Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 4/1 p. 9-13
  • Nwee Obi Ike Ka Mgbapụta Na-eru Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwee Obi Ike Ka Mgbapụta Na-eru Nso
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Oge Dị Oké Egwu”
  • O Nweghị Mgbapụta Sitere n’Aka Mmadụ
  • Mgbapụta Dị Nso—Maka Olee Ndị?
  • Onye Mgbapụta Bụ Isi
  • Mgbapụta n’Oge Gara Aga
  • Kwadebe Maka Mgbapụta Banye n’Ime Ụwa Ọhụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Oge Eruwela Mgbe Alaeze Chineke Ga-anapụta Anyị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ì Nwere Ekele Maka Ihe Jehova Mere Iji Napụta Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Mgbapụta Baa n’Ụwa Ọhụrụ Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 4/1 p. 9-13

Nwee Obi Ike Ka Mgbapụta Na-eru Nso

“Gị ka M nọnyeere, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ịnapụta gị.”—JEREMAỊA 1:19.

1, 2. N’ihi gịnị ka ezinụlọ mmadụ ji nwee mkpa mgbapụta?

MGBAPỤTA! Lee okwu na-akasi obi ọ bụ! Ịbụ onye a gbapụtara pụtara ịbụ onye a napụtara, a tọhapụrụ site n’ọnọdụ ọjọọ, nke obi ilu. Nke a na-agụnye echiche nke ịbụ onye a kpọbatara n’ọnọdụ ka mma, nke obi ụtọ dị karị.

2 Lee ka ezinụlọ mmadụ si nwee mkpa dị ukwuu maka ụdị mgbapụta ahụ n’oge a! Nsogbu ndị siri ike—nke akụ̀ na ụba, ọha mmadụ, elu ahụ, uche, na mmetụta uche—na-ebogbu ma na-akụda mmụọ ndị mmadụ n’ebe nile. Ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ enweghị afọ ojuju, ha nwekwara ndakpọ olileanya n’ụzọ ụwa si aga, ha ga-achọkwa ka ihe gbanwee wee ka mma.—Aịsaịa 60:2; Matiu 9:36.

“Oge Dị Oké Egwu”

3, 4. N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa ka ukwuu maka mgbapụta ugbu a?

3 Ebe ọ bụ na narị afọ nke 20 nke a ahụjuwo anya n’ụzọ dị ukwuu karịa nke ọ bụla ọzọ, e nwere mkpa ka ukwuu maka mgbapụta ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Taa, ihe karịrị nnọọ otu ijeri mmadụ bi n’ogbenye ọnụ ntụ, ọnụ ọgụgụ ahụ jikwa ihe dị ka nde 25 kwa afọ na-amụba. Kwa afọ ihe dị ka nde ụmụaka 13 na-anwụ site n’erighị nri na-edozi ahụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ịda ogbenye na-akpata—ihe karịrị 35,000 otu ụbọchị! Ọtụtụ nde ndị okenye na-anwụchukwa site n’ọrịa dị iche iche.—Luk 21:11; Mkpughe 6:8.

4 Agha na ọgba aghara dị iche iche nke obodo akpatawo ahụhụ dị oké ukwuu. Akwụkwọ bụ́ Death by Government na-ekwu na agha, esemokwu agbụrụ na okpukpe, na igbu mmadụ n’ìgwè nke ọchịchị na-egbu ụmụ amaala ha “egbuwo ihe karịrị nde mmadụ 203 na narị afọ a.” Ọ gara n’ihu na-asị: “A pụrụ ime atụmatụ ndị nwụrụ anwụ ịbụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ 360. O yiri nnọọ ka ụdị anyị abụrụwo nke Ihe Otiti Ojii nke oge a bibisịrị. N’ezie o mewokwa otú ahụ, kama ọ bụ ihe otiti nke Ike, ọ bụghị nje.” Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Richard Harwood kwuru, sị: “Agha ime ọhịa nke narị afọ ndị gara aga dị nnọọ obere n’iji ihe tụnyere ibe ya.”—Matiu 24:6, 7; Mkpughe 6:4.

5, 6. Gịnị mere oge anyị ji bụrụ nke na-enye oké nsogbu?

5 N’ịgbakwụnye ihe n’ọnọdụ ndị na-enye nsogbu nke afọ ndị na-adịbeghị anya bụ mmụba dị ukwuu nke mpụ ime ihe ike, omume rụrụ arụ, na ndakpọ ezinụlọ. Onye bụbu Odeakwụkwọ Agụmakwụkwọ nke United States bụ́ William Bennett kwuru na n’ime afọ 30 ụba mmadụ United States ji 41 pasent too, ma mpụ ime ihe ike ji 560 pasent too, ịmụ nwa mkpuke 400 pasent, ịgba alụkwaghịm 300 pasent, ọ̀tụ̀tụ̀ igbu onwe onye nke ndị nọ n’afọ iri na ụma dịkwa 200 pasent. Prọfesọ John DiIulio, Jr., nke Mahadum Princeton dọrọ aka ná ntị banyere òtù nke ndị na-eto eto “na-ebibi ihe gafee ókè,” bụ́ ndị “na-egbu mmadụ, na-eme mwakwasị, na-edina n’ike, na-apụnara ihe, na-ezu ohi ma na-akpata ọgba aghara obodo dị oké njọ. Ha adịghị atụ egwu ihere nke njide, ihe mgbu nke ịga mkpọrọ, ma ọ bụ ahụhụ nke akọ na uche.” N’ala ahụ, igbu ọchụ bụ ugbu a ihe nke abụọ bụ isi na-akpata ọnwụ n’etiti ndị nọ n’afọ 15 ruo 19. Ụmụaka ọzọkwa na-erubeghị afọ anọ na-anwụ site ná mmetọ karịa site n’ọrịa.

6 Ọ bụghị nanị n’otu mba ka ụdị mpụ na ime ihe ike ahụ dị. Ihe ka n’ọtụtụ ala na-akọ ihe yiri nke ahụ. Ihe na-atụnye ụtụ na nke a bụ mmụba nke iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ iwu na-akwadoghị nke na-emerụ ọtụtụ nde. The Sydney Morning Herald nke Australia kwuru, sị: “Ịgba mgbere ọgwụ ọjọọ nke mba nile aghọwo achụmnta ego nke abụọ kasị enye ego n’ụwa ma e wepụ ahịa ngwá agha.” Ihe ọzọ bụ ime ihe ike na omume rụrụ arụ nke jupụtara telivishọn ugbu a. N’ọtụtụ mba, ka nwatakịrị na-erule afọ 18, ọ hụwo ọtụtụ iri puku nke omume ime ihe ike na TV nakwa ndị nke omume rụrụ arụ a na-apụghị ịgụta ọnụ. Nke ahụ bụ mmetụta dị ịrịba ama na-emerụ emerụ, ebe ihe anyị na-etinye n’uche anyị mgbe nile na-akpụzi ụdị onye anyị bụ.—Ndị Rom 12:2; Ndị Efesọs 5:3, 4.

7. Olee otú amụma Bible si buru ụzọ kwuo banyere ọnọdụ ọjọọ dị ugbu a?

7 Amụma Bible buru ụzọ kwuo banyere ọnọdụ ndị a dị egwu na narị afọ anyị. Ọ sịrị na a ga-enwe agha zuru ụwa ọnụ, ọrịa juru ebe nile, ụkọ nri, na ịba ụba nke mmebi iwu. (Matiu 24:7-12; Luk 21:10, 11) Mgbe anyị tụlekwara amụma e dekọrọ na 2 Timoti 3:1-5, ọ dị nnọọ ka ige akụkọ ụwa kwa abalị. Ọ na-akọwa ọgbọ anyị dị ka “mgbe ikpeazụ,” na-akọwakwa ndị mmadụ dị ka ‘ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.’ Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe ụwa dị ka ya taa. Dị ka William Bennett kwetara: “E nwere nnọọ ọtụtụ ihe ịrịba ama nke . . . mmepeanya rere ure.” Ọbụna e kwuwo na mmepeanya gwụsịrị n’Agha Ụwa Mbụ.

8. N’ihi gịnị ka Chineke ji weta Iju Mmiri ahụ n’ụbọchị Noa, oleekwa ụzọ nke a si metụta ụbọchị anyị?

8 Ọnọdụ ugbu a dị njọ ọbụna karịa nke dị tupu Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, mgbe “ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” Laa azụ n’oge ahụ, ndị mmadụ n’ozuzu ha jụrụ ichegharị site n’ụzọ ọjọọ ha. N’ihi ya, Chineke sịrị: “Ụwa jupụtara n’ihe ike site na ha; ma, lee, M ga-ebibi ha.” Oké Iju Mmiri ahụ wetara ụwa ime ihe ike ahụ ná njedebe.—Jenesis 6:11, 13; 7:17-24.

O Nweghị Mgbapụta Sitere n’Aka Mmadụ

9, 10. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ghara ilegara ụmụ mmadụ anya iweta mgbapụta?

9 Mgbalị mmadụ hà pụrụ ịgbapụta anyị site n’ọnọdụ ọjọọ ndị a? Okwu Chineke na-aza, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Abụ Ọma 146:3; Jeremaịa 10:23) Ọtụtụ puku afọ nke akụkọ ihe mere eme akwadowo eziokwu ndị ahụ. Ụmụ mmadụ anwalewo usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụ̀ na ụba, na ọha mmadụ a pụrụ iche n’echiche, ma ọnọdụ na-aka njọ. A sị na e nwere ngwọta mmadụ, ọ gaara apụtaworị ìhè ugbu a. Kama nke ahụ, eziokwu dị na ya bụ na “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9; Ilu 29:2; Jeremaịa 17:5, 6.

10 Afọ ole na ole gara aga, onye bụbu onye ndụmọdụ nchebe nke mba United States bụ́ Zbigniew Brzezinski sịrị: “Nkwubi okwu a na-apụghị izere ezere banyere nnyocha e ji ezi obi mee nke ihe na-eme n’ụwa bụ na oké ọgba aghara ọha mmadụ, nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nsogbu akụ̀ na ụba, na esemokwu mba na mba yiri ka ọ ga-agbasawanye karị.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ihe ize ndụ nke na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu [bụ] ọnọdụ nke enweghị ọchịchị n’ụwa nile.” Ntụle ahụ nke ọnọdụ ụwa kwesịrị ekwesị taa ọbụna karị. N’ikwu banyere ọgbọ a nke mmụba ime ihe ike, otu uche akwụkwọ akụkọ bụ́ Register nke New Haven, Connecticut, kwupụtara, sị: “O yiri ka anyị agamiwo nke na anyị enweghịkwa ike ịkwụsị ya.” Ee e, a gaghị enwe nkwụsị nke mbibi ụwa a, n’ihi na amụma banyere “mgbe ikpeazụ” ndị a na-asịkwa: “Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.”—2 Timoti 3:13.

11. N’ihi gịnị ka mgbalị mmadụ na-agaghị eji agbanwe ọnọdụ na-aka njọ?

11 Ụmụ mmadụ apụghị ịgbanwe ihe a na-emenụ n’ihi na Setan bụ “chi nke oge a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Ee, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19; leekwa Jọn 14:30.) N’ụzọ ziri ezi Bible na-ekwu banyere ụbọchị anyị, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12) Setan maara na ọchịchị ya na ụwa ya agala ịgwụsị, ya mere o yiri “ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.”—1 Pita 5:8.

Mgbapụta Dị Nso—Maka Olee Ndị?

12. Maka ole ndị ka mgbapụta na-eru nso?

12 Ọnọdụ siri ike na-abawanye ụba n’ụwa bụ ihe àmà pụtara ìhè na mgbanwe dị ukwuu—n’ezie, mgbapụta dị ebube—dị nnọọ nso! Maka olee ndị? Mgbapụta na-eru nso maka ndị na-ege ntị n’ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị na ndị na-eme ihe kwesịrị ekwesị. Jọn nke Mbụ 2:17 na-egosi ihe a ga-emerịrị: “Ụwa [usoro ihe Setan] na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya, ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Leekwa 2 Pita 3:10-13.

13, 14. Olee otú Jisọs si mesie ike mkpa ọ dị ịmụrụ anya?

13 Jisọs buru amụma na a ga-ekpochapụ ọha mmadụ rụrụ arụ nke taa n’oge na-adịghị anya n’oge nsogbu “nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) Ọ bụ ya mere o ji dọọ aka ná ntị, sị: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà: n’ihi na otú a ka ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile. Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime.”—Luk 21:34-36.

14 Ndị ‘na-eze onwe ha’ ma ‘mụrụ anya’ ga-achọpụta uche Chineke ma mee ya. (Ilu 2:1-5; Ndị Rom 12:2) Ndị a bụ ndị ‘ga-aka n’ike ịgbanarị’ mbibi nke a ga-eweta n’elu usoro ihe Setan n’oge na-adịghị anya. Ha ga-enwekwa obi ike zuru ezu na a ga-agbapụta ha.—Abụ Ọma 34:15; Ilu 10:28-30.

Onye Mgbapụta Bụ Isi

15, 16. Ònye bụ Onye Mgbapụta bụ isi, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji jide n’aka na ikpe ya ga-abụ nke ezi omume?

15 Iji gbapụta ndị ohu Chineke, ọ dị mkpa ka e wepụ Setan na usoro ihe ya nile zuru ụwa ọnụ. Nke a chọrọ isi iyi nke mgbapụta ka mmadụ ike nke ukwuu. Isi iyi ahụ bụ Jehova Chineke, Eze Kasị Elu, Onye Okike pụrụ ime ihe nile nke eluigwe na ala dị egwu. Ọ bụ Onye Mgbapụta bụ isi: “Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Jehova; ọ dịghịkwa onye nzọpụta dị ma ọ́ bụghị nanị m.”—Aịsaịa 43:11; Ilu 18:10.

16 N’ime Jehova e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ukwuu nke ike, amamihe, ikpe ziri ezi, na ịhụnanya. (Abụ Ọma 147:5; Ilu 2:6; Aịsaịa 61:8; 1 Jọn 4:8) Ya mere mgbe o mere ihe o kpere n’ikpe, anyị ga-ejide n’aka na ihe ndị o mere ga-abụ ihe ezi omume. Abraham jụrụ, sị: “Onye ikpe ụwa nile, Ọ́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe?” (Jenesis 18:24-33) Pọl tiri ná mkpu, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ajọ omume dị n’ebe Chineke nọ? Chineke ekwela.” (Ndị Rom 9:14) Jọn dere, sị: “Ee, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile, ikpe Gị nile bụ eziokwu na ikpe ziri ezi.”—Mkpughe 16:7.

17. Olee otú ndị ohu Jehova n’oge gara aga siworo gosipụta obi ike ná nkwa ya?

17 Mgbe Jehova kwere nkwa mgbapụta, ọ ghaghị imezu ya. Joshua sịrị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova gwara ụlọ Israel.” (Joshua 21:45) Solomọn sịrị: “Ọ dịghị otu okwu dapụrụ n’okwu Ya nile dị mma, nke O kwuru.” (1 Ndị Eze 8:56) Pọl onyeozi kwuru na Abraham ‘ejighị ekweghị ekwe nwee obi abụọ . . . na-ekwezukwa na ihe [Chineke] kwere ná nkwa, Ọ pụrụ imekwa.’ N’otu aka ahụ Sera “gụrụ [Chineke] n’Onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Onye kwererị nkwa.”—Ndị Rom 4:20, 21; Ndị Hibru 11:11.

18. N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova taa pụrụ iji nwee obi ike na a ga-agbapụta ha?

18 N’adịghị ka ụmụ mmadụ, a pụrụ ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam, ọ na-emezu okwu ya. “Jehova nke usuu nile nke ndị agha aṅụwo iyi, sị, N’ezie dị ka M cheworo, otú a ka ọ ga-adị; na dị ka M zubeworo, nke ahụ ga-eguzosi ike.” (Aịsaịa 14:24) Ya mere mgbe Bible na-ekwu na “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọchị ikpe,” anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu na nke a ga-eme. (2 Pita 2:9) Ọbụna mgbe ndị iro dị ike ji mbibi yie ha egwu, ndị ohu Jehova na-enwe obi ike n’ihi àgwà ya, nke e gosipụtara ná nkwa o kwere otu n’ime ndị amụma ya, sị: “Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha agaghị enwe ike imegide gị: n’ihi na gị ka M nọnyeere, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ịnapụta gị.”—Jeremaịa 1:19; Abụ Ọma 33:18, 19; Taịtọs 1:2.

Mgbapụta n’Oge Gara Aga

19. Olee otú Jehova si gbapụta Lọt, gịnị yiri ya maka oge anyị?

19 Anyị pụrụ ịbụ ndị a gbara ume nke ukwuu site n’ịkọ ụfọdụ ihe omume nzọpụta gara aga nke Jehova. Dị ka ihe atụ, Lọt bụ onye ajọ omume nke Sọdọm na Gọmọra ‘na-ewute nke ukwuu.’ Ma Jehova rịbara ama “iti mkpu” megide obodo ndị ahụ. N’oge kwesịrị ekwesị, o zijere ndị ozi ya ịgba Lọt na ezinụlọ ya ume ịgbapụ n’ebe ahụ ozugbo. Gịnị si na ya pụta? Jehova wee “dọpụta Lọt, bụ́ onye ezi omume,” “wee mee ka obodo Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ.” (2 Pita 2:6-8; Jenesis 18:20, 21) Taakwa, Jehova na-anụ mkpu a na-eti banyere oké ajọ omume nke ụwa a. Mgbe ndị ozi nke oge a rụzuworo ọrụ ịgba àmà ha dị ngwa ruo n’ókè ọ chọrọ, ọ ga-eme ihe megide ụwa a ma gbapụta ndị ohu ya dị ka o mere Lọt.—Matiu 24:14.

20. Kọwaa mgbapụta Jehova gbapụtara Israel oge ochie n’aka Ijipt.

20 N’Ijipt oge ochie e ji ọtụtụ nde ndị Chineke mere ohu. Jehova kwuru banyere ha, sị: “Anụwokwa m iti mkpu ha . . . n’ihi na amawo m ihe mgbu ha nile; M wee rịdata ịnapụta ha.” (Ọpụpụ 3:7, 8) Otú ọ dị, mgbe ọ hapụsịrị ndị Chineke ka ha lawa, Fero gbanwere obi ya wee jiri usuu ndị agha ya dị ike chụsoo ha. O yiri ka a matara ụmụ Israel n’ọnyà n’Osimiri Uhie. Ma Mosis kwuru, sị: “Unu atụla egwu, guzonụ onwe unu n’ebe a, hụ nzọpụta Jehova, nke Ọ ga-emere unu taa.” (Ọpụpụ 14:8-14) Jehova kewara Osimiri Uhie ahụ, ụmụ Israel alafere. Usuu ndị agha Fero chụsoro ha, ma Jehova ji ike ya mee ihe nke na “oké osimiri kpuchiri ha: ha mikpuru dị ka opu n’ime mmiri dị ebube.” Mgbe e mesịrị, Mosis ṅụrịrị ọṅụ n’abụ nye Jehova, sị: “Ònye dị ka Gị, dị ebube n’ịdị nsọ? Onye a na-atụ egwu n’otuto nile, na-eme ihe ebube dị iche iche.”—Ọpụpụ 15:4-12, 19.

21. Olee otú e si zọpụta ndị Jehova n’aka Amọn, Moab, na Sia?

21 N’oge ọzọ, mba ndị iro bụ́ Amọn, Moab, na Sia (Edọm) ji mbibi yie ndị Jehova egwu. Jehova sịrị: “Unu onwe unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ ihu ìgwè mmadụ a [ndị iro] bara ụba; n’ihi na ọ bụghị unu nwe agha nke a, kama ọ bụ Chineke nwe. . . . Ọ bụghị unu ga-enwe ibu agha . . . Guzo, hụ nzọpụta Jehova n’etiti unu.” Jehova gbapụtara ndị ya site n’itinye ọgba aghara n’ìgwè ndị iro ahụ nke na ha gburịtara ibe ha.—2 Ihe Emere 20:15-23.

22. Mgbapụta ọrụ ebube dị aṅaa pụọ n’aka Asiria ka Jehova wetaara Israel?

22 Mgbe Ike Ụwa bụ́ Asiria bịara megide Jerusalem, Eze Senakerib mara Jehova aka site n’ịgwa ndị nọ n’elu mgbidi ahụ sị: “Olee ndị n’etiti chi nile nke ala ndị a [m meriworo] ka ha bụ, bụ́ ndị napụtara ala ha n’aka m, na Jehova ga-anapụta Jerusalem n’aka m?” Nye ndị ohu Chineke o kwuru, sị: “Unu ekwela ka Hezekaịa mee ka unu tụkwasị Jehova obi, sị, Jehova aghaghị ịnapụta anyị.” Mgbe ahụ Hezekaịa kpesiri ekpere ike maka mgbapụta, “ka alaeze nile nke ụwa wee mara na Gị onwe gị bụ Jehova, nanị Gị.” Jehova gburu ndị agha Asiria 185,000, a gbapụtakwara ndị ohu Chineke. Mgbe e mesịrị, ka Senakerib nọ na-efe chi ụgha ya, ụmụ ya ndị ikom gburu ya.—Aịsaịa, isi nke 36 na 37.

23. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka a zaa banyere mgbapụta taa?

23 N’ezie anyị pụrụ inwe obi ike mgbe anyị hụrụ otú Jehova si gbapụta ndị ya n’ụzọ dị ebube n’oge gara aga. Gịnị banyere taa? N’ime ọnọdụ dị ize ndụ dị aṅaa ka ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ga-abanye n’isi nso nke ga-achọ mgbapụta ya n’ụzọ ọrụ ebube? N’ihi gịnị ka o ji chere ruo ugbu a iji gbapụta ha? Mmezu dị aṅaa ga-adị banyere okwu Jisọs: “Mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso”? (Luk 21:28) Oleekwa otú mgbapụta ga-esi bịara ndị ohu Chineke ndị nwụwororịị? Isiokwu na-esonụ ga-enyocha ajụjụ ndị a.

Ajụjụ Ntụleghachi

◻ N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa dị ukwuu maka mgbapụta?

◻ N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji legara ụmụ mmadụ anya maka mgbapụta?

◻ Maka ole ndị ka mgbapụta dị nso?

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike ná mgbapụta Jehova?

◻ Ihe atụ ndị dị aṅaa nke mgbapụta ndị gara aga na-agba ume?

[Foto dị na peeji nke 10]

Abraham so ná ndị nwere obi ike zuru ezu na Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya