Anyị Aghaghị Ịrọ Nrọ
Ị̀NA-ARỌ nrọ? Ọ gaghị emebi ihe iwere ya na ị na-arọ, ebe ọ bụ na anyị nile na-arọ nrọ mgbe anyị na-ehi ụra, ọ bụrụgodị na anyị pụrụ ịzọrọ na anyị adịghị arọ. E mewo atụmatụ na a dịghị echeta ihe karịrị 95 pasent nke nrọ nile. Olee ndị ị na-echeta? N’ezie, ndị anyị na-echetakarị bụ ndị ahụ anyị ka rọpụrụ tupu anyị eteta.
Ndị nnyocha nrọ achọtawo na ụra bụ usoro na-aga n’ihu nke na-adịkarịsị omimi n’ime hour ole na ole ndị mbụ ma ghọzie nke na-emichaghị emi ka oge na-aga. Ịrọ nrọ na-ewere ọnọdụ karịsịa n’oge anya na-aga ngwa ngwa, nke a kpọrọ ụra REM. Nke a na ụra na-abụghị nke REM na-agbanwerịta. Usoro ọ bụla nke ụra na-abụghị nke REM/ụra REM na-anọru ihe dị ka minit 90, a na-emeghachi usoro ndị a ugboro ise ma ọ bụ isii n’abalị, nke ikpeazụ na-ewere ọnọdụ kpọmkwem tupu anyị eteta.
Ọ bụ ihie ụzọ iche na ụbụrụ gị na-arụ ọrụ dị ala n’oge ụra. A chọpụtawo na ụbụrụ na-arụ ọrụ ná nrọ karịa n’ọnọdụ ụfọdụ nke ịmụ anya, e wezuga usoro akwara, bụ́ nke e jikọrọ ya na ntụkwasị uche na ike ncheta. Ndị a na-eyi ka ha na-ezu ike n’oge ụra REM. Ma n’ozuzu ha akwara ndị dị n’ụbụrụ nwere nzirịta ozi na-aga n’ihu site n’otu mkpụrụ ndụ gaa n’ọzọ.
Ụbụrụ anyị bụ n’ụzọ dị ịtụnanya akụkụ dị mgbagwoju anya nke ahụ na-enwe ọtụtụ ijeri akụkụ ndị na-ewepụta ihe àmà n’ihe dị ka otu narị ruo narị abụọ ma ọ bụ atọ kwa sekọnd. E nwere ọtụtụ akụkụ n’ụbụrụ mmadụ karịa ka e nwere ndị mmadụ n’ụwa. Ụfọdụ ndị nnyocha na-eme atụmatụ na o nwere site na ijeri 20 gaa n’ihe karịrị ijeri 50 akụkụ. Ịdị mgbagwoju anya ya na-akwado ihe onye so dee Bible bụ́ Devid kwuru banyere ahụ mmadụ: “M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị.”—Abụ Ọma 139:14.
Ụwa nke Nrọ
N’oge anyị mụ anya, ikike ise anyị ji amata ihe na-anọgide na-ezigara ụbụrụ ihe ọmụma na onyoonyo, ma n’oge ụra nke a adịghị otú ahụ. Ụbụrụ na-ewepụta onyoonyo n’ime onwe ya n’enweghị enyemaka nke ikike e ji amata ihe. N’ihi ya, ihe anyị na-ahụ ná nrọ na ihe anyị na-eme n’ime ha mgbe ụfọdụ na-adị ka ịmụ anya arọ nrọ. Nke a na-eme ya ka o kwee anyị omume ime ihe ndị na-emebi iwu okike, dị ka ife efe dị ka Peter Pan ma ọ bụ isite n’elu ugwu daa n’emerụghị ahụ. A pụrụ ịgbagọ oge nke na a na-ahụ oge gara aga dị ka a ga-asị na ọ bụ ugbu a. Ma ọ bụ ọ bụrụ na anyị na-anwa ịgbalaga, o yighị ka anyị na-achịkwa njem anyị—ụkwụ anyị achọghị ịga aga. N’ezie, mmetụta na ahụmahụ ndị anyị pụrụ inwe mgbe anyị mụ anya nwere ike imetụta nrọ anyị. Ọtụtụ ndị nweworo ahụmahụ arụrụala agha ndị na-atụ egwu apụghị ichezọ ha ngwa ngwa, ụfọdụ apụghịkwa ichezọ mmetụta nke ịbụ ndị onye omekome wakporo. Ụdị ahụmahụ ndị ahụ na-enye nsogbu n’obi mgbe anyị mụ anya pụrụ ịpụta ná nrọ anyị, na-akpata nrọ ọjọọ. Ihe nkịtị ndị dị n’uche anyị mgbe anyị lakpuru ụra pụrụ ịpụta ná nrọ anyị.
Mgbe ụfọdụ mgbe anyị na-agbalị ịgwọta otu nsogbu, ngwọta ya na-abịa n’isi anyị mgbe anyị nọ n’ụra. Nke a pụrụ igosipụta na ọ bụghị ụra nile ka ịrọ nrọ na-emejupụta. Otu akụkụ ya bụ iche echiche.
Otu akwụkwọ banyere nrọ na ụbụrụ anyị na-ekwu, sị: “Ụdị ịrụ ọrụ nke uche a kasị enwe n’ụra abụghị ịrọ nrọ kama iche echiche. Iche echiche n’ụra abụghị nke ya na ịhụ ihe inyoghị inyoghị na-eso, ọ dịghị apụkwa nnọọ iche. O yiri ka ọ bụ nke a na-ahụkarị, mgbe mgbe na-emetụta ihe ndị mere eme n’ezie ụnyahụ ma ọ bụ echi, ọ na-abụkarịkwa ihe na-adịghị akpali mmasị, ihe na-enweghị nkà, na ihe a na-emeghachi.”
Ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na ihe ndị ha rọrọ ná nrọ nwere ozi ndị pụrụ iche nye ha. Iji kọwaa nrọ ndị ahụ, ha na-edebe akwụkwọ e ji edetu ihe n’ihe ndina ha ka ha wee nwee ike idetu ha mgbe ha tetara. Banyere abamuru nke akwụkwọ ndị na-agbalị ịkọwa akara nrọ, akwụkwọ bụ́ The Dream Game, nke Ann Faraday dere, na-asị: “Akwụkwọ nrọ bụ́ ebe ị na-achọpụta ihe isiokwu na akara nrọ pụtara bụkwa ihe ndị na-abaghị uru, ma hà bụ nke ọdịnala ma hà dabeere n’ụfọdụ nchepụta echiche mmụta akparamàgwà mmadụ nke ọgbara ọhụrụ a.”
Ebe ọ bụ na o yiri ka nrọ na-esi n’ụbụrụ apụta n’ụzọ bụ isi, ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya iche na ha nwere ozi pụrụ iche nye anyị. Anyị kwesịrị ile ha anya dị ka ọrụ kwesịrị ekwesị nke ụbụrụ bụ́ nke na-enye aka ime ka ọ nọgide n’ọnọdụ ahụ ike.
Ma gịnị banyere ndị na-ekwu na ha rọrọ nrọ banyere ọnwụ onye ikwu ma ọ bụ enyi ma nụ echi ya na onye ahụ anwụọla? Nke ahụ ọ́ dịghị egosi na nrọ pụrụ ịkọ ọdịnihu? N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ihe dị n’azụ nrọ amụma.