrụ,” ma ọ na-akọwa “ide ihe” dị ka ịhapụ akara ga-adịgide adịgide.
b A gbara Servetus, bụ́ onye gbaghara ụfọdụ n’ime echiche nkà mmụta okpukpe Calvin, ọkụ n’elu osisi dị ka onye jụrụ okwukwe.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị bụ ihe kasị mkpa n’iwu Kraịst?
◻ Olee otú ụzọ izi ihe Jisọs si dị iche na nke ndị Farisii?
◻ Olee otú Setan si jiri mmụọ emeghị mgbanwe, nke ime iwu merụọ Krisendọm?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ mmetụta ndị dị mma nke ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Kraịst?
[Foto dị na peeji nke 16]
Jisọs ji Iwu Mosis mee ihe n’ụzọ ezi uche dị na ya na n’ụzọ ebere