Iwu Ahụ E Nyere N’ọnụ—N’ihi Gịnị Ka E Ji Dee Ya Ede?
N’IHI gịnị ka ọtụtụ ndị Juu nke narị afọ mbụ na-ejighị nabata Jisọs dị ka Mesaịa? Otu onye ji anya ya hụ ihe merenụ na-akọ, sị: “Mgbe [Jisọs] batara n’ụlọukwu Chineke, ndị isi nchụàjà na ndị okenye nke ndị Juu wee bịakwute Ya mgbe Ọ na-ezi ihe, sị, Ọ̀ bụ n’aha ike gịnị ka Ị na-eme ihe ndị a? ònye nyekwara Gị ike a?” (Matiu 21:23) N’anya ha, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile enyewo mba ndị Juu Torah (Iwu), Torah nyekwara ndị ikom ụfọdụ ikike si n’aka Chineke. Jisọs ò nwere ikike dị otú ahụ?
Jisọs gosipụtara nkwanye ùgwù kasịnụ n’ebe Torah dị nakwa n’ebe ndị ahụ o nyere ezigbo ikike nọ. (Matiu 5:17-20; Luk 5:14; 17:14) Ma mgbe mgbe ọ katọrọ ndị ahụ na-emebi iwu Chineke. (Matiu 15:3-9; 23:2-28) Ndị ikom dị otú ahụ gbasoro ọdịnala ndị a bịara mara dị ka iwu e nyere n’ọnụ. Jisọs jụrụ ikike ya. N’aka nke ha, ọtụtụ jụrụ ya dị ka Mesaịa. Ha kweere na ọ bụ nanị onye na-akwado ọdịnala nke ndị nọ n’ọchịchị n’etiti ha pụrụ inwe nkwado Chineke.
Olee ebe iwu a e nyere n’ọnụ malitere? Olee otú ndị Juu si lewezie ya anya dị ka nke ya na Iwu e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ nwere ikike hà nhata? Ya bụrụkwa na e bu n’uche ka ọ bụrụ ọdịnala a na-edeghị ede, n’ihi gịnị ka e ji mesịa detuo ya edetu?
Olee Ebe Ọdịnala Ndị ahụ Malitere?
Ụmụ Israel sooro Jehova Chineke banye ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ n’Ugwu Saịnaị na 1513 T.O.A. Site n’aka Mosis, ha natara ntụzi nke ọgbụgba ndụ ahụ. (Ọpụpụ 24:3) Ịgbaso iwu nchịkwa ndị a ga-enye ha ohere ‘ịdị nsọ dị ka Jehova Chineke ha dị nsọ.’ (Levitikọs 11:44) N’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ofufe Jehova gụnyere àjà ndị òtù ndị nchụàjà a họpụtara ahọpụta chụrụ. A ga-enwe ebe bụ́ isi nke ofufe—nke mesịrị bụrụ ụlọ nsọ dị na Jerusalem.—Deuterọnọmi 12:5-7; 2 Ihe E Mere 6:4-6.
Iwu Mosis nyere ọdịdị zuru ezu maka ofufe Israel ga-efe Jehova dị ka otu mba. Otú ọ dị, a kapịghị okwu ụfọdụ ọnụ n’ụzọ zuru ezu. Dị ka ihe atụ, Iwu ahụ machibidoro ịrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, ma ọ kapịghị ọnụ ọdịiche dị n’etiti ọrụ na ihe omume ndị ọzọ.—Ọpụpụ 20:10.
Ọ bụrụ na Jehova hụrụ ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ime otú ahụ, ọ pụrụ inyewo iwu nchịkwa ndị zuru ezu bụ́ ndị na-akọwazu ajụjụ ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche. Ma o kewo ụmụ mmadụ na-enye ha akọ na uche, o kwekwara ka ha nwere onwe ha ichepụta otú ha ga-esi ejere ya ozi n’emegideghị ntụzi ya. Iwu ahụ mere ndokwa ka ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị ikpe, na-ahụ maka okwu ikpe. (Deuterọnọmi 17:8-11) Ka okwu ikpe mụbara, e setịpụrụ ụkpụrụ ụfọdụ, obi abụọ adịghịkwa ya na ụfọdụ n’ime ndị a sitere n’ọgbọ ruo n’ọgbọ. E bufekwara usoro ndị e ji elekọta ọrụ ndị nchụàjà n’ụlọ nsọ Jehova site ná nna ruo na nwa. Ka ahụmahụ nke mba ahụ n’ozuzu ya mụbara, otú ahụkwa ka ọdịnala ya mụbara.
Otú ọ dị, Iwu ahụ e dere ede nke e nyere Mosis nọgidere bụrụ akụkụ bụ́ isi nke ofufe Israel. Ọpụpụ 24:3, 4 na-ekwu, sị: “Mosis wee bịa, kọọrọ ndị Israel okwu Jehova nile, na ikpe Ya nile; ndị Israel nile wee zaa n’otu olu, sị, Okwu nile Jehova kwuworo, anyị ga-eme ha. Mosis wee dee okwu Jehova nile n’akwụkwọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ bụ n’ikwekọ n’ihe ndị a e nyere n’iwu bụ́ ndị e dere ede ka Chineke ji soro ụmụ Israel gbaa ndụ. (Ọpụpụ 34:27) N’ezie, ọ dịghị ebe ọ bụla Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ịdị adị nke iwu e nyere n’ọnụ.
‘Ònye Nyere Gị Ike A?’
N’ụzọ doro anya, Iwu Mosis hapụrụ ikike na ntụziaka okpukpe bụ́ isi n’aka ndị nchụàjà, bụ́ ụmụ Erọn. (Levitikọs 10:8-11; Deuterọnọmi 24:8; 2 Ihe E Mere 26:16-20; Malakaị 2:7) Otú ọ dị, n’ime ọtụtụ narị afọ, ụfọdụ ndị nchụàjà ghọrọ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi na ndị rụrụ arụ. (1 Samuel 2:12-17, 22-29; Jeremaịa 5:31; Malakaị 2:8, 9) N’oge ndị Gris na-achị, ọtụtụ ndị nchụàjà mebiri nguzo ha n’okwu ndị metụtara okpukpe. Na narị afọ nke abụọ T.O.A., ndị Farisii—òtù ọhụrụ n’okpukpe ndị Juu nke na-atụkwasịghị òtù ndị nchụàjà obi—malitere iguzobe ọdịnala bụ́ nke mmadụ nkịtị pụrụ iji na-ele onwe ya anya dị ka onye dị nsọ dị ka onye nchụàjà. Ọdịnala ndị a masịrị ọtụtụ ndị, ma ha bụ ntụkwasị na-adịghị mma n’ebe Iwu ahụ dị.—Deuterọnọmi 4:2; 12:32 (13:1 ná nsụgharị ndị Juu).
Ndị Farisii ghọrọ ndị ọkà ọhụrụ n’Iwu ahụ, na-arụ ọrụ ha chere na ndị nchụàjà adịghị arụ. Ebe ọ bụ na Iwu Mosis enyeghị ohere maka ikike ha, ha wepụtara usoro ndị ọhụrụ nke ịkọwa Akwụkwọ Nsọ site ná nhota ndị dị mgbagwoju anya na site n’usoro ndị ọzọ ndị yiri ka ha na-akwado echiche ha.a Dị ka ndị bụ́ isi na-elekọta ma na-akwalite ọdịnala ndị a, ha mepụtara ebe ọhụrụ bụ́ isi nke ikike n’Israel. Ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., ndị Farisii aghọwo ike na-achị achị n’okpukpe ndị Juu.
Ka ha chịkọtara ọdịnala ndị e nyere n’ọnụ ndị dịnụ, ma chọọ nkọwa ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ iji guzobekwuo nke ha, ndị Farisii hụrụ mkpa ọ dị inyekwu ihe omume ha ikike. E wepụtara echiche ọhụrụ banyere mmalite nke ọdịnala ndị a. Ndị rabaị malitere ịkụzi, sị: “Mosis natara Torah na Saịnaị wee nyefee ya Joshua, Joshua nyefee ya ndị okenye, ndị okenye nyefeekwa ya ndị amụma. Ndị amụma nyefekwara ya ndị ikom nke mgbakọ ukwu ahụ.”—Avot 1:1, Mishnah.
N’ikwu sị, “Mosis natara Torah,” ndị rabaị nọ na-ezo aka ọ bụghị nanị n’iwu ndị e dere ede kama n’ọdịnala ha ndị e nyere n’ọnụ. Ha zọọrọ na ọdịnala ndị a—ndị ụmụ mmadụ chọpụtara ma guzobe—bụ ndị Chineke nyere Mosis na Saịnaị. Ha kụzikwara na Chineke ahapụghị ya n’aka ndị mmadụ ịkọwa ihe ndị na-adịghị na ya kama na o jiriwo ọnụ kọwaa ihe Iwu ndị e dere ede na-ekwughị okwu banyere ha. Dị ka ha si kwuo, Mosis mere ka iwu a e nyere n’ọnụ ruo ọtụtụ ọgbọ, ọ bụghị nye ndị nchụàjà, kama nye ndị ndú ndị ọzọ. Ndị Farisii n’onwe ha zọọrọ na ha bụ ndị nketa nke usoro ịbụisi a “a na-akwụsịghị akwụsị” site n’ọmụmụ.
Iwu ahụ Enwee Nsogbu —Ngwọta Ọhụrụ
Jisọs, bụ́ onye ndị ndú okpukpe ndị Juu mara ikike Chineke nyere ya aka, ebuwo amụma mbibi nke ụlọ nsọ ahụ. (Matiu 23:37–24:2) Mgbe ndị Rom bibisịrị ụlọ nsọ ahụ na 70 O.A., a pụghịzi imezu ihe ndị Iwu Mosis chọrọ n’ihe banyere àjà na ije ozi ndị nchụàjà. Chineke eguzobewo ọgbụgba ndụ ọhụrụ ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs. (Luk 22:20) E wetawo ọgbụgba ndụ Iwu Mosis ná njedebe.—Ndị Hibru 8:7-13.
Kama ịhụ ihe omume ndị a dị ka ihe àmà na-egosi na Jisọs bụ Mesaịa, ndị Farisii chọtara ihe ngwọta ọzọ. Ha adịwo mbụ pụnara ihe dị ukwuu n’ikike nke òtù ndị nchụàjà. Ebe e bibiworo ụlọ nsọ ahụ, ha pụrụ imekwu otu ihe. Ụlọ akwụkwọ ndị rabaị dị na Yavneh ghọrọ ebe e nwere Sanhedrin ahụ a hazigharịrị ahazigharị—ụlọikpe dị elu nke ndị Juu. N’okpuru idu ndú Yohanan ben Zakkai na Gamaliel nke Abụọ n’obodo Yavneh, a gbanwegharịrị okpukpe ndị Juu kpam kpam. Ozi ndị a na-eje n’ụlọ nzukọ, bụ́ nke ndị rabaị na-eduzi, nọchiri ofufe a na-efe n’ụlọ nsọ, bụ́ nke ndị nchụàjà na-eduzi. Ekpere dị iche iche, karịsịa ndị a na-ekpe n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, nọchiri àjà dị iche iche. Ndị Farisii kwuru na iwu ahụ e nyere n’ọnụ bụ́ nke e nyere Mosis na Saịnaị ebuworị ụzọ hụ ma mee ndokwa maka nke a.
Ụlọ akwụkwọ ndị rabaị ghọkwuru nke pụtara ìhè. Usoro ihe ọmụmụ ha bụ́ isi bụ nkwurịta okwu kpụ ọkụ n’ọnụ, iburu ihe n’isi, na itinye iwu ahụ e nyere n’ọnụ n’ọrụ. Na mbụ, e jikọrọ ihe ndabere maka iwu ahụ e nyere n’ọnụ ná nkọwa nke Akwụkwọ Nsọ—Midrash. Ugbu a, a malitere ịkụzi na ịhazi ọdịnala ndị nọgidere na-amụbawanye bụ́ ndị nọ na-agbakọju, iche iche. E belatara ụkpụrụ nduzi nke ọ bụla nke iwu ahụ e nyere n’ọnụ gaa ná nkebi okwu ndị dị nkenke, bụ́ ndị dị mfe iburu n’isi, ndị a na-agụkarị n’uri olu ụtọ.
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Edetu Iwu E Nyere n’Ọnụ Edetu?
Ịba ụba nke ụlọ akwụkwọ ndị rabaị na ịrị elu nke iwu ndị rabaị wetara nsogbu ọhụrụ. Ọkà mmụta ndị rabaị bụ́ Adin Steinsaltz na-akọwa, sị: “Onye nkụzi nke ọ bụla nwere usoro nke ya, kebiekwa okwu iwu ya ndị e nyere n’ọnụ n’ụzọ nke ya. . . . O zughịzi ezu mmadụ ịmara nkụzi nke onye nkụzi ya, nwa akwụkwọ nwekwara ibu ọrụ nke ịmara ọrụ nke ndị ọkà mmụta ọzọ . . . E si otú a manye ụmụ akwụkwọ iburu ihe odide ndị buru nnọọ ibu n’isi n’ihi ‘nnupụta nke ihe ọmụma.’” N’ime ụbara nke ihe ọmụma na-adịghị n’usoro, ikike ncheta nke nwa akwụkwọ ahụ bụ nke e nyere ọrụ n’ụzọ na-agbawa isi.
Na narị afọ nke abụọ O.A., nnupụisi ndị Juu megide Rom, nke Bar Kokhba duziri, dugara ná mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’ebe ndị ọkà mmụta bụ́ ndị rabaị nọ. E gburu Akiba—onye rabaị kasị ukwuu, bụ́ onye kwadoworo Bar Kokhba—nakwa ọtụtụ ndị ọkà mmụta a ma ama. Ndị rabaị tụrụ egwu na mkpagbu ọhụrụ pụrụ itinye ịdị adị nke iwu ha e nyere n’ọnụ n’ihe ize ndụ. Ha ekwerewo na ọ kasị mma ibufe ọdịnala site ná nna ukwu gaa n’onye na-eso ụzọ ya site n’okwu ọnụ, ma ọnọdụ ndị a na-agbanwe agbanwe dugara n’imekwu mgbalị imepụta ọdịdị a haziri ahazi iji chekwaa ozizi nke ndị amamihe, ka a ghara ichefu ha ruo mgbe ebighị ebi.
N’oge ndị sochirinụ nke iso ndị Rom nọrọtụ n’ụdọ, Judah Ha-Nasi, bụ́ onye rabaị kasị ukwuu nke ngwụsị narị afọ nke abụọ na mmalite narị afọ nke atọ O.A., kpọkọtara ọtụtụ ndị ọkà mmụta ma detuo ụbara ọdịnala ndị e nyere n’ọnụ gaa n’usoro a haziri ahazi nke nwere Nkebi isii, e kerisịrị nke ọ bụla gaa n’ihe odide ndị ka nta—ha nile dị 63. A maara ihe odide a dị ka Mishnah. Ephraim Urbach, bụ́ onye ọnụ na-eru n’okwu n’ihe banyere iwu ahụ e nyere n’ọnụ, na-ekwu, sị: “E nyere Mishnah . . . nkwado na ikike dị ka a na-enyetụbeghị akwụkwọ ọ bụla ma e wezụga Torah n’onwe ya.” A jụwo Mesaịa ahụ, ụlọ nsọ ahụ bụ mkpọmkpọ ebe, ma ebe e chekwaworo iwu ahụ e nyere n’ọnụ site n’ide ya ede n’ụdị nke Mishnah, ọgbọ ọhụrụ n’okpukpe ndị Juu malitere.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a A na-akpọ ụdị nkọwa Akwụkwọ Nsọ a midrash.
[Foto dị na peeji nke 26]
N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị Juu ji jụ ikike Jisọs?