Nrọ Hà Pụrụ Ịkọ Ọdịnihu?
SITE n’oge ochie, ihe a kpọrọ mmadụ enwewo oké mmasị ná nrọ. Ndị Ijipt dere akwụkwọ dị ukwuu maka ịkọ isi nrọ, ndị Babilọn nwekwara ndị na-akọwara ha isi nrọ. N’etiti ndị Gris ihe a na-emekarị bụ ime ka ndị ọrịa hie ụra n’ihu arụsị bụ́ Asclepius iji nweta ntụziaka ahụ ike ná nrọ ha. Na narị afọ nke abụọ nke Oge Anyị, Artemidorus mepụtara akwụkwọ bụ́ ebe ọ kọwara isi akara nrọ. Ọtụtụ akwụkwọ yiri nke ahụ e mepụtaworo kemgbe ahụ adaberewo n’akwụkwọ ya. Ruo taa, a na-eme mgbalị ịkọ isi nrọ, ma hà na-enye nghọta nke ihe ga-eme n’ọdịnihu n’ezie?
Ka ha wee nwee ihe ha pụtara n’ọdịnihu, ikike ka elu aghaghị ịkpali ha. Na Bible anyị na-ahụ ọtụtụ ihe atụ ebe Chineke nyere ikike ahụ. O nyere ndị ohu ya nakwa ụfọdụ ndị na-efeghị ya ofufe nrọ amụma. N’ezie, Job 33:14-16 na-asị: “Chineke na-ekwu . . . ná nrọ, bụ́ ọhụụ nke abalị, mgbe oké ụra na-adakwasị mmadụ, n’ịtụ oru ụra n’elu ihe ndina; mgbe ahụ ka Ọ na-ekpughe ntị mmadụ.”
Chineke mere nke a n’ọnọdụ Fero nke Ijipt n’ụbọchị Josef, bụ́ onye biri ndụ ihe karịrị afọ 1,700 tupu Oge Anyị. Nrọ Fero dị na Jenesis 41:1-7, n’amaokwu nke 25 ruo 32 kwa, Josef na-akọwa isi ya dị ka ihe na-ebu amụma afọ asaa “nke a ga na-eriju afọ nke ukwuu n’ala Ijipt nile,” bụ́ nke afọ asaa nke ụnwụ ga-esochi. Josef kọwaara Fero, sị: “Ihe nke Chineke gaje ime, nke ahụ ka O mere ka Fero hụ anya.” (Jenesis 41:28) Nrọ ahụ bụ amụma nke ihe mere n’ezie.
Eze a ma ama nke ndị Babilọn nwere otu ụdị ahụmahụ ahụ. Nebukadneza rọrọ nrọ nke nyere ya nsogbu n’obi nke ukwuu, ma ọ pụghị icheta ya. Ya mere ọ kpọrọ ndị mgbaasị ya ịkọrọ ya nrọ ahụ na isi ya. Nke a bụ arịrịọ nke ha na-apụghị imezu.—Daniel 2:1-11.
Ebe Chineke nyeworo eze ahụ nrọ ahụ, O mere ka Daniel onye amụma nwee ike ikpughe nrọ ahụ na isi ya. Daniel 2:19 na-asị: “Mgbe ahụ Daniel ka e kpugheere ihe nzuzo ahụ nye n’ọhụụ nke abalị.” Daniel nyere Chineke otuto maka nrọ a, sị: “Ihe nzuzo nke eze jụworo, ndị maara ihe na ndị dibịa na ndị odeakwụkwọ dị nsọ na ndị na-eke eluigwe apụghị ịkọrọ eze ya; ma Chineke dị, Onye nọ n’eluigwe, Nke na-ekpughe ihe nzuzo nile, O mewokwa ka eze, bụ́ Nebukadneza, mara ihe aghaghị ịdị n’ikpeazụ ụbọchị ndị a.”—Daniel 2:27, 28.
Mgbe ụfọdụ Chineke nyere ndị ya ntụziaka site ná nrọ, oge ndị ọzọkwa o mesiri ha obi ike banyere ihu ọma Chineke ma ọ bụ nyere ha aka ịghọta otú o si na-enyere ha aka. N’ọnọdụ Jekọb, Chineke kpughere nnwapụta ya site ná nrọ.—Jenesis 48:3, 4.
Mgbe Josef, nna nkuchi nke Jisọs, chọpụtara na Meri dị ime, o kpebiri ịgba ya alụkwaghịm. Mgbe ahụ o nwetara ntụziaka ná nrọ ịghara ime otú ahụ. Matiu 1:20 na-asị: “Mgbe ihe ndị a dị ya n’obi, lee, mmụọ ozi nke Chineke weere onwe ya gosi ya ná nrọ, sị, Josef, nwa Devid, atụla egwu ikuru nwunye gị Meri: n’ihi na Ihe Nke ọ dị ime Ya sitere n’aka Mmụọ Nsọ.” Mgbe e mesịrị o nwetara ịdọ aka ná ntị ná nrọ: “Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị weere onwe ya gosi Josef ná nrọ, sị, Bilie, kuru Nwatakịrị ahụ na nne Ya gbalaga n’Ijipt.”—Matiu 2:13.
Nrọ Ndị Na-esiteghị na Chineke
Eziokwu ahụ bụ na ịkọ isi nrọ jupụtara n’etiti ndị na-abụghị ndị Chineke na-egosi na a pụghị ile nrọ n’ozuzu ya anya dị ka ihe mkpughe a pụrụ ịdabere na ya nke ọdịnihu. N’ụbọchị onye amụma Chineke bụ́ Jeremaịa, ndị amụma ụgha nọ na-asị: “Arọwo m nrọ, arọwo m nrọ.” (Jeremaịa 23:25) Ebumnobi ha bụ iduhie ndị ahụ iche na Chineke na-ekwu okwu site n’ọnụ ha. Banyere ndị a na-arọ nrọ, e nyere Jeremaịa ike mmụọ nsọ ikwu, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Chineke nke Israel, sịrị: Unu ekwela ka ndị amụma unu ndị nọ n’etiti unu, na ndị unu ndị na-ajụ arụsị ase, rafuo unu, unu egekwala ntị nrọ nile unu nke unu onwe unu na-eme ka a rọọ ha. N’ihi na amụma ụgha ka ndị ahụ na-eburu unu n’aha m . . . , ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—Jeremaịa 29:8, 9.
Ebe ọ bụ na ndị amụma ụgha a bụ “ndị na-ajụ arụsị ase,” ọ pụrụ ịbụ ndị mmụọ ọjọọ kpaliri nrọ ha iji rafuo ndị ahụ. E gosiri otu ihe ahụ n’ihe e kwuru na Zekaraịa 10:2: “Teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndị na-ajụ ase [ahụwo] ọhụụ ụgha; ọ bụkwa nrọ ụgha ka ha na-eze.”
Ekwensu bụ onye isi nduhie bụ́ onye ruo ọtụtụ puku afọ jiworo ndị ndú okpukpe mee ihe iji na-azọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi na Chineke agwawo ha okwu site n’ọhụụ na nrọ, dị nnọọ ka ndị amụma ụgha ahụ mere n’ụbọchị Jeremaịa na Zekaraịa. Banyere ndị dị otú ahụ, onye so dee Bible e nyere ike mmụọ nsọ bụ́ Jud degaara ndị Kraịst nke narị afọ mbụ akwụkwọ, sị: “Mmadụ ụfọdụ gbebara, bụ́ ndị e werewooro ha gosi ọha mmadụ mgbe ochie ka e wee maa ha ikpe a, ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko, ndị na-agọnarịkwa Onye nanị Ya bụ Nna nwe ọha, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” O kwuru na ndị mmadụ a, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ‘na-arọ nrọ.’—Jud 4, 8.
Nwapụta Nzọrọ Ahụ
Mmadụ pụrụ ịzọrọ na Chineke gwara ya okwu ná nrọ ma ọ bụ na nrọ ya nke ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu mechara bụrụ eziokwu, ma nke ahụ abụghị ihe zuru ezu iji kwenyere ya ma gbasoo ya n’ísì. Rịba ama ntụziaka ndị e degaara ụmụ Israel, nke dị na Deuterọnọmi 13:1-3, 5: “Mgbe onye amụma ma ọ bụ ọrọ nrọ ga-ebili n’etiti gị, nye gị ihe ịrịba ama ma ọ bụ ihe ebube, ihe ịrịba ama ahụ ma ọ bụ ihe ebube ahụ wee mee, nke ọ gwara gị okwu banyere ya, sị, Ka anyi jesoo chi ọzọ n’azụ, (nke ọ na-adịghị mgbe ị maara ha), ka anyị feekwa ha ofufe; egela ntị okwu onye amụma ahụ, ma ọ bụ ọrọ nrọ ahụ . . . Ma a ga-eme ka onye amụma ahụ, ma ọ bụ ọrọ nrọ ahụ, nwụọ.” Chineke kwere ka ndị dị otú ahụ kwupụta okwu ụgha dị ka ule nye iguzosi ike n’ihe nke ndị ya.
Kama ikwere nzọrọ nke ndị ọrọ nrọ na-adọrọ adọrọ n’ísì, ihe amamihe dị na ya bụ ka anyị nwapụta nzọrọ ha iji zere ịbụ ndị onye isi nduhie ahụ a na-adịghị ahụ anya duhiere, bụ́ “onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ma olee otú a pụrụ isi nwapụta ha n’ụzọ a pụrụ ịdabere na ya?
Okwu e dere ede nke Chineke bụ nduzi Chineke nyere anyị gaa n’eziokwu ahụ. Banyere ya, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Okwu Gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ya mere a dụrụ anyị ọdụ na 1 Jọn 4:1, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwela okwu mmụọ nile, kama nwapụtanụ ndị mmụọ ahụ, ma ha bụ ndị siri na Chineke pụta: n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụwo baa n’ụwa.” Mgbe e jiri nlezianya tụlee ya na Bible, nzọrọ, nkà ihe ọmụma, na omume ha ga-emegide ya. Okwu Chineke bụ o kwuchaa o bie n’ihe banyere ihe bụ eziokwu.
Ọrọ nrọ ahụ nke na-azọrọ inwe ihe ọmụma pụrụ iche ọ̀ na-eji n’ezie ịjụ ndị mmụọ ase ma ọ bụ ihe omume mgbaasị ndị ọzọ eme ihe? Ọ bụrụ otú ahụ, Okwu Chineke katọrọ ya. “A gaghị ahụta n’etiti gị . . . onye na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị, ma ọ bụ dibịa nrafu, ma ọ bụ onye na-ajụ mmụọ ihe, ma ọ bụ dibịa afa, ma ọ bụ onye na-ajụ ndị nwurụ anwụ ihe. N’ihi na ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ.”—Deuterọnọmi 18:10-12.
Ọ bụrụ na ọ na-azọrọ inwe mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ n’ime ya, ọ na-emegide Okwu Chineke nke na-ekwu hoo haa, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Ọ̀ na-ebuli onwe ya elu ma na-adọtara onwe ya ndị na-eso ụzọ? Matiu 23:12 na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye ọ bụla nke ga-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya.” Ọrụ 20:30 na-adọkwa ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe dị iche iche na-eduhie mmadụ ụzọ, ka ha dọpụ ndị na-eso ụzọ Jisọs iso ha n’azụ.”
Ọ̀ na-akwado omume ime ihe ike? Jemes 3:17, 18 na-akatọ ya, sị: “Amamihe ahụ nke si n’elu bịa buru ụzọ dị ọcha, e mesịa ọ dị udo, nwee obiọma, na-ekwenye okwu nke ọma, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, na-enweghị obi abụọ, na-enweghị ihu abụọ. Ma ọ bụ mkpụrụ nke ezi omume ka ndị na-eme udo na-agha n’udo.” Ọ̀ na-achọ ikike ma ọ bụ ịbụisi ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ụwa? Okwu Chineke na-akatọ ya n’ụzọ siri ike, na-asị: “Onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.” Bible si otú a na-ekpughe ihe bụ ụgha.—Jemes 4:4.
Ọ bụrụ na mmadụ rọrọ nrọ banyere ọnwụ nke otu onye so n’ezinụlọ ma ọ bụ otu enyi, ikekwe ọ bụ n’ihi na o nweworịị nchegbu banyere onye a. Na onye ahụ pụrụ ịnwụ kpọmkwem n’abalị ahụ a rọrọ nrọ ahụ egosighị n’onwe ya na nrọ ahụ bụ amụma. Maka nrọ ọ bụla dị otú a nke yiri ka ọ ghọrọ ihe mere eme n’ezie, e nwere ọtụtụ narị ndị na-emeghị eme.
Ọ bụ ezie na Chineke jiri nrọ n’oge gara aga kpughee ihe amụma ndị mere eme ma nye ntụziaka mgbe a na-emepụta Okwu ya e dere ede, o nweghị mkpa nke ime otú ahụ taa. Okwu ahụ e dere ede nwere ntụziaka nile sitere n’aka Chineke nke dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa n’oge a, amụma ya nile metụtakwara ihe ndị ga-eme n’ihe karịrị otu puku afọ n’ọdịnihu. (2 Timoti 3:16, 17) Ya mere anyị pụrụ inwe obi ike na nrọ anyị abụghị ihe ngosipụta sitere n’aka Chineke nke ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu kama ịrụ ọrụ ndị dị mkpa nke ụbụrụ maka ịnọgide na-eme ka uche anyị dị mma.
[Foto dị na peeji nke 7]
Dị ka nrọ Fero gosiri ihe gaje ịbịa, Okwu Chineke na-enye ihe ọmụma banyere ọdịnihu anyị