Ahụhụ Ehika
“N’IHI gịnị ka e ji nwee ajọ ahụhụ nile a nke ndị mmadụ n’otu n’otu na n’ìgwè . . . ? Chineke kwesịrị ịbụ nzube dum n’onwe ya ma n’agbanyeghị nke ahụ e nwere ihe dị ukwuu na-enweghị isi n’ụwa a, oké ahụhụ na-enweghị isi na mmehie nzuzu. Chineke nke a ọ̀ bụ ma eleghị anya ihe Nietzsche boro ya ebubo ịbụ: onye aka ike, onye nduhie, onye wayo, ogbu mmadụ?”—On Being a Christian, nke Hans Küng dere.
Ị pụrụ ịhụ na nanị ihe ọkà okpukpe Katọlik bụ́ Hans Küng na-eme bụ iwepụta otu nsogbu na-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya—n’ihi gịnị ka Chineke nwere ike nile, nke na-ahụ n’anya ji ekwe ka ahụhụ hiri nne dịrị? Ị́ nụbeghị ka ndị mmadụ jụrụ ajụjụ dị otú ahụ? Onye ọ bụla nwere ọmịiko na-enwe mwute n’ihi ihe Küng kọwara dị ka “ọbara na-asọ ka mmiri, ọsụsọ na anya mmiri, ihe mgbu, iru újú na egwu, owu ọmụma na ọnwụ na-enweghị ọgwụgwụ.” N’ezie, ọ dịkarịrị ka osimiri, idei mmiri nke ihe ụjọ na ịta ikikere eze nke mebiworo ndụ ọtụtụ nde mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nile.—Job 14:1.
Jupụta ná ‘Ndọgbu n’Ọrụ na Ajọ Ihe’
Chee banyere ahụhụ na-esite n’agha, ihe mgbu nke ọ na-abụghị nanị ndị o metụtara kpọmkwem na-enwe kamakwa ndị a hapụrụ iru újú, dị ka ndị nne na nna na ndị ikwu nke ụmụaka o metụtara na ndị ọzọ e mekpọrọ ọnụ. “N’afọ 10 ikpeazụ,” ka òtù Red Cross kwuru n’isi nso a, “e gburu 1.5 nde ụmụaka n’ọgụ ndị e ji ngwá agha lụọ.” Na Rwanda na 1994, ka òtù Red Cross na-akọ, “e gbuwo ọtụtụ narị puku ndị ikom, ndị inyom na ụmụaka n’ụzọ obi ọjọọ na n’usoro.”
Anyị ekwesịghịkwa ileghara ihe mgbu nke ndị rụrụ arụ na-edina ụmụaka na-akpata. Otu nne na-eru újú, onye sịrị na nwa ya nwoke gburu onwe ya mgbe otu onye ọrụ nlekọta ụmụaka metọsịrị ya, kwuru, sị: “Nwoke ahụ metọrọ nwa m nwoke . . . bibiri ya na ọtụtụ ụmụ okoro ndị ọzọ n’ụzọ kasị dị n’usoro, nke rụrụ arụ a pụrụ ichetụ n’echiche.” Gịnịkwa banyere nrọ ọjọọ nke ihe mgbu nke ndị dabara n’aka ndị ogbu mmadụ dị obi ọjọọ ma ọ bụ ndị ogbu n’ahịrị, dị ka ndị aka kpaara na Britain bụ́ ndị “tọọrọ, dinaa n’ike, mekpọọ ọnụ ma gbuo ndị mmadụ n’enweghị ihe mere ha ruo afọ 25”? N’akụkọ ihe mere eme nile o yiri ka e nweghị njedebe nye ihe ndị ikom na ndị inyom meworo ibe ha n’ụzọ ihe mgbu na ahụhụ.—Eklisiastis 4:1-3.
Tụkwasị nke a ahụhụ nke nrịanrịa mmetụta uche na ndị nke elu ahụ na ajọ ihe mgbu nke iru újú nke na-etijasị ezinụlọ mgbe ndị a hụrụ n’anya nwụchuru ọnwụ. E nwekwara ịta ikikere eze nke ndị ụnwụ nri ma ọ bụ ọdachi ndị ọzọ a sịrị na ha na-emere onwe ha dakwasịrị. Ole na ole ga-agbagha okwu Mosis na afọ 70 ma ọ bụ 80 anyị jupụtara ná ‘ndọgbu n’ọrụ na ajọ ihe.’—Abụ Ọma 90:10.
Ọ̀ Bụ Akụkụ Nhazi Chineke?
Ọ̀ pụrụ ịbụ, dị ka ụfọdụ zọrọworo, na ahụhụ a nọgidere na-adị bụ akụkụ nke nhazi a na-apụghị ịghọta aghọta nke Chineke? Ànyị ga-atarịrị ahụhụ ugbu a iji nwee ekele maka ndụ ‘n’ụwa na-esonụ’? Ọ̀ bụ eziokwu, dị ka onye France bụ́ ọkà ihe ọmụma bụ́ Teilhard de Chardin kwenyere, na “ahụhụ nke na-egbu mmadụ ma na-eweta nretọ, dị mmadụ mkpa ka o wee dịrị ndụ ma ghọọ mmụọ”? (The Religion of Teilhard de Chardin; ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ dịghị ma ọlị!
Omenkà na-eche banyere ndị ọzọ ọ̀ ga-ama ụma kepụta ọnọdụ na-eweta ọnwụ ma na-azọrọzi ịdị ọmịiko mgbe ọ zọpụtara ụmụ mmadụ site ná mmetụta ya? Mbanụ! Gịnị mere Chineke na-ahụ n’anya ga-eji mee ihe dị otú ahụ? Mgbe ahụ n’ihi gịnị ka Chineke ji ekwe ka ahụhụ dịrị? Ọ̀ dị mgbe ahụhụ ga-akwụsị? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Foto WHO nke P. Almasy sere