Nwa Gị Ò Kwesịrị Ịga Ụlọ Akwụkwọ A Na-ebi Ebi?
WERE ya na i bi n’otu obodo nta n’otu mba ka na-emepe emepe. I nwere ọtụtụ ụmụaka n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, ma n’afọ ndụ nke 12, ha ga-eru ịga ụlọ akwụkwọ sekọndrị. N’ógbè unu, ụlọ akwụkwọ sekọndrị nile jubigara ókè, ghara inwe ngwá mmụta zuru ezu, nweekwa ndị nkụzi ole na ole. Mgbe ụfọdụ ịgba abụbọ ọrụ na-emechi ụlọ akwụkwọ ruo ọtụtụ izu na ọnwa n’otu oge.
Mmadụ ewee nye gị otu broshuọ mara mma nke na-akọwa otu ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi n’obodo ukwu. Ị na-ahụ foto ụmụ akwụkwọ obi dị ụtọ, yiri uwe dị sam, na-amụ akwụkwọ n’ọnụ ụlọ ịgụ akwụkwọ, ụlọ nchọpụta, na ọ́bá akwụkwọ ndị nwere ngwá mmụta zuru ezu. Ụmụ akwụkwọ ahụ na-enyonye anya na kọmputa ma na-ezu ike n’ọnụ ụlọ obibi ndị dị ọcha, maa mma. Ị na-agụ na otu n’ime nzube nke ụlọ akwụkwọ ahụ bụ inyere ụmụ akwụkwọ aka “inweta ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ kasị elu nke ha nwere ike ya.” Ị na-agụkwu sị: “A chọrọ ka ụmụ akwụkwọ nile kwekọọ n’otu ụkpụrụ akparamàgwà yiri nke a na-atụ anya ya dị ka o kwesịrị n’ime ezinụlọ ebe ihe ndị a na-emesi ike bụ nsọpụrụ, ọnụ ọma, nkwanye ùgwù maka nne na nna na ndị okenye, mmekọ ihe ọnụ, ikwe ibe nọrọ, obiọma, ịkwụwa aka ọtọ na iguzosi ike n’ezi ihe.”
E hotara okwu otu nwa okoro na-amụmụ ọnụ ọchị ka ọ na-asị: “Nne na nna m nyere m ihe ùgwù kachasịnụ nke ịga ụlọ akwụkwọ kasị mma.” Otu nwa agbọghọ na-asị: “Ụlọ akwụkwọ na-ama aka ma na-akpali akpali. N’ebe a mmụta na-abịara onwe ya.” Ị̀ ga-eziga nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi dị otú ahụ?
Agụmakwụkwọ na Ọnọdụ Ime Mmụọ
Nne na nna nile na-enye nlekọta chọrọ inye ụmụ ha mmalite dị mma ná ndụ, iji mezuokwa nke ahụ agụmakwụkwọ dị mma, nke a haziri nke ọma dị mkpa. Ọtụtụ mgbe agụmakwụkwọ ụwa na-emeghe ụzọ nye ohere ọrụ n’ọdịnihu ma na-enyere ndị na-eto eto aka ịghọ ndị toworo eto nwere ike ilekọta onwe ha na ezinụlọ ha n’ọdịnihu.
‘Ọ bụrụ na ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi na-enye agụmakwụkwọ dị mma tinyere nduzi ụfọdụ n’omume, gịnị ma e jiri ya mee ihe?’ ka ị pụrụ ịjụ. N’ịza ajụjụ ahụ, nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị iji ekpere tụlee otu ihe dị oké mkpa—ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ha. Jisọs Kraịst jụrụ, sị: “N’ihi na uru gịnị ka ọ baara mmadụ, irite elu ụwa dum n’uru, e wee napụ ya ndụ ya?” (Mak 8:36) N’ezie, ọ dịghị uru dị na nke a ma ọlị. Ya mere, tupu ikpebi iziga ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi, nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịtụle mmetụta nke a pụrụ inwe n’atụmanya ụmụ ha maka ndụ ebighị ebi.
Mmetụta nke Ụmụ Akwụkwọ Ndị Ọzọ
Ụfọdụ ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi pụrụ inwe ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ magburu onwe ha. Ma gịnị banyere ụkpụrụ omume nke ndị na-aga ma ọ bụ ikekwe ọbụna nke ụfọdụ ndị ọrụ ụlọ akwụkwọ dịgasị otú ahụ? Banyere ụdị ndị ga-ejupụta na “mgbe ikpeazụ” a, Pọl onyeozi dere, sị: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya: gị gbakụtakwa ndị a azụ.”—2 Timoti 3:1-5.
Ọdịda nke a n’omume na ọnọdụ ime mmụọ zuru ụwa ọnụ, na-eche Ndịàmà Jehova ihe ịma aka n’ihu ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. Ụmụ akwụkwọ na-alata ụlọ kwa ụbọchị na-achọpụta na ọbụna mkpakọrịta dị nta ha na ụmụ akwụkwọ ibe ha bụ́ ndị ụwa na-enwe pụrụ inwe mmetụta ọjọọ nke dị ike n’ọnọdụ ime mmụọ ha. Iguzogide mmetụta ahụ pụrụ ịbụ oké mgba nye ụmụ Ndịàmà, ọbụna mgbe e nwere nkwado, ndụmọdụ, na agbamume site n’aka nne na nna ha kwa ụbọchị.
Mgbe ahụ, gịnị bụ ọnọdụ ụmụ e si n’ụlọ ha zipụ gaa n’ụlọ akwụkwọ ndị a na-ebi ebi? A na-edebe ha iche, gbochie ha inwe nkwado ime mmụọ chiri anya nke nne na nna na-ahụ n’anya. Ebe ha na ụmụ klas ha bi hour 24 n’ụbọchị, nrụgide ikwenyere ìgwè mmadụ na-enwe mmetụta ka ike n’uche na obi ụmụaka ha karịa ka o yiri ka ọ̀ ga-enwe n’ahụ ụmụ akwụkwọ bi n’ụlọ. Otu nwa akwụkwọ kwuru, sị: “N’ụzọ omume, onye bi n’ụlọ akwụkwọ bi n’ihe ize ndụ site n’ụtụtụ ruo abalị.”
Pọl dere, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu: Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Nne na nna bụ́ ndị Kraịst ekwesịghị ịbụ ndị e duhiere gaa n’iche na ụmụ ha agaghị enwe mmerụ ahụ ime mmụọ ọ bụla ma ọ bụrụ na ha na ndị na-adịghị ejere Chineke ozi na-akpakọrịta mgbe nile. Mgbe oge na-aga, obi ụmụ na-atụ egwu Chineke pụrụ ime etili n’ebe ụkpụrụ ndị Kraịst dị, nweekwa ike ghara inwekwa mmasị ọ bụla n’ihe ime mmụọ. Mgbe ụfọdụ nne na nna adịghị ahụta nke a ruo mgbe ụmụ ha hapụworo ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi. Mgbe ahụ ọ na-abụkarị na oge agafesịwo idozi ihe.
Ahụmahụ Clement bụ ihe a na-ahụkarị. Ọ na-akọ, sị: “Tupu ịpụ gaa ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi, ahụrụ m eziokwu ahụ n’anya ma na-eso ụmụnna apụ n’ozi ubi. Ikere òkè n’ọmụmụ Bible ezinụlọ anyị na Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kachasị atọ m ụtọ. Otú ọ dị, ozugbo m gara ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi n’afọ ndụ nke 14, ahapụrụ m eziokwu ahụ kpam kpam. N’ime afọ ise dum m nọrọ n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi, ọ dịghị mgbe m gara nzukọ. N’ihi òtù ọjọọ, etinyere m aka n’ọgwụ ọjọọ, ise siga, na ịṅụ oké mmanya.”
Mmetụta nke Ndị Nkụzi
N’ụlọ akwụkwọ ọ bụla a pụrụ inwe ndị nkụzi rụrụ arụ n’omume bụ́ ndị na-eji ọnọdụ ịbụisi ha eme ihe na-ezighị ezi. Ụfọdụ dị obi ọjọọ na aka ike, ebe ndị ọzọ na-erigbu ụmụ akwụkwọ ha n’ụzọ mmekọahụ. N’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi ihe ndị nkụzi dị otú ahụ mere yikarịrị ka ha ga-abụ ndị a na-emeghị mkpesa ha.
Otú ọ dị, ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị nkụzi ji ezi obi na-anwa ịzụ ụmụaka ịghọ ndị òtù ọha mmadụ bara uru, ịdabakọ n’ụwa dị ha gburugburu, ikwekọ. Ma n’ebe a ka nsogbu ọzọ dịịrị ụmụaka bụ́ Ndịàmà. Ụkpụrụ ụwa dị iche iche adịghị ekwekọ mgbe nile n’ụkpụrụ ndị Kraịst. Ebe ndị nkụzi na-agba ụmụ akwụkwọ ume ịdabakọ n’ụwa a, Jisọs kwuru na ụmụazụ ya agaghị ‘esite n’ụwa.’—Jọn 17:16.
Gịnị ma ọ bụrụ na nsogbu ebilite mgbe ụmụaka na-agbaso ụkpụrụ Bible? Ọ bụrụ na ụmụaka ahụ na-aga ụlọ akwụkwọ dị n’ógbè ha ma biri n’ụlọ, ha pụrụ iso nne na nna ha tụlee okwu ndị dị otú ahụ. N’aka nke ha, nne na nna ahụ pụrụ iduzi ụmụ ha ma eleghịkwa anya gwa onye nkụzi ha okwu. N’ihi ya, a na-edozikarị nsogbu na nghọtahie dị iche iche ngwa ngwa.
N’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi ọ bụ ihe dị iche. Ụmụ akwụkwọ dị otú ahụ nọ n’okpuru nchịkwa ndị nkụzi ha mgbe nile. Ọ bụrụ na ụmụaka ewere nguzo maka ụkpụrụ ndị Kraịst, ha aghaghị ime otú ahụ n’enweghị nkwado kwa ụbọchị nke nne na nna ha. Mgbe ụfọdụ, ụmụaka na-agbalị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe karị ha adịghị. Nwatakịrị yikarịrị ka ọ ga-ekwenye n’ihe onye nkụzi chọrọ.
Ngagharị A Kpaara Ókè
N’adịghị ka mahadum, ebe ụmụ akwụkwọ na-enwerekarị onwe ha ịbịa na ịla otú ọ masịrị ha, ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi na-egbochi ngagharị nke ụmụaka. Ọtụtụ n’ime ụlọ akwụkwọ ndị a adịghị ekwe ka ụmụ akwụkwọ hapụ ogige ụlọ akwụkwọ ma ọ bụghị na Sunday, ụfọdụ adịghịkwarị ekwere nke ahụ. Otu nwa akwụkwọ dị afọ 11 n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi, onye aha ya bụ Eru na-ekwu, sị: “Ndị isi ụlọ akwụkwọ adịghị ekwe mgbe ọ bụla ka anyị gaa nzukọ, ma ya fọdụkwa ije ozi ubi. N’ime ụlọ akwụkwọ, a na-enwe nzukọ okpukpe nanị maka ndị Katọlik na ndị Alakụba. Nwa akwụkwọ ọ bụla aghaghị ịhọrọ otu n’ime ha abụọ ma ọ bụ nagide ajọ mmegide site n’aka ma ndị nkụzi ma ụmụ akwụkwọ. A na-amanyekwa ụmụ akwụkwọ ịgụ egwú ito mba na abụ chọọchị.”
Mgbe nne na nna debara aha ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ dị otú ahụ, ozi dị aṅaa ka ha na-ezipụrụ ụmụ ha? Ozi ahụ pụrụ nnọọ ịbụ na agụmakwụkwọ ụwa dị mkpa karịa izukọta maka ofufe na ikere òkè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ—ọbụna dị mkpa karịa iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke.—Matiu 24:14; 28:19, 20; 2 Ndị Kọrint 6:14-18; Ndị Hibru 10:24, 25.
N’ụlọ akwụkwọ ụfọdụ a na-ebi ebi, ụmụ akwụkwọ bụ́ Ndịàmà na-agbalị ịmụkọ Bible ọnụ, ma ọbụna nke a na-esikarị ike. Otu onye ntorobịa aha ya bụ Blessing, onye dị afọ 16, na-ekwu nke a banyere ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi ọ gara: “Kwa ụbọchị ndị sị na ha bụ ndị Kraịst na-apụta ikpe ekpere. Anyị bụ́ Ndịàmà na-anwa ịrịọ ha ka anyị wee nwee ike inwe ọmụmụ ihe anyị, ma ndị nọ na klas ka elu na-agwa anyị na ọ dịghị onye ma òtù anyị. Mgbe ahụ ha na-anwa ịmanye anyị iso ha kpee ekpere. Anyị jụ, ha enye anyị ahụhụ. Ikpesara ndị nkụzi na-eme ka ihe ka njọ. Ha na-akpọ anyị iyi dị iche iche ma gwa ụmụ akwụkwọ nọ na klas ka elu ka ha nye anyị ahụhụ.”
Iguzopụ Iche
Mgbe a matara ụmụ akwụkwọ ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi nke ọma dị ka Ndịàmà Jehova, nke a pụrụ ịbụrụ ha ihe ọma. Ndị isi ụlọ akwụkwọ pụrụ ịhapụ ha ka ha ghara ikere òkè n’ihe omume okpukpe ụgha ndị bụ iwu, bụ́ ndị megidere okwukwe Ndịàmà. Ụmụ akwụkwọ ibe ha pụrụ ịkwụsị ịnwa ime ka ha tinye aka n’ihe omume na mkparịta ụka ndị na-adịghị mma. Ụzọ pụrụ imeghe maka ịgbara ụmụ akwụkwọ ibe ha na ndị nkụzi àmà. Ọzọkwa, ọ ga-esi ike inyo ndị ji ụkpụrụ ndị Kraịst na-ebi ndụ enyo dị ka ndị mere oké ihe ọjọọ, mgbe ụfọdụkwa ha na-enweta nkwanye ùgwù ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe ha.
Otú ọ dị, ihe adịghị eme otú ahụ mgbe nile. Iguzopụ iche na-emekarị ka onye na-eto eto bụrụ onye ụmụ akwụkwọ nakwa ndị nkụzi na-akpagbu ma na-akwa emo. Yinka, nwa okoro dị afọ 15 nke gara ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi, na-asị: “N’ụlọ akwụkwọ, a mara gị dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, anya nile awụkwasị gị. Ebe ha maara nguzo ime mmụọ na omume anyị, ha na-agba ọnyà ịnwụde anyị.”
Ibu Ọrụ Nne na Nna
Ọ dịghị onye nkụzi, ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ kọleji pụrụ n’izi ezi ịnwa iweghara ọrụ nke ịkpụzi ụmụaka ịghọ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye. Nke ahụ abụghị ọrụ ha nke ọ na-abụ ibu ọrụ ha. Okwu Chineke na-ekwu na nne na nna n’onwe ha ga-ahụ maka mkpa ime mmụọ nke ụmụ ha. Pọl dere, sị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Olee otú nne na nna pụrụ isi tinye ndụmọdụ Chineke a n’ọrụ ma ọ bụrụ na ụmụ ha bipụrụ n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi ebe a pụrụ igbochi nleta gaa n’otu ugbo ma ọ bụ ugbo abụọ n’ọnwa?
Ọnọdụ na-adịgasị iche nke ukwuu, ma nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-agbalị ime ihe kwekọrọ n’okwu a sitere n’ike mmụọ nsọ: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.”—1 Timoti 5:8.
È Nwere Nhọrọ Ndị Ọzọ?
Gịnị ka nne na nna pụrụ ime ma o yie ka ha nwere nanị nhọrọ abụọ—ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ dị n’ógbè bụ́ nke na-enweghị ngwá mmụta zuru ezu? Ụfọdụ ndị chọtaworo onwe ha n’ọnọdụ a na-edokwa maka agụmakwụkwọ onwe onye iji tụkwasị ihe n’agụmakwụkwọ ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ dị n’ógbè. Ndị ọzọ mụrụ ụmụ na-ewepụta oge iji aka ha kụziere ụmụ ha akwụkwọ.
Mgbe ụfọdụ nne na nna na-egbochi nsogbu site n’ime atụmatụ tupu oge mgbe ụmụ ha ga-etoru ịbanye ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ bụrụ na i nwere ụmụntakịrị ma ọ bụ na-eme atụmatụ ịzụlite ezinụlọ, ị pụrụ ile ma è nwere ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị mma n’ógbè unu. Ma e nweghị, ọ pụrụ ikwe omume ịkwaga nso ebe e nwere otu.
Dị ka ndị nne na nna maara nke ọma, ọ na-ewe nkà, ndidi, na oge dị ukwuu ịkụbanye ịhụnanya maka Jehova n’ime nwatakịrị. Ọ bụrụ na nke a siri ike mgbe nwatakịrị bi n’ụlọ, lee ka ọ ga-esi sie ike karị ma ọ bụrụ na nwa ahụ bi ebe dị anya! Ebe o metụtara ndụ ebighị ebi nke nwatakịrị, nne na nna aghaghị iji ezi uche na ekpere kpebie ma inyefe nwa ha n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi ọ̀ na-enye ụgwọ ọrụ zuru ihe ize ndụ ahụ. Lee ka ọ ga-esi bụrụ elepụghị anya n’ọdịnihu iji ọdịmma ime mmụọ nwatakịrị chụọ àjà maka uru ndị dị n’agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi! Nke a ga-eyi ịmaba n’ụlọ na-agba ọkụ iji gụpụta otu ọla—wee bụrụ onye ọkụ gbagburu.
Okwu Chineke na-asị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nhá.” (Ilu 22:3) Ọ ka mma igbochi ọnọdụ ọjọọ kama idozi ya ma e mesịa. Ọ ga-abụ ihe amamihe iche banyere nke ahụ ma ị jụọ onwe gị sị, ‘Nwa m ò kwesịrị ịga ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi?’
[Foto dị na peeji nke 28]
Ndịàmà Na-eto Eto Ekwuo Uche Ha Banyere Ụlọ Akwụkwọ A Na-ebi Ebi
“N’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi, a na-ekewapụ ụmụaka bụ́ Ndịàmà pụọ ná mkpakọrịta ime mmụọ. Ọ bụ ebe na-adịghị mma ma ọlị nke nwere oké nrụgide ime ihe ọjọọ.”—Rotimi, onye gara ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi n’agbata afọ ndụ nke 11 na 14.
“Ịga nzukọ ndị Kraịst siri oké ike. Apụrụ m ịga nanị na Sunday, ijikwa mee nke ahụ, aghaghị m ịmịpụ ka ụmụ akwụkwọ na-akwụ n’ahịrị maka chọọchị. Ọ dịghị mgbe m nwere obi ụtọ, n’ihi na n’ụlọ ọ marawo m ahụ ịga nzukọ nile nke ọgbakọ, m na-agakwa ozi ubi na Saturday na Sunday. Ụlọ akwụkwọ abụghị ahụmahụ na-ewuli elu. Ọtụtụ ihe kwara m.”—Esther, onye ndị nkụzi na-apịa ihe mgbe nile n’ihi na ọ jụrụ ikere òkè n’ihe omume chọọchị ụlọ akwụkwọ.
“Ịgbara ụmụ akwụkwọ ibe m àmà adịghị mfe n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi. Ọ dịghị mfe iguzopụ iche. Achọrọ m ịgbaso ìgwè mmadụ. Ikekwe m gaara enwe anyaike karị ma a sị na m nwere ike ịga nzukọ ma na-ekere òkè n’ozi ubi. Ma apụrụ m ime nke ahụ nanị mgbe m nọ ezumike, nke bụ nanị ugboro atọ n’afọ. Ọ bụrụ na i nwere oriọna nke a na-agbanyeghachighị mmanụ, ọkụ ya na-anyụlata. Ọ bụ otu ihe ahụ n’ụlọ akwụkwọ.”—Lara, onye gara ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi malite n’afọ ndụ nke 11 ruo 16.
“Ugbu a m na-anọkwaghị n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi, obi dị m ụtọ na m pụrụ ịga nzukọ nile, kere òkè n’ije ozi ubi, ma soro ndị ọzọ n’ezinụlọ m na-anụ ụtọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Ọ bụ ezie na ibi n’ụlọ akwụkwọ nwere uru ụfọdụ, ọ dịghị ihe ka mmekọrịta mụ na Jehova mkpa.”—Naomi, onye mere ka nna ya kweta ịkpọpụ ya n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi.