Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 9/1 p. 8-13
  • Iwu Ahụ Tupu Kraịst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iwu Ahụ Tupu Kraịst
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iwu Mosis—Nzube Ya
  • Iwu nke Gosipụtara Ebere na Ọmịiko
  • Iji Iwu ahụ Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
  • Mmetọ nke Okpukpe Ndị Farisii
  • Ịmụta Ihe Site ná Nzuzu nke Ndị Farisii
  • “Iwu Jehova Zuru Okè”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Iwu Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Iwu Ahụ E Nyere N’ọnụ—N’ihi Gịnị Ka E Ji Dee Ya Ede?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ndị Kraịst Oge Mbụ Na Iwu Mozis
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 9/1 p. 8-13

Iwu Ahụ Tupu Kraịst

“Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.”—ABỤ ỌMA 119:97.

1. Gịnị na-achị ngagharị nke ihe ndị dị n’eluigwe?

KEMGBE ọ bụ obere nwa, ma eleghị anya Job elewo anya n’elu n’ijuanya n’ebe kpakpando dị. Ikekwe, ndị mụrụ ya akụziworo ya aha nke oké ụyọkọ kpakpando dị iche iche na ihe ha maara banyere iwu ndị chịkwara ngagharị nke oké ụyọkọ kpakpando ndị ahụ n’eluigwe. E kwuwerị, ndị biri ndụ n’oge ochie jiri ngagharị e ji n’aka nke usoro kpakpando ndị a sara mbara, ndị mara mma amata oge ndị na-agbanwe agbanwe. Ma n’oge nile o lere ha anya n’egwu, Job amaghị ma ọlị oké ike ndị jikọtara ìgwè kpakpando ndị a ọnụ. N’ihi ya, tupu ọ malite ịza ihe ọ bụla Jehova Chineke jụrụ ya, sị: “Ị̀ ghọtawo iwu nke eluigwe?” (Job 38:31-33, The New Jerusalem Bible) Ee, iwu dị iche iche na-achịkwa kpakpando ndị ahụ—iwu ndị doro anya ma dị mgbagwoju anya nke na ndị ọkà mmụta sayensị nke taa adịghị aghọta ha n’ụzọ zuru ezu.

2. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na iwu na-achị ihe nile e kere eke?

2 Jehova bụ Onye Kachasị Ukwu Na-enye Iwu n’eluigwe na ala. Ọrụ ya nile bụ nke iwu na-achịkwa. Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke,” ji ikwesị ntụkwasị obi na-erubere iwu Nna ya isi tupu eluigwe na ala a na-ahụ anya amalite ịdị! (Ndị Kọlọsi 1:15) Ndị mmụọ ozi kwa bụ ndị iwu na-eduzi. (Abụ Ọma 103:20) Ọbụna anụmanụ bụ ndị iwu na-achị ka ha na-erube isi n’iwu amamihe ebumpụta ụwa ndị Onye Okike ha kenyere n’ime ha.—Ilu 30:24-28; Jeremaịa 8:7.

3. (a) N’ihi gịnị ka iwu ji dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa? (b) Gịnị ka Jehova ji chịkwaa mba Israel?

3 Gịnị banyere ihe a kpọrọ mmadụ? Ọ bụ ezie na e ji onyinye ndị dị ka ọgụgụ isi, ụkpụrụ omume, na ọnọdụ ime mmụọ gọzie anyị, ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke iwu Chineke ka dịkwa anyị mkpa iji duzie anyị n’iji ikike ndị a mee ihe. Nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, zuru okè, nke na a chọrọ nanị iwu ole na ole iji duzie ha. Ịhụnanya maka Nna ha nke eluigwe kwesịrị inyeworị ha ihe zuru ezu mere ha ga-eji jiri obi ụtọ rube isi. Ma ha nupụrụ isi. (Jenesis 1:26-28; 2:15-17; 3:6-19) N’ihi ya, ụmụ ha bụ ihe e kere eke na-eme mmehie bụ́ ndị chọkwuru ọtụtụ iwu iji duzie ha. Ka oge na-aga, Jehova ji ịhụnanya gboo mkpa a. O nyere Noa iwu ndị a kapịrị ọnụ bụ́ ndị ọ ga-enyefe ezinụlọ ya. (Jenesis 9:1-7) Ọtụtụ narị afọ n’ihu, site n’ọnụ Mosis, Chineke nyere mba ọhụrụ bụ́ Israel usoro Iwu sara mbara, e dere ede. Nke a bụ mgbe mbụ Jehova ji iwu sitere n’eluigwe chịa otu mba dum. Inyocha Iwu ahụ ga-enyere anyị aka ịghọta ọrụ dị mkpa nke iwu Chineke na-arụ ná ndụ ndị Kraịst taa.

Iwu Mosis—Nzube Ya

4. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji bụrụ ihe ịma aka nye ụmụ Abraham a họọrọ iwepụta Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa?

4 Pọl onyeozi, bụ́ onye mmụta dị uchu nke Iwu ahụ, jụrụ, sị: “Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka e ji nye Iwu ahụ?” (Ndị Galetia 3:19, NW) Iji zaa ya, ọ dị anyị mkpa icheta na Jehova kwere enyi ya bụ́ Abraham nkwa na eriri ezinụlọ ya ga-ewepụta Mkpụrụ bụ́ onye ga-ewetara mba nile oké ngọzi. (Jenesis 22:18) Ma ihe ịma aka dị n’ebe a: ụmụ Abraham a họọrọ, bụ́ ndị Israel, abụghị ndị hụrụ Jehova n’anya ha nile. Ka oge na-aga, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ghọrọ ndị na-ekwesi olu ike, ndị nnupụisi—ụfọdụ fọrọ nke nta ka ha bụrụ ndị a na-apụghị ịchịkwa achịkwa! (Ọpụpụ 32:9; Deuterọnọmi 9:7) Nye ndị dị otú ahụ, ịnọ n’etiti ndị Chineke bụ nanị n’ihi ebe a mụnyere ha, ọ bụghị n’ihi na ha chọrọ.

5. (a) Gịnị ka Jehova kụziiri ụmụ Israel site n’Iwu Mosis? (b) Olee otú e si hazie Iwu ahụ iji metụta omume nke ndị rapaara na ya?

5 Olee otú ụdị ndị ahụ pụrụ isi wepụta ma rite uru site ná Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa? Kama ịchịkwa ha dị ka ígwè ọrụ robot, Jehova kụziiri ha ihe site n’iwu. (Abụ Ọma 119:33-35; Aịsaịa 48:17) N’ezie, okwu Hibru maka “iwu,” toh·rahʹ, pụtara “ntụziaka.” Gịnị ka ọ kụziri? N’ụzọ bụ́ isi ọ kụziiri ndị Israel banyere mkpa Mesaịa dị ha, bụ́ onye ga-agbapụta ha n’ọnọdụ mmehie ha. (Ndị Galetia 3:24) Iwu ahụ kụzikwara egwu na nrubeisi Chineke. N’ikwekọ ná nkwa ahụ e kwere Abraham, ndị Israel gaje ịbụrụ Jehova ndị àmà nye mba ndị ọzọ nile. Ya mere Iwu ahụ aghaghị ịkụziri ha ụkpụrụ àgwà dị elu, nke magburu onwe ya, nke ga na-ekwu ihe ọma banyere Jehova; ọ ga-enyere Israel aka ịnọpụ iche n’omume rụrụ arụ nke mba ndị gbara ha gburugburu.—Levitikọs 18:24, 25; Aịsaịa 43:10-12.

6. (a) Ihe dị ka ụkpụrụ ole dị n’Iwu Mosis, n’ihi gịnịkwa ka a na-agaghị eji were nke ahụ dị ka nke gafere ókè? (Lee nkọwa ala ala peji.) (b) Nghọta dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site n’ịmụ Iwu Mosis?

6 Ka a sịkwanụ ihe mere Iwu Mosis ahụ ji nwee ọtụtụ ụkpụrụ—ihe karịrị 600 n’ime ha.a Usoro iwu a e dere ede chịkwara ihe ndị metụtara ofufe, ọchịchị, ụkpụrụ omume, ikpe ziri ezi, ọbụna ihe oriri na ịdị ọcha. Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ pụtara na Iwu ahụ bụ nanị ìgwè iwu nduzi ndị siri ike ma dị mkpirikpi? Ọ dịghị ma ọlị! Ịmụ usoro Iwu a na-enye nghọta dị ukwuu n’àgwà ịhụnanya nke Jehova. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Iwu nke Gosipụtara Ebere na Ọmịiko

7, 8. (a) Olee otú Iwu ahụ si mesie ebere na ọmịiko ike? (b) Olee otú Jehova si jiri Iwu ahụ mee ihe n’ụzọ ebere n’ọnọdụ nke Devid?

7 Iwu ahụ mesiri ebere na ọmịiko ike, karịsịa maka ndị e wedara n’ala ma ọ bụ ndị na-enweghị onye inyeaka. A kpọrọ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ na ụmụ mgbei aha kpọmkwem maka nchebe. (Ọpụpụ 22:22-24) E chebere anụmanụ ndị e ji arụ ọrụ pụọ ná mmeso obi ọjọọ. A kwanyeere ikike bụ isi ruuru mmadụ n’ebe ihe onwunwe ya dị ùgwù. (Deuterọnọmi 24:10; 25:4) Ọ bụ ezie na Iwu ahụ kwuru ka e nye ntaramahụhụ ọnwụ maka igbu ọchụ, o mere ka e nwee ebere n’ọnọdụ nke igbu mmadụ n’ọghọm. (Ọnụ Ọgụgụ 35:11) Dị ka ihe àmà gosiri, ndị ikpe bụ ndị Israel nwere ohere nke ime mkpebi na ntaramahụhụ e nyere maka mmehie ụfọdụ, na-adabere n’àgwà nke onye ahụ mere ihe ọjọọ.—Tụlee Ọpụpụ 22:7 na Levitikọs 6:1-7.

8 Jehova setịpụụrụ ndị ikpe ihe nlereanya site n’iji Iwu ahụ mee ihe n’ụzọ siri ike n’ebe ọ dị mkpa ma n’ụzọ ebere n’ebe ọ bụla o kwere mee. E meere Eze Devid, bụ́ onye kwara iko ma gbuo ọchụ ebere. Ọ bụghị na ọ lafeere n’enwetaghị ntaramahụhụ, n’ihi na Jehova echebeghị ya pụọ n’oké ihe ọjọọ ndị si ná mmehie ya pụta. Ma, n’ihi ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ na n’ihi na Devid bụ nwoke na-eme ebere ma nwee àgwà nchegharị sitere n’ala ala obi, e gbughị ya.—1 Samuel 24:4-7; 2 Samuel 7:16; Abụ Ọma 51:1-4; Jemes 2:13.

9. Ọrụ dị aṅaa ka ịhụnanya rụrụ n’Iwu Mosis ahụ?

9 Tụkwasị, Iwu Mosis mesiri ịhụnanya ike. Cheedị banyere otu n’ime mba nke taa inwe usoro iwu chọrọ n’ezie ka e gosi ịhụnanya! Ya mere ọ bụghị nanị na Iwu Mosis machibidoro igbu ọchụ; o nyere iwu, sị: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” (Levitikọs 19:18) Ọ bụghị nanị na ọ machiri imeso onye ọbịa n’ụzọ na-ezighị ezi; o nyere iwu, sị: “Ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu bụrịị n’ala Ijipt.” (Levitikọs 19:34) Ọ bụghị nanị na ọ machibidoro ịkwa iko iwu; o nyere di iwu ime ka nwunye ya ṅụrịa ọṅụ! (Deuterọnọmi 24:5) N’akwụkwọ Deuterọnọmi nanị, e ji okwu Hibru ndị na-egosi àgwà ịhụnanya mee ihe ihe ruru ugboro 20. Jehova mere ka ndị Israel jide ịhụnanya ya n’aka—n’oge gara aga, ugbu a, na n’ọdịnihu. (Deuterọnọmi 4:37; 7:12-14) N’ezie, iwu kachasị n’ime Iwu Mosis bụ: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” (Deuterọnọmi 6:5) Jisọs kwuru na Iwu ahụ dum kokwasịrị n’iwu a, tinyere iwu ịhụ agbata obi mmadụ n’anya. (Levitikọs 19:18; Matiu 22:37-40) Ka a sịkwa ihe mere onye ọbụ abụ ahụ ji dee, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.”—Abụ Ọma 119:97.

Iji Iwu ahụ Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi

10. Olee otú ndị Juu, n’akụkụ ka ukwuu, si were Iwu Mosis?

10 Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe ọdachi na ndị Israel enweghị ekele ma ọlị maka Iwu Mosis! Ndị ahụ nupụrụ isi n’Iwu ahụ, leghara ya anya, ma ọ bụ chefuo ya. Ha ji omume okpukpe ndị na-asọ oyi nke mba ndị ọzọ metọọ ofufe dị ọcha. (2 Ndị Eze 17:16, 17; Abụ Ọma 106:13, 35-38) Ha mebikwara Iwu ahụ n’ụzọ ndị ọzọkwa.

11, 12. (a) Olee otú ìgwè dị iche iche nke ndị ndú okpukpe si mebie ihe mgbe ụbọchị Ezra gasịrị? (Lee igbe.) (b) N’ihi gịnị ka ndị rabaị oge ochie ji chee na ọ dị mkpa ‘ịgba Iwu ahụ ogige gburugburu’?

11 Ụfọdụ n’ime mmebi kasị njọ e mebiri Iwu ahụ bụ ndị na-azọrọ na ha na-akụzi ma na-echekwa ya mere ya. Nke a mere mgbe ụbọchị nke odeakwụkwọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ezra nke narị afọ nke ise T.O.A. gasịrị. Ezra lụsiri ọgụ ike megide mmetụta ndị na-emetọ emetọ nke mba ndị ọzọ ma mesie ọgụgụ na nkụzi nke Iwu ahụ ike. (Ezra 7:10; Nehemaịa 8:5-8) Ụfọdụ ndị nkụzi nke Iwu ahụ zọọrọ na ha na-agbaso nzọụkwụ Ezra wee guzobe ihe e mesịrị kpọọ “Ụlọ Nzukọ Ukwu.” Ụfọdụ n’ime ihe o kwuru bụ okwu ntụzi ahụ bụ́: “Gbaa Iwu ahụ ogige gburugburu.” Ndị nkụzi a chere na Iwu ahụ yiri ubi dị oké ọnụ ahịa. Ka onye ọ bụla wee ghara ịwabanye n’ubi a site n’imebi iwu ya, ha mepụtara iwu ndị ọzọ, “Iwu A Na-edeghị Ede,” iji gbochie ndị ahụ pụọ n’ịbịakete ụdị mmejọ ahụ nso.

12 Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na ndị ndú ndị Juu ziri ezi n’iche otú a. Mgbe ụbọchị Ezra gasịrị, ike mba ndị ọzọ chịrị ndị Juu, karịsịa Gris. Iji lụsoo mmetụta nke nkà ihe ọmụma na ọdịbendị ndị Gris ọgụ, ìgwè dị iche iche nke ndị ndú okpukpe bilitere n’etiti ndị Juu. (Lee igbe, peji nke 10.) Ka oge na-aga ụfọdụ n’ime ìgwè ndị a ghọrọ ndị ha na usoro ndị nchụàjà si n’ebo Livaị malitere ịha nhata na ọbụna karịa ha dị ka ndị nkụzi nke Iwu ahụ. (Tụlee Malakaị 2:7.) Ka ọ na-erule 200 T.O.A., iwu ahụ a na-edeghị ede, nọ na-egbebata ná ndụ ndị Juu. Na mbụ a gaghị ede iwu ndị a ede, ka a ghara iwere ya na ha na Iwu ahụ e dere ede hà nhata. Ma e ji nwayọọ nwayọọ bute echiche ụmụ mmadụ ụzọ karịa nke Chineke, nke mere na “ogige” a mesịrị n’ezie mebie “ubi” ahụ e zubere ka o chebe.

Mmetọ nke Okpukpe Ndị Farisii

13. Olee otú ndị ndú okpukpe ụfọdụ nke ndị Juu si mee ka ha ime ọtụtụ iwu zie ezie?

13 Ndị rabaị chere na ebe Torah, ma ọ bụ Iwu Mosis, zuru okè, ọ ghaghị inwe azịza nye ajụjụ ọ bụla nke pụrụ ibilite. Echiche a adịghị enye nsọpụrụ n’ezie. N’ezie, o nyere ndị rabaị ikike iji echiche dị nkọ́ nke ụmụ mmadụ na-eme ihe, na-eme ka o yie ka Okwu Chineke ọ bụ ebe mgbakwasị ụkwụ maka iwu n’ụdị okwu nile—ụfọdụ bụ ndị dịịrị onwe onye, ndị ọzọ ndị na-erijughị afọ.

14. (a) Olee otú ndị ndú okpukpe nke ndị Juu si gbatịa ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ nke nnọpụiche site ná mba ndị ọzọ ruo n’ókè gabigara ókè nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị? (b) Gịnị na-egosi na iwu ndị rabaị dara ada n’ichebe ndị Juu pụọ ná mmetụta ndị ọgọ mmụọ?

14 Ugboro ugboro ndị ndú okpukpe ahụ weere ụkpụrụ nduzi nke Akwụkwọ Nsọ ma gbatịbiga ha ókè. Dị ka ihe atụ, Iwu Mosis kwadoro nnọpụiche site ná mba ndị ọzọ, ma ndị rabaị kwusara otu ụdị nleda anya ezi uche na-adịghị na ya maka ihe ọ bụla na-abụghị nke ndị Juu. Ha kụziri na onye Juu agaghị ahapụ ehi ya n’ụlọ ndị ọbịa nke onye Jentaịl, n’ihi na ndị Jentaịl bụ ndị “a na-enyo enyo ịdị na-edina anụmanụ.” E nyeghị nwanyị onye Juu ohere inyere nwanyị onye Jentaịl aka mgbe ime na-eme ya n’ihi na ọ ga-esi otú a “na-enye aka ịmụ nwa maka ikpere arụsị.” Ebe ọ bụ na ha na-enyo ụlọ mmega ahụ nke ndị Gris enyo n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ndị rabaị machibidoro ụdị egwuregwu mmega ahụ nile iwu. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ihe a nile mere ihe dị nta iji chebe ndị Juu pụọ ná nkweta ndị Jentaịl. N’ezie, ndị Farisii n’onwe ha malitere izi ozizi ọgọ mmụọ ndị Gris nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi!—Ezikiel 18:4.

15. Olee otú ndị ndú okpukpe nke ndị Juu si hịgharịa iwu banyere ime ka a dị ọcha na mmekọahụ n’etiti ndị ikwu?

15 Ndị Farisii hịgharịkwara iwu nile nke ime ka a dị ọcha. E kwuru na ndị Farisii ga-eme ka anyanwụ n’onwe ya dị ọcha ma ọ bụrụ na e nye ha ohere. Iwu ha kwuru na igbu oge ‘n’ije nyụọ nsị’ ga-emerụ mmadụ! Ịkwọ aka ghọrọ ememe okpukpe dị mgbagwoju anya, na-enwe iwu banyere aka nke a ga-ebu ụzọ kwọọ na ụzọ a ga-esi kwọọ ya. E weere ụmụ nwanyị karịsịa dị ka ndị na-adịghị ọcha. Dabere n’iwu Akwụkwọ Nsọ bụ ka a ghara ‘ịbịaru’ onye ahụ ọ bụla nso (nke bụ n’ezie iwu megide mmekọahụ n’etiti ndị ikwu), ndị rabaị nyere iwu na di agaghị eso nwunye ya n’azụ; ma ọ bụkwanụ soro ya kpaa nkata n’ọmà ahịa.—Levitikọs 18:6.

16, 17. Olee otú iwu ahụ a na-edeghị ede si mụbaa iwu idebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?

16 Akaje ime mmụọ nke iwu ahụ a na-edeghị ede mere iwu Ụbọchị Izu Ike ahụ bụ nke a ma ama karịsịa. Chineke nyere Israel iwu dị mfe: Arụla ọrụ ọ bụla n’ụbọchị nke asaa nke izu. (Ọpụpụ 20:8-11) Otú ọ dị, iwu ahụ a na-edeghị ede gara n’ihu ịkọwa ụdị ọrụ 39 dị iche iche a machibidoro iwu, gụnyere ikechi ma ọ bụ ịtọpe akpụ a mara ama, ịdụ ahịrị eriri abụọ, ide mkpụrụ akwụkwọ Hibru abụọ, na ihe ndị ọzọ. Nke ọ bụlazi n’ime ụdị ọrụ ndị a chọrọ iwu ndị ọzọkwa na-enweghị ọgwụgwụ. Olee akpụ a mara ama ndị a machibidoro iwu na ndị e kwere ka a tọpee? Iwu ahụ a na-edeghị ede ji iwu nduzi ndị na-enweghị ezi ihe mgbakwasị ụkwụ zaa ha. A malitere ile ọgwụgwọ ọrịa anya dị ka ọrụ a machibidoro iwu. Dị ka ihe atụ, a machibidoro ịgbazi ọkpụkpụ gbajiri agbaji n’Ụbọchi Izu Ike. Onye ezé na-egbu mgbu pụrụ iji mmanya vine gbara ụka mee ka ihe oriri ya tọọ ụtọ, ma ọ gaghị amịfe mmanya vine ahụ gbara ụka n’oghere ezé ya. Nke ahụ pụrụ ịgwọ ezé ya!

17 N’ịbụ nke e si otú a lie n’ime ọtụtụ narị iwu ndị mmadụ mere, iwu Ụbọchị Izu Ike ahụ tụfuru ihe ọ pụtara n’ụzọ ime mmụọ nye ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu. Mgbe Jisọs Kraịst, bụ́ “Onyenwe ụbọchị izu ike,” rụrụ ọrụ ebube ndị na-atụ n’anya, ndị na-enye obi ụtọ n’Ụbọchi Izu Ike, o metụghị ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’obi. Ihe na-echegbu ha agwụla na o yiri ka ọ na-eleghara iwu nduzi ha anya.—Matiu 12:8, 10-14.

Ịmụta Ihe Site ná Nzuzu nke Ndị Farisii

18. Gịnị si na ịgbakwụnye iwu ndị a na-edeghị ede na ọdịnala n’Iwu Mosis ahụ pụta? Mee ihe atụ.

18 Ná mkpirikpi, anyị pụrụ ikwu na iwu na ọdịnala ndị a a tụkwasịrị ghọrọ ndị a gbakwụnyere n’Iwu Mosis dị nnọọ ka ejula barnacle si anyakụdo n’ahụ ụgbọ mmiri. Onye nwe ụgbọ mmiri na-eme ihe dị ukwuu iji kpụchasịa ihe okike ndị a na-enye nsogbu pụọ n’ahụ ụgbọ mmiri ya n’ihi na ha na-adọghachi ụgbọ ahụ azụ ma na-ebibi ágbà na-egbochi ya ịta nchara. N’otu aka ahụ, iwu na ọdịnala ndị ahụ a na-edeghị ede mere ka Iwu ahụ dị oké arọ ma kpughee ya nye iji ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nke na-akpata mmebi. Otú ọ dị, kama ịkpụchapụ iwu ntụkwasị ndị dị otú ahụ, ndị rabaị ahụ nọgidere na-atụkwasịkwu ndị ọzọ. Ka ọ na-erule mgbe Mesaịa ahụ bịara iji debezuo Iwu ahụ, “ejula barnacle” nyakụdojuru n’ahụ “ụgbọ mmiri” ahụ nke na o sere nanị ese n’elu mmiri! (Tụlee Ilu 16:25.) Kama ichebe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ndị ndú okpukpe a mere omume nzuzu nke imebi ya. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka “ogige” ha nke iwu dị iche iche ji daa?

19. (a) N’ihi gịnị ka ‘ogige a gbara Iwu ahụ gburugburu’ ji daa? (b) Gịnị na-egosi na ndị ndú okpukpe nke ndị Juu enweghị ezi okwukwe?

19 Ndị ndú nke okpukpe ndị Juu aghọtaghị na ọgụ ahụ a na-alụ megide mmetọ bụ n’ime obi ọ bụghị n’ime peji nile nke akwụkwọ iwu. (Jeremaịa 4:14) Isi ihe dị mkpa maka mmeri bụ ịhụnanya—ịhụnanya maka Jehova, iwu ya, na ụkpụrụ ezi omume ya nile. Ịhụnanya dị otú ahụ na-arụpụta ịkpọasị ya na ya hà nhata maka ihe ndị Jehova kpọrọ asị. (Abụ Ọma 97:10; 119:104) Ndị e si otú a jiri ịhụnanya mejupụta obi ha na-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye iwu Jehova nile n’ime ụwa a rụrụ arụ. Ndị ndú okpukpe nke ndị Juu nwere oké ihe ùgwù nke izi ndị ahụ ihe iji kwalite ma kpasuo ịhụnanya dị otú ahụ. N’ihi gịnị ka ha na-ejighị mee otú ahụ? Dị ka ihe àmà gosiri ha enweghị okwukwe. (Matiu 23:23) A sị na ha nwere okwukwe n’ike nke mmụọ Jehova nwere ịrụ ọrụ n’ime obi ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi, ha agaghị enweworị mkpa nke ịchịkwa ndụ ndị ọzọ n’ụzọ na-adịghị agbanwe agbanwe. (Aịsaịa 59:1; Ezikiel 34:4) Ebe ha na-enweghị okwukwe, ha enyefeghị okwukwe; ha jiri iwu ndị mmadụ mere bogbuo ndị ahụ.—Matiu 15:3, 9; 23:4.

20, 21. (a) N’ozuzu ya mmetụta dị aṅaa ka echiche chere ihu n’ọdịnala nwere n’okpukpe ndị Juu? (b) Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe mere okpukpe ndị Juu?

20 Ndị ndú ndị Juu ahụ akwaliteghị ịhụnanya. Ọdịnala ha rụpụtara okpukpe nke na-elekwasịkarị anya n’ihe ndị pụtara ìhè, ná nrubeisi na-esighị n’obi iji mee ngosipụta—ọnọdụ kwesịrị ekwesị maka ihu abụọ. (Matiu 23:25-28) Iwu nduzi ha rụpụtara ọtụtụ ihe mere a ga-eji na-ekpe ndị ọzọ ikpe. N’ihi ya ndị Farisii ahụ dị mpako, na-achị ọchịchị aka ike, chere na ha ziri ezi n’ịkatọ Jisọs Kraịst n’onwe ya. Ha chefuru nzube bụ́ isi nke Iwu ahụ ma jụ otu ezi Mesaịa ahụ. N’ihi ya, ọ ghaghị ịgwa mba ndị Juu, sị: “Lee, a na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.”—Matiu 23:38; Ndị Galetia 3:23, 24.

21 Gịnị ka ọ na-akụziri anyị? N’ụzọ doro anya, echiche uche na-adịghị agbanwe agbanwe, nke e chere ihu n’ọdịnala adịghị akwalite ofufe dị ọcha nke Jehova! Ma nke a ọ̀ pụtara na ndị na-efe Jehova ofufe taa agaghị enwe iwu ọ bụla ma ọlị nanị ma a kpọrọ ndị a aha kpọmkwem n’ime Akwụkwọ Nsọ? Ee e. Maka azịza zuru ezu, ka anyị tụlezie otú Jisọs Kraịst si jiri iwu ọhụrụ na nke ka mma dochie anya Iwu Mosis ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a N’ezie, nke ahụ ka bụ ọnụ ọgụgụ dị nnọọ nta ma e jiri ya tụnyere usoro iwu nke mba ndị nke oge a. Dị ka ihe atụ, ka ọ na-erule mmalite nke afọ ndị 1990, iwu mba United States juru ihe karịrị 125,000 peji, a na-atụkwasịkwa ọtụtụ puku iwu ndị ọhụrụ kwa afọ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Olee otú iwu Chineke si achị ihe nile e kere eke?

◻ Gịnị bụ nzube bụ isi nke Iwu Mosis?

◻ Gịnị na-egosi na Iwu Mosis mesiri ebere na ọmịiko ike?

◻ N’ihi gịnị ka ndị ndú okpukpe nke ndị Juu ji gbakwụnye ọtụtụ iwu n’Iwu Mosis, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?

[Igbe dị na peeji nke 10]

Ndị Ndú Okpukpe Ndị Juu

Ndị Odeakwụkwọ: Ha weere onwe ha dị ka ndị nọchiri anya Ezra na ndị nkọwa nke Iwu ahụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ A History of the Jews si kwuo, “ndị odeakwụkwọ abụchaghị ndị pụrụ iche, mgbalị ndị ha mekwara inweta nkọwa ndị zoro ezo site n’iwu ahụ na-ajọwanyekarị njọ ịghọ ụkpụrụ ndị na-enweghị isi na ihe mgbochi echiche na-adịghị na ha. Ndị a ghọrọ omenala, nke ghọrọ onye ọchịchị aka ike nke ike na-adịghị agwụ agwụ n’oge na-adịghị anya.”

Ndị Hasid: Aha ahụ pụtara “ndị na-eme nsọ nsọ” ma ọ bụ “ndị senti.” N’ịbụ nke a kpọrọ aha dị ka otu òtù nke mbụ ya n’ihe dị ka na 200 T.O.A., ha dị ike n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị nchebe na-anụbiga ọkụ n’obi ókè nke ịdị ọcha nke Iwu ahụ megide ọchịchị obi ọjọọ nke mmetụta ndị Gris. Ndị Hasid kewara gaa n’ìgwè atọ: ndị Farisii, ndị Sadusii, na ndị Essene.

Ndị Farisii: Ndị ọkà mmụta ụfọdụ kwenyere na e si n’okwu ndị bụ maka “Ndị E Kewapụrụ Iche,” ma ọ bụ “Ndị Nkewapụ,” nweta aha ahụ. Ha na-anụbiga ọkụ n’obi ókè n’ezie ná mgbalị ha siri ike ịnọpụ iche n’ebe ndị Jentaịl nọ, ma ha hụkwara òtù ha dị ka nke dị iche pụọ na​—⁠nke karịkwara⁠—​ndị Juu nkịtị, bụ́ ndị na-amaghị mgbagwoju anya nile nke iwu ahụ a na-edeghị ede. Otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru banyere ndị Farisii, sị: “N’ozuzu ha, ha mesoro ndị mmadụ dị ka ụmụaka, na-eme ka ihe ndị kasị nta n’usoro ememe dị iche iche bụrụ iwu ma na-akọwa ha.” Onye ọkà mmụta ọzọ kwuru, sị: “Okpukpe ndị Farisii rụpụtara ọtụtụ ụkpụrụ iwu ndị na-emetụta ọnọdụ nile, na-akpata ihe a na-apụghị izere ezere bụ na ha mere ka ihe ndị na-abụghị oké ihe buo ibu, n’imekwa otú ahụ were ihe ndị buru ibu dị ka ihe na-abụghị oké ihe (Mt. 23:23).”

Ndị Sadusii: Ìgwè e jikọtara ha na ọchịchị ndị oké ozu na òtù ndị nchụàjà n’ụzọ chiri anya. Ha megidere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’ụzọ siri ike, na-ekwu na iwu ahụ a na-edeghị ede enweghị nkwado nke Iwu ahụ e dere ede. Na ha dara n’ọgụ a bụ nke Mishnah n’onwe ya gosiri: “E ji [ndebe nke] okwu Ndị Odeakwụkwọ kpọrọ ihe karịa [ndebe nke] okwu nke Iwu ahụ [e dere ede].” Talmud, bụ́ nke gụnyere nkọwa dị ukwuu nke iwu ahụ a na-edeghị ede, mesịrị ruo n’ókè nke ikwu, sị: “Okwu ndị odeakwụkwọ dị . . . oké ọnụ ahịa karịa okwu nke Torah.”

Ndị Essene: Ìgwè ndị na-anapụ onwe ha ihe ụtọ bụ́ ndị kewapụrụ onwe ha iche n’ógbè ndị dịpụrụ iche. Dị ka akwụkwọ The Interpreter’s Dictionary of the Bible si kwuo, ndị Essene ọbụna na-eleda ndị ọzọ anya karịa ndị Farisii, ‘mgbe ụfọdụkwa ha pụrụ inwe omume ndị Farisii karịa ndị Farisii n’onwe ha.’

[Foto dị na peeji nke 8]

Ikekwe ndị mụrụ Job kụziiri ya banyere iwu ndị na-achị ụyọkọ kpakpando dị iche iche

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya