Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 3/1 p. 20-23
  • Maimonides—Nwoke Kọwagharịrị Okpukpe Ndị Juu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Maimonides—Nwoke Kọwagharịrị Okpukpe Ndị Juu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Maimonides?
  • Gịnị Ka O Dere?
  • Gịnị Ka Ọ Kụziri?
  • Olee Otú O Si Metụta Okpukpe Ndị Juu na Nkwenkwe Ndị Ọzọ?
  • Ònye Kwesịrị Ka A Kpọọ Ya Rabaị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Naḥmanides—Ọ̀ Gbaghara Iso Ụzọ Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ọnọdụ Ndị Dọkịta n’Ụwa nke Na-agbanwe Agbanwe
    Teta!—2005
  • Gịnị bụ Tora?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 3/1 p. 20-23

Maimonides—Nwoke Kọwagharịrị Okpukpe Ndị Juu

“SITE na Mosis ruo na Mosis, ọ dịghị onye dị ka Mosis.” Ọtụtụ ndị Juu ga-amata okwu ihe omimi nke a dị ka nkwupụta inwe mmasị maka onye Juu na narị afọ nke 12 bụ́ ọkà n’ihe ọmụma ụwa, onye ọkà ná nkebi ihe odide, na onye nkọwa nke Talmud na Akwụkwọ Nsọ, Moses Ben Maimon—onye a makwaara dị ka Maimonides na dị ka Rambam.a Taa ọtụtụ ndị amaghị onye Maimonides bụ, ma ihe ndị o dere nwere mmetụta miri emi n’echiche ndị Juu, ndị Alakụba, na nke chọọchị n’oge ya. N’ụzọ bụ isi, ọ kọwagharịrị okpukpe ndị Juu. Ònye bụ Maimonides, n’ihi gịnịkwa ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ele ya anya dị ka “Mosis nke abụọ”?

Ònye Bụ Maimonides?

A mụrụ Maimonides na Córdoba, Spain, na 1135. Nna ya, Maimon, onye nyere ihe ka ukwuu nke ọzụzụ okpukpe mbụ ọ natara, bụ onye mmụta wuru ewu site n’otu ezinụlọ ndị rabaị a na-akwanyere ùgwù. Mgbe ndị Almohad meriri Córdoba na 1148, ndị Juu chere nhọrọ nke ịbụ ndị a tọghatara gaa n’Alakụba ma ọ bụ ịgba ọsọ ndụ ihu. Nke a malitere ogologo oge nke mwagharị maka ezinụlọ Maimonides. Na 1160 ha biri na Fez, Morocco, ebe ọ natara ọzụzụ dị ka dọkịta. Na 1165, ezinụlọ ya aghaghị ịgbaga Palestine.

Otú ọ dị, ọnọdụ dị n’Israel akwụsịghị ike. Ógbè nta ndị Juu na-eche ihe ize ndụ ihu ma n’aka ndị Agha Ntụte Krisendọm ma n’aka ndị agha Alakụba. Mgbe ihe naerughị ọnwa isii ‘n’Ala Nsọ’ ahụ gasịrị, Maimonides na ezinụlọ ya chọtara ebe mgbaba na Fustat, Obodo Ochie nke Cairo, Ijipt. Ọ bụ n’ebe a ka a hụtazuru nkà ndị Maimonides nwere. Na 1177 ọ ghọrọ onye isi nke ógbè ndị Juu, na 1185 kwa a họpụtara ya ịbụ dọkịta n’obí onye ndú ndị Alakụba ahụ a ma ama bụ́ Saladin. Maimonides jigidere ọkwá abụọ ndị a ruo ọnwụ ya na 1204. Nkà ọgwụ na ahụ ike ya bụ nke wuru ewu nke ukwuu nke na a sịrị na site n’ebe ndị dị anya dị ka England, Eze Richard Nwere Obi Ọdụm mere mgbalị inweta Maimonides dị ka dọkịta onwe onye ya.

Gịnị Ka O Dere?

Maimonides bụ onye degburu onwe ya n’ihe. Ka ọ na-agbalaga site ná mkpagbu ndị Alakụba, n’ebe o zoro na mgbe ọ nọ n’ọsọ, ọ chịkọtara ihe ka ukwuu n’akwụkwọ mbụ ya bụ isi, Commentary on the Mishnah.b N’ịbụ nke e dere n’Arabic, o wepụtara ọtụtụ nchepụta na okwu ndị dị na Mishnah, mgbe ụfọdụ banye ná nkọwa nke nkà ihe ọmụma ụwa nke Maimonides banyere okpukpe ndị Juu. N’akụkụ nke na-akọwa Sanhedrin na-enye nkọwa ruru ala, Maimonides chepụtara ụkpụrụ 13 bụ́ isi nke okwukwe ndị Juu. Okpukpe ndị Juu enwebeghị mgbe ọ kọwara nkwenkwe okwukwe, ma ọ bụ nkwupụta nke ihe ndị e kwenyere. Ugbu a, Ụkpụrụ Okwukwe 13 nke Maimonides ghọrọ nke mbụ nke nkwupụta ndị sochiri nke ụkpụrụ okwukwe ndị Juu.—Lee igbe, peji nke 23.

Maimonides chọrọ ịkọwa usoro ezi uche dị na ya nke ihe nile, ma hà bụ nke anụ ahụ ma hà bụ nke ime mmụọ. Ọ jụrụ okwukwe kpuru ìsì, na-achọ ka e nye nkọwa maka ihe ọ bụla ná ndabere nke ihe o lere anya dị ka ihe nnwapụta si n’ezi echiche na arụmụka. Ọchịchọ nke a sitere n’okike dubara n’odide nke akwụkwọ ukwu ya—Mishneh Torah.c

N’ụbọchị Maimonides ndị Juu lere “Torah,” ma ọ bụ “Iwu,” anya dị ka nke gụnyere ọ bụghị nanị okwu ndị ahụ e dere ede nke Mosis kamakwa nkọwa nile nke ndị rabaị banyere Iwu a n’ime narị afọ nile. E dekọrọ echiche ndị a na Talmud na n’ọtụtụ puku mkpebi na ihe odide ndị rabaị banyere Talmud. Maimonides matara na nanị ịdị ukwuu na mgbasasị nke ihe ọmụma a nile hapụrụ onye Juu nkịtị ná mgbagwoju anya n’ime mkpebi ndị na-emetụta ndụ ọ na-ebi kwa ụbọchị. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ anọghị n’ọnọdụ itinye ogologo ndụ n’ọmụmụ nke akwụkwọ nile nke ndị rabaị, ndị e dere ihe ka ukwuu n’ime ha n’asụsụ Aramaic siri ike. Ihe ngwọta Maimonides bụ ịhazi ihe ọmụma a, na-eme ka mkpebi ndị dị irè pụta ìhè, na ịhazinye ha n’otu ndokwa dị n’usoro nke akwụkwọ 14, ndị e kewara dị ka isiokwu ha si dị. O dere ya n’asụsụ Hibru doro nnọọ anya, nke na-aga were were n’ọnụ.

Mishneh Torah bụ ihe nduzi dị irè nke ukwuu nke na ụfọdụ ndị ndú ndị Juu tụrụ egwu na ọ ga-anọchi Talmud kpam kpam. Ma, ọbụna ndị jụrụ nakweere nkà dị nnọọ elu e tinyere n’akwụkwọ ahụ. Nkebi ihe odide nke a a haziri nnọọ nke ọma bụ nrụzu ọrụ nke oké mgbanwe, na-enye ndụ ọhụrụ n’otu usoro okpukpe ndị Juu nke ndị nkịtị na-apụkwaghị ịghọta ma ọ bụ ịnakwere.

Mgbe ahụ, Maimonides banyere ọrụ ide nnukwu akwụkwọ ọzọ—The Guide for the Perplexed. Site ná nsụgharị nke akwụkwọ Grik ndị ochie gaa n’Arabic, ọtụtụ ndị Juu karị na-amata banyere Aristotle na ndị ọkà ihe ọmụma ụwa ndị ọzọ. Ụfọdụ nwere ijuanya, ọ na-esiri ha ike ijikọta ihe nkịtị okwu dị iche iche nke Bible pụtara na nkà ihe ọmụma ụwa. N’akwụkwọ bụ́ The Guide for the Perplexed, Maimonides, onye nwere oké mmasị n’Aristotle, gbalịrị ịkọwa ihe bụ isi na Bible na okpukpe ndị Juu n’ụzọ kwekọrọ n’echiche na arụmụka nkà ihe ọmụma ụwa.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 2:1-5, 11-16.

Tinyere akwụkwọ ndị a bụ́ isi na akwụkwọ ndị ọzọ nke okpukpe, Maimonides dere ihe ndị a na-adịghị agbagha agbagha n’okwu mmụta ọgwụ na ahụ ike na nkà nnyocha mbara igwe. A gaghịkwa eleghara akụkụ ọzọ nke pen ya na-aghọ nkọ anya. Akwụkwọ Encyclopaedia Judaica na-ekwu, sị: “Akwụkwọ ozi dị iche iche Maimonides dere kara akara ọgbọ ọhụrụ n’ide akwụkwọ ozi. Ọ bụ onye Juu mbụ dere akwụkwọ ozi e chekwaworo akwụkwọ ozi ya nke ukwuu. . . . Akwụkwọ ozi ya dị iche iche achọtawo ụzọ ha baa n’uche na n’obi nke ndị o degaara ha, ọ na-agbanwegharịkwa ụzọ o si ede ha iji kwesị ndị a na-edere ha.”

Gịnị Ka Ọ Kụziri?

N’Ụkpụrụ Okwukwe 13 ya, Maimonides nyere ndepụta doro anya nke nkwenkwe, ụfọdụ n’ime ha gbara mkpọrọgwụ n’ime Akwụkwọ Nsọ. Otú ọ dị, ụkpụrụ nke asaa na itoolu na-emegide ihe bụ́ isi nke okwukwe dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’ime Jisọs dị ka Mesaịa.d Iburu n’uche nkụzi dị iche iche nke ndapụ n’ezi ofufe nke Krisendọm, dị ka Atọ n’Ime Otu, na ihu abụọ pụtara ìhè e mere ihe atụ ya n’oké mwụfu ọbara n’Agha Ntụte ndị ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na Maimonides agakwughị n’ihu n’okwu banyere ịbụ Mesaịa nke Jisọs.—Matiu 7:21-23; 2 Pita 2:1, 2.

Maimonides na-ede, sị: “À pụrụ inwe ihe mkpọbi ụkwụ ka [Iso Ụzọ Kraịst]? Ndị amụma nile kwuru banyere Mesaịa ahụ dị ka onye mgbapụta Israel na onye nzọpụta ya . . . [N’ụzọ megidere nke ahụ, Iso Ụzọ Kraịst] kpataara ndị Juu ịbụ ndị e ji mma agha gbuo, ihe fọrọ n’ime ha ịbụ ndị a chụsasịrị ma wetuo ala, Torah ahụ ịbụ nke a gbanwere, na ihe ka ọtụtụ n’ụwa ịbụ ndị e mere ka ha hie ụzọ ma fee chi ọzọ na-abụghị Onyenwenụ ahụ.”—Mishneh Torah, “Iwu Ndị Eze na Agha Ha,” isiakwụkwọ nke 11.

Ma, n’agbanyeghị oké ùgwù a na-akwanyere ya, ọtụtụ ndị Juu na-ahọrọ ileghara Maimonides anya n’ihe ụfọdụ o kwuru okwu hoo haa banyere ha. N’ihi ike na-arịwanye elu nke okpukpe ndị Juu nke mgbaasị (Kabbalah), ịgụ kpakpando na-ewuwanye ewu n’etiti ndị Juu. Maimonides dere, sị: “Onye ọ bụla tinyere aka n’ịgụ kpakpando ma na-eme atụmatụ ọrụ ya ma ọ bụ njem ná ndabere nke oge ndị na-enyocha eluigwe setịpụrụ kwesịrị ịpịa ihe . . . Ihe ndị a nile bụ ụgha na aghụghọ . . . Onye ọ bụla kwere n’ihe ndị a . . . bụ nnọọ onye nzuzu ma ghara inwe uche.”—Mishneh Torah, “Iwu Banyere Ikpere Arụsị,” isiakwụkwọ nke 11; tụlee Levitikọs 19:26; Deuterọnọmi 18:9-13.

Maimonides katọsikwara ihe omume ọzọ ike: “[Ndị rabaị] setịpụụrụ onwe ha ego ha na-anara ndị mmadụ na ógbè dị iche iche ma mee ka ndị mmadụ na-eche, n’ụzọ ajọ nzuzu, na ọ bụ iwu ma kwesị ekwesị . . . Ihe a dum ezighị ezi. E nweghị otu mkpụrụ okwu ọ bụla, ma ọ bụ na Torah ma ọ bụ n’okwu ndị amamihe [nke Talmud], ịkwado ya.” (Commentary on the Mishnah, Avot 4:5) N’ụzọ na-adịghị ka nke ndị rabaị a, Maimonides rụsiri ọrụ ike iji kwado onwe ya dị ka dọkịta, n’adịghị mgbe ọ naara ụgwọ maka ije ozi okpukpe ya.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 2:17; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:9.

Olee Otú O Si Metụta Okpukpe Ndị Juu na Nkwenkwe Ndị Ọzọ?

Professor Yeshaiahu Leibowitz nke Hebrew University, Jerusalem, kwuru, sị: “Maimonides bụ onye kasị nwee mmetụta n’akụkọ ihe mere eme nke okpukpe ndị Juu, site n’ọgbọ Ndị Nna Ochie ahụ na Ndị Amụma ruo n’ọgbọ nke oge a.” Encyclopaedia Judaica na-ekwu, sị: “Mmetụta Maimonides n’ọganihu nke okpukpe ndị Juu n’oge dị n’ihu karịrị ikwu n’ọnụ. . . . C. Tchernowitz . . . ruru n’ókè nke ikwusi ike na e wezụga Maimonides okpukpe ndị Juu gaara etisasịworị gaa n’ịrọ òtù na nkwenkwe dị iche iche . . . Ọ bụ oké ihe ọ rụzuru ijikọta echiche ndị ahụ dịgasị iche iche.”

Site n’ịhazigharị echiche ndị Juu ikwekọ n’echiche nke ya nke usoro na arụmụka, Maimonides kọwagharịrị okpukpe ndị Juu. Ndị mmụta na ìgwè mmadụ n’otu aka ahụ hụrụ nkọwa ọhụrụ nke a dị ka nke dị irè ma na-adọrọ adọrọ. Ọbụna ndị megidere ya mesịrị nakwere ihe dị ukwuu n’ụzọ Maimonides si ele ihe anya. Ọ bụ ezie na ihe ndị o dere bụ maka ịtọpụ ndị Juu ná mkpa nke ichigharịkwuru ọtụtụ nkọwa okwu na-enweghị ọgwụgwụ, ngwa ngwa e dere nkọwa ndị dị ogologo banyere akwụkwọ ndị o dere.

Encyclopaedia Judaica na-ekwu sị: “Maimonides bụ . . . ọkà ihe ọmụma ụwa bụ́ onye Juu nke kasị pụta ìhè n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, akwụkwọ ya kwa bụ́ Guide of the Perplexed bụ akwụkwọ nkà ihe ọmụma ụwa kasị mkpa nke onye Juu bipụtara.” Ọ bụ ezie na e dere ya n’Arabic, a sụgharịrị The Guide for the Perplexed na Hibru n’oge ndụ Maimonides na ná mkpirikpi oge nke ahụ gasịrị gaa na Latin, na-eme ka e nwee ike iji ya mụọ ihe na Europe nile. N’ihi ya, ngwakọ pụrụ iche nke Maimonides nke nkà ihe ọmụma ụwa Aristotle na echiche okpukpe ndị Juu banyere ngwa ngwa n’echiche bụ́ isi nke ndị Krisendọm. Ndị mmụta Krisendọm nke oge ahụ, dị ka Albertus Magnus na Thomas Aquinas, na-ezokarị aka n’echiche Maimonides. O nwekwara mmetụta n’ahụ ndị mmụta Alakụba. Ụzọ ile ihe anya nke nkà ihe ọmụma ụwa nke Maimonides mere ka ndị ọkà ihe ọmụma ụwa bụ́ ndị Juu bụ́ ndị mesịrị pụta, dị ka Baruch Spinoza, wezụga onwe ha kpam kpam pụọ n’okpukpe ndị Juu nke omenala.

A pụrụ ile Maimonides anya dị ka nwoke nke Oge Ntụte nke biri ndụ tupu Oge Ntụte. Isi ọnwụ ya na okwukwe aghaghị ikwekọ n’echiche ka bụkwa ụkpụrụ bara uru. Ụkpụrụ nke a dubara ya n’ikwusi okwu ike megide nkwenkwe ụgha nke okpukpe. Ma, ihe nlereanya ọjọọ nke Krisendọm na mmetụta nkà ihe ọmụma ụwa nke Aristotle gbochiri ya ọtụtụ mgbe iru nkwubi okwu ndị kwekọzuru n’eziokwu Bible. Ọ bụ ezie na ọ bụghị mmadụ nile ga-ekwenye n’okwu a kanyere n’ili Maimonides—“Site na Mosis ruo na Mosis, ọ dịghị onye dị ka Mosis”—a ghaghị ikwenye na ọ kọwagharịrị usoro na ụkpụrụ okpukpe ndị Juu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a “Rambam” bụ ndebiri okwu Hibru, aha nke e nwetara site ná mkpụrụ akwụkwọ ndị mbụ nke okwu bụ́ “Rabbi Moses Ben Maimon.”

b Mishnah bụ nchịkọta nke okwu nkọwa ndị rabaị, ndị dabeere n’ihe ndị Juu lere anya dị ka iwu e nyere n’ọnụ. E deturu ya edetu n’ọgwụgwụ narị afọ nke abụọ na mmalite nke atọ O.A., na-eguzobe mmalite nke Talmud. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee broshuọ bụ́ Will There Ever Be a World Without War? peji nke 10, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

c Aha ahụ bụ́ Mishneh Torah bụ okwu Hibru e si na Deuterọnọmi 17:18 nweta, ya bụ, ndepụtaghachi nke Iwu.

d Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ihe àmà nke Jisọs dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, lee broshuọ bụ́ Will There Ever Be a World Without War? peji nke 24-30, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 23]

ỤKPỤRỤ OKWUKWE 13 NKE MAIMONIDESe

1. Chineke bụ Onye Okike na Onye Ọchịchị nke ihe nile. Nanị ya mere, na-eme, ga-emekwa ihe nile.

2. Chineke bụ otu. E nweghị ịdị n’otu yiri nke Ya n’ụzọ ọ bụla.

3. Chineke enweghị anụ ahụ. A gaghị eji echiche nke ihe ndị a na-ahụ anya kọwaa ya.

4. Chineke bụ mbụ na ikpeazụ.

5. O kwesịrị ekwesị ikpegara nanị Chineke ekpere. Mmadụ agaghị ekpegara onye ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ekpere.

6. Okwu nile nke ndị amụma bụ eziokwu.

7. Amụma Mosis bụcha eziokwu. Ọ bụ onye isi nke ndị amụma nile, ma ndị bu ya ụzọ ma ndị o bu ụzọ.

8. Torah dum nke anyị nwere ugbu a bụ nke ahụ e nyere Mosis.

9. A gaghị agbanwe Torah ahụ, ọ dịghịkwa mgbe Chineke ga-enye ọzọ.

10. Chineke maara ihe omume na echiche nile nke mmadụ.

11. Chineke na-enye ndị debere ihe ndị o nyere n’iwu ụgwọ ọrụ, na-atakwa ndị mehiere megide ya ahụhụ.

12. Mesaịa ahụ ga-abịa.

13. A ga-akpọghachite ndị nwụrụ anwụ ná ndụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

e Maimonides kọwara ụkpụrụ ndị a n’akwụkwọ ya bụ́ Commentary on the Mishnah, (Sanhedrin 10:1). Okpukpe ndị Juu mesịrị nakwere ha dị ka ụkpụrụ okwukwe iwu kwadoro. Ihe odide dị n’elu bụ nke e mere ka ọ dị nkenke site n’ụzọ ha si pụta n’akwụkwọ ekpere ndị Juu.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 21]

Jewish Division / The New York Public Library / Astor, Lenox, and Tilden Foundations

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya