Abanyeghị n’Ọlụlụ—Ụzọ Ọrụ Uche Mgbasasị Na-adịghị Ya
“Ka unu wee nọdụ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị.”—1 NDỊ KỌRINT 7:35.
1. Akụkọ dị aṅaa na-agbari isi ruru Pọl ntị banyere ndị Kraịst nọ na Kọrint?
PỌL onyeozi nwere nchegbu banyere ụmụnna ya ndị Kraịst nọ na Kọrint, Gris. Ihe dị ka afọ ise tupu mgbe ahụ, o hiwela ọgbakọ ahụ dị n’obodo ukwu ahụ na-aga n’ihu nke e ji omume rụrụ arụ ya mara. Ugbu a, ihe dị ka afọ 55 O.A., ka ọ nọ n’Efesọs, n’Asia Minor, ọ natara akụkọ na-agbari isi site na Kọrint banyere nkewa òtù na ikwe ka ajọ omume rụrụ arụ dịrị. Ọzọ, Pọl anatawo akwụkwọ ozi site n’aka ndị Kraịst bụ́ ndị Kọrint na-achọ nduzi banyere inwe mmekọahụ, abanyeghị n’ọlụlụ, alụmdi na nwunye, nkewa, na nlụgharị.
2. Olee otú omume rụrụ arụ juru eju na Kọrint si yie ka o si na-emetụta ndị Kraịst nọ n’obodo ukwu ahụ?
2 Ajọ omume rụrụ arụ juru eju na Kọrint yiri ka ọ na-emetụta ọgbakọ dị n’ebe ahụ n’ụzọ abụọ. Ndị Kraịst ụfọdụ na-adaba n’ọnọdụ ime otú masịrị onye ma na-anabata omume rụrụ arụ. (1 Ndị Kọrint 5:1; 6:15-17) O yiri ka ndị ọzọ, n’imeghachi omume n’ebe ihe ụtọ anụ ahụ juru ebe nile n’obodo ukwu ahụ dị, gara n’echiche gabigara ókè nke ikwu ka a hapụ mmekọahụ nile, ọbụna maka ndị di na nwunye.—1 Ndị Kọrint 7:5.
3. Okwu ndị dị aṅaa ka Pọl bu ụzọ tụlee n’akwụkwọ ozi mbụ ya nye ndị Kọrint?
3 N’ogologo akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kọrint, o bu ụzọ kwuo maka nsogbu adịghị n’otu. (1 Ndị Kọrint, isi 1-4) Ọ gbara ha ume izere ịgbaso ụmụ mmadụ, bụ́ nke pụrụ iduga nanị ná nkewa na-emerụ ahụ. Ha kwesịrị ịdị n’otu dị ka “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” Mgbe ahụ o nyere ha ntụziaka doro anya banyere idebe ọgbakọ ọcha n’ihe banyere omume. (Isi nke 5, 6) Onyeozi ahụ cheziri ihu n’akwụkwọ ozi ha.
A Tụọ Aro Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye
4. Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru na “ọ dị mma ka nwoke ghara imetụ nwanyị aka”?
4 Ọ malitere, sị: “Ma okwu banyere ihe unu dere akwụkwọ banyere ha: Ọ dị mma ka nwoke ghara imetụ nwanyị aka.” (1 Ndị Kọrint 7:1) Okwu bụ́ “ghara imetụ nwanyị aka” n’ebe a pụtara izere imetụ nwanyị ahụ maka igbo agụụ mmekọahụ. Ebe Pọl kagbuwororị ịkwa iko, ọ na-ezo aka ugbu a ná mmekọahụ n’ime ndokwa alụmdi na nwunye. Ya mere, Pọl na-atụ aro ugbu a maka ọnọdụ alụghị di ma ọ bụ nwunye. (1 Ndị Kọrint 6:9, 16, 18; tụlee Jenesis 20:6; Ilu 6:29.) N’ịgatụkwu n’ihu o dere, sị: “Ma asị m ndị na-anọghị n’ọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ, Ọ dịịrị ha mma ma a sị na ha na-anọgide dị ka mụ onwe m nọkwa.” (1 Ndị Kọrint 7:8) Pọl ejighị nwanyị, ma eleghị anya bụrụ onye nwunye ya nwụrụ.—1 Ndị Kọrint 9:5.
5, 6. (a) Gịnị ka o ji doo anya na Pọl adịghị atụ aro ụzọ ndụ ebe obibi ndị mọnk? (b) N’ihi gịnị ka Pọl ji tụọ aro alụghị di ma ọ bụ nwunye?
5 Ma eleghị anya ndị Kraịst nọ na Kọrint amarala banyere nkà ihe ọmụma Gris, nke òtù ya ụfọdụ na-akwado oké ịta onwe onye ahụhụ, ma ọ bụ nnapụ onwe onye ihe. Nke ahụ ọ̀ pụrụ ịbụwo ihe mere ndị Kọrint ji jụọ Pọl ma ọ ‘ga-adị mma’ ka ndị Kraịst zere mmekọahụ nile? Azịza Pọl egosipụtaghị nkà ihe ọmụma Gris. (Ndị Kọlọsi 2:8) N’adịghị ka ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik, ọ dịghị ebe ọ tụrụ aro ndụ ịta onwe onye ahụhụ nke abanyeghị n’ọlụlụ n’ebe obibi ndị mọnk ma ọ bụ nke ndị nọn, dị ka a ga-asị na ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye dị nsọ n’ụzọ pụrụ iche, na ha pụkwara itinye ihe ná nzọpụta nke ha site n’ụzọ ndụ na ekpere ha.
6 Pọl tụrụ aro alụghị di ma ọ bụ nwunye “n’ihi mkpa dị ugbu a.” (1 Ndị Kọrint 7:26) Ọ pụrụ ịdị na-ezorị aka n’oge siri ike ndị Kraịst na-enwe, bụ́ nke alụmdi na nwunye pụrụ ime ka ọ kakwuo njọ. (1 Ndị Kọrint 7:28) Ndụmọdụ ya nye ndị Kraịst na-anọghị n’alụmdi na nwunye bụ: “Ọ dịịrị ha mma ma a sị na ha na-anọgide dị ka mụ onwe m nọkwa.” Nye ndị nwunye ha nwụrụ, ọ sịrị: “À tọpụwo gị n’ahụ nwunye? achọla nwunye.” Banyere onye Kraịst di ya nwụrụ, o dere: “Ngọzi dịkarịịrị ya ma a sị na ọ nọgidere otú ọ dị, dị ka izu m si dị: ma ana m eche na mụ onwe m nwekwara Mmụọ Chineke.”—1 Ndị Kọrint 7:8, 27, 40.
E Nweghị Mmanye Ịnọ n’Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye
7, 8. Gịnị na-egosi na Pọl adịghị arụgide onye Kraịst ọ bụla ịnọgide n’alụghị di ma ọ bụ nwunye?
7 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmụọ nsọ Jehova na-eduzi Pọl mgbe o nyere ndụmọdụ a. Ihe dum o kwuru banyere abanyeghị n’ọlụlụ na-egosi ezi nguzo na njide onwe onye. O meghị ya okwu ikwesị ma ọ bụ ekwesịghị ntụkwasị obi. Ọ bụ, kama nke ahụ, okwu nnwere onwe ime nhọrọ, na-enye alụghị di ma ọ bụ nwunye maka ndị nwere ike ịnọgide n’ịdị n’ọcha n’ọnọdụ ahụ nkwado kanụ.
8 Ozugbo o kwusịrị na “ọ dị mma ka nwoke ghara imetụ nwanyị aka,” Pọl gbakwụnyere: “Ma, n’ihi ịkwa iko nile, ka nwoke ọ bụla nwee nwunye nke aka ya, ka nwanyị ọ bụla nweekwa di nke aka ya.” (1 Ndị Kọrint 7:1, 2) Mgbe ọ dụsịrị ndị na-anọghị n’alụmdi na nwunye na ndị di ha nwụrụ ọdụ ka ha “na-anọgide dị ka mụ onwe m nọkwa,” o mere ngwa ịgbakwụnye: “Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ka ha lụrụ: n’ihi na ịlụ di na nwunye ka ire ọkụ n’agụụ ahụ mma.” (1 Ndị Kọrint 7:8, 9) Ọzọ, ndụmọdụ ya nye ndị nwunye ha nwụrụ bụ: “Achọla nwunye. Ma a sịkwa na ọ bụ ezie na ị lụrụ nwunye, i mehieghị.” (1 Ndị Kọrint 7:27, 28) Ndụmọdụ a guzoziri eguzosi na-egosipụta nnwere onwe ime nhọrọ.
9. Dị ka Jisọs na Pọl kwuru, olee otú ma alụmdi na nwunye ma alụghị di ma ọ bụ nwunye sicha bụrụ onyinye sitere n’aka Chineke?
9 Pọl gosiri na ma alụmdi na nwunye ma alụghị di ma ọ bụ nwunye bụcha onyinye sitere n’aka Chineke. “Ana m achọ ka mmadụ nile dị ka mụ onwe m dịkwa. Otú ọ dị, mmadụ nile n’otu n’otu nwere onyinye amara nke aka ha site na Chineke, otu onye otú a, onye ọzọ otú a kwa.” (1 Ndị Kọrint 7:7) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o bu ihe Jisọs kwuru n’uche. Mgbe o kwusịrị na alụmdi na nwunye sitere n’aka Chineke, Jisọs gosiri na alụghị di ma ọ bụ nwunye site n’ọchịchọ obi maka iji jee ozi maka ọdịmma Alaeze bụ onyinye pụrụ iche: “Ọ bụghị mmadụ nile na-anagide okwu a, kama ọ bụ ndị e nyeworo ya. N’ihi na ndị ọnozi dị, ndị a mụrụ otú a site n’afọ nne ha: ndị ọnozi dịkwa, ndị e mere ọnozi site n’aka mmadụ: ndị ọnozi dịkwa, ndị mere onwe ha ọnozi n’ihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnagide ya, ya nagide.”—Matiu 19:4-6, 11, 12.
Ịnagide Onyinye nke Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye
10. Olee otú mmadụ pụrụ isi “nagide” onyinye nke alụghị di ma ọ bụ nwunye?
10 Ọ bụ ezie na ma Jisọs ma Pọl kwuchara banyere alụghị di ma ọ bụ nwunye dị ka “onyinye,” ọ dịghị nke kwuru na ọ bụ onyinye ọrụ ebube nke nanị ụfọdụ nwere. Jisọs sịrị na “ọ bụghị mmadụ nile na-anagide” onyinye ahụ, ọ gbakwara ndị nwere ike ime otú ahụ ume ka ha ‘nagide ya,’ dị ka Jisọs na Pọl mere. N’eziokwu, Pọl dere, sị: “Ịlụ di na nwunye ka ire ọkụ n’agụụ ahụ mma,” ma ọ na-ekwu banyere ndị ‘na-apụghị ijide onwe ha.’ (1 Ndị Kọrint 7:9) N’ihe ndị o dere mbụ, Pọl gosiri na ndị Kraịst pụrụ izere ire ọkụ n’ahụ. (Ndị Galetia 5:16, 22-24) Ijegharị site na mmụọ nsọ pụtara ikwe ka mmụọ Jehova na-eduzi nzọụkwụ anyị ọ bụla. Ndị Kraịst na-eto eto hà pụrụ ime nke a? Ee, ma ha gbasochie Okwu Jehova anya. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Gịnị ka okorobịa [ma ọ bụ agbọghọbịa] ga-eji mee ka ụzọ ya dị ọcha? Ọ bụ n’ilezi ya anya dị ka okwu Gị si dị.”—Abụ Ọma 119:9.
11. Gịnị ka ‘ijegharị dị ka mmụọ nsọ si chọọ’ pụtara?
11 Nke a na-agụnye iche nche megide echiche ime otú masịrị onye ndị a na-ewepụta site n’ọtụtụ ihe omume TV, sinima, isiokwu magazin, akwụkwọ, na okwu abụ. Echiche ndị ahụ bụ nke anụ ahụ. Onye Kraịst na-eto eto ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị nke chọrọ ịnagide alụghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ‘ijegharị, ọ bụghị dị ka anụ ahụ si chọọ, kama dị ka Mmụọ Nsọ si chọọ. N’ihi na ndị dị ka anụ ahụ si chọọ na-atụkwasị uche n’ihe nke anụ ahụ; ma ndị dị ka Mmụọ Nsọ si chọọ na-atụkwasị uche n’ihe nke Mmụọ Nsọ.’ (Ndị Rom 8:4, 5) Ihe nke mmụọ nsọ ziri ezi, dị ọcha, kwesị ịhụnanya, bụrụ nke e kwuru nke ọma. Ndị Kraịst, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, meenụ nke ọma ịnọ ‘na-agụkọ ihe ndị a.’—Ndị Filipaị 4:8, 9.
12. Gịnị ka ịnagide onyinye alụghị di ma ọ bụ nwunye gụnyekarịrị?
12 Ịnagide onyinye nke alụghị di ma ọ bụ nwunye bụkarịrị okwu metụtara mmadụ ịtụkwasị obi ya n’ihe mgbaru ọsọ ahụ na ikpegara Jehova ekpere maka enyemaka n’ịgbaso ya. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebiwo n’obi ya, n’enweghị mkpa ọ bụla, kama nwee ike n’ebe ọchịchọ nke ya dị, meekwa mkpebi nke a n’obi nke ya, idebe ọnọdụ enwebeghị mmekọahụ ya, ọ ga-eme nke ọma. N’ihi ya onye na-enyefe ọnọdụ enwebeghị mmekọahụ ya n’alụmdi na nwunye na-eme nke ọma, ma onye na-enyefeghị ya n’alụmdi na nwunye ga-eme nke ọma karị.”—1 Ndị Kọrint 7:37, 38, NW.
Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye nke Nwere Nzube
13, 14. (a) Ntụnyere dị aṅaa ka Pọl onyeozi mere n’etiti ndị Kraịst na-anọghị n’alụmdi na nwunye na ndị nọ? (b) Nanị n’ụzọ dị aṅaa ka onye Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye pụrụ ‘ime nke ọma karịa’ ndị lụrụ?
13 Alụghị di ma ọ bụ nwunye abụghị ihe ùgwù n’onwe ya. Mgbe ahụ, n’echiche dị aṅaa ka ọ pụrụ ịbụ ‘ime nke ọma karị’? Ọ dabeere nnọọ n’otú mmadụ si eji nnwere onwe ọ na-eweta eme ihe. Pọl dere, sị: “Ma ana m achọ ka unu bụrụ ndị na-adịghị echegbu onwe unu. Onye na-enweghị nwunye na-echegbu onwe ya n’ihe nke Onyenwe anyị, otú ọ ga-eme ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ: ma onye nwere nwunye na-echegbu onwe ya n’ihe ụwa, otú ọ ga-eme ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ. A kpawokwa ókè n’etiti nwunye na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Nwanyị nke na-enweghị di na-echegbu onwe ya n’ihe nke Onyenwe anyị, ka o wee dị nsọ n’ahụ ya na mmụọ ya kwa: ma nwanyị nke nwere di na-echegbu onwe ya n’ihe nke ụwa, otú ọ ga-eme ihe ga-atọ di ya ụtọ. Ma nke a ka m na-ekwu ka ọ baara unu onwe unu uru; ọ bụghị ka m fekwasị ihe ntụhị n’ahụ unu, kama ka e mee ihe kwesịrị, ya na ka unu wee nọdụ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị.”—1 Ndị Kọrint 7:32-35.
14 Onye Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nke ji ọnọdụ anọghị n’alụmdi na nwunye ya na-achụso ihe mgbaru ọsọ ọdịmma onwe onye nanị adịghị eme ‘nke ọma karịa’ ndị Kraịst lụrụnụ. Ọ na-anọgide n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, ọ bụghị “n’ihi alaeze eluigwe,” kama n’ihi ihe dị iche iche nke onwe onye. (Matiu 19:12) Nwoke ma ọ bụ nwanyị na-anọghị n’alụmdi na nwunye kwesịrị ịdị “na-echegbu onwe ya n’ihe nke Onyenwe anyị,” na-enwe nchegbu “otú ọ ga-eme ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ,” ma ‘na-anọ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị.’ Nke a pụtara itinye uche a na-ekewaghị ekewa n’ijere Jehova na Kraịst Jisọs ozi. Nanị site n’ime otú ahụ ka ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst na-anọghị n’alụmdi na nwunye ga na-eme ‘nke ọma karịa’ ndị Kraịst nọ.
Ọrụ Uche Mgbasasị Na-adịghị Ya
15. Gịnị bụ isi ihe dị n’arụmụka Pọl ná 1 Ndị Kọrint isi nke 7?
15 Arụmụka dum Pọl n’isiakwụkwọ a bụ nke a: Ọ bụ ezie na alụmdi na nwunye bụ nke iwu kwadoro, n’ọnọdụ ụfọdụkwa, bụrụ ihe ka mma nye ụfọdụ, a pụghị ịgọnarị na alụghị di ma ọ bụ nwunye baara nwoke ma ọ bụ nwanyị bụ́ onye Kraịst nke chọrọ ijere Jehova ozi n’enweghị uche mgbasasị dị ukwuu uru. Ọ bụ ezie na ‘e kewara’ (NW) onye nọ n’alụmdi na nwunye, onye Kraịst na-anọghị nweere onwe ya ịtụkwasị uche “n’ihe nke Onyenwe anyị.”
16, 17. Olee otú onye Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye pụrụ isi tụkwasị uche karị “n’ihe nke Onyenwe anyị”?
16 Olee ihe ndị bụ nke Onyenwe anyị bụ́ ndị onye Kraịst na-anọghị n’alụmdi na nwunye pụrụ inwere onwe ya ilekwasị anya karịa ndị lụrụnụ? N’ọnọdụ ọzọ, Jisọs kwuru banyere “ihe nke Chineke”—ihe ndị onye Kraịst na-apụghị inye Siza. (Matiu 22:21) Ihe ndị a metụtara n’ụzọ bụ isi ndụ, ofufe, na ozi onye Kraịst.—Matiu 4:10; Ndị Rom 14:8; 2 Ndị Kọrint 2:17; 3:5, 6; 4:1.
17 Ndị na-abanyeghị n’ọlụlụ na-enwerekarị onwe ha itinye oge n’ozi Jehova, bụ́ nke pụrụ ịba uru nye n’ọnọdụ ime mmụọ ha na ọ̀tụ̀tụ̀ nke ozi ha. Ha pụrụ itinyekwu oge n’ọmụmụ ihe onwe onye na ntụgharị uche. Ọtụtụ mgbe ọ pụrụ ịkara ndị Kraịst na-abanyeghị n’ọlụlụ mfe itinye ọgụgụ Bible ha n’usoro ihe omume ha karịa otú ndị lụrụ pụrụ ime. Ha pụrụ ịkwadebe nke ọma karị maka nzukọ na ozi ubi. Ihe a dum ‘baara ha onwe ha uru.’—1 Ndị Kọrint 7:35.
18. Olee otú ọtụtụ ụmụnna nwoke na-ejighị nwanyị pụrụ isi gosi na ha chọrọ ijere Jehova ozi ‘n’enweghị uche mgbasasị’?
18 Ọtụtụ ụmụnna nwoke na-ejighị nwanyị bụ́ ndị nọrị na-eje ozi dị ka ndị ohu na-eje ozi nweere onwe ha ịgwa Jehova: “Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) Ha pụrụ itinye akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, nke dịịrị nanị ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye na-ejighị nwanyị bụ́ ndị nweere onwe ha ije ozi n’ebe mkpa ka ukwuu. Ọbụna ụmụnna na-enwereghị onwe ha ịhapụ ọgbakọ ha pụrụ iwepụta onwe ha ijere ụmụnna ha ozi dị ka ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị okenye.—Ndị Filipaị 2:20-23.
19. Olee otú e si agọzi ọtụtụ ụmụnna nwanyị na-anọghị na di, oleekwa otu ụzọ ha pụrụ isi bụrụ ngọzi nye ọgbakọ?
19 Ụmụnna nwanyị na-anọghị na di, n’enweghị onye isi bụ́ mmadụ ha ga-ejekwu ma kọọrọ ihe nzuzo, pụrụ inwe ọchịchọ ka ukwuu ‘ịtụkwasị Jehova ihe o nyeworo ha dị ka ibu.’ (Abụ Ọma 55:22; 1 Ndị Kọrint 11:3) Nke a dị mkpa karịsịa maka ụmụnna nwanyị ndị na-anọghị na di n’ihi ịhụnanya maka Jehova. Ọ bụrụ na mgbe oge na-aga ha alụọ di, ọ ga-abụ “nanị n’ime Onyenwe anyị,” ya bụ, nye nanị onye raara onwe ya nye Jehova. (1 Ndị Kọrint 7:39) Ndị okenye na-enwe obi ekele inwe ụmụnna nwanyị na-anọghị na di n’ime ọgbakọ ha; ndị a na-eletakarị ma na-enyere ndị ọrịa na ndị agadi aka. Nke a na-ewetara ndị nile o metụtara obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.
20. Olee otú ọtụtụ ndị Kraịst si egosi na ha ‘na-anọdụ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị’?
20 Ọtụtụ ndị Kraịst na-eto eto ahaziwo ihe omume ha iji “wee nọdụ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị.” (1 Ndị Kọrint 7:35) Ha na-ejere Jehova ozi dị ka ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile, ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society. Leekwa ìgwè obi ụtọ ha bụ! Lee ka ọnụnọ ha si enye ume ọhụrụ! Ee, n’anya Jehova na Jisọs, ha dị nnọọ ka “igirigi.”—Abụ Ọma 110:3.
Ọ Bụghị Iyi Abanyeghị n’Ọlụlụ ruo Mgbe Nile
21. (a) N’ihi gịnị ka o ji doo anya na Pọl adịghị agba ume ịṅụ iyi abanyeghị n’ọlụlụ? (b) Gịnị ka o bu n’uche mgbe o kwuru banyere ‘ịgafe ntoju ntorobịa’?
21 Otu isi ihe dị na ndụmọdụ Pọl bụ na ndị Kraịst ga-eme “nke ọma” ịnagide alụghị di ma ọ bụ nwunye ná ndụ ha. (1 Ndị Kọrint 7:1, 8, 26, 37) Otú ọ dị, ọ dịghị ụzọ o si na-akpọ ha òkù ịṅụ iyi abanyeghị n’ọlụlụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, o dere: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eche na ya na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ebe enwebeghị mmekọahụ ya dị, ọ bụrụ na ọ gafewo ntoju ntorobịa, nke a bụkwa otú o kwesịrị ịdị, ka o mee ihe ọ na-achọ; o mehieghị. Ka ha lụọ.” (1 Ndị Kọrint 7:36, NW) Otu okwu Grik (hy·peʹra·kmos) a sụgharịrị “gafewo ntoju ntorobịa” pụtara n’ụzọ nkịtị “gabiga ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu” ma na-ezo aka n’ịgafere ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke nnupụta ọchịchọ mmekọahụ. Ya mere ndị tinyeworo ọtụtụ afọ n’ọnọdụ alụghị di ma ọ bụ nwunye ma mesịa chee na ha kwesịrị ịlụ nweere onwe ha kpam kpam ịlụ onye kwere ekwe ibe ha.—2 Ndị Kọrint 6:14.
22. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ uru site n’akụkụ ọ bụla nye onye Kraịst ịhapụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye nnọọ na nwata?
22 Afọ ndị onye Kraịst na-eto eto tinyere n’ijere Jehova ozi n’enweghị uche mgbasasị bụ oge e ji mee ihe n’ụzọ amamihe. Ha na-enye ya ohere inweta amamihe, ahụmahụ, na nghọta bara uru. (Ilu 1:3, 4) Onye nọgiderela n’alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi Alaeze nọ n’ọnọdụ ka nnọọ mma ma e mesịa, ma o kpebie otú ahụ, ịnakwere ibu ọrụ dị iche iche nke ndụ alụmdi na nwunye na ma eleghị anya ịbụ nne ma ọ bụ nna.
23. Gịnị ka ụfọdụ ndị na-eche echiche ịlụ pụrụ ibu n’uche, ma olee ajụjụ a ga-atụle n’isiokwu ndị na-esonụ?
23 Ndị Kraịst ụfọdụ tinyeworo ọtụtụ afọ n’ijere Jehova ozi oge nile n’ọnọdụ alụghị di ma ọ bụ nwunye na-eji nlezianya ahọrọ onye ha ga-alụ n’ọdịnihu na-eburu n’uche ịnọgide n’ụdị ụfọdụ nke ozi oge nile. Nke a kwesịrị nnọọ ịja mma. Ọbụna na ụfọdụ pụrụ iburu n’uche ịlụ na-enwe echiche nke ekweghị ka alụmdi na nwunye ha gbochie ozi ha n’ụzọ ọ bụla. Ma onye Kraịst lụrụ nwunye ò kwesịrị iche na ya ka nweere onwe ya ịtụkwasị uche n’ozi ọ na-ejere Jehova dị ka mgbe ọ na-abanyebeghị n’ọlụlụ? A ga-atụle ajụjụ a n’isiokwu ndị na-esonụ.
Ná Ntụleghachi
◻ N’ihi gịnị ka Pọl onyeozi ji chee na ọ dị mkpa idegara ọgbakọ dị na Kọrint akwụkwọ?
◻ N’ihi gịnị ka anyị ji mara na Pọl adịghị atụ aro ụzọ ndụ ebe obibi ndị mọnk?
◻ Olee otú mmadụ pụrụ isi “nagide” ọnọdụ alụghị di ma ọ bụ nwunye?
◻ Olee otú ụmụnna nwanyị na-anọghị na di pụrụ isi rite uru n’ọnọdụ alụghị di ma ọ bụ nwunye ha?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ụmụnna nwoke na-ejighị nwanyị pụrụ isi jiri nnwere onwe ha jeere Jehova ozi “ghara inwe uche mgbasasị”?