Amụtara M Eziokwu Bible na Romania
DỊ KA GOLDIE ROMOCEAN SI KỌỌ
Na 1970, eletara m ndị òtù ezinụlọ m na Romania na nke mbụ ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 50. Ndị mmadụ bi n’okpuru ọchịchị aka ike nke Kọmunist, a dọkwara m aka ná ntị ugboro ugboro ịkpachara anya banyere ihe m na-ekwu. Mgbe ahụ, ka m guzo n’ọfịs gọọmenti n’obodo nta a mụrụ anyị, onye isi ọrụ gwara m ka m hapụ mba ahụ ozugbo. Tupu m kọwaa ihe kpatara ya, ka m kọọ otú m si mụta eziokwu Bible na Romania.
A MỤRỤ m na March 3, 1903, n’obodo nta Ortelec n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Romania n’ebe dị nso n’obodo Zalău. Anyị biri na gburugburu ndị mara mma. Mmiri na ikuku dị ọcha. Anyị kọrọ nri nke anyị, ọ dịghịkwa ihe kọrọ anyị n’ụzọ anụ ahụ. N’afọ ndị m bụ nwata, mba ahụ nọ n’udo.
Ndị mmadụ ji okpukpe kpọrọ oké ihe. N’ezie, ezinụlọ anyị nọ n’okpukpe atọ dị iche iche. Otu n’ime nne nne m bụ onye Orthodox Katọlik, onye nke ọzọ bụ onye Adventist, nne na nna m bụkwa ndị Baptist. N’ihi na ekwenyeghị m na nke ọ bụla n’ime okpukpe ha, ezinụlọ m sịrị na m ga-aghọ onye na-ekweghị na Chineke. ‘Ọ bụrụ na otu Chineke dị,’ ka m chere, ‘e kwesịrị inwe nanị otu okpukpe—ọ bụghị atọ n’ime otu ezinụlọ.’
Ihe ndị m hụrụ n’okpukpe nyere m nsogbu. Dị ka ihe atụ, onye ụkọchukwu na-aga n’ebe obibi dị iche iche ịnakọta ụtụ chọọchị. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enweghị ego inye, ọ na-achịrị blanket owu ha kasị mma n’ọnọdụ ya. Na chọọchị Katọlik, ana m ekiri nne nne m ka ọ na-egbu ikpere n’ihu ihe osise Meri. ‘Gịnị mere e ji ekpegara ihe osise ekpere?’ ka m chere.
Oge Jupụtara ná Nsogbu
Papa m gara United States na 1912 ịkpata ego iji kwụọ ụgwọ o ji. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị agha tiwapụrụ, ndị ikom obodo nta anyị pụkwara ịga lụọ agha—nanị ndị inyom, ụmụaka, na ndị agadi fọrọ. Ruo oge ụfọdụ, obodo nta anyị bara n’okpuru ịchịisi Hungary, ma e mesịa ndị agha Romania laghachiri ma wereghachi obodo nta ahụ. Ha nyere anyị iwu ịpụ n’egbughị oge. Otú ọ dị, n’ọkụ ọkụ na ọgba aghara nke ịchịkọba ngwongwo na ụmụaka n’ime ụgbọ ịnyịnya, a hapụrụ m. Ị ma, abụ m nke kasị okenye n’ime ụmụ ise.
Agbakwuuru m otu onye agbata obi, otu agadi nwoke na-agbapụghị, ọ sịkwara: “Laa ụlọ. Kpọchie ụzọ gị, ekwekwala ka onye ọ bụla bata.” Emere m otú ahụ ngwa ngwa. Mgbe m risịrị ofe ọkụkọ na nri e ji akwụkwọ cabbage sie, bụ́ nke a hapụworo mgbe a na-eme ngwa ngwa ịgbapụ, egburu m ikpere n’akụkụ àkwà m ma kpee ekpere. N’oge na-adịghị anya ụra ji ọsọ buru m.
Mgbe m mepere anya m, chi abọọla, m wee kwuokwa, sị: “Ewo, i meela, Chineke! Adị m ndụ!” Ahụ ájá ndị ahụ jupụtara n’oghere mgbọ égbè, ebe ọ bụ na a kwawo mgbọ n’akwụsịghị akwụsị n’abalị. Mgbe mama m ghọtara na mụ esoghị ha nọrọ n’obodo nta ọzọ ahụ, o zigara George Romocean na-eto eto, bụ́ onye chọtara m ma kpọghachite m. O teghị anya tupu anyị enwee ike ịlaghachi n’obodo nta a mụrụ anyị ma maliteghachi ibi n’ebe ahụ.
Ọchịchọ M Maka Eziokwu Bible
Mama m chọrọ ka e mee m baptism dị ka onye Baptist, ma achọghị m ime nke ahụ n’ihi na apụghị m ikwere na Chineke na-ahụ n’anya ga-akpọ ndị mmadụ ọkụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime hel. N’ịgbalị ịkọwa, nne m sịrị: “Eenụ, ma ọ bụrụ na ha bụ ndị ọjọọ.” Ma azaghachiri m, sị: “Ọ bụrụ na ha bụ ndị ọjọọ, gbuchapụnụ ha, kama atala ha ahụhụ. M gaghịdị ata nkịta ma ọ bụ nwamba ahụhụ.”
Ana m echeta na n’otu ụbọchị oge opupu ihe ubi, mgbe m dị afọ 14, mama m gwara m ka m kpọpụ ehi ka ha taa nri. Ka m dina n’elu ahịhịa n’akụkụ osimiri, ebe oké ọhịa dị gburugburu, elere m anya n’eluigwe wee kwuo, sị: “Chineke, ama m na ị nọ n’ebe ahụ; ma enweghị m mmasị na nke ọ bụla n’ime okpukpe ndị a. Ị ghaghị inwe otu nke dị mma.”
Ekwere m n’ezie na Chineke nụrụ ekpere m n’ihi na n’oge okpomọkụ ahụ nke 1917 kpọmkwem, Ndị Mmụta Bible abụọ (dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ) bịara obodo nta anyị. Ha bụ ndị colporteur, ma ọ bụ ndị ozi oge nile, ha bịakwara na chọọchị Baptist ahụ n’oge ụka na-aga n’ihu.
Eziokwu Bible Agbasaa na Romania
N’afọ ole na ole bu ụzọ, na 1911, Carol Szabo na Josif Kiss, bụ́ ndị ghọworo Ndị Mmụta Bible na United States, laghachiri Romania iji webata eziokwu Bible n’ebe ahụ. Ha biri na Tîrgu-Mureş, ihe na-erughị kilomita 160 na ndịda ọwụwa anyanwụ nke obodo nta anyị. N’ime afọ ole na ole, ọtụtụ narị mmadụ nakweere ozi Alaeze ahụ ma malite ije ozi ndị Kraịst.—Matiu 24:14.
Otú ọ dị, mgbe Ndị Mmụta Bible abụọ ahụ na-akatabeghị ahụ bịara chọọchị Baptist n’obodo nta anyị bụ́ Ortelec, George Romocean, ọ bụ ezie na ọ dị nanị afọ 18, nọ na-eduzi ụka ahụ, na-agbalịkwa ịkọwa ihe Ndị Rom 12:1 pụtara. N’ikpeazụ, otu n’ime ndị colporteur ahụ na-akatabeghị ahụ biliri ma kwuo, sị: “Ụmụnna, ndị enyi, gịnị ka Pọl onyeozi na-agbalị ịgwa anyị n’ebe a?”
Mgbe m nụrụ nke ahụ, enwere m oké mkpali! Echere m sị, ‘Ndị ikom a aghaghị ịma otú e si akọwa Bible.’ Ma ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ ya tiri ná mkpu, sị: “Ndị amụma ụgha! Anyị maara ndị unu bụ!” Oké mkpọtụ sochiri. Ma mgbe ahụ nna George biliri ma kwuo, sị: “Unu nile mechie ọnụ! Olee ụdị mmụọ nke a bụ—ọ̀ bụ ụdị nke na-abịa site ná mmanya ogbugbu? Ọ bụrụ na o nwere ihe ndị ikom a chọrọ ịgwa anyị, ọ bụrụkwa na unu achọghị ige ntị, m na-akpọ ha òkù ịbịa n’ụlọ m. A na-anabata onye ọ bụla chọrọ ịbịa.”
N’oké mkpali, agbagara m ụlọ ma kọọrọ mama m ihe meworonụ. Abụ m otu n’ime ndị naara ọkpụkpọ òkù ịga n’ụlọ Romocean. Lee obi ụtọ m nwere n’uhuruchi ahụ ịmụta site na Bible na e nweghị hel na-ere ọkụ, na ịhụ aha Chineke, bụ́ Jehova, n’ime Bible Romanian nke m! Ndị colporteur ahụ mere ndokwa ka otu Onye Mmụta Bible na-abịa n’ụlọ Romocean kwa Sunday ịkụziri anyị ihe. N’oge okpomọkụ sochirinụ, n’afọ ndụ nke 15, e mere m baptism ná ngosipụta nke nrara m nye Jehova.
Ka oge na-aga, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ezinụlọ Prodan na ezinụlọ Romocean dum nakweere eziokwu Bible ma rara ndụ ha nye Jehova. Ọtụtụ ndị ọzọ sitere obodo nta anyị mekwara otú ahụ, gụnyere di na nwunye ahụ na-akatabeghị ahụ ndị e jibu ụlọ ha mere chọọchị Baptist. E mesịa ha gbanwere ya ka ọ bụrụ ebe Ndị Mmụta Bible ga na-ezukọ maka ọmụmụ ihe. Eziokwu Akwụkwọ Nsọ gbasara n’ụzọ dị ngwa n’obodo nta ndị dị nso, ka ọ na-erulekwa 1920 e nwere ihe dị ka ndị nkwusa Alaeze 1,800 na Romania!
Ịga United States
Ọ gụsiri anyị agụụ ike isoro nna m, bụ́ Peter Prodan, kerịta ihe anyị mụtaworo. Ma, n’ụzọ na-eju anya, tupu anyị enwee ike ide akwụkwọ, anyị natara akwụkwọ ozi sitere n’aka ya nke o ji agwa anyị na ya aghọwo ohu Jehova e mere baptism. O sorowo Ndị Mmụta Bible mụọ ihe n’Akron, Ohio, ọ chọkwara ka anyị nile bịakwute ya na United States. Otú ọ dị, nne m jụrụ ịhapụ Romania. Ya mere, na 1921, n’iji ego nna m zitewooro m mee ihe, m gakwuuru ya n’Akron. George Romocean na nwanne ya nwoke akwagaworị United States n’afọ bu ụzọ.
Mgbe m ji ụgbọ mmiri rute Ellis Island, New York, onye ọrụ nnyocha ndị si mba ọzọ amaghị otú ọ ga-esi sụgharịa aha m, bụ́ Aurelia, gaa na Bekee, ya mere o kwuru, sị: “Ị bụ Goldie.” Nke ahụ abụrụwo aha m kemgbe ahụ. N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, na May 1, 1921, mụ na George Romocean lụrụ. N’ihe dị ka otu afọ ka e mesịrị, nna m laghachiri Romania, na 1925 kwa, ọ kpọghachiri nwanne m nwanyị nke m tọrọ, bụ́ Mary, n’Akron. E mesịa nna m laghachiri Romania ka ya na mama m na ndị fọdụrụ n’ezinụlọ wee nọrọ.
Ozi Mbụ Anyị na United States
George bụ nnọọ ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe, nke raara onwe ya nye. N’agbata 1922 na 1932, e ji ọmarịcha ụmụ ndị inyom anọ gọzie anyị—Esther, Anne, Goldie Elizabeth, na Irene. A malitere ọgbakọ Romanian n’Akron, ná mmalite e nwekwara nzukọ n’ụlọ anyị. E mesịa, kwa ọnwa isii, onye nnọchiteanya sitere isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndị Mmụta Bible na Brooklyn, New York, letara ọgbakọ anyị ma nọnyere anyị.
Anyị ji ọtụtụ ụbọchị Sunday dum rụọ ọrụ nkwusa ahụ. Anyị na-akwakọba akpa akwụkwọ anyị na nri ehihie, kpọbaa ụmụ agbọghọ ahụ n’ụgbọala anyị bụ́ Model T Ford, ma jiri ụbọchị ahụ mee nkwusa n’ókèala ime obodo. E mesịa n’uhuruchi, anyị na-aga Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ụmụ agbọghọ anyị bịara nwee mmasị maka ọrụ nkwusa ahụ. Na 1931, anọ m ya na Columbus, Ohio, mgbe Ndị Mmụta Bible nakweere aha doro ha iche bụ́ Ndịàmà Jehova.
Mgbazi Olu nke Dị M Mkpa
Afọ ole na ole n’ihu, ewesoro m Joseph F. Rutherford iwe, bụ́ onyeisi oche Watch Tower Bible and Tract Society na mgbe ahụ. Otu Onyeàmà ọhụrụ chere na Nwanna Rutherford mesoro ya ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, n’ịghara ige ya ntị. Echere m na Nwanna Rutherford mejọrọ ihe. Otú ọ dị, otu Sunday nwanne m nwanyị bụ Mary na di ya, bụ́ Dan Pestrui, bịara ileta anyị. Mgbe anyị risịrị nri, Dan sịrị: “Ka anyị kwadebe ịga nzukọ.”
“Anyị adịghịzi aga nzukọ,” ka m kwuru. “Anyị na-eweso Nwanna Rutherford iwe.”
Dan jikọtara aka ya abụọ n’azụ ya ma gaa ihu na azụ, mgbe ahụkwa o wee sị: “Ị̀ maara Nwanna Rutherford mgbe e mere gị baptism?”
“Ọ dịghị ma ọlị,” ka m zara. “Ị ma na e mere m baptism na Romania.”
“Gịnị mere i ji mee baptism?” ka ọ jụrụ.
“N’ihi na m mụtara na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ, achọkwara m ịrara ndụ m nye ijere ya ozi,” ka m zara.
“Echefula nke ahụ mgbe ọ bụla!” ka ọ zaghachiri. “Gịnị ma ọ bụrụ na Nwanna Rutherford ahapụ eziokwu ahụ, ị̀ ga-ahapụ ya?”
“Ọ dịghị ma ọlị!” ka m kwuru. Nke ahụ mere ka anya doo m, m wee kwuokwa, sị: “Onye ọ bụla kwadebenụ maka nzukọ.” Anyị akwụsịbeghịkwa kemgbe ahụ. Lee obi ekele m nwere n’ebe Jehova nọ n’ihi mgbazi olu ịhụnanya nke di nwanne m nwanyị!
Ịnagide n’Oge Ndakpọ Akụ̀ na Ụba Ahụ
N’oge Ndakpọ Akụ̀ na Ụba ahụ n’afọ ndị 1930, ihe siri ike. Otu ụbọchị George ji oké ihu mgbarụ lọta ọrụ, na-agwa m na a chụwo ya n’ọrụ ya n’ụlọ mmepụta rọba. “Esogbula,” ka m kwuru, “anyị nwere Nna bara ọgaranya n’eluigwe, ọ gaghịkwa ahapụ anyị.”
N’otu ụbọchị ahụ George zutere otu enyi ya onye nwere ero juru otu nnukwu nkata. Mgbe George matara ebe enyi ya foro ha, o bu otu bushel ero lọta ụlọ. Mgbe ahụ o ji dollar atọ ikpeazụ anyị nwere wee zụrụ ụmụ obere nkata. “Olee otú ị ga-esi mee nke ahụ,” ka m jụrụ, “ebe anyị nwere obere ụmụ agbọghọ atọ nwere mkpa mmiri ara ehi?”
“Esogbula,” ka ọ zaghachiri, “nanị mee ihe m kwuru.” N’ime izu ole na ole sochiri, anyị nwere otu obere ụlọ mmepụta ihe n’ụlọ anyị, na-ehicha ma na-ekechi ero. Anyị resịrị ha ụlọ nri ndị welitere isi ma welata dollar 30 ruo 40 ụlọ kwa ụbọchị, nke bụụrụ anyị nnukwu ego n’oge ahụ. Onye ọrụ ugbo ahụ nyere anyị ikike iforo ero ahụ n’ókèala ya sịrị na ya ebiwo n’ebe ahụ eri afọ 25, na ya ahụbeghịkwa ero n’ụba otú ahụ. N’oge na-adịghị anya ụlọ mmepụta rọba ahụ kpọghachiri George n’ọrụ.
Ijigide Okwukwe Anyị
Na 1943 anyị kwagara Los Angeles, California, mgbe afọ anọ gasịkwara anyị bịara biri n’Elsinore. Anyị mepere ụlọ ahịa ihe e ji esi nri n’ebe ahụ, ezinụlọ anyị dum rụrụ ọrụ na ya, onye rụtụ ibe ya arụtụ. N’oge ahụ, Elsinore bụ nanị obere obodo nke ihe dị ka mmadụ 2,000, anyị aghaghịkwa ime njem kilomita 30 gaa obodo ọzọ maka nzukọ ndị Kraịst anyị. Lee obi ụtọ m nwere ịhụ otu obere ọgbakọ e guzobere n’Elsinore na 1950! E nwere ọgbakọ 13 ugbu a n’otu ógbè ahụ.
Na 1950 nwa anyị nwanyị bụ́ Goldie Elizabeth (onye ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ maara ugbu a dị ka Beth) gụsịrị akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead dị na South Lansing, New York, e zigakwara ya Venezuala dị ka onye ozi ala ọzọ. Na 1955 nwa anyị nwanyị nke ikpeazụ, bụ́ Irene, nwere obi ụtọ na a kpọrọ di ya òkù ije ozi dị ka onye ozi na-ejegharị ejegharị n’ọrụ sekit. E mesịa na 1961, mgbe ha gasịrị Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na South Lansing, New York, e zigara ha Thailand. Ọ dị mgbe ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ ụmụ m ndị inyom nke na m na-ebe ákwá, ma mgbe ahụ m na-eche sị, ‘Nke ahụ bụ ihe m chọrọ ka ha mee.’ Ya mere m na-esekpụrụ akpa akwụkwọ m ma gawa ọrụ ime nkwusa. M na-eji obi ụtọ alọta mgbe nile.
Na 1966 ezi di m, bụ́ George, dara ọrịa ahụ mkpọnwụ. Beth, onye siworo na Venezuela lọta n’ihi nsogbu ahụ ike, nyere aka ilekọta ya. George nwụrụ n’afọ so ya, eziokwu ahụ bụ na o kwesịwo ntụkwasị obi nye Jehova ma narakwa ụgwọ ọrụ eluigwe ya kasiri m obi. N’ikpeazụ Beth gara Spain ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ada m nwanyị, bụ́ Esther, dara ọrịa cancer ma nwụọ na 1977, na 1984 kwa, ọrịa leukemia gburu Anne. Nke ọ bụla abụrụwo ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ná ndụ ya nile.
N’oge ọnwụ Anne, Beth na Irene esiwo n’ọrụ nkwusa ala ọzọ ha lọta. Ha enyeworị aka n’ilekọta ụmụnne ha nwanyị, anyị nile rukwara újú nke ukwuu. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị agwara m ụmụ agbọghọ m, sị: “Ọ dị mma, o zuola! Anyị ejiriwo nkwa ndị dị oké ọnụ ahịa nke Bible kasie ndị ọzọ obi. Ugbu a anyị aghaghị ikwe ka a kasie anyị obi. Setan chọrọ ịnapụ anyị ọṅụ anyị n’ijere Jehova ozi, ma anyị apụghị ikwe ya.”
Ezinụlọ Anyị Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Romania
Mụ na nwanne m nwanyị bụ́ Mary mere njem ahụ kwesịrị ncheta ịga leta ezinụlọ anyị na Romania na 1970. Otu n’ime ụmụnne anyị nwanyị anwụwo, ma anyị nwere ike ileta nwanne anyị nwoke John na nwanne anyị nwanyị Lodovica, onye ka bi n’obodo nta Ortelec. N’oge nleta anyị, papa na mama m anwụwo, ha ekwesịwokwa ntụkwasị obi nye Jehova. Ọtụtụ ndị gwara anyị na papa anyị abụrụwo idé n’ọgbakọ. Ọbụna ụfọdụ n’ime ụmụ nke ụmụ ụmụ ya na Romania bụ Ndịàmà ugbu a. Anyị letakwara ọtụtụ ndị ikwu n’akụkụ ezinụlọ nke di m, bụ́ ndị nọgidesiworo ike n’eziokwu Bible.
Na 1970, Romania nọ n’okpuru ọchịchị Kọmunist obi ọjọọ nke Nicolae Ceauşescu, a na-akpagbukwa Ndịàmà Jehova n’ụzọ siri ike. Nwa nwoke nke nwanne m nwoke John, bụ́ Flore, tinyere ndị ikwu m ọzọ, nọrọ ọtụtụ afọ n’ogige ịta ahụhụ n’ihi okwukwe ndị Kraịst ha, otú ahụkwa ka ọ dị nwa nwoke nke nwanne di m, bụ́ Gábor Romocean. Ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe e nyere anyị ọrụ iziga ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na New York, ụmụnna anyị ndị Romania sịrị na obi agaghị ezu ha ike ruo mgbe ha nụrụ na anyị apụwo ná mba ahụ n’enweghị nsogbu!
Mgbe anyị chọpụtara na visa anyị agwụwo, anyị gara n’ọfịs gọọmenti dị n’Ortelec. Ọ bụ n’ehihie Friday, ọ bụkwa nanị otu onye ọrụ nọ n’ọrụ. N’ịnụ na anyị bụ ndị ọbịa nakwa na nwa nwanne anyị nwoke nọrịị n’ogige ịta ahụhụ, ọ sịrị: “Ụmụ ada, sinụ n’ebe a pụọ!”
“Ma ọ dịghị ụgbọ okporo ígwè na-apụ taa,” ka nwanne m nwanyị zara.
“Ọ dịghị ihe o mere,” ka o ji olu ike kwuo. “Banyenụ bọs. Banyenụ ụgbọ okporo ígwè. Banyenụ tagzi. Jirinụ ụkwụ. Nanị jirinụ ọsọ otú unu nwere ike si n’ebe a pụọ!”
Ka anyị malitere ịpụ, a kpọghachiri anyị wee gwa anyị na ụgbọ okporo ígwè ndị agha a na-emebughị ndokwa ya ga-agafe n’elekere isii nke uhuruchi. Lee ka nke ahụ si bụrụ ezi ihe ndaba! N’ụgbọ okporo ígwè nkịtị, a ga-enyocha akwụkwọ anyị ugboro ugboro, ma ebe ọ bụ na ụgbọ okporo ígwè a bu ndị agha, anyị abụọ bụkwa nanị ndị nkịtị o bu, ọ dịghị onye kwuru ka ya hụ akwụkwọ ikike ngafe anyị. Ha nwere ike ichewo na anyị bụ nne nne nke ụfọdụ ndị agha ahụ.
Anyị rutere Timisoara n’ụtụtụ echi ya, sitekwa n’enyemaka otu enyi nke otu onye ikwu, anyị nwere ike inweta visa anyị. N’echi ya anyị si ná mba ahụ pụọ. Anyị ji ọtụtụ ihe ncheta dị ụtọ a na-apụghị ichefu echefu banyere ụmụnna nwoke na nwanyị ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe na Romania wee lọghachi ụlọ.
N’afọ ndị sochiri nleta anyị mere na Romania, anyị nụrụ irighiri ihe ole na ole banyere ọrụ ime nkwusa site n’azụ Ihe Mgbochi Ígwè ahụ. Ma, anyị nwere obi ike na ụmụnna nwoke na nwanyị ndị Kraịst anyị ga-anọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke anyị—ihe ọ sọrọ ya bụrụ. Ha emewokwa otú ahụ n’ezie! Lee ọṅụ ọ bụ ịnụ na a matawo Ndịàmà Jehova n’ụzọ iwu kwadoro dị ka òtù okpukpe na Romania n’April 1990! N’oge okpomọkụ sochirinụ, akụkọ banyere mgbakọ ndị e nwere na Romania mere anyị obi ụtọ. Leenụ, ihe karịrị 34,000 gara n’obodo ukwu asatọ, e mekwara 2,260 baptism! Ugbu a e nwere ihe karịrị 35,000 na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ na Romania, n’afọ gakwara aga 86,034 gara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst.
Eziokwu ahụ Ka Dị Oké Ọnụ Ahịa Nye M
Ruo afọ ole na ole, akwụsịrị m ikere òkè n’ihe nnọchianya n’Ememe Ncheta. Ahụrụ m ọtụtụ ụmụnna nwoke ruru eru ndị na-adịghị ekere òkè na ya, m wee chee, sị: ‘Gịnị mere Jehova ga-eji nye m ihe ùgwù nke ịbụ onye ga-eso Ọkpara ya chịa n’eluigwe mgbe ndị ọzọ bụ ndị ọkà okwu n’ụzọ dị were were otú a?’ Ma mgbe m na-ekereghị òkè, ahụ erughị m ala. Ọ dị m ka a ga-asị na ọ dị ihe m na-ajụ. Mgbe m mụsiri ihe ike ma rịọ arịrịọ site n’ekpere, amalitere m iri ya ọzọ. Udo na ọṅụ m lọghachiri, ha ahapụtụbeghịkwa m aka.
Ọ bụ ezie na enweghịzi m ike ịhụ ụzọ iji gụọ ihe, ana m egere tepu Bible na nke magazin Ụlọ Nche na Teta! kwa ụbọchị. M ka na-ekerekwa òkè n’ọrụ ime nkwusa. M na-etinyekarị ihe dị n’agbata magazin 60 na 100 kwa ọnwa, ma mgbe anyị ji magazin Teta! mee mkpọsa pụrụ iche n’April gara aga, etinyere m 323. Site n’enyemaka ụmụ m ndị inyom, m na-enwekwa ike ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Obi dị m ụtọ na m nwere ike ịnọgide na-agba ndị ọzọ ume. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-akpọ m Nne Nne.
N’ileghachi anya azụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 79 nke ijere Jehova ozi a raara nye, ana m ekele ya kwa ụbọchị na o nyewo m ohere ịmara eziokwu ya dị oké ọnụ ahịa na iji ndụ m mee ihe n’ozi ya. Enwere m obi ụtọ dị ukwuu na adịwo m ndụ wee hụ mmezu nke amụma Bible ndị magburu onwe ha ndị buru amụma banyere nchịkọbata nke ndị Chineke yiri atụrụ na mgbe ikpeazụ a.—Aịsaịa 60:22; Zekaraịa 8:23.
[Foto dị na peeji nke 23]
Nwanne m nwanyị bụ́ Mary na nna m guzo ọtọ, na mụ, George, na ụmụ anyị ndị nwanyị bụ́ Esther na Anne
[Foto dị na peeji nke 24]
Mụ na ụmụ m ndị nwanyị bụ́ Beth na Irene na di Irene na ụmụ ha ndị nwoke abụọ, ha nile na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi