Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 1/15 p. 3-4
  • Olee Ndị Bụ Ezigbo Ndị Ozi nke Udo?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị Bụ Ezigbo Ndị Ozi nke Udo?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezi Udo Dị Nso!
  • Ndị Ozi Udo nke Chineke
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ije Ozi Dị Ka Ndị Ozi nke Udo Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 1/15 p. 3-4

Olee Ndị Bụ Ezigbo Ndị Ozi nke Udo?

NA May 31, 1996, ebe ndị e si enweta akụkọ kpọsara ihe yiri ozi nke udo. N’ụbọchị bu ya ụzọ, e wepụtara okwu sitere n’aka gọọmenti nke na-akwado na Benjamin Netanyahu, bụ́ onye gaje ịghọ praịm minista Israel, “raara onwe ya nye nke ukwuu n’ịga n’ihu n’okwu udo, udo na ntụkwasị obi, n’etiti mba Israel na ndị agbata obi ya nile, tinyere ndị Palestine.”

Nhọpụta a kpọsara ebe nile nke a họpụtara Netanyahu mere ka ọtụtụ ndị chee ma udo n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ ọ̀ pụrụ ịbụ ihe karịrị nanị nrọ. Ọ bụrụ otú ahụ, mba ndị ọzọ hà pụrụ ịgbaso ya, na-echezọ esemokwu ha?

Otú ọ dị, ọ dị mfe ikwe nkwa udo karịa inweta ya. N’ịmata nke a, ọtụtụ nwere obi abụọ. Dị ka onye odeakụkọ bụ́ Hemi Shalev si tinye ya, “ọkara nke ndị nọ n’Israel ugbu a nwere echiche nke na nzọpụta dị nso, ọkara nke ọzọ na-ekwenyekwa na e jichiri ya na hel dị n’ụwa.” Ná nchịkọta, o kwuru, sị: “Ụfọdụ na-aṅụrị ọṅụ; ndị ọzọ na-ebe ákwá.”

Otú ahụ ka ọ na-adị mgbalị mmadụ na-eme maka udo. Mmeri nke otu onye ndú na ndị nkwado ya pụtara imeri òtù nke na-emegide emegide. Enweghị afọ ojuju na-eduga ná ndakpọ olileanya, ndakpọ olileanya na-edujekarịkwa ná nnupụisi. Ma ọ bụ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ, Latin America, Ọwụwa Anyanwụ Europe, ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ—mgbalị ihe a kpọrọ mmadụ maka udo na-eduhie eduhie.

Ezi Udo Dị Nso!

N’oge mgbe udo n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ bụ isiokwu akụkọ na-akpọtụ akpọtụ, a nọ na-anụ ozi ọzọ nke udo. Nke a abụghị okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị a kpọsara ebe nile; ọ bụghịkwa nkwekọrịta udo n’etiti mba dị iche iche. Kama nke ahụ, ozi a kpọsara udo nke ga-abịa nanị site n’Alaeze Chineke. Ebee ka a nụrụ ozi a? N’ihe karịrị 1,900 Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke Ndịàmà Jehova na-enwe n’ụwa nile na 1996/1997.

Ná mgbakọ ndị a e mere ka o doo anya na ọ dịghị gọọmenti mmadụ nke pụrụ iweta ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. N’ihi gịnị? N’ihi na nke a ga-achọ ịkwụsị ihe ndị na-anapụ anyị udo kwa ụbọchị. Ezi udo pụtara iteta ụra kwa ụtụtụ n’enweghị iyi egwu nke agha ma ọ bụ ime ihe ike. Ọ pụtara enwekwaghị mpụ, enwekwaghị ihe mkpọchi n’ọnụ ụzọ anyị, enwekwaghị ụjọ nke ịga n’okporo ámá, enwekwaghị ezinụlọ ndị e tisara. Olee gọọmenti dị n’ụwa nke pụrụ imezu ihe ahụ nile? N’ezie, olee gọọmenti dị n’elu ụwa ga-anwa anwa ekwe ya ná nkwa?

Otú ọ dị, Alaeze Chineke pụrụ, ọ ga-ewetakwa ihe ndị a. Bible kwere ná nkwa, sị: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Lee ahụ efe nke ahụ ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ na-ata ahụhụ!

Nkwa Jehova Chineke abụghị nke efu. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Chineke abụghị mmadụ, nke Ọ ga-ekwu okwu ụgha; Ọ bụghịkwa nwa mmadụ, nke Ọ ga-elogha: ọ̀ bụ na Ya onwe ya asịwo na Ọ ga-eme ihe, ma O meghị ya?” (Ọnụ Ọgụgụ 23:19) Ee, ihe Chineke kweworo ná nkwa ga-emezu—ịbụ ngọzi nye ndị nile weere nguzo ha n’akụkụ ya.

Ndị Ozi Udo nke Chineke

A maara Ndịàmà Jehova nke ọma maka nkwusa ịnụ ọkụ n’obi ha banyere Alaeze Chineke. Kwa afọ, ha nile na-etinye ihe karịrị otu ijeri hour n’isoro ndị ọzọ kerịta ozi na-enye obi ụtọ nke Bible. Nke a bụ iji mezuo okwu Jisọs: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ozi nke Ndịàmà na-eweta bụ n’ezie “ozi ọma,” n’ihi na ọ na-akpọsa Alaeze eluigwe nke Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Leekwa olileanya siri ike maka ọdịnihu ọ bụ!

Ọbụna ugbu a Alaeze Chineke na-emepụta n’ime ndị ọ na-achị ihe nkekọ nke udo na ịhụnanya ụmụnna. Jisọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ndịàmà Jehova na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe bụ isi a chọrọ n’aka ezi Iso Ụzọ Kraịst. N’ihi ya, nke ha bụ òtù ụmụnna magburu onwe ya na-eme ka ndị Juu na ndị Arab, ndị Croatia na ndị Serbia, ndị Hutu na ndị Tutsi dịrị n’otu. Udo a nke ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ nanị ịrọ ná nrọ bụ ugbu a ihe ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova n’ụwa nile nwere.

Agbamume ịnọgide na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible na ịnọgide na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke bụ nke e mere ka ọ pụta ìhè n’usoro ihe omume nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke.” Anyị na-akpọ gị òkù ịgụ akụkọ na-esonụ nke mgbakọ ụbọchị atọ ahụ na-akpali akpali nke ọtụtụ nde nọworo na-anụ ụtọ ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya