Naḥmanides—Ọ̀ Gbaghara Iso Ụzọ Kraịst?
MGBE Ụwa Na-emepechabeghị Anya. Gịnị ka ha na-eweta n’uche? Agha Ntute? Njụta Okwukwe? Mmekpọ ọnụ? Ọ bụ ezie na ọ bụghị oge a na-ejikọkarị ya na nkwurịta okwu okpukpe a na-eme n’ezoghị ọnụ, n’oge ahụ, n’afọ 1263, otu n’ime nrụrịta ụka kasị pụọ iche n’akụkọ ihe mere eme nke Europe weere ọnọdụ. Olee ndị rụrụ ya? Ihe iseokwu ndị dị aṅaa ka e welitere? Olee otú ọ pụrụ isi nyere anyị aka taa ịmata ezi okpukpe ahụ?
Gịnị Kpasuru Nrụrịta Ụka Ahụ?
N’oge nile Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, Chọọchị Roman Katọlik weere onwe ya dị ka ezi okpukpe ahụ. Otú ọ dị, ndị Juu ahapụtụbeghị nzọrọ ha na-azọrọ ịbụ ndị Chineke họọrọ. Ike chọọchị ahụ na-enweghị ime ka ndị Juu kweta mkpa ọ dị ha ịbụ ndị a tọghatara dujere ná nkụda mmụọ na ime ihe ike nakwa mgbe mgbe ná mkpagbu. N’oge Agha Ntute ndị ahụ e gburu ọtụtụ iri puku ndị Juu ma ọ bụ gbaa ha ọkụ n’elu osisi mgbe a sị ka ha họrọ baptism ma ọ bụ ọnwụ. N’ọtụtụ ala mmegide ndị Semite nke chọọchị kpasuru zuru ebe nile.
Otú ọ dị, mmụọ dị iche jupụtara na Spain Katọlik nke narị afọ nke 12 na 13. E kwere ka ndị Juu nwere onwe ha ikpe okpukpe—ma ọ bụrụhaala na ha awakpoghị okpukpe ndị Kraịst—e nyekwara ha ọkwá ndị dị mkpa n’obí eze. Ma mgbe ihe dị ka otu narị afọ nke ihu ọma gasịrị, ndị ụkọchukwu òtù Dominic mere ihe iji belata mmetụta nke ndị Juu na-enwe n’ọha mmadụ na ịtọghata ndị Juu gaa n’okpukpe Katọlik. Ndị òtù Dominic rụgidere Eze James Mbụ nke Aragon ime ndokwa maka nrụrịta ụka ọchịchị haziri, nke nzube ya bụ igosipụta ịdị ala nke ọkwá ndị Juu na mkpa ndị Juu nile nwere ịbụ ndị a tọghatara.
Nke a abụghị nrụrịta ụka mbụ nke ndị Juu na ndị Kraịst. N’afọ 1240, e mere arụmụka ọchịchị haziri na Paris, France. Nzube ya bụ isi bụ itinye Talmud, akwụkwọ dị nsọ nye ndị Juu, n’ule. Otú ọ dị, e nyere ndị Juu keere òkè nnwere onwe dị nta ikwu okwu. Mgbe chọọchị kwupụtara mmeri ya n’arụmụka a, a kpọrọ ọnụ ọgụgụ dị ukwu nke Talmud ọkụ n’ámá.
Ma mmụọ ikwe ibe nọrọ ka ukwuu nke Eze James Mbụ nke Aragon enyeghị ohere maka ụdị ule ime akaje ahụ. N’ịghọta nke a, ndị òtù Dominic nwalere ụzọ dị iche. Dị ka Hyam Maccoby si tinye ya n’akwụkwọ ya bụ́ Judaism on Trial, ha kpọrọ ndị Juu òkù isonye ná nrụrịta ụka “ka o yie nkwanye ùgwù na ido anya, kama ịbụ nkatọ dị ka na Paris.” Ndị òtù Dominic họpụtara dị ka onye nnọchiteanya ha bụ isi Pablo Christiani, onye Juu a tọghatara gaa n’okpukpe Katọlik, onye ghọwokwara ụkọchukwu òtù Dominic. Site n’iji ọmụma Pablo Christiani maara ihe odide Talmud na ndị rabaị mee ihe, ndị òtù Dominic chere na ha ji n’aka na ha pụrụ ịnwapụta ihe ha na-azọrọ.
Gịnị Ka O Ji Bụrụ Naḥmanides?
Nanị otu onye na Spain ruru eru n’ụzọ ime mmụọ ịnọchite anya akụkụ nke ndị Juu ná nrụrịta ụka ahụ—Moses ben Naḥman, ma ọ bụ Naḥmanides.a Onye a mụrụ n’ihe dị ka na 1194 n’obodo Gerona, Naḥmanides emeworị ka a mara ya dị ka ọkà mmụta Bible na Talmud n’oge ọ nọ n’afọ iri na ụma. Ka ọ na-erule afọ 30, o dewo nkọwa dị iche iche n’akụkụ ka ukwuu nke Talmud, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke a gasịrị ọ bụ onye a kasị anụ olu ya n’ịbụ onye ogbugbo n’esemokwu banyere ihe odide Maimonides nke yiri egwu ikewa ógbè ndị Juu.b E weere Naḥmanides dị ka onye kasị ukwuu ná ndị Juu bụ ndị ọkà mmụta Bible na Talmud nke ọgbọ ya, eleghịkwa anya na-esote Maimonides n’ọkwá ná mmetụta o nwere n’okpukpe ndị Juu n’oge ahụ.
Naḥmanides nwere mmetụta dị ukwuu n’ógbè ndị Juu na Catalonia, ọbụnadị Eze James Mbụ jụtara echiche ya n’okwu dị iche iche nke Ọchịchị. Ma ndị Juu ma ndị Jentaịl kwanyeere ikike iche echiche ya dị nkọ ùgwù. Ndị òtù Dominic ghọtara na iji weda ndị Juu ala n’ụzọ dị irè, onye ga-arụ ụka ahụ ga-abụ ya, rabaị ha kasị ukwuu.
Naḥmanides lara azụ ikwere ịrụ ụka ahụ, n’ịghọta na ndị òtù Dominic enweghị nzube ọ bụla inwe nrụrịta ụka dị mma. Ọ gaje ịza ajụjụ ma ghara inwe ike ịjụ nke ọ bụla. Otú ọ dị, ọ nakweere arịrịọ eze, na-ekwu ka e nye ya ohere ikwu okwu n’ezoghị ọnụ n’inye nzaghachi ya. Eze James Mbụ kwetara nke a. Ohere dị otú ahụ maka nnwere onwe ikwu okwu a kpaara ókè bụ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya na nke a na-emeghachibeghị ọzọ n’oge nile Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ihe àmà doro anya nke ùgwù dị ukwu eze na-akwanyere Naḥmanides. Ma, ụjọ ji Naḥmanides. Ọ bụrụ na e lee ya anya dị ka ajọ onye mmegide ná nrụrịta ụka ahụ, ọ ga-arụpụta ọdachi nye ma ya ma ndị Juu nile. Ime ihe ike pụrụ itiwapụ mgbe ọ bụla.
Naḥmanides Megide Pablo Christiani
Ebe bụ isi a nọ nwee nrụrịta ụka ahụ bụ obí eze dị na Barcelona. E nwere nnọkọ anọ—July 20, 23, 26, na 27, 1263. Eze ahụ n’onwe ya bụ onye isi oche nke nnọkọ nke ọ bụla, ndị Chọọchị na ndị Ọchịchị ọnụ ha na-eru n’okwu, tinyere ndị Juu bi n’ógbè ahụ bịakwara.
Nye chọọchị e nweghị ajụjụ ọ bụla banyere ihe nrụrịta ụka ahụ ga-arụpụta. N’ihe ndekọ ha, ndị òtù Dominic kwuru na nzube nke nrụrịta ụka ahụ ‘abụghị iji welite okpukpe ka a rụọ ụka banyere ya dị ka a ga-asị na ọ bụ okwu a na-enwere obi abụọ, kama iji bibie njehie nke ndị Juu ma wepụ nkwenye obi ike nke ọtụtụ ndị Juu.’
Ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka ọ gbaa afọ 70, Naḥmanides gosiri ikike iche echiche ya dị nkọ site n’ịchọ ka e nwedebe nkwurịta okwu ahụ nanị n’okwu ndị metụtara nkwenkwe bụ isi. Ọ malitere site n’ịsị: “Arụmụka [ndị bu nke a ụzọ] n’etiti ndị jentaịl na ndị Juu metụtara ọtụtụ akụkụ nke ihe omume dị iche iche nke okpukpe ndị ụkpụrụ bụ isi nke okwukwe na-adịghị adabere na ha. Otú ọ dị, n’ụlọikpe eze a, ọ ga-amasị m ịrụ ụka nanị banyere okwu ndị esemokwu ahụ nile dabeere na ha.” Mgbe ahụ e kwekọrịtara na isiokwu ndị ahụ ga-ejedebe na ma Mesaịa ahụ ọ bịaworị, ma ọ bụ Chineke ka ọ bụ mmadụ, nakwa ma ọ bụ ndị Juu ka ọ bụ ndị Kraịst nwere ezi iwu ahụ.
N’arụmụka o ji malite, Pablo Christiani kwuru na ya ga-egosi site na Talmud na Mesaịa ahụ abịaworị. Naḥmanides zaghachiri na ọ bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka ndị rabaị nakweere Talmud ji ghara ịnakwere Jisọs? Kama ihiwe arụmụka ya isi n’echiche doro anya nke Akwụkwọ Nsọ, Christiani zoro aka mgbe mgbe n’ihe odide na-edoghị anya nke ndị rabaị iji kwadoo arụmụka ya. Site n’otu isi ihe gaa n’ọzọ Naḥmanides gbaghara ndị a site n’igosi na a na-ehota ha n’ụzọ na-ekwekọghị n’ihe gbara ha gburugburu. Ezi uche ga-egosi na Naḥmanides pụrụ ime nnọọ nke ọma dị ka onye ka nwee nkà n’ịrụ ụka banyere ihe odide ndị a o jiworo oge ndụ ya nile mụọ. Ọbụna mgbe Christiani zoro aka n’Akwụkwọ Nsọ, arụmụka ya welitere isi ihe ndị a pụrụ ịgbagha n’ụzọ dị mfe.
Ọ bụ ezie na a chọrọ ka nanị ihe ọ ga-eme bụrụ ịza ajụjụ, Naḥmanides nwere ike inye arụmụka dị ike nke gosiri ihe mere echiche Chọọchị Katọlik ji bụrụ nke ma ndị Juu ma ndị ọzọ na-eche ezi echiche na-adịghị anakwere. Banyere ozizi Atọ n’Ime Otu, o kwupụtara, sị: “Uche nke onye Juu ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla agaghị ekwe ya ikwere na Onye Okike nke eluigwe na ala . . . ga-apụta site n’akpa nwa nke nwanyị onye Juu . . . mgbe e mesịkwara [a ga-arara ya] nye n’aka ndị iro ya, bụ́ ndị . . . gburu ya.” Naḥmanides kwuru ná mkpirikpi: “Ihe i kwenyere—ọ bụkwa mkpọrọgwụ nke okwukwe gị—abụghị ihe uche [nwere nghọta] na-anakwere.”
N’igosipụta otu enweghị nkwekọ nke gbochiworo ọtụtụ ndị Juu ruo taa ọbụna ịtụle ikwe omume nke Jisọs ịbụ Mesaịa ahụ, Naḥmanides kwusiri okwu ike banyere ikpe ọmụma ọbara gabigara ókè nke chọọchị. Ọ sịrị: “Onye amụma ahụ kwuru na n’oge Mesaịa ahụ, . . . ha ga-akpụgharị mma agha ha ịbụ mma ogè, na ube ha nile ịbụ mma ịkwọ osisi; mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ. Malite n’oge onye Nazaret ahụ ruo ugbu a, ụwa dum ejupụtawo n’ime ihe ike na iji égbè ezu ohi. [N’ezie], ndị Kraịst na-akwafu ọbara karịa ndị ọzọ nke mba nile, ha na-ebikwa ndụ rụrụ arụ. Lee ka ọ ga-esi esiri gị ike, eze onyenwe m, na ndị knight gị a ma ọ bụrụ na ha agaghị . . . amụtakwa agha ọzọ!”—Aịsaịa 2:4.
Mgbe nnọkọ nke anọ gasịrị, eze ahụ kwuru ka a kwụsị nrụrịta ụka ahụ. Ọ gwara Naḥmanides, sị: “Ahụtụbeghị m nwoke hiere ụzọ na-arụ ụka nke ọma dị ka i mere.” N’imezu nkwa ya, bụ́ inye Naḥmanides nnwere onwe ikwu okwu na nchebe, Eze James Mbụ nke Aragon zilara ya ụlọ, tinyere onyinye nke dinar 300. N’arịrịọ nke bishọp nke Gerona, Naḥmanides mere ndekọ nke nrụrịta ụka ahụ.
N’ikwupụta mmeri doro anya, ndị òtù Dominic were iwe. Ha mesịrị boo Naḥmanides ebubo ikwulu chọọchị, na-eji ihe o dere banyere nrụrịta ụka ahụ dị ka ihe àmà. N’enweghị afọ ojuju ná mmeso eze mesoro Naḥmanides, ndị òtù Dominic kpọkuru Popu Clement nke Anọ. Ọ bụ ezie na ọ dị ihe karịrị afọ 70, a chụpụrụ Naḥmanides na Spain.c
Olee Ebe Eziokwu Dị?
Nrụrịta ụka nke akụkụ nke ọ bụla ò nyere aka ime ka a mata ezi okpukpe ahụ? Ọ bụ ezie na nke ọ bụla mere ka ezighị ezi nke akụkụ nke ọzọ pụta ìhè, ọ dịghị nke nyere ozi doro anya nke eziokwu. Ihe Naḥmanides ji ezi nkà gbaghaa abụghị ezi Iso Ụzọ Kraịst ma, kama nke ahụ, ozizi mmadụ mere, dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu, nke Krisendọm chepụtara n’ọtụtụ narị afọ mgbe Jisọs nwụsịrị. Omume rụrụ arụ na mwụfu ọbara aghara aghara nke Krisendọm, nke Naḥmanides mere ka ọ pụta ìhè, bụkwa ihe ndekọ a na-apụghị ịgbagha agbagha.
O sighị ike ịghọta ihe mere, n’okpuru ọnọdụ ndị a, Naḥmanides na ndị Juu ndị ọzọ abụghị ndị arụmụka iji kwadoo Iso Ụzọ Kraịst masịrị. Tụkwasị na nke ahụ, arụmụka Pablo Christiani dabeere, ọ bụghị n’echiche doro anya sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, kama n’ihe odide ndị rabaị a kọwahiere.
Ee e, Naḥmanides agbaghaghị ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ka ọ na-erule n’oge ya, ezi ìhè nke ozizi Jisọs na nnwapụta nke ịbụ Mesaịa ya aghọwo ihe okwu ụgha kpuchiri. Jisọs na ndị ozi ya buru amụma n’ezie banyere mpụta nke ozizi dị otú ahụ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ.—Matiu 7:21-23; 13:24-30, 37-43; 1 Timoti 4:1-3; 2 Pita 2:1, 2.
Otú ọ dị, a pụrụ ịmata ezi okpukpe ahụ nke ọma taa. Jisọs kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha. . . . Otú a ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ.” (Matiu 7:16, 17) Anyị na-akpọ gị òkù ịmata ya. Ka Ndịàmà Jehova nyere gị aka ime nnyocha dị mma nke ihe àmà Akwụkwọ Nsọ. Ị ga-esi otú a mụta ihe nkwa nile nke Chineke ndị e jikọrọ ha na Mesaịa na ịchịisi ya pụtara n’ezie.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọtụtụ ndị Juu na-ezo aka n’ebe Naḥmanides nọ dị ka “Ramban,” bụ́ aha ịchafụ Hibru nke e nwetara site ná mkpụrụ akwụkwọ ndị mbụ nke okwu bụ́ “Rabbi Moses Ben Naḥman.”
b Lee isiokwu bụ́ “Maimonides—Nwoke Kọwagharịrị Okpukpe Ndị Juu” n’Ụlọ Nche nke March 1, 1995, peji nke 20-23.
c Na 1267, Naḥmanides rutere ala a maara ugbu a dị ka Israel. Afọ ndị ikpeazụ ya jupụtara n’ihe a rụzuru. O guzobeghachiri ịdị adị nke ndị Juu na otu ebe mmụta na Jerusalem. O dechakwara otu nkọwa banyere Torah, bụ́ akwụkwọ ise ndị mbụ nke Bible, ghọọkwa onye isi ime mmụọ nke ógbè ndị Juu n’ebe ugwu obodo Acre dị n’ụsọ osimiri, ebe ọ nwụrụ na 1270.
[Foto dị na peeji nke 20]
Naḥmanides kwupụtara arụmụka ya na Barcelona
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]
Ihe osise ndị dị na peji nke 19-20: E sepụtaghachiri ha site na Illustrirte Pracht - Bibel/Heilige Schrift des Alten und Neuen Testaments, nach der deutschen Uebersetzung D. Martin Luther’s