Legara Jehova Anya Maka Nkasi obi
“Ka Chineke nke ntachi obi na nke nkasi obi nye unu ka unu tụkwasị uche n’otu ihe ahụ n’etiti onwe unu dị ka Kraịst Jisọs si chọọ.”—NDỊ ROM 15:5.
1. N’ihi gịnị ka ụbọchị ọ bụla ji na-eweta mkpa ka ukwuu maka nkasi obi?
ỤBỌCHỊ ọ bụla na-agafenụ na-eweta mkpa na-arị elu maka nkasi obi. Dị ka onye so dee Bible kwuru ihe karịrị afọ 1,900 gara aga, “ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) N’oge anyị ‘ịsụ ude’ na ‘ime omume’ adịwo ukwuu karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Kemgbe Agha Ụwa Mbụ, ihe a kpọrọ mmadụ esitewo n’otu ọgba aghara gaa n’ọzọ n’ụdị nke agha, mpụ, na ọdachi ndị na-emere onwe ha ndị a na-ejikọkarị ha na mmadụ elekọtazighị ụwa a anya.—Mkpughe 11:18.
2. (a) Ònye ka a ga-akasị taa ụta maka ahụhụ ihe a kpọrọ mmadụ n’oge a? (b) Eziokwu dị aṅaa na-enye anyị ihe ndabere maka nkasi obi?
2 N’ihi gịnị ka e jiworo nwee nhụjuanya dị ukwuu n’oge anyị? N’ịkọwa nchụda a chụdara Setan site n’eluigwe mgbe a mụsịrị Alaeze ahụ na 1914, Bible na-aza, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12) Ihe àmà doro anya nke mmezu amụma ahụ pụtara na ọ fọrọ nke nta ka anyị ruo ọgwụgwụ nke ọchịchị ọjọọ nke Setan. Lee ka o si na-akasi obi ịmara na n’isi nso ndụ n’elu ala ga-alaghachi n’ọnọdụ udo ahụ nke dịrịị tupu Setan eduje nne na nna anyị mbụ ná nnupụisi!
3. Olee mgbe ụmụ mmadụ na-enweghị mkpa maka nkasi obi?
3 Ná mmalite, Onye Okike mmadụ nyere ogige mara mma dị ka ebe obibi maka di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ. Ọ dị n’ógbè a kpọrọ Iden, nke pụtara “Ọṅụ” ma ọ bụ “Obi Ụtọ.” (Jenesis 2:8, nkọwa dị n’ala ala peji nke NW) Ọzọkwa, Adam na Iv nwere ahụ ike zuru okè, n’atụmanya nke anwụghị anwụ ma ọlị. Cheedị nnọọ banyere ọtụtụ akụkụ ha gaara azụliteworị ikike ha na ha—ịkọ ubi, nkà, iwu ihe owuwu, egwú. Cheekwa banyere ọrụ nile nke okike ha gaara amụworị ka ha na-emezu ọrụ ha nke ibuda ụwa n’okpuru ha na ime ya ka ọ bụrụ paradaịs. (Jenesis 1:28) N’ezie, ndụ nke Adam na Iv gaara abụworị nke na-eju afọ, ọ bụghị n’ịsụ ude na ihe mgbu, kama n’obi ụtọ na ọṅụ. N’ụzọ doro anya, nkasi obi agaraghị adị ha mkpa.
4, 5. (a) N’ihi gịnị ka Adam na Iv ji daa ule nke nrubeisi? (b) Olee otú ihe a kpọrọ mmadụ si bịa nwee mkpa maka nkasi obi?
4 Otú ọ dị, ihe dị Adam na Iv mkpa bụ ịzụlite ịhụnanya na ekele dị omimi nye Nna ha nke eluigwe nwere obiọma. Ụdị ịhụnanya ahụ gaara akpali ha irubere Chineke isi n’okpuru ọnọdụ nile. (Tụlee Jọn 14:31.) N’ụzọ dị mwute, ma nne ma nna anyị mbụ erubeghịrị Eze ziri ezi ha, bụ́ Jehova, isi. Kama nke ahụ, ha kwere ka ha onwe ha bịa n’okpuru ajọ ọchịchị nke otu mmụọ ozi dara ada, Setan bụ́ Ekwensu. Ọ bụ Setan nwara Iv ime mmehie na iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu. Mgbe ahụ Adam mehiere mgbe ya onwe ya kwa riri mkpụrụ osisi ahụ nke Chineke dọworo aka ná ntị n’ụzọ doro anya banyere ya, sị: “N’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.”—Jenesis 2:17.
5 N’ụzọ dị otú a, di na nwunye ahụ mehierenụ malitere ịnwụ. Mgbe ọ na-ama ha ikpe ọnwụ ahụ, Chineke gwakwara Adam, sị: “Ihe a na-abụ ọnụ ka ala bụ n’ihi gị; n’ihe mgbu ka ị ga-eri ihe sitere na ya ụbọchị nile nke ndụ gị; ọ bụkwa ogwu na uke ka ọ ga-epuru gị; ị ga-erikwa ihe ọkụkụ nke ubi.” (Jenesis 3:17, 18) Adam na Iv si otú a tụfuo olileanya nke ime ka ụwa ahụ a na-akwadebeghị akwadebe ghọọ paradaịs. N’ịbụ ndị a chụpụrụ n’Iden, ha aghaghị itinye ume ha nile n’inweta nri site n’ala nke a bụworo ọnụ. Ụmụ ha, ebe ha ketaworo ọnọdụ a nke ime mmehie, nke ịnwụ anwụ, bịara nọrọ n’oké mkpa maka nkasi obi.—Ndị Rom 5:12.
E Mezuo Nkwa Na-akasi Obi
6. (a) Nkwa dị aṅaa na-akasi obi ka Chineke kwere mgbe ihe a kpọrọ mmadụ dabasịrị ná mmehie? (b) Amụma dị aṅaa banyere nkasi obi ka Lemek buru?
6 Mgbe ọ na-ama onye kpalitere nnupụisi mmadụ ikpe, Jehova nwapụtara na ya bụ ‘Chineke nke nkasi obi.’ (Ndị Rom 15:5) O mere otú ahụ site n’ikwe nkwa izipụ otu “mkpụrụ” nke ga-emesịa gbapụta ụmụ Adam ná mmetụta na-ebute ọdachi nke nnupụisi Adam. (Jenesis 3:15) Ka oge na-aga, Chineke nyekwara ihe atụ nke nnapụta a. Dị ka ihe atụ, o nyere Lemek, nwa nwa Adam site na nwa ya bụ́ Set mmụọ nsọ, ibu amụma banyere ihe nwa nwoke Lemek ga-eme: “Onye a ga-akasi anyị obi banyere ọrụ anyị, banyekwara ndọgbu anyị ji aka anyị adọgbu onwe anyị n’ọrụ, bụ́ nke pụtara n’ala Jehova bụworo ọnụ.” (Jenesis 5:29) N’ikwekọ ná nkwa a, a kpọrọ nwa okoro ahụ Noa, nke a ghọtara na ọ pụtara “Izu Ike” ma ọ bụ “Ngụgụ Obi.”
7, 8. (a) Ọnọdụ dị aṅaa dujere Jehova n’ichegharị banyere ike mmadụ, gịnịkwa ka O zubere ime ná nzaghachi? (b) Olee otú Noa si mezuo ihe aha ya pụtara?
7 Ka ọ dị mgbe ahụ, Setan na-enweta ụmụazụ n’etiti ụfọdụ ndị mmụọ ozi nke eluigwe. Ndị a nwoghara ghọọ ụmụ mmadụ ma kpọrọ ndị inyom mara mma bụ́ ụmụ Adam dị ka nwunye. Ụdị njikọ ahụ na-ekwekọghị n’okike merụrụ òtù ụmụ mmadụ ma mepụta agbụrụ nke Nefilim na-adịghị asọpụrụ Chineke, “ndị dike,” bụ́ ndị mere ka elu ala jupụta n’ime ihe ike. (Jenesis 6:1, 2, 4, 11; Jud 6) “Jehova wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa . . . Jehova wee chegharịa na O mere mmadụ n’ụwa, o wee wute Ya n’obi Ya.”—Jenesis 6:5, 6.
8 Jehova zubere ibibi ajọ ụwa ahụ site n’iju mmiri zuru ụwa ọnụ, ma tupu nke ahụ o mere ka Noa wuo otu ụgbọ iji chekwaa ndụ. N’ụzọ dị otú a, a zọpụtara agbụrụ mmadụ na ụdị anụmanụ nile. Lee ka Noa na ezinụlọ ya na-aghaghị isiworị nwee ahụ efe mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị ka ha na-apụta n’ụgbọ ahụ baa n’elu ala e mere ka ọ dị ọcha! Lee ka o si na-akasi obi ịhụ na e bupụwo ọnụ ahụ a bụrụ ala, na-eme ka ọrụ ịkọ ugbo dị mfe nke ukwuu karị! N’ezie, amụma Lemek ghọrọ eziokwu, Noa mezukwara ihe aha ya pụtara. (Jenesis 8:21) Dị ka ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, e ji Noa rụọ ọrụ n’iwetara ihe a kpọrọ mmadụ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke “nkasi obi.” Otú ọ dị, mmetụta ọjọọ nke Setan na ndị mmụọ ozi ọjọọ ya akwụsịghị n’Iju Mmiri ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ gakwara n’ihu na-asụ ude n’okpuru ibu arọ nke mmehie, ọrịa, na ọnwụ.
Onye Ka Noa Ukwuu
9. Olee otú Jisọs Kraịst siworo nwapụta ịbụ onye inyeaka na onye nkasi obi maka ụmụ mmadụ chegharịrịnụ?
9 N’ikpeazụ, n’ọgwụgwụ nke ihe dị ka afọ 4,000 nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa bịara. N’ịbụ onye ịhụnanya dị ukwuu maka ihe a kpọrọ mmadụ kpaliri, Jehova Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’elu ala ịnwụ dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie. (Jọn 3:16) Jisọs Kraịst na-ewetara ndị mmehie nwere nchegharị bụ́ ndị na-egosipụta okwukwe n’ọnwụ ịchụ àjà ya ahụ efe dị ukwuu. Ndị nile na-arara ndụ ha nye Jehova ma ghọọ ndị e mere baptism na-eso ụzọ Ọkpara ya na-enweta izu ike na nkasi obi na-adịgide adịgide. (Matiu 11:28-30; 16:24) N’agbanyeghị ezughị okè ha, ha na-achọta ọṅụ dị ukwuu n’ijere Chineke ozi site n’akọ na uche dị ọcha. Lee ka o si bụụrụ ha ihe nkasi obi ịmara na ọ bụrụ na ha anọgide na-egosipụta okwukwe na Jisọs, a ga-eji ndụ ebighị ebi kwụghachi ha ụgwọ ọrụ! (Jọn 3:36; Ndị Hibru 5:9) Ọ bụrụ na n’ihi adịghị ike ha emee mmehie dị oké njọ, mgbe ahụ ha nwere onye inyeaka, ma ọ bụ onye nkasi obi, n’Onyenwe anyị Jisọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ. (1 Jọn 2:1, 2) Site n’ikwupụta mmehie dị otú ahụ na iwere nzọụkwụ Akwụkwọ Nsọ kwadoro iji zere ịbụ onye na-anọgide ná mmehie, ha na-enweta ahụ efe, na-amara na ‘Chineke bụ Onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa Onye ezi omume, ka O wee gbaghara ha mmehie ha.’—1 Jọn 1:9; 3:6; Ilu 28:13.
10. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ọrụ ebube ndị Jisọs rụrụ mgbe ọ nọ n’elu ala?
10 Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs wetakwara izu ike site n’ịtọpụ ndị ndị mmụọ ọjọọ ji, site n’ịgwọ ụdị ọrịa nile, nakwa site n’ịkpọlite ndị a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ bịaghachi ná ndụ. N’eziokwu, ụdị ọrụ ebube ndị ahụ nwere abamuru dịrị nanị nwa mgbe, ebe ọ bụ na ndị e si otú ahụ gọzie mesịrị kaa nká ma nwụọ. Ka o sina dị, Jisọs si otú ahụ zoo aka ná ngọzi ọdịnihu na-adịgide adịgide nke ọ ga-awụkwasị n’ahụ ihe nile a kpọrọ mmadụ. Ebe ọ bụ ugbu a Eze dị ike nke eluigwe, n’isi nso ọ ga-eme ihe karịrị nnọọ nanị ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ọ ga-atụba ha n’abyss tinyere onye ndú ha, bụ́ Setan, n’ọnọdụ nke arụghị ọrụ. Mgbe ahụ Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst dị ebube ga-amalite.—Luk 8:30, 31; Mkpughe 20:1, 2, 6.
11. N’ihi gịnị ka Jisọs ji kpọọ onwe ya “Onyenwe ụbọchị izu ike”?
11 Jisọs sịrị na ya bụ “Onyenwe ụbọchị izu ike,” ọtụtụ n’ime ọrịa ndị ọ gwọrọ bụkwa n’Ụbọchị Izu Ike. (Matiu 12:8-13; Luk 13:14-17; Jọn 5:15, 16; 9:14) N’ihi gịnị? Ụbọchị Izu Ike bụ akụkụ nke Iwu Chineke nye Israel wee si otú a jee ozi dị ka “onyinyo nke ezi ihe ahụ nile gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 10:1) Ụbọchị isii nke ịrụ ọrụ n’ime izu na-echetara anyị afọ 6,000 gara aga nke mmadụ ịgba ohu nye ọchịchị nchịgbu Setan. Ụbọchị Izu Ike n’ọgwụgwụ izu na-eme ka e cheta izu ike na-akasi obi nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-enweta n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Onye Ka Noa Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst.—Tụlee 2 Pita 3:8.
12. N’ahụmahụ ndị dị aṅaa na-akasi obi ka anyị ga-elepụ anya?
12 Lee ahụ efe nke ndị ọchịchị Kraịst ga-achị n’elu ala ga-enwe mgbe, n’ikpeazụ, ha ga-ahụta onwe ha ịbụ ndị nweere onwe ha kpam kpam pụọ ná mmetụta ọjọọ nke Setan! Nkasi obi ọzọ ga-abịa ka ha na-enweta ọgwụgwọ nke ọrịa elu ahụ, mmetụta uche, na nke uche ha. (Aịsaịa 65:17) Mgbe ahụ, cheedị nnọọ banyere oké obi ụtọ ha ka ha na-amalite ịnabata ndị a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ site n’ọnwụ! N’ụzọ ndị a Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” (Mkpughe 21:4) Ka e ji nwayọọ nwayọọ na-etinye abamuru nke àjà mgbapụta Jisọs n’ọrụ, ndị na-erube isi nke Alaeze Chineke ga-achị ga-etoru izu okè, na-aghọ ndị nweere onwe ha kpam kpam pụọ ná mmetụta ọjọọ nile nke mmehie Adam. (Mkpughe 22:1-5) Mgbe ahụ a ga-atọhapụ Setan “nwa oge.” (Mkpughe 20:3, 7) A ga-eji ndụ ebighị ebi nye ndị nile ji ikwesị ntụkwasị obi kwadoo ọbụbụeze ziri ezi nke Jehova ụgwọ ọrụ. Cheedị banyere ọṅụ a na-apụghị ikwu n’ọnụ na ahụ efe nke ‘ịpụ n’ịbụ ohu mmebi’ n’ụzọ zuru ezu! N’ụzọ dị otú a ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enweta “inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:21.
13. N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst nile ji nwee mkpa nke nkasi obi Chineke na-enye?
13 Ka ọ dị ugbu a, anyị na-anọgide na-anọ n’ịsụ ude na ihe mgbu nke na-abịara ndị nile bi n’ime ajọ usoro ihe Setan. Ịba ụba nke ọrịa elu ahụ na nsogbu mmetụta uche na-emetụta ụdị mmadụ nile, tinyere ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. (Ndị Filipaị 2:25-27; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Tụkwasị na nke a, dị ka ndị Kraịst anyị na-anatakarị ịkwa emo na mkpagbu na-ezighị ezi nke Setan na-awụkwasị anyị maka “ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Ya mere, ọ bụrụ na anyị ga-atachi obi n’ime uche Chineke ruo ọgwụgwụ ụwa Setan, nkasi obi, enyemaka, na ume nke Ọ na-enye dị anyị mkpa.
Ebe A Ga-achọta Nkasi Obi
14. (a) Nkwa dị aṅaa ka Jisọs kwere n’abalị tupu ọnwụ ya? (b) Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-erite uru zuru ezu site ná nkasi obi nke mmụọ nsọ Chineke?
14 N’abalị ahụ tupu ọnwụ ya, Jisọs mere ka o doo ndị ozi ya na-ekwesị ntụkwasị obi anya na ya ga-ahapụ ha n’oge na-adịghị anya wee lakwuru Nna ya. Nke a nyere ha nsogbu n’obi ma mee ka ha ruo újú. (Jọn 13:33, 36; 14:27-31) N’ịghọta mkpa ha nwere maka ịnọgide na-enwe nkasi obi, Jisọs kwere nkwa, sị: “Mụ onwe m ga-ekpekwara Nna m, Ọ ga-enyekwa unu Onye nkasi obi ọzọ, ka Ọ nọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi.” (Jọn 14:16) N’ebe a Jisọs zoro aka na mmụọ nsọ Chineke, bụ́ nke a wụkwasịrị ndị na-eso ụzọ ya ụbọchị 50 mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị.a Tinyere ihe ndị ọzọ, mmụọ Chineke kasiri ha obi n’oge ule ha ma wusie ha ike ịga n’ihu na-eme uche Chineke. (Ọrụ 4:31) Otú ọ dị, e kwesịghị iwere ụdị enyemaka ahụ dị ka nke na-abịa n’onwe ya. Iji rite uru na ya n’ụzọ zuru ezu, onye Kraịst ọ bụla aghaghị ịnọgide na-ekpe ekpere maka enyemaka nkasi obi nke Chineke na-enye site na mmụọ nsọ ya.—Luk 11:13.
15. Olee ụfọdụ ụzọ Jehova na-esi enye anyị nkasi obi?
15 Ụzọ ọzọ Chineke si enye nkasi obi bụ site n’Okwu ya, bụ́ Bible. Pọl dere, sị: “Ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Nke a na-egosi mkpa anyị nwere mgbe nile ịmụ ihe na ịtụgharị uche n’ihe ndị e dere na Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible. Ọ dịkwa anyị mkpa ịgachi nzukọ nile nke ndị Kraịst anya, bụ́ ebe a na-ekerịta echiche na-akasi obi site n’Okwu Chineke. Otu n’ime nzube bụ isi nke nzukọ ndị dị otú ahụ bụ ịgbarịta ibe anyị ume.—Ndị Hibru 10:25.
16. Gịnị ka ndokwa nkasi obi nke Chineke kwesịrị ịkpali anyị ime?
16 Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom na-aga n’ihu igosi ezi ihe anyị na-enweta site n’iji ndokwa nkasi obi nke Chineke na-eme ihe. “Ka Chineke nke ntachi obi na nke nkasi obi,” ka Pọl dere, “nye unu ka unu tụkwasị uche n’otu ihe ahụ n’etiti onwe unu dị ka Kraịst Jisọs si chọọ: ka unu wee ji otu obi jikwa otu olu na-enye Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto.” (Ndị Rom 15:5, 6) Ee, site n’iji ndokwa nkasi obi nke Chineke na-eme ihe bara uru n’ụzọ zuru ezu, anyị ga-adịkwu ka Onye Ndú anyị nwere obi ike, bụ́ Jisọs Kraịst. Nke a ga-akpali anyị ịnọgide na-eji ọnụ anyị na-eto Chineke n’ọrụ ịgba àmà anyị, ná nzukọ anyị, ná mkparịta ụka dịịrị nanị anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị, nakwa n’ekpere anyị.
N’oge Ule Siri Ike
17. Olee otú Jehova si kasie Ọkpara ya obi, gịnịkwa ka nke a rụpụtara?
17 Jisọs nwere ‘obi ịlọ mmiri’ na ‘mwute nke mkpụrụ obi’ n’abalị ahụ tupu ọnwụ ya na-egbu mgbu. (Matiu 26:37, 38) Ya mere ọ pụtụrụ n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ wee kpegara Nna ya ekpere maka enyemaka. “A nụsịkwara olu Ya n’ihi na Ọ tụrụ egwu Chineke.” (Ndị Hibru 5:7) Bible na-akọ na ‘e mere ka Jisọs hụ mmụọ ozi nke si n’eluigwe bịa, na-enye Ya ike.’ (Luk 22:43) Ụzọ obi ike na nke dimkpa Jisọs si gaa n’ihu iche ndị na-emegide ya ihu bụ ihe àmà na ụzọ Chineke si kasie Ọkpara ya obi dị irè karịsịa.—Jọn 18:3-8, 33-38.
18. (a) Oge dị aṅaa ná ndụ Pọl onyeozi lere ya ule karịsịa? (b) Olee otú anyị pụrụ isi kasie ndị okenye na-arụsi ọrụ ike, dị ọmịiko obi?
18 Pọl onyeozi kwa gabigara oge ule ndị siri ike. Dị ka ihe atụ, “anya mmiri, na ọnwụnwa dị iche iche nke dakwasịrị [ya] n’ajọ ìzù nile nke ndị Juu” kara ozi ya n’Efesọs akara. (Ọrụ 20:17-20) N’ikpeazụ, Pọl hapụrụ Efesọs mgbe ndị nkwado nke chi nwanyị bụ́ Daịana kpasuworo obodo ahụ ime oké ụ̀zụ̀ n’ihi ọrụ nkwusa ya. (Ọrụ 19:23-29; 20:1) Ka Pọl tinyere isi n’ebe ugwu gaa obodo Troas, ihe ọzọkwa nyere ya nsogbu n’obi. Otu mgbe tupu ụ̀zụ̀ ahụ tụrụ n’Efesọs, ọ nataworị akụkọ dị mwute. Nkewa dị n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ dị na Kọrint, ọ na-agbachikwa ịkwa iko nkịtị. Ya mere site n’Efesọs, Pọl edewo akwụkwọ ozi ịdọ aka ná ntị siri ike n’olileanya nke idozi ọnọdụ ahụ. Nke a abụghịrị ya ihe dị mfe ime. “M sitere ná mkpagbu na ihe mgbu nke obi hiri nne were ọtụtụ anya mmiri degara unu akwụkwọ,” ka o mesịrị kpughee n’akwụkwọ ozi nke abụọ. (2 Ndị Kọrint 2:4) Dị ka Pọl, ọ dịghị adịrị ndị okenye nwere ọmịiko mfe inye ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị na-agbazi olu, n’otu akụkụ n’ihi na ha makwaara adịghị ike nke onwe ha nke ọma. (Ndị Galetia 6:1) Mgbe ahụ, ka anyị nye ndị na-edu ndú n’etiti anyị nkasi obi site n’ịnakwere ndụmọdụ ịhụnanya, nke dabeere na Bible n’egbughị oge.—Ndị Hibru 13:17.
19. N’ihi gịnị ka Pọl ji si Troas gaa Masedọnia, oleekwa otú o si mesịa nweta ahụ efe?
19 Mgbe ọ nọ n’Efesọs, ọ bụghị nanị na Pọl degaara ụmụnna nọ na Kọrint akwụkwọ kama o zijekwara Taịtọs inyere ha aka, na-enye ya ọrụ iwetaghachi akụkọ banyere nzaghachi ha nye akwụkwọ ozi ahụ. Pọl nwere olileanya ịga chere Taịtọs n’ụzọ na Troas. N’ebe ahụ e ji ezi ohere ime ndị na-eso ụzọ gọzie Pọl. Ma nke a ewepụlighị nchegbu ya n’ihi na Taịtọs abịarutebeghị. (2 Ndị Kọrint 2:12, 13) Ya mere o mere njem gaa Masedọnia, na-atụ anya izute Taịtọs n’ebe ahụ. Mmegide kpụ ọkụ nye ozi ya mere ka ọnọdụ nchegbu Pọl ka njọ. “Mgbe anyị bịakwara na Masedọnia,” ka ọ na-akọwa, “anụ ahụ anyị adịghị mfe ma ọlị, kama a na-akpagbu anyị n’akụkụ nile; ịlụ ọgụ dị n’èzí, egwu dị n’ime. Otú ọ dị, Onye ahụ Nke na-akasi ndị dị ala obi, bụ́ Chineke, weere ọbịbịa Taịtọs kasie anyị obi.” (2 Ndị Kọrint 7:5, 6) Lee ahụ efe o nwere mgbe Taịtọs mesịrị bịarute ịgwa Pọl banyere nzaghachi dị mma nke ndị Kọrint nye akwụkwọ ozi ya!
20. (a) Dị ka n’ọnọdụ Pọl, gịnị bụ ụzọ ọzọ dị mkpa nke Jehova na-esi enye nkasi obi? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu ọzọ?
20 Ahụmahụ Pọl na-akasi ndị ohu Chineke taa obi, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-echekwa ule ndị na-eme ka ha “dị ala,” ma ọ bụ “daa mbà n’obi” ihu. (Phillips) Ee, ‘Chineke nke nkasi obi’ maara mkpa anyị n’otu n’otu, ọ pụkwara iji anyị kasirịta ibe anyị obi, dị nnọọ ka Pọl nwetara nkasi obi site n’akụkọ Taịtọs banyere àgwà nchegharị nke ndị Kọrint. (2 Ndị Kọrint 7:11-13) N’isiokwu anyị ọzọ, anyị ga-atụle nzaghachi na-ekpo ọkụ nke Pọl nye ndị Kọrint na otú ọ pụrụ isi nyere anyị aka ịbụ ndị na-ekerịta nkasi obi Chineke taa n’ụzọ dị irè.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Otu n’ime ọrụ gbara ọkpụrụkpụ nke mmụọ Chineke n’ahụ ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ ite ha mmanụ dị ka ụmụ ime mmụọ e kuchiri ekuchi nke Chineke na ụmụnne Jisọs. (2 Ndị Kọrint 1:21, 22) Ọ bụ nanị 144,000 na-eso ụzọ Kraịst ka nke a dịịrị. (Mkpughe 14:1, 3) Taa e jiwo obiọma nye ihe ka n’ọtụtụ ndị Kraịst olileanya nke ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. Ọ bụ ezie na e teghị ha mmanụ, ha na-anatakwa enyemaka na nkasi obi nke mmụọ nsọ Chineke.
Ị̀ Pụrụ Ịza?
◻ Olee otú ihe a kpọrọ mmadụ si bịa nwee mkpa nke nkasi obi?
◻ Olee otú Jisọs siworo nwapụta ịka Noa ukwuu?
◻ N’ihi gịnị ka Jisọs ji kpọọ onwe ya “Onyenwe ụbọchị izu ike”?
◻ Olee otú Chineke na-esi enye nkasi obi taa?
[Map/Foto dị na peeji nke 10]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Pọl nwetara nkasi obi dị ukwuu site n’akụkọ Taịtọs banyere ndị Kọrint
MASEDỌNIA
Filipaị
GRIS
Kọrint
ESIA
Troas
Efesọs