“Onye Unu Hụrụ n’Anya, Ọ Bụ Ezie na Unu Ahụghị Ya Anya”
“Onye unu hụrụ n’anya, ọ bụ ezie na unu ahụghị Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bụ ezie na unu adịghị ahụ Ya anya ugbu a, obi wee na-atọ unu ụtọ nke ukwuu.”—1 PITA 1:8.
1. Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye nọ n’ụwa taa hụtụworo Jisọs, olee otú ndị okpukpe si agbalị igosi nsọpụrụ ha nye ya?
O NWEGHỊ onye dị ndụ n’elu ala taa hụtụworo Jisọs Kraịst. Ma, ọtụtụ nde mmadụ na-ekwu na ha hụrụ ya n’anya. Kwa afọ na January 9, na Manila, Philippines, a na-adọkpụgharị ihe a kpụrụ akpụ hà ka mmadụ nke Jisọs Kraịst bu obe n’okporo ámá n’ihe a kọwaworo dị ka ngosipụta kasị ukwuu, kasị dị ịrịba ama nke okpukpe na-ewu ewu ná mba ahụ. Ìgwè mmadụ ahụ a kpaliworo na-enu aka ma na-akwa aka; ọbụna ndị mmadụ na-arị ibe ha elu n’oké mgbalị ha na-eme iji metụ ihe oyiyi ahụ aka. Ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ iji kirie nke a bụ ndị ịkwụ n’ahịrị nke ememe ahụ dọọrọ karịsịa. Ma, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nwere mmetụta nke ịbụ ndị a dọtara n’ebe Jisọs nọ n’eziokwu. Dị ka ihe àmà nke ahụ, ha pụrụ iyiri obe ma ọ bụ nwee ike ịdị na-agachi chọọchị anya. Otú ọ dị, à pụrụ iwere ikpere arụsị dị otú ahụ dị ka ezi ofufe?
2, 3. (a) Ndị ole n’etiti ụmụazụ Jisọs hụrụ ma nụ olu ya n’ezie? (b) Olee ndị ọzọ na narị afọ mbụ hụrụ Jisọs n’anya ma nwee okwukwe na ya, ọ bụ ezie na ha ahụtụghị ya anya n’onwe ha?
2 Na narị afọ mbụ, e nwere ọtụtụ puku n’ógbè ndị Rom nke Judia, Sameria, Peria, na Galili ndị hụrụ ma nụ olu Jisọs Kraịst n’onwe ha n’ezie. Ha gere ntị ka ọ kọwara eziokwu ndị na-enye obi ụtọ banyere Alaeze Chineke. Ha bụ ndị ji anya ha hụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ. Ụfọdụ n’ime ndị a ghọrọ ezi ndị na-eso ụzọ ya, na-ekwere na ọ bụ “Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” (Matiu 16:16) Otú ọ dị, ndị Pita onyeozi degaara akwụkwọ ozi ya mbụ e dere n’ike mmụọ nsọ esobeghị n’ime ndị a.
3 Ndị Pita degaara ya nọ n’ógbè ndị Rom nke Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia—ndị dịcha n’ógbè Turkey nke oge a. Nye ha Pita dere, sị: “Onye unu hụrụ n’anya, ọ bụ ezie na unu ahụghị Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bụ ezie na unu adịghị ahụ Ya anya ugbu a, obi wee na-atọ unu ụtọ nke ukwuu n’ọṅụ nke a na-apụghị ikwu okwu nke e nyewokwara ya otuto.” (1 Pita 1:1, 8) Olee otú ha siworo mara Jisọs Kraịst ruo n’ókè nke ịhụ ya n’anya na igosipụta okwukwe na ya?
4, 5. Olee otú ndị ahụ na-ahụtụbeghị Jisọs si mụta ihe zuru ezu banyere ya iji hụ ya n’anya ma nwee okwukwe na ya?
4 Dị ka ihe àmà na-egosi, ụfọdụ nọ na Jerusalem mgbe Pita onyeozi gbaara ìgwè mmadụ bịara ememe nke Pentikọst na 33 O.A. àmà. Mgbe ememe ahụ gasịrị ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya nọrọ na Jerusalem iji natakwuo ntụziaka n’aka ndị ozi. (Ọrụ 2:9, 41, 42; tụlee 1 Pita 1:1.) Na njem ozi ala ọzọ o mere ugboro ugboro, Pọl onyeozi weere ozi ịnụ ọkụ n’obi gaa n’ihu n’etiti ndị bi n’ebe Pita mesịrị zije akwụkwọ ozi mbụ nke Bible na-aza aha ya.—Ọrụ 18:23; 19:10; Ndị Galetia 1:1, 2.
5 N’ihi gịnị ka ndị ahụ, bụ́ ndị na-ahụtụbeghị Jisọs, jiri bụrụ ndị a dọtara n’ebe ọ nọ n’ụzọ siri ike? N’ụbọchị anyị, n’ihi gịnị ka ọtụtụ nde ndị ọzọ, gburugburu ụwa, jiri hụ ya n’anya nke ukwuu?
Ihe Ha Nụrụ
6. (a) A sị na ị nụrụ àmà Pita gbara banyere Jisọs na Pentikọst 33 O.A., gịnị ka ị pụrụ ịmụtaworị? (b) Olee otú nke a si metụta ihe dị ka 3,000 ndị nọ n’ebe ahụ?
6 Ọ bụrụ na ị nọrịị na Jerusalem mgbe Pita gwara ìgwè ndị ememe ahụ okwu na 33 O.A., gịnị ka ị gaara amụtaworị banyere Jisọs? N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya ọrụ ebube ndị ọ rụrụ gosiri na Chineke zitere ya. Na, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eme mmehie egbuwo Jisọs, ọ nọkwaghị n’ili kama a kpọlitewo ya n’ọnwụ, buliekwa ya gaa n’eluigwe n’aka nri Chineke. Na Jisọs bụ, n’ezie, Kraịst ahụ, Mesaịa ahụ ndị amụma deworo banyere ya. Na site na Jisọs Kraịst, a wụkwasịwo mmụọ nsọ n’ahụ ụmụazụ ya nke mere ozugbo ka ha nwee ike ịgbara ndị nke ọtụtụ mba àmà banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke na-eme site n’aka Ọkpara ya. A kpaliri obi nke ọtụtụ ndị gere Pita ntị n’oge ahụ, e mekwara ihe dị ka 3,000 baptism dị ka ndị Kraịst na-eso ụzọ. (Ọrụ 2:14-42) A sị na ị nọrịị n’ebe ahụ, ị̀ gaara eme ihe doro anya dị otú ahụ?
7. (a) A sị na ị nọ n’Antiọk mgbe Pọl onyeozi mere nkwusa n’ebe ahụ, gịnị ka ị pụrụ ịmụtaworị? (b) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị nọ n’ìgwè ahụ ji ghọọ ndị kwere ekwe ma soro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ?
7 Ọ bụrụ na i so ná ndị nọ n’ebe ahụ mgbe Pọl onyeozi kụziri ihe n’Antiọk dị n’ógbè Rom bụ́ Galetia, gịnị ọzọ ka ị pụrụ ịmụtaworị banyere Jisọs? Ị gaara anụ ka Pọl kọwara na ndị amụma ebuwo amụma banyere Jisọs ịbụ onye ndị ọchịchị nọ na Jerusalem mara ikpe ọnwụ. Ị gaara anụwokwa banyere ihe akaebe nke ndị ji anya ha hụ mbilite n’ọnwụ Jisọs. N’ezie ị gaara enwe mmasị ná nkọwa Pọl na site n’ịkpọlite Jisọs n’ọnwụ, Jehova kwadoro na onye a n’ezie bụ Ọkpara Chineke. Ọ̀ bụkwa na obi gị agaghị ekpoworị ọkụ ka ị mụtara na mgbaghara mmehie nke e mere ka o kwe omume site n’okwukwe n’ebe Jisọs nọ pụrụ iduje ná ndụ ebighị ebi? (Ọrụ 13:16-41, 46, 47; Ndị Rom 1:4) Ịmata ịdị mkpa nke ihe ha na-anụ, ụfọdụ ndị nọ n’Antiọk ghọrọ ndị na-eso ụzọ, soro ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma ahụ n’ụzọ dị irè, ọ bụ ezie na ime nke ahụ pụtara na ha ga-eche mkpagbu siri ike ihu.—Ọrụ 13:42, 43, 48-52; 14:1-7, 21-23.
8. A sị na ị nọ ná nzukọ nke ọgbakọ Efesọs mgbe a natara akwụkwọ ozi Pọl degaara ha, gịnị ka ị pụrụ ịmụtaworị?
8 Gịnị ma ọ bụrụ na i sonyeere ọgbakọ ndị Kraịst dị n’Efesọs, n’ógbè Rom nke Esia, mgbe a natara akwụkwọ ozi Pọl dere n’ike mmụọ nsọ nye ndị ahụ na-eso ụzọ? Gịnị ka ị pụrụ ịmụtaworị site na ya banyere òkè Jisọs na-ekere na nzube Chineke? N’akwụkwọ ozi ahụ Pọl kọwara na site na Kraịst a ga-eme ka ihe nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa na Chineke dịghachi na mma, na onyinye Chineke site na Kraịst ruru ndị nke mba nile, na ndị nwụworo anwụ n’otu n’otu n’anya Chineke n’ihi mmehie ha bụ ndị a na-eme ka ha dịghachi ndụ site n’okwukwe na Kraịst, nakwa n’ihi ndokwa a, o kwere ụmụ mmadụ omume ọzọ ịghọ ụmụ Chineke ọ hụrụ n’anya.—Ndị Efesọs 1:1, 5-10; 2:4, 5, 11-13.
9. (a) Gịnị pụrụ inyere gị aka ịmata ma ị ghọtara n’onwe gị ịdị mkpa nke ihe Pọl degaara ndị Efesọs? (b) Olee otú ihe ha mụtara banyere Jisọs si metụta ụmụnna ndị nọ n’ógbè ndị Rom nke Pọl kpọtụrụ aha?
9 Ekele maka ihe ndị a nile ọ̀ gaara eme ka ịhụnanya i nwere maka Ọkpara Chineke mie emi? Ịhụnanya ahụ ọ̀ gaara emetụta ndụ ị na-ebi kwa ụbọchị, dị ka Pọl onyeozi gbara ume ya n’isi nke 4 ruo nke 6 nke Ndị Efesọs? Ekele dị otú ahụ ọ̀ gaara akwaliwo gị inyocha ihe ndị bụ isi ná ndụ gị nke ọma? N’ihi ịhụnanya maka Chineke na obi ekele nye Ọkpara ya, ị̀ gaara eme mgbanwe ndị dị mkpa ka ime uche Chineke bụrụ n’ezie ihe bụ isi ná ndụ gị? (Ndị Efesọs 5:15-17) Banyere ụzọ ihe ndị Kraịst nọ n’Esia, Galetia, na ógbè ndị Rom ndị ọzọ nọ na-amụta si metụta ha, Pita onyeozi degaara ha, sị: “Onye unu hụrụ n’anya, ọ bụ ezie na unu ahụghị [Jisọs Kraịst]; Onye unu kwere na Ya, . . . obi wee na-atọ unu ụtọ nke ukwuu n’ọṅụ nke a na-apụghị ikwu okwu nke e nyewokwara ya otuto.”—1 Pita 1:8.
10. (a) N’ụzọ doro anya, gịnị tụnyere ụtụ n’ịhụnanya ndị Kraịst oge mbụ nwere n’ebe Jisọs nọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ritekwa uru?
10 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o nwere ihe ọzọ nke tụnyere ụtụ n’ịhụnanya maka Ọkpara Chineke nke ndị Kraịst oge mbụ ahụ ndị Pita gwara okwu nwere. Gịnị ka ọ bụ? Ka ọ na-erule oge Pita dere akwụkwọ ozi ya nke mbụ, ọ dịkarịa ala a na-ekesa abụọ n’ime Oziọma ahụ—Matiu na Luk. Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ndị na-ahụtụbeghị Jisọs pụrụ ịgụ ihe ndekọ Oziọma ndị a. Anyị pụkwara. Oziọma ndị ahụ abụghị ihe ndekọ e chepụtara echepụta; ha nwere akara nile nke akụkọ ihe mere eme a pụrụ ịdabere na ya karịsịa. N’ime ihe ndekọ ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, anyị na-ahụ ọtụtụ ihe ndị na-eme ka ịhụnanya anyị maka Ọkpara Chineke mie emi.
Mmụọ O Gosiri
11, 12. Gịnị dị ná mmụọ nke Jisọs gosiri ụmụ mmadụ ndị ọzọ nke na-eme ka ị hụ ya n’anya?
11 N’ihe ndekọ ahụ nke ndụ Jisọs, anyị na-amụta otú o si mesoo ụmụ mmadụ ndị ọzọ ihe. Mmụọ o gosiri na-emetụ obi ndị mmadụ ọbụna ugbu a, ihe karịrị afọ 1,960 mgbe ọ nwụsịrị. Mmetụta nke mmehie na-ebo onye ọ bụla dị ndụ ibu arọ. Ọtụtụ nde na-enweta ikpe na-ezighị ezi, na-agbaso nrịanrịa mgba, ma ọ bụ n’ihi ihe ndị ọzọ bụrụ ndị na-enwe ndakpọ olileanya na-egwepịa egwepịa. Nye ndị dị otú ahụ, Jisọs na-asị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.
12 Jisọs gosiri nchegbu na-emetụ n’ahụ maka ndị ogbenye, ndị agụụ na-agụ, na ndị na-eru újú. Mgbe ọnọdụ dị iche iche mere ka ọ dị mkpa, ọbụna o nyejuru ìgwè mmadụ dị ukwuu afọ n’ụzọ ọrụ ebube. (Luk 9:12-17) Ọ tọhapụrụ ha n’ọdịnala ndị na-ejide mmadụ n’ohu. O wulitekwara okwukwe ha na ndokwa Chineke ịkwụsị mmegbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na akụ̀ na ụba. Jisọs egwepịaghị mmụọ nke ndị e wedawororị n’ala. Site n’ịdị nro na ịhụnanya, o ji nkà bulie ndị dị umeala n’obi elu. O wetara izu ike nye ndị dị ka amị a pịara apịa a na-ezere ezere nakwa ndị dị ka ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọkụ nke a na-achọ imenyụ emenyụ. Ruokwa n’oge a, aha ya na-akpali olileanya, ọbụna n’obi nke ndị na-ahụtụbeghị ya.—Matiu 12:15-21; 15:3-10.
13. N’ihi gịnị ka ụzọ Jisọs si mesoo ndị mmehie ji na-adọrọ ndị mmadụ?
13 Jisọs akwadoghị ihe ọjọọ, ma o gosiri nghọta nye ndị jehieworonụ ná ndụ ma bụrụ ndị gosiri nchegharị, chigharịkwurukwa ya maka enyemaka. (Luk 7:36-50) Ọ na-anọdụ ala ma soro ndị a na-eleda anya n’obodo rie nri ma o chee na nke a pụrụ inye ohere inyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. (Matiu 9:9-13) N’ihi mmụọ o gosipụtara, ọtụtụ nde ndị nọ n’otu ọnọdụ ndị ahụ bụ́ ndị na-ahụtụbeghị Jisọs abụrụwo ndị a kwaliri ịmara ya ma nwee okwukwe na ya.
14. Gịnị na-amasị gị banyere ụzọ Jisọs si nyere ndị ọrịa, ndị nwere nkwarụ, ma ọ bụ ndị mmadụ nwụnahụrụ aka?
14 Ụzọ Jisọs si mesoo ndị ọrịa ma ọ bụ ndị nwere nkwarụ na-enye ihe àmà nke ịhụnanya na ọmịiko ya nakwa ikike o nwere iwetara ha ahụ efe. N’ihi ya, mgbe onye ọrịa nke ekpenta ghara n’ahụ bịakwutere ya ma rịọ ya maka enyemaka, Jisọs ewepụghị ihu ya. Ọ gwaghịkwa nwoke ahụ na, ọ bụ ezie na ya nwere obi ebere maka ya, na ọrịa ya adịwo oké njọ nakwa na ọ dịghị ihe a pụrụ ime iji nye aka. Nwoke ahụ rịọrọ, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ị na-achọ, Ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” N’egbughị oge, Jisọs gbatịpụrụ aka ya ma metụ nwoke ekpenta ahụ aka, na-asị: “Ana m achọ; ka e mee ka ị dị ọcha.” (Matiu 8:2, 3) N’oge ọzọ otu nwanyị chọrọ ka a gwọọ ya site n’imetụ ọnụ uwe mwụda ya aka n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè. Jisọs mesoro ya n’ụzọ obiọma na n’ụzọ na-emesighachi obi ike. (Luk 8:43-48) Mgbe o zutekwara ndị na-eje ili ozu, o nwere obi ebere n’ahụ nwanyị di ya nwụrụ na-eru újú bụ́ onye nanị nwa nwoke o nwere nwụworo. Ọ bụ ezie na Jisọs ajụwo iji ike ịrụ ọrụ ebube nke Chineke nyere ya wetara onwe ya nri, ọ laghị azụ n’iji ya kpọlite nwoke ahụ nwụrụ anwụ n’ọnwụ ma weghachitere ya nne ya.—Luk 4:2-4; 7:11-16.
15. Olee otú ịgụ ihe ndekọ ndị ahụ banyere Jisọs na ịtụgharị uche na ha si emetụta gị?
15 Ka anyị na-agụ ihe ndekọ ndị a ma na-atụgharị uche na mmụọ nke Jisọs gosipụtara, ịhụnanya anyị maka onye a tọgbọrọ ndụ mmadụ ya ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi na-emiwanye emi. Ọ bụ ezie na anyị ahụtụbeghị ya, anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a dọtara ebe ọ nọ, anyị na-achọkwa ịgbaso ijeụkwụ ya.—1 Pita 2:21.
Ndabere O Ji Umeala Dabere na Chineke
16. N’ònye ka Jisọs tụkwasịrị uche n’ụzọ bụ isi, gịnịkwa ka ọ gbara anyị ume ime?
16 Nke ka nke, Jisọs tụkwasịrị uche ya na nke anyị na Nna eluigwe ya, bụ́ Jehova Chineke. O mere ka a mara iwu kasị ukwuu n’Iwu ahụ, na-asị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:36, 37) Ọ dụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ, sị: “Nweenụ okwukwe [na] Chineke.” (Mak 11:22) Mgbe ule siri ike nke okwukwe ha chere ha ihu, ọ gbara ha ume, sị: “Na-ekpekwanụ ekpere.”—Matiu 26:41.
17, 18. (a) Olee otú Jisọs si gosi ndabere o ji obi umeala dabere n’ebe Nna ya nọ? (b) N’ihi gịnị ka ihe o mere ji dị oké mkpa nye anyị?
17 Jisọs n’onwe ya setịpụrụ ihe nlereanya. Ekpere bụ akụkụ dị mkpa nke ndụ ya. (Matiu 14:23; Luk 9:28; 18:1) Mgbe oge ruru ka ọ họrọ ndị ozi ya, Jisọs adabereghị nanị n’echiche ya, ọ bụ ezie na n’oge mbụ ndị mmụọ ozi nile nọ n’eluigwe nọ n’okpuru nchịkwa ya. N’obi umeala o jiri abalị nile kpegara Nna ya ekpere. (Luk 6:12, 13) Mgbe o chere njide na ọnwụ na-egbu mgbu ihu, ọzọkwa Jisọs chigharịkwuuru Nna ya, na-ekpesi ekpere ike. O nweghị echiche nke na ọ maara Setan nke ọma, na ya pụkwara ịnagide nnọọ ihe ọ bụla ajọ onye ahụ pụrụ izupụta. Jisọs ghọtara mkpa ọ dị na ya adaghị. Lee nkọcha ọdịda ga-abụrụ Nna ya! Leekwa mfu ọ gaara abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ, ndị olileanya ndụ ha dabeere n’àjà nke Jisọs gaje ịchụ!
18 Jisọs kpere ekpere ugboro ugboro—mgbe ya na ndị ozi ya nọ n’ụlọ elu dị na Jerusalem na ọbụna n’ụzọ siri ike karị n’ogige Getsemane. (Matiu 26:36-44; Jọn 17:1-26; Ndị Hibru 5:7) Mgbe ọ na-ahụju anya n’osisi ịta ahụhụ, o kwutọghị ndị kọchara ya. Kama nke ahụ, o kpere ekpere n’isi ndị na-eme ihe n’amaghị ama: “Nna, gbaghara ha; n’ihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” (Luk 23:34) Ọ nọgidere na-etinye uche ya n’ebe Nna ya nọ, “rara Onwe ya nye n’aka Onye ahụ Nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” Okwu ikpeazụ o kwuru n’elu osisi ịta ahụhụ bụ ekpere nye Nna ya. (1 Pita 2:23; Luk 23:46) Lee ekele anyị nwere na, n’ịdabere na Jehova n’ụzọ zuru ezu, Jisọs ji ikwesị ntụkwasị obi rụzuo ọrụ Nna ya nyefere ya n’aka! Ọ bụ ezie na anyị ahụtụbeghị Jisọs Kraịst, lee ka anyị si hụ ya n’anya nke ukwuu maka ihe o mere!
Igosipụta Ịhụnanya Anyị Maka Ya
19. N’igosipụta ịhụnanya maka Jisọs, omume ndị dị aṅaa ka anyị ga-ezere dị ka ihe na-ekwesịtụghị ekwesị?
19 Olee otú anyị pụrụ isi nye ihe àmà na ịhụnanya anyị na-ekwu na anyị nwere karịrị nanị okwu? Ebe ọ bụ na Nna ya, bụ́ onye Jisọs hụrụ n’anya, machibidoro ime ihe oyiyi na iwere ndị a dị ka ihe a na-efe ofufe, n’ezie anyị agaghị ewetara Jisọs nsọpụrụ site n’iyiri ụdị ihe oyiyi ahụ dị n’ihe olu anyị ma ọ bụ site n’ibugharị otu n’okporo ámá. (Ọpụpụ 20:4, 5; Jọn 4:24) Ọ gaghị abụrụ Jisọs nsọpụrụ anyị ịga ihe omume okpukpe, ọbụna na-eme nke ahụ ọtụtụ mgbe kwa izu, ma ọ bụrụ na anyị adịghị ebi ndụ kwekọrọ n’ozizi ya n’oge ndị ọzọ n’izu ahụ. Jisọs kwuru, sị: “Onye nwere ihe M nyere n’iwu, nke na-edebekwa ha, ọ bụ onye ahụ na-ahụ m n’anya: onye na-ahụ m n’anya, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya.”—Jọn 14:21, 23; 15:10.
20. Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị ga-egosi ma anyị hụrụ Jisọs n’anya n’ezie?
20 Ihe ndị dị aṅaa ka o nyere anyị n’iwu? Nke mbụ, ife ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, nanị ya kwa. (Matiu 4:10; Jọn 17:3) N’ihi òkè ọ na-ekere ná nzube Chineke, Jisọs kụzikwara na anyị aghaghị igosipụta okwukwe na ya dị ka Ọkpara Chineke nakwa na anyị aghaghị igosi ya site n’ịjụ ajọ ọrụ nile nakwa site n’ije ije n’ìhè. (Jọn 3:16-21) O nyere anyị ndụmọdụ ibu ụzọ chọọ Alaeze Chineke na ezi omume ya, na-eme ka ndị a bute nchegbu banyere mkpa elu ahụ ụzọ. (Matiu 6:31-33) O nyere iwu na anyị ga-ahụrịta ibe anyị n’anya dị ka ọ hụrụ anyị. (Jọn 13:34; 1 Pita 1:22) O nyekwara anyị ọrụ ịgba àmà banyere nzube Chineke, ọbụna dị ka o mere. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Mkpughe 3:14) Ọ bụ ezie na ha ahụtụbeghị Jisọs, ezi ịhụnanya maka ya na-akwali ihe dị ka nde Ndịàmà ise nke Jehova taa idebe ihe ndị ahụ e nyere n’iwu. Ha ịbụ ndị na-ahụtụbeghị Jisọs n’onwe ha ebelataghị ikike mkpebi ha irube isi. Ha na-echeta ihe Onyenwe ha gwara Tọmas onyeozi, sị: “N’ihi na ị hụwo m, ì kwerewo? ngọzi na-adịrị ndị aka-ahụghị, ma ha kwere.”—Jọn 20:29.
21. Olee otú anyị si erite uru site n’ịga Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst, bụ́ nke a ga-enwe n’afọ a na Sunday, March 23?
21 E nwere olileanya na ị ga-eso n’ime ndị ga-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa mgbe anyanwụ dasịrị na Sunday, March 23, 1997, iji cheta ngosipụta kasịnụ nke ịhụnanya Chineke n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ nakwa ime ememe ncheta ọnwụ Ọkpara ya na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ Jisọs Kraịst. Ihe e kwuru ma mee n’oge a kwesịrị ime ka ịhụnanya maka Jehova na Ọkpara ya dịwanye omimi wee si otú ahụ mụbaa ọchịchọ idebe ihe Chineke nyere n’iwu.—1 Jọn 5:3.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú ndị e degaara akwụkwọ mbụ nke Pita ji bịa mara ma hụ Jisọs n’anya?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị Kraịst oge mbụ nụrụ nke na-amasị gị?
◻ Gịnị dị na mmụọ nke Jisọs gosiri nke mere ka ịhụnanya gị maka ya dịkwuo omimi?
◻ N’ihi gịnị ka ndabere Jisọs ji obi umeala dabere na Chineke ji dị anyị oké mkpa?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya anyị maka Jisọs Kraịst?
[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
Anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a dọtara n’ebe Jisọs nọ n’ihi mmụọ o gosiri