“Mee Ohere Maka Ya”
1 N’otu oge, mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ekwu okwu banyere alụmdi na nwunye, Jizọs zoro aka n’ebe alụghị di ma ọ bụ nwunye nọ dị ka ‘onyinye.’ O kwuziri, sị: “Onye ọ bụla nke pụrụ ime ohere maka ya, ya mee ohere maka ya.” (Mat. 19:10-12) Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Pọl onyeozi dere banyere uru alụghị di ma ọ bụ nwunye bara ma gbaa ndị ọzọ ume ịgbaso ihe nlereanya ya n’ịnọ n’alụghị nwunye. (1 Kọr. 7:7, 38) Ọtụtụ ndị taa ‘emewo ohere’ maka alụghị di ma ọ bụ nwunye, ha na-enwetakwa uru ndị dị na ya. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime uru ndị a?
2 Ije Ozi “n’Enweghị Ndọpụ Uche”: Pọl ghọtara na alụghị nwunye nyere ya ohere ijere Jehova ozi “n’enweghị ndọpụ uche.” N’otu aka ahụ taa, nwanna nwoke nke na-alụbeghị nwunye pụrụ ịgbalị iru eru maka ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Dị ka ọ na-adịkarịkwa, onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe ohere ka ukwuu ịghọ onye ọsụ ụzọ, ịmụ asụsụ ọzọ, ịga ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ije ozi na Betel ma ọ bụ iwepụta onwe ya maka ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ pụrụ iche. Ọ pụrụ inwe oge na ohere ka ukwuu iji nwee ọmụmụ ihe onwe onye miri emi na ịtụgharị uche na ịgwa Jehova okwu site n’ekpere si ya n’obi. Onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-enwekarị oge ka ukwuu iwepụta onwe ya iji nyere ndị ọzọ aka. Ọrụ nile dị otú a bụ maka ‘ọdịmma onwe onye nke onye ahụ.’—1 Kọr. 7:32-35; Ọrụ 20:35.
3 Ozi dị otú a a na-ejere Chineke n’enweghị ndọpụ uche na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Mgbe o jeworo ozi ruo afọ 27 na Kenya, otu nwanna nwanyị na-alụghị di dere, sị: “Enwere m ọtụtụ ndị enyi na ọtụtụ ọrụ! Anyị na-emekọ ihe n’otu [ma] na-eletarịta onwe anyị. . . . O kwere m mee iji inwe onwe na ohere ije ebe ọ bụla nke alụghị di m na-eweta mee ihe iji nọgide n’ije ozi ahụ, nke a ewetawokwara m oké obi ụtọ.” O kwukwara, sị: “N’ime afọ ndị a, mmekọrịta mụ na Jehova adịwo omimi.”
4 Ime Ohere Maka Ya: Jizọs kwuru na nzube a ga-eji zụlite onyinye alụghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịbụ “n’ihi alaeze nke eluigwe.” (Mat. 19:12) Dị ka ọ dị banyere onyinye ọ bụla, a ghaghị iji alụghị di ma ọ bụ nwunye mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji nweta ọṅụ na uru na ya. Site n’iji ohere ndị alụghị di ma ọ bụ nwunye na-enye eme ihe nakwa site n’ịdabere n’ebe Jehova nọ maka amamihe na ike, ọtụtụ ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye abịawo ghọta uru ime ohere maka onyinye ahụ bara.