Mgbapụta Baa n’Ụwa Ọhụrụ Ezi Omume
“Ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—ABỤ ỌMA 37:11.
1, 2. (a) Olee otú mgbapụta Jehova n’oge anyị ga-esi dị iche ná mgbapụta nke oge ochie? (b) N’ụdị ụwa dị aṅaa ka Jehova ga-akpọba ndị ya?
JEHOVA bụ Chineke nke mgbapụta. N’oge ochie, ọ gbapụtara ndị ya n’ọtụtụ mgbe. Mgbapụta ndị ahụ dịrị nwa oge, n’ihi na na nke ọ bụla n’oge ndị ahụ Jehova emeghị ihe o kpere n’ikpe megide ụwa dum nke Setan n’ụzọ na-adịgide adịgide. Ma n’oge anyị, Jehova ga-arụ ọrụ mgbapụta kasị ukwuu maka ndị ohu ya nile n’isi nso. N’oge a ọ ga-ebibi akụkụ nile nke usoro ihe Setan n’elu ụwa nile, ọ ga-akpọbatakwa ndị ohu ya n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume, na-adịgide adịgide.—2 Pita 2:9; 3:10-13.
2 Jehova kwere nkwa, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:10, 11) Ruo oge hà aṅaa? “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29; Matiu 5:5) Otú ọ dị, tupu nke ahụ emee, ụwa a ga-agabiga oge nsogbu kasị ukwuu o nwetụworo.
“Mkpagbu Ukwu” Ahụ
3. Olee otú Jisọs si kọwaa “mkpagbu ukwu” ahụ?
3 Na 1914 ụwa a banyere na “mgbe ikpeazụ” ya. (2 Timoti 3:1-5, 13) Anyị nọ afọ 83 ugbu a n’ime oge ahụ, na-erukwa nso n’ọgwụgwụ ya mgbe, dị ka Jisọs buru amụma ya, ihe na-esonụ ga-ewere ọnọdụ: “Mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) Ee, ọ ga-adị njọ ọbụna karịa Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe e gburu ihe dị ka nde 50 mmadụ. Lee oge ga-eme ka ụwa mee mkpatụ na-abịa ngwa ngwa!
4. N’ihi gịnị ka ikpe Chineke ji abịakwasị “Babilọn Ukwu ahụ”?
4 “Mkpagbu ukwu” ahụ ga-abịa na mberede na-eju anya, “n’otu oge hour.” (Mkpughe 18:10) Chineke ime ihe o kpere n’ikpe n’ahụ okpukpe ụgha nile, bụ́ nke Okwu Chineke na-akpọ “Babilọn Ukwu ahụ,” ga-aka ntiwapụ ya akara. (Mkpughe 17:1-6, 15) Akụkụ bụ isi nke Babilọn oge ochie bụ okpukpe ụgha. Babilọn nke oge a yiri ibe ya nke oge ochie ma na-anọchite anya alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ọ kpawo àgwà nwanyị na-akwa iko site n’ikwenyere usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ kwadowo agha ha ma gọzie ndị agha nọ n’akụkụ na-emegiderịta onwe ha, na-eme ka ndị nọ n’otu okpukpe na-egburịta onwe ha. (Matiu 26:51, 52; 1 Jọn 4:20, 21) O legharawo omume rụrụ arụ nke ndị kwenyeere ya anya, ọ kpagbuwokwa ezi ndị Kraịst.—Mkpughe 18:5, 24.
5. Olee otú “mkpagbu ukwu” ahụ si amalite?
5 “Mkpagbu ukwu” ahụ na-amalite mgbe usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị wakporo “Babilọn Ukwu ahụ” na mberede. Ha “ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:16) Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị na-akwadobu ya “ga-akwakwara ya ákwá, tikwaara ya aka n’obi.” (Mkpughe 18:9-19) Ma ndị ohu Jehova atụwo anya nke a eri ogologo oge, ha ga-etikwa mkpu, sị: “Haleluya; . . . n’ihi na O kpere oké nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, bụ́ nwanyị nke weere ịkwa iko ya mebie ụwa, Ọ bọkwara ọ́bọ̀ ọbara ndị ohu Ya n’isi ya.”—Mkpughe 19:1, 2.
A Wakpoo Ndị Ohu Chineke
6, 7. N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova pụrụ iji nwee obi ike mgbe a wakporo ha n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ?
6 Ebe ha bibiworo okpukpe ụgha, usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-echigharịkwuru ndị ohu Jehova. Setan, “Gọg, nke ala Megọg” n’amụma, na-asị: “M ga-abakwasị ndị nọ jụụ, ndị nọ ná ntụkwasị obi.” N’iche na ha bụ anụ a na-eri eri n’ụzọ dị mfe, ọ na-eji “usuu ndị agha bara ụba . . . , dị ka igwe ojii ikpuchi ala” awakpo ha. (Ezikiel 38:2, 10-16) Ndị Jehova maara na mwakpo a ga-akụ afọ n’ala n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi.
7 Mgbe Fero na usuu ndị agha ya chere na ha amatawo ndị ohu Chineke n’ọnyà n’Osimiri Uhie, Jehova gbapụtara ndị ya ma bibie usuu ndị agha Ijipt n’ụzọ ọrụ ebube. (Ọpụpụ 14:26-28) N’oge “mkpagbu ukwu” ahụ, mgbe mba nile chere na ha amatawo ndị Jehova n’ọnyà, ọ na-abịa ịnapụta ha ọzọ n’ụzọ ọrụ ebube: “N’ụbọchị ahụ, . . . ọnụma m ga-arịgota n’imi m. Ọ bụkwa n’ekworo m n’ọkụ nke nrubiga ókè nke iwe m ka M kwuworo.” (Ezikiel 38:18, 19) Njedebe nke “mkpagbu ukwu” ahụ ga-adịzi nso!
8. Ihe omume dị aṅaa ndị karịrị ike mmadụ ga-ewere ọnọdụ tupu Jehova egbuo ndị ajọ omume, gịnịkwa ga-abụ mmetụta ya?
8 N’otu oge mgbe “mkpagbu ukwu” ahụ malitesịrị, ma tupu Jehova emee ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ihe fọdụrụ nke ụwa a, ihe omume ndị karịrị ike mmadụ ga-ewere ọnọdụ. Rịba ama mmetụta ha ga-enwe. “Mgbe ahụ ka ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ [Kraịst] ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.” (Matiu 24:29, 30) “Ihe ịrịba ama dị iche iche ga-adịkwa n’anyanwụ na ọnwa na kpakpando; . . . mmadụ na-atụbọ site n’egwu, sitekwa na ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Luk 21:25, 26.
“Mgbapụta Unu Na-eru Nso”
9. N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova pụrụ iji ‘eweli isi ha elu’ mgbe ihe ndị karịrị ike mmadụ na-eme?
9 N’oge ahụ kpọmkwem, amụma Luk 21:28 ga-emezu. Jisọs sịrị: “Mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.” Ndị iro Chineke ga na-ama jijiji n’egwu n’ihi na ha ga-amara na ihe omume ndị ahụ karịrị ike mmadụ na-ewere ọnọdụ sitere n’aka Jehova. Ma ndị ohu Jehova ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ha ga-ama na mgbapụta ha na-eru nso.
10. Olee otú Okwu Chineke si akọwa njebebe nke “mkpagbu ukwu” ahụ?
10 Mgbe ahụ Jehova ga-eti usoro ihe Setan ihe ga-egbu ya: “Mụ na [Gọg] ga-ekpekwa ikpe n’ajọ ọrịa na-efe efe na n’ọbara; ọ bụkwa oké mmiri ozuzo na-ezobiga ókè, na oké akụ mmiri ígwé, na ọkụ, na brimstone, ka M ga-eme ka ha zokwasị ya, zokwasịkwa ọtụtụ ndị dị iche iche so ya . . . Ha ewee mara na Mụ onwe m bụ Jehova.” (Ezikiel 38:22, 23) E bibie akụkụ nile nke usoro Setan. E kpochapụ ọha mmadụ nile nke ndị na-eleghara Chineke anya. Nke ahụ ga-abụ njebebe nke “mkpagbu ukwu” ahụ n’Amagedọn.—Jeremaịa 25:31-33; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8; Mkpughe 16:14, 16; 19:11-21.
11. N’ihi gịnị ka e ji agbapụta ndị ohu Jehova gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ?
11 Ọtụtụ nde ndị na-efe Jehova ofufe n’ụwa nile ga-abụ ndị a gbapụtara gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ. Ndị a na-emejupụta “oké ìgwè mmadụ” ahụ siteworo “ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile” pụta. N’ihi gịnị ka e ji gbapụta ha n’ụzọ ahụ na-akpali egwu? N’ihi na ha na-efe Jehova “ofufe ehihie na abalị.” Ya mere ha lanarịrị ọgwụgwụ ụwa a ma bụrụ ndị a kpọbara n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume. (Mkpughe 7:9-15) Otú a, ha na-eji anya ha hụ mmezu nke nkwa Jehova: “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ Ya, Ọ ga-ebulikwa gị inweta ala: mgbe a na-ebipụ ndị na-emebi iwu, ị ga-ahụ.”—Abụ Ọma 37:34.
Ụwa Ọhụrụ Ahụ
12. Na gịnị ka ndị lanarịrị Amagedọn ga-elepụ anya?
12 Lee oge na-akpali akpali nke ahụ ga-abụ—mkpochapụ nke ajọ omume na mmalite nke oge kasị ebube n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ! (Mkpughe 20:1-4) Lee ekele ndị lanarịrị Amagedọn ga-enwe n’ebe Jehova nọ ịbụ ndị baworo ná mmepeanya na-enwu nke ọma, dị ọcha nke Chineke na-eme, ụwa ọhụrụ, n’elu ala nke a ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs! (Luk 23:43) Ọ gaghịkwa adị ha mkpa ịnwụ ọzọ ma ọlị! (Jọn 11:26) N’ezie, site n’oge ahụ gaa n’ihu, ha ga-enwe olileanya dị ịtụnanya, dịkwa ebube nke ịdị ndụ ruo ogologo oge Jehova na-adị ndụ!
13. Olee otú Jisọs si maliteghachi ọrụ ọgwụgwọ o bidoro n’ụwa?
13 Jisọs, bụ́ onye Jehova họpụtaworo dị ka Eze eluigwe, ga-elekọta ngọzi ọrụ ebube nke ndị ahụ a gbapụtara ga-anụ ụtọ ha. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o meghere anya kpuru ìsì na ntị chiri echi ma gwọọ “ọrịa nile dị iche iche na nrịanrịa nile dị iche iche.” (Matiu 9:35; 15:30, 31) N’ụwa ọhụrụ ahụ, ọ ga-amaliteghachi oké ọrụ ịgwọ ọrịa ahụ kama n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ. Dị ka Onye Ozi Chineke, ọ ga-emezu nkwa ahụ: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:4) Ọ dịghịkwa mgbe a ga-enwe mkpa maka ndị ọrụ ma ọ bụ ndị ahịa ọgwụ ahụ ike!—Aịsaịa 25:8; 33:24.
14. Mgbapụta dị aṅaa ga-abịara ndị ohu Jehova nwụwororị?
14 A ga-agbapụtakwa ndị ohu Chineke nile kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwụrụ n’oge gara aga. N’ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-anapụta ha n’aka ili. Jehova na-emesi obi ike, sị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) O yikarịrị ka a ga-ebu ụzọ kpọlite ndị “ezi omume” n’ọnwụ, ha ga-atụnyekwa ụtụ n’ịgbasa Paradaịs ahụ. Lee ka ọ ga-esi adọrọ mmasị ndị lanarịrị Amagedọn ịnụ ahụmahụ nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ anwụ eri ogologo oge, ndị a weghachiri ná ndụ ugbu a!—Jọn 5:28, 29.
15. Kọwaa ụfọdụ n’ime ọnọdụ ndị a ga-enwe n’ụwa ọhụrụ ahụ.
15 Mgbe ahụ ndị ahụ nile dị ndụ ga-enwe ahụmahụ nke ihe ọbụ abụ ahụ kwuru banyere Jehova: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.” (Abụ Ọma 145:16) Agụụ agaghị adịkwa ọzọ: A ga-eweghachi ụwa gaa ná nhazi dị mma nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ebe obibi ha, ọ ga-emepụtakwa ihe n’ụba. (Abụ Ọma 72:16) Ndị na-enweghị ebe obibi adịkwaghị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha,” onye nke ọ bụla ga-anọdụ “n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Aịsaịa 65:21, 22; Maịka 4:4) Egwu adịkwaghị ọzọ: Agha, ime ihe ike, ma ọ bụ mpụ agaghị adịkwa. (Abụ Ọma 46:8, 9; Ilu 2:22) “Ụwa nile ezuwo ike, dị jụụ: ha etiwawo mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 14:7.
16. N’ihi gịnị ka ezi omume ga-eji zuo ụwa ọhụrụ ahụ ọnụ?
16 N’ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-ewepụworị usoro mgbasa ozi aghụghọ nke Setan. Kama nke ahụ, “ezi omume ka ndị bi n’elu ụwa dum mmadụ bi mụtaworo.” (Aịsaịa 26:9; 54:13) Site ná ntụziaka ime mmụọ dị mma site n’afọ ruo n’afọ, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Echiche na omume ndị na-ewuli elu ga-ezu ihe a kpọrọ mmadụ ahụ. (Ndị Filipaị 4:8) Cheedị, ọha mmadụ zuru ụwa ọnụ nke ndị nweere onwe ha pụọ na mpụ, nganga, ekworo—òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ ebe mmadụ nile na-amịpụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke. N’ezie, ọbụna ugbu a ìgwè mmadụ ahụ na-azụlite àgwà ndị dị otú ahụ.—Ndị Galetia 5:22, 23.
N’ihi Gịnị Ka O Ji Wee Ogologo Oge Otú A?
17. N’ihi gịnị ka Jehova jiworo cheruo ogologo oge tupu ya akwụsị ajọ omume?
17 Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka Jehova ji cheruo ogologo oge iji wepụ ajọ omume ma gbapụta ndị ya baa n’ime ụwa ọhụrụ? Tụlee ihe a na-aghaghị ịrụzu. Nke kasị mkpa bụ iwepụ ọbụbụeze Jehova, ikike o nwere ịchị, n’ụta. Site n’ikwe ka oge zuru ezu gabiga, o gosiwo n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ịchịisi mmadụ n’adabereghị n’ọbụbụeze ya aghọwo ihe dawara afọ. (Jeremaịa 10:23) Ya mere ugbu a Jehova ziri nnọọ ezi n’iji ọchịchị nke Alaeze eluigwe n’okpuru Kraịst dochie ọchịchị mmadụ.—Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10.
18. Olee mgbe ụmụ Abraham ga-eketa ala Kenean?
18 Ihe meworo na narị afọ ndị a nile yiri ihe mere n’oge Abraham. Jehova gwara Abraham na ụmụ ya ga-eketa ala Kenean—ma ọ bụghị tupu narị afọ anọ “n’ihi na ajọ omume ndị Amọraịt aka-ezughị.” (Jenesis 12:1-5; 15:13-16) N’ebe a okwu ahụ bụ́ “ndị Amọraịt” (agbụrụ bụ isi) yiri ka ọ na-anọchite anya ndị Kenean n’ozuzu ha. Ya mere ihe dị ka narị afọ anọ ga-agabiga tupu Jehova emee ka ndị ya weghara Kenean. Ka ọ dịgodị mgbe ahụ Jehova kwere ka mba nile dị na Kenean zụlite ọha mmadụ ha. Gịnị ka ọ rụpụtara?
19, 20. Ụdị ọha mmadụ ndị dị aṅaa ka ndị Kenean zụlitere?
19 Akwụkwọ bụ́ Bible Handbook, nke Henry H. Halley dere, kwuru na na Megido, ndị ọkà mmụta ihe ndị e gwupụtara n’ala chọpụtara mkpọmkpọ ebe nke ụlọ nsọ Ashtoret, chi nwanyị bụ́ nwunye Beal. Ọ na-ede, sị: “Nanị nzọụkwụ ole na ole site n’ụlọ nsọ nke a ka e nwere ebe ili ozu, ebe a chọtara ọtụtụ ite ájá, ndị akụkụ ahụ nke ụmụ ọhụrụ dị n’ime ha bụ́ ndị a chụworo n’àjà n’ụlọ nsọ nke a . . . Ndị amụma nke Beal na Ashtoret bụ ndị isi n’igbu obere ụmụaka.” “Ihe omume ọzọ jọgburu onwe ya bụ [ihe] ha kpọrọ ‘àjà ntọala.’ Mgbe a ga-ewu ụlọ, a ga-achụ nwatakịrị n’àjà, a ga-ewukwa ozu ya ka ọ bụrụ mgbidi.”
20 Halley na-ekwu, sị: “Ofufe nke Beal, Ashtoret, na chi ndị ọzọ nke Kenean jupụtara n’imebiga ihe arụ ókè; ụlọ nsọ ha nile bụ ogige nke ajọ omume. . . . Ndị Kenean fere ofufe, site n’itinye aka n’omume rụrụ arụ, . . . mgbe ahụkwa, site n’igbu ụmụ ha ndị e bu ụzọ mụọ, dị ka àjà nyekwa chi ndị a. O yiri ka, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, ala Kenean aghọwo nke yiri Sọdọm na Gọmọra n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru mba ọnụ. . . . Mmepeanya nke omume rụrụ arụ na nke ime ihe ike jọgburu onwe ya dị otú ahụ ọ̀ ka kwesịrị ịnọ na-adịgide? . . . Ọ tụrụ ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie, bụ́ ndị gwuru ihe ná mkpọmkpọ ebe ndị ahụ nke obodo ndị Kenean n’anya na Chineke ebibighị ha n’oge karịa ka O mere.”—Tụlee 1 Ndị Eze 21:25, 26.
21. Myirịta dị aṅaa dị n’etiti ọnọdụ ndị Kenean na nke ụbọchị anyị?
21 Ajọ omume nke ndị Amọraịt ‘ezuwo.’ Ya mere Jehova ziri nnọọ ezi ugbu a ikpochapụ ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ụwa a jupụtara n’ime ihe ike, omume rụrụ arụ, na ilelị iwu Chineke. Ebe ọ bụkwa na ịchụ ụmụaka n’àjà n’ụzọ dị oké njọ na Kenean oge ochie na-asọ anyị oyi n’ụzọ ziri ezi, gịnị banyere àjà e ji ọtụtụ iri nde ndị na-eto eto achụ n’agha nke ụwa a, nke dị njọ nke ukwuu karịa ihe ọ bụla na Kenean? N’ezie, Jehova ziri nnọọ ezi ugbu a iweta ajọ usoro ihe a ná njedebe.
Ịrụzu Ihe Ọzọ
22. Gịnị ka ndidi Jehova na-arụzu n’oge anyị?
22 Ndidi Jehova na mgbe ikpeazụ a na-arụzu ihe ọzọkwa. Ọ na-enye oge iji chịkọta ma kụziere oké ìgwè mmadụ ahụ ihe, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha karịwororị nde ise. N’okpuru nduzi Jehova, a haziwo ha ịbụ nzukọ na-aga n’ihu. A na-azụ ndị ikom, ndị inyom, na ndị ntorobịa ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Bible. Site ná nzukọ na mbipụta ha ndị dabeere na Bible, ha na-amụta ụzọ ịhụnanya Chineke. (Jọn 13:34, 35; Ndị Kọlọsi 3:14; Ndị Hibru 10:24, 25) Tụkwasị na nke a, ha na-azụlite nkà n’iwu ihe owuwu, ígwè electronic, obibi akwụkwọ, na aka ọrụ ndị ọzọ iji kwadoo nkwusa nke “ozi ọma” ahụ. (Matiu 24:14) O yikarịrị ka a ga-eji ụdị nkụzi na nkà iwu ihe owuwu ahụ eme ihe n’ụzọ sara mbara n’ụwa ọhụrụ ahụ.
23. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ùgwù ịdị ndụ n’oge a?
23 Ee, taa Jehova na-akwadebe ndị ohu ya maka ịgabiga “mkpagbu ukwu” ahụ banye n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume. Mgbe ahụ a gaghị enwe Setan na ụwa ọjọọ ya ịgbaso mgba, ọrịa, iru újú, na ọnwụ adịghị. Site n’ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ dị ukwuu, ndị Chineke ga-aga n’ihu n’ọrụ obi ụtọ nke iwu paradaịs, ebe ụbọchị ọ bụla ‘ga-atọ ụtọ.’ Lee ka anyị si nwee ihe ùgwù ịdị ndụ ná njedebe a nke oge, ịmara na ijere Jehova ozi, na ịghọta na n’isi nso anyị ‘ga-eweli isi anyị elu n’ihi na mgbapụta anyị na-eru nso’!—Luk 21:28; Abụ Ọma 146:5.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ Gịnị bụ “mkpagbu ukwu” ahụ, oleekwa otú o si amalite?
◻ N’ihi gịnị ka mwakpo nke Gọg ga-awakpo ndị ohu Jehova ga-eji akụ afọ n’ala?
◻ Olee otú “mkpagbu ukwu” ahụ si ejedebe?
◻ Uru ndị dị aṅaa dị ebube ka ụwa ọhụrụ ahụ ga-eweta?
◻ N’ihi gịnị ka Jehova jiworo cheruo ogologo oge tupu ya eweta usoro ihe a ná njedebe?
[Foto dị na peeji nke 16]
A ga-eme ka ụwa nile ghọọ paradaịs