Ndị A Hà Bụ Mgbe Ikpeazụ n’Ezie?
Ị NỌ n’ihu ụgbọ epeepe ka ọ na-abanye akụkụ dị njọ nke osimiri. Site n’etiti nsọpụta ụfụfụ na mmali mmiri, nkume ndị buru ibu na-apụta ìhè. Ị na-agbalị izere ha. Onye nke nọ n’azụ gị kwesịrị inyere gị aka ịkpa ụgbọ ahụ, ma o nwere ahụmahụ dị nta. Nke ka njọ, i nweghị map, n’ihi ya ị maghị ma mmiri a na-asọ ngwa ngwa ọ̀ ga-asọba n’ọdọ dị jụụ ka ọ bụ ná nsụda mmiri.
Ọ bụghị ọnọdụ na-atọ ụtọ, ka ọ̀ bụ? Ya mere ka anyị gbanwee ya. Ka e were ya na i nwere onye nduzi nwere ahụmahụ gị na ya so, onye nke maara nkume nile, mgbagọ nile nke osimiri a. O buruworị ụzọ mara na a na-erute mmiri a na-agbọ ụfụfụ, ọ maara ebe ọ ga-akwụsị, ọ makwaara otú ọ ga-esi gafee na ya. Ọ̀ bụ na ị gaghị anọrọ ná ntụkwasị obi nke ukwuu karị?
N’ezie, anyị nile nọ ná nsogbu yiri nke a. Anyị na-achọta onwe anyị, n’abụghị ihe anyị kpatara, n’oge dị njọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ amaghị ogologo oge ihe ga-adị otú a, ma ọnọdụ ọ̀ ga-akawanye mma, ma ọ bụ ụzọ kasị mma isi nagidegodị ya ugbu a. Ma anyị ekwesịghị iche na anyị amaghị ihe anyị ga-eme ma ọ bụ na anyị enweghị enyemaka. Onye Okike anyị enyewo anyị ihe nduzi—nke buru amụma banyere oge a gbara ọchịchịrị nke akụkọ ihe mere eme, na-ebu amụma ụzọ ọ ga-esi kwụsị ma na-enye anyị nduzi dị anyị mkpa iji wee lanarị. Ihe nduzi ahụ bụ akwụkwọ, Bible. Onye Chepụtara ya, bụ́ Jehova Chineke, na-akpọ onwe ya Onye Nkụzi Ukwu, sitekwa n’ọnụ Aịsaịa ọ na-ekwu n’ụzọ imesi obi ike, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:20, 21) Ị̀ ga-anabata nduzi dị otú ahụ? Mgbe ahụ ka anyị tụlee ma Bible o buru amụma n’ezie ihe ụbọchị anyị ga-adị ka ya.
Ụmụazụ Jisọs Ajụọ Ajụjụ Bara Uru
Ọ ghaghị ịbụ na o juru ụmụazụ Jisọs anya. Jisọs ka gwapụrụ ha, n’ụzọ doro anya, na a ga-ebibi agadaga ihe owuwu ụlọ nsọ nke Jerusalem kpam kpam! Amụma dị otú ahụ bụ ihe ijuanya. Nwa oge ka e mesịrị, ka ha na-anọdụ n’elu Ugwu Olive, anọ n’ime ndị na-eso ụzọ jụrụ Jisọs, sị: “Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW; Mak 13:1-4) Ma hà ghọtara ya ma ọ bụ na ha aghọtaghị, azịza Jisọs ga-enwe ọtụtụ mmezu.
Mbibi nke ụlọ nsọ Jerusalem na ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu na oge ọnụnọ Kraịst na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke ụwa dum abụghị otu ihe. Ka o sina dị, n’azịza ya dị ogologo, Jisọs jiri nkà kwuo okwu banyere akụkụ ndị a nile nke ajụjụ ahụ. Ọ gwara ha otú ihe ga-adị ka ya tupu mbibi Jerusalem; ọ gwakwara ha ihe ha ga-atụ anya ụwa ịdị ka ya n’oge ọnụnọ ya, mgbe ọ ga na-achị dị ka Eze n’eluigwe ma fọdụ nke nta ka o weta usoro ihe nke ụwa dum n’ọgwụgwụ ya.
Ọgwụgwụ nke Jerusalem
Buru ụzọ tụlee ihe Jisọs kwuru banyere Jerusalem na ụlọ nsọ ya. Ihe karịrị iri afọ atọ tupu o mee, o buru amụma oge nke ihe isi ike dị egwu maka otu n’ime obodo ndị kasị ukwuu n’ụwa. Rịba ama karịsịa okwu ya e dekọrọ na Luk 21:20, 21: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu; ndị nọkwa n’etiti ya, ka ha si n’ime ya wezụga onwe ha; ndị nọkwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ịba n’ime ya.” Ọ bụrụ na a ga-agba Jerusalem gburugburu, usuu ndị agha agbaa ya okirikiri, olee otú “ndị nọkwa n’etiti ya” ga-esi nnọọ “gbalaga,” dị ka Jisọs nyeworo n’iwu? N’ụzọ doro anya, ihe Jisọs na-ekwu bụ na ohere ga-emepe. Ò mepere?
Na 66 O.A., ndị agha Rom nọ n’okpuru nduzi Cestius Gallus achụghachiwo ndị agha Juu na-enupụ isi na Jerusalem ma jichigide ha n’ime obodo ahụ. Ọbụna ndị Rom ahụ wabara n’ime obodo ahụ n’onwe ya ma rute ná mgbidi ụlọ nsọ ahụ. Ma mgbe ahụ Gallus duziri ndị agha ya ime ihe na-agbagwoju anya n’ezie. O nyere ha iwu ịlaghachi! Ndị agha Juu jupụtara n’ọṅụ malitere ịchụso ndị iro ha na-alaghachi azụ bụ́ ndị Rom, merụọkwa ha ahụ. Otú a, ohere Jisọs buru amụma ya meghepụrụ. Ezi ndị Kraịst ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị ya ma si na Jerusalem gbapụ. Nke a bụ ihe amamihe, n’ihi na nanị afọ anọ ka e mesịrị, ndị agha Rom laghachiri, na-enwe Ọchịagha Titus dị ka onye ndú. N’oge a mgbapụ agaghị ekwe omume.
Ndị agha Rom gbara Jerusalem gburugburu ọzọ; ha gwuru ekpe nke ịga gburugburu ya. Jisọs ebuwo amụma banyere Jerusalem, sị: “Ụbọchị ga-abịakwasị gị, mgbe ndị iro gị ga-egwu ekpe na ịga imegide gị, nọgidekwa gị gburugburu, jigidekwa gị n’akụkụ nile.”a (Luk 19:43) N’oge na-adịghị anya, Jerusalem dara; e tituru ụlọ nsọ ya dị ebube ịbụ mkpọmkpọ ebe na-akwụ anwụrụ. E mezuru okwu Jisọs nile!
Otú ọ dị, Jisọs bu ihe karịrị mbibi nke Jerusalem n’uche. Ndị na-eso ụzọ ya ajụwokwa ya banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya. Ha amaghị ya mgbe ahụ, ma nke a zoro aka n’oge mgbe a ga-echi ya echichi ịchị dị ka Eze n’eluigwe. Gịnị ka o buru amụma ya?
Agha na Mgbe Ikpeazụ
Ọ bụrụ na ị gụọ Matiu isi nke 24 na 25, Mak isi nke 13, na Luk isi nke 21, ị ga-ahụ ihe àmà doro anya na Jisọs na-ekwu banyere ọgbọ anyị. O buru amụma banyere oge agha—ọ bụghị nanị “agha dị iche iche na akụkọ agha dị iche iche” ndị mebiworo akụkụ ihe mere eme mmadụ, kama agha nke gụnyere ‘mba megide mba, na alaeze megide alaeze’—ee, agha ndị dị ukwuu zuru ụwa dum.—Matiu 24:6-8.
Cheedị echiche nwa oge banyere ụzọ agha siworo gbanwee na narị afọ anyị. Mgbe agha pụtara nanị obubuagha nke ndị agha na-anọchite anya mba abụọ na-emegiderịta onwe ha, na-eji mma agha na-egbu ma ọ bụ ọbụna na-agbarịta ibe ha egbe n’ihu agha, ọ dị nnọọ egwu. Ma na 1914 Agha Ukwu ahụ tiwapụrụ. Mba sooro mba ọzọ banye n’agha kpụ ọkụ n’ọnụ n’ụzọ onye banye ibe ya eso ya—agha mbụ zuru ụwa ọnụ. E mere égbè na-agba n’akwụsịghị akwụsị iji gbuo ọtụtụ ndị mmadụ site n’ebe ndị dịkwu anya. Égbè na-awụpụ mgbọ na-agbọpụsị mgbọ n’ehieghị ụzọ; mustard gas gbara ọkụ, mekpaa ahụ, kwarụọ, ma gbuo ọtụtụ puku ndị soja; ụgbọ agha tankị gafere n’ihu agha ndị iro n’enweghị obi ebere, égbè ukwu ha na-agbapụ mgbọ. E jikwa ụgbọelu na ụgbọ agha okpuru mmiri mee ihe—nanị ihe mgbaàmà nke ihe ndị ha ga-aghọ.
Agha Ụwa nke Abụọ mere ihe a na-apụghị icheli n’echiche—n’ezie o mere ka nke bu ya ụzọ dị oké nta, na-egbu ọtụtụ nde ndị mmadụ. Akataka ụgbọ agha na-ebu ụgbọelu, bụ́ nnọọ obodo na-ese n’elu mmiri, na-agafe n’oké osimiri ma na-ezipụ ụgbọelu e ji eje agha iji site n’igwe zodata ọnwụ n’isi ndị iro. Ụgbọ agha okpuru mmiri na-agbapụ torpedo ma na-eme ka ụgbọ mmiri ndị iro mikpuo. A tụkwara bọmbụ atọm, na-ala ọtụtụ puku ndụ ndị mmadụ n’iyi ná mgbawapụ ọ bụla! Dị nnọọ ka Jisọs buru n’amụma, n’ezie e nwewo “ihe dị egwu” iji kaa ọgbọ a na-alụ agha akara.—Luk 21:11.
Agha o belatawo eri Agha Ụwa nke Abụọ? Ọ dịghị ma ọlị. Mgbe ụfọdụ a na-alụ ọtụtụ agha n’ime otu afọ—ọbụna n’iri afọ a nke afọ ndị 1990—na-egbu ọtụtụ nde. E nwewokwa mgbanwe ná ndị bụ isi agha na-egbu. Ọ bụkwaghị nanị ndị soja na-anwụ. Taa, ihe ka ọtụtụ ná ndị agha gburu—n’ezie, ihe karịrị 90 pasent n’ime ha—bụ ndị nkịtị.
Akụkụ Ndị Ọzọ nke Ihe Ịrịba Ama Ahụ
Agha bụ nanị otu akụkụ nke ihe ịrịba ama Jisọs kpọtụrụ uche. Ọ dọkwara aka ná ntị na a ga-enwe “oké ụnwụ.” (Matiu 24:7) Otú ahụ ka ọ dịwokwara, ọ bụ ezie na n’ụzọ eziokwu na-agba gharịị ụwa na-emepụta ihe oriri karịa ka ọ dị mkpa iji zụọ ihe nile a kpọrọ mmadụ, ọ bụ ezie na sayensị ịkọ ugbo agawo n’ihu karịa ka ọ dị mgbe ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme mmadụ, ọ bụ ezie na e nwere usoro mbugharị ihe nke dị mma ma na-aga ọsọ ọsọ iji buga ihe oriri n’ebe ọ bụla n’ụwa. N’agbanyeghị ihe ahụ nile, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ ise nke ụba mmadụ ụwa na-akwụ agụụ kwa ụbọchị.
Jisọs bukwara amụma na “n’ebe dị iche iche” a ga-enwe “ajọ ọrịa na-efe efe.” (Luk 21:11) Ọzọ, ọgbọ anyị ahụwo ọnọdụ eziokwu na-agba gharịị dị mgbagwoju anya—nlekọta ahụ ike ka mma karịa ka ọ dị mgbe ọ bụla, ịga n’ihu ná nkà na ụzụ, ọgwụ iji gbochie ọrịa ndị a na-ahụkarị; ma ọrịa ndị na-efe efe agawokwa n’ihu n’ụzọ a na-enwetụbeghị ụdị ya n’otu aka ahụ. Ahụ Ọkụ Spain sochiri Agha Ụwa Mbụ ozugbo ma laa ọtụtụ ndụ n’iyi karịa ka agha ahụ mere. Ọrịa a na-efe efe nke ukwuu nke na n’obodo ukwu ndị dị ka New York, a pụrụ ịda ndị mmadụ nhá ma ọ bụ tụọ ha mkpọrọ nanị n’ihi ịma uzere! Taa, ọrịa cancer na ọrịa obi na-ala ọtụtụ nde ndụ n’iyi kwa afọ—ọrịa na-efe efe n’ezie. AIDS anọgidewokwa na-egbu ndị mmadụ, bụ́ nke sayensị ahụ ike na-egbochibeghị.
Ọ bụ ezie na Jisọs n’ụzọ dị ukwuu kwuru banyere mgbe ikpeazụ n’ihe metụtara ọnọdụ akụkọ ihe mere eme na ndọrọ ndọrọ ọchịchị gbasapụrụ ebe nile, Pọl onyeozi tụkwasịrị uche karị ná nsogbu ọha na eze na omume ndị ga-ejupụta ebe nile. O dere, ná mkpirikpi, sị: “Mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.”—2 Timoti 3:1-5.
Okwu ndị a hà yiri ihe ndị ị ma? Tụlee nanị otu akụkụ nke nretọ ọha na eze n’ụwa taa—nkewasị nke ezinụlọ. Oké ịrị elu nke ezinụlọ ndị kewara ekewa, ndị di ma ọ bụ nwunye e tiri ihe, ụmụaka e metọrọ, na ndị nne na nna meworo agadi e mesoro omume ọjọọ—lee ka ndị a si egosi na ndị mmadụ bụ “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ,” na ha “dị ka anụ ọhịa,” na ọbụna “na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha,” “ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya”! Ee, anyị na-ahụ àgwà ndị a n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu taa.
Ọgbọ Anyị Ọ̀ Bụ nke ahụ E Buru n’Amụma?
Otú ọ dị, ị pụrụ iche, sị, ‘Ọ̀ bụ na ọnọdụ ndị a adịghị eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti mgbe nile? Olee otú anyị si mara na ọgbọ anyị nke oge a bụ nke ahụ e buru n’amụma oge ochie ndị a?’ Ka anyị tụlee ụzọ ihe àmà atọ nke na-egosi na Jisọs na-ekwu banyere oge anyị.
Nke mbụ, ọ bụ ezie na e nwere mmezu mbụ, nke dị nta ná mbibi nke Jerusalem na ụlọ nsọ ya, okwu Jisọs na-atụ aka kpọmkwem n’ọdịnihu gabigara oge ahụ. Ihe dị ka afọ 30 mgbe ọdachi nke bibiri Jerusalem gasịrị, Jisọs nyere Jọn onyeozi ahụ meworo agadi ọhụụ na-egosi na ọnọdụ ndị e buru n’amụma—agha, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na ọnwụ na-esi na ha apụta—ga-abịa n’ụwa nile n’ọdịnihu. Ee, ahụhụ ndị a ga-agụnye, ọ bụghị otu ógbè, kama “ụwa” n’ozuzu ya.—Mkpughe 6:2-8.
Nke abụọ, na narị afọ a, a na-emezu akụkụ ụfọdụ nke ihe ịrịba ama Jisọs n’ihe anyị pụrụ ịkpọ ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ukwuu. Dị ka ihe atụ, è nwere ohere maka agha ịdị oké njọ karịa ka ha dịworo eri 1914? Ọ bụrụ na e nwere Agha Ụwa nke Atọ, ebe mba nile taa nwere ike nuklia ga-ewepụta ngwá agha ha, o yikarịrị ka ihe ọ ga-arụpụta ga-eme ụwa ihe mkpofu rere ọkụ—ihe a kpọrọ mmadụ ga-apụkwa n’anya. N’ụzọ yiri nke ahụ, Mkpughe 11:18 buru amụma na n’ụbọchị ndị a mgbe mba nile ‘ga-ewe iwe,’ ihe a kpọrọ mmadụ ga “na-emebi ụwa.” Na nke mbụ ya n’akụkọ ihe mere eme, mmetọ na mmerụ nke gburugburu ebe obibi na-eyi ịdị mma obibi nke mbara ụwa a egwu ugbu a! Ya mere akụkụ a kwa na-ahụ mmezu ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu ma ọ bụ fọrọ nke nta ka o mee otú ahụ. Agha na mmetọ hà pụrụ n’ezie ịnọgide na-aka njọ ruo mgbe mmadụ bibiworo onwe ya na mbara ụwa a? Ee e; n’ihi na Bible n’onwe ya na-enye iwu na ụwa ga-adịru ebighị ebi, na-enwe ụmụ mmadụ nwere ezi obi na-ebi n’elu ya.—Abụ Ọma 37:29; Matiu 5:5.
Nke atọ, ihe ịrịba ama nke mgbe ikpeazụ na-edo anya karịsịa mgbe e lere ya anya n’ozuzu ya. Ná ngụkọta, mgbe anyị chetara akụkụ dị iche iche Jisọs kpọtụrụ uche n’Oziọma atọ ahụ, ndị nke dị n’ihe odide Pọl, na ndị dị ná Mkpughe, ihe ịrịba ama nke a nwere ọtụtụ akụkụ. Mmadụ pụrụ ime nkatọ banyere ha otu otu, na-arụ ụka na ọgbọ ndị ọzọ ahụwo nsogbu ndị yiri nke ahụ, ma mgbe anyị na-atụlekọ ha nile, ha na-atụ aka n’ehieghị ụzọ nanị n’otu ọgbọ—nke anyị.
Otú ọ dị, gịnị ka ihe ndị a nile pụtara? Nanị ihe Bible mere ọ̀ bụ ịkọwa ọgbọ anyị dị ka oge olileanya na-adịghị? Ọ dịghị ma ọlị!
Ozi Ọma
E dekọrọ otu n’ime akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ nke kasị kwesị ịrịba ama na Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Na narị afọ a, Ndịàmà Jehova arụwo ọrụ pụrụ iche n’akụkọ ihe mere eme mmadụ. Ha anarawo ozi Bible banyere Alaeze Jehova Chineke—ihe ọ bụ, ụzọ o si achị, na ihe ọ ga-emezu—gbasaakwa ozi ahụ n’elu ụwa nile. Ha ebipụtawo akwụkwọ ọgụgụ n’isiokwu a n’ihe karịrị asụsụ 300 ma wetara ya ndị mmadụ n’ebe obibi ha ma ọ bụ n’okporo ámá ma ọ bụ n’ebe azụmahịa ha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ala nile dị n’ụwa.
N’ime otú ahụ, ha anọwo na-emezu amụma a. Ma ha anọwokwa na-agbasa olileanya. Rịba ama na Jisọs kpọrọ nke a “ozi ọma,” ọ bụghị ozi ọjọọ. Olee otú ọ pụrụ isi dị otú ahụ n’oge ndị a gbara ọchịchịrị? N’ihi na ozi bụ isi nke Bible abụghị otú ihe ga-adịru njọ n’ọgwụgwụ nke ụwa ochie a. Ozi ya bụ isi na-emetụta Alaeze Chineke, Alaeze ahụ na-ekwekwa nkwa ihe dị oké ọnụ ahịa nye obi nke mmadụ ọ bụla na-ahụ udo n’anya—mgbapụta.
Gịnị bụ nnọọ mgbapụta ahụ, oleekwa otú ọ pụrụ isi bụrụ nke gị? Biko tụlee isiokwu ndị na-esonụ n’isiokwu a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Titus nwere ohere inwe mmeri doro anya n’ebe a. Ka o sina dị, n’akụkụ abụọ dị mkpa, o mezughị ihe ọ chọrọ ime. O nyere ohere maka ịchịli aka elu n’udo, ma ndị ndú nke obodo ahụ jiri ịkpọ ekwo nkụ jụwaa isi. Mgbe e mesịkwara tituo mgbidi ahụ, o nyere iwu ka a hapụ ụlọ nsọ ahụ. Ma a gbara ya ọkụ kpam kpam! Amụma Jisọs emewo ka o doo anya na a ga-ebibi Jerusalem nakwa na a ga-etikpọ ụlọ nsọ ahụ kpam kpam.—Mak 13:1, 2.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Ndị mmadụ na-achọ azịza nye ajụjụ ndị na-enye nsogbu dị otú ahụ dị ka, N’ihi gịnị ka ihe ji dị oké njọ? Ebee ka ihe a kpọrọ mmadụ na-etinye isi?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Taa, ihe karịrị 90 pasent n’ime ndị na-emerụ ahụ n’agha bụ ndị nkịtị
[Foto dị na peeji nke 7]
Amụma Jisọs banyere mbibi nke Jerusalem mezuchara