Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 6/1 p. 7-12
  • Jehova—Chineke nke Na-ekpughe Ihe Nzuzo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova—Chineke nke Na-ekpughe Ihe Nzuzo
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ma Na-ahụ n’Anya
  • Nkwanye Ùgwù Kwesịrị Ekwesị Maka Ngwá Ọrụ Ndị Jehova Ji Eme Ihe
  • Ịgba Ihe n’Anwụ Ka Ọ̀ Bụ Izobe Ihe?
  • Ịkọ Ka Ọ̀ Bụ Ịghara Ịkọ?
  • Ihe Nzuzo Ndị Kraịst Na-agaghị Anwa Anwa Idebe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Olee Otú Anyị Ga-esi Nweta Ihe Ọmụma Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • ‘Amamihe Chineke nke Dị n’Ihe Nzuzo Dị Nsọ’
    Bịaruo Jehova Nso
  • Nlekọta Iji Mezuo Nzube Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 6/1 p. 7-12

Jehova—Chineke nke Na-ekpughe Ihe Nzuzo

“Chineke dị, Onye nọ n’eluigwe, Nke na-ekpughe ihe nzuzo nile.”—DANIEL 2:28.

1, 2. (a) Olee otú Jehova si dị iche n’ebe Onye Iro ukwu ya nọ? (b) Olee otú ụmụ mmadụ si egosipụta ịdị iche nke a?

JEHOVA, Chineke nke eluigwe na ala kasị elu nke na-ahụ n’anya, onye nanị ya bụ Onye Okike, bụ Chineke nke amamihe na ikpe ziri ezi. Ọ dịghị ya mkpa izo ihe e ji mara ya, ọrụ ya, ma ọ bụ nzube ya nile. N’oge nke ya nakwa n’otú o si chọọ, ọ na-ekpughe onwe ya. N’ụzọ dị otú a ọ dị iche n’ebe Onye Iro ya, bụ́ Setan Ekwensu nọ, onye na-agbalị izo ihe bụ ezie e ji mara ya na nzube ya.

2 Ọbụna dị ka Jehova na Setan na-adịghị ekwekọ, otú ahụ ka ndị na-efe ha ofufe dị. E ji omume ihu abụọ na aghụghọ mara ndị na-agbaso idu ndú Setan. Ha na-agbalị igosi onwe ha dị ka ndị dị mma, ebe ha na-arụ ọrụ ndị dịịrị ọchịchịrị. A gwara ndị Kọrint bụ ndị Kraịst ka eziokwu a ghara iju ha anya. “N’ihi na mmadụ dị otú a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ na-atụ ntụ, ndị na-eme onwe ha ka ha yie ndị ozi Kraịst. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya; n’ihi na Setan onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:13, 14) Ndị Kraịst, n’aka nke ọzọ, na-elegara Kraịst anya dị ka Onye Ndú ha. Mgbe ọ nọ n’elu ala o gosipụtara n’ụzọ zuru okè ụdị onye Nna ya, bụ́ Jehova Chineke bụ. (Ndị Hibru 1:1-3) N’ihi ya, site n’iso Kraịst, ndị Kraịst na-eṅomi Jehova, bụ́ Chineke nke eziokwu, nke ịgba ihe n’anwụ, na nke ìhè. Ọ dịghịkwa ha mkpa izo ihe e ji mara ha, ọrụ ha, ma ọ bụ nzube ha nile.—Ndị Efesọs 4:17-19; 5:1, 2.

3. Olee otú anyị pụrụ isi gbaghaa ebubo ahụ bụ na a na-amanye ndị ghọrọ Ndịàmà Jehova isonye ‘n’òtù nzuzo’?

3 N’oge ndị ọ maara na ọ kasị mma, Jehova na-ekpughe ihe banyere nzube ya na banyere ọdịnihu nke ụmụ mmadụ na-amabughị. N’echiche a ọ bụ Chineke nke na-ekpughe ihe nzuzo. N’ihi ya, a na-akpọ ndị chọrọ ijere ya ozi òkù—ee a na-agba ha ume—ịmụta ihe ọmụma dị otú ahụ e kpughere ekpughe. Otu nnyocha e mere Ndịàmà karịrị 145,000 na 1994 n’otu mba dị na Europe kpughere na, ná nkezi, nke ọ bụla n’ime ha nyochara n’onwe ya nkụzi nke Ndịàmà Jehova ruo afọ atọ tupu ọ họrọ ịbụ Onyeàmà. Ha mere nhọrọ ahụ dị ka inwere onwe ime nhọrọ nke ha si dị, n’abụghị ná mmanye. Ha nọgidere na-enwere onwe ha ime nhọrọ na ime ihe. Dị ka ihe atụ, n’ihi na ụfọdụ mesịrị jụ ụkpụrụ ndị dị elu nke omume maka ndị Kraịst, ndị a mesịrị kpebie na ha achọghị ịnọgide na-abụ Ndịàmà. Otú ọ dị, ọ bụ ihe na-akpali mmasị na n’ime afọ ise gara aga, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị a bụbu Ndịàmà weere nzọụkwụ iji maliteghachi mkpakọrịta na ọrụ ha dị ka Ndịàmà.

4. Olee ihe na-ekwesịghị inye ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nsogbu, n’ihi gịnịkwa?

4 Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nile bụbu Ndịàmà na-alọghachi, ụfọdụ n’ime ha kwa bụ ndị nọtụworo n’ọnọdụ inwe ibu ọrụ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Nke a ekwesịghị iju anya, n’ihi na ọbụna otu n’ime ụmụazụ Jisọs ndị kasị chie anya, bụ́ Judas onyeozi, wezụgara onwe ya. (Matiu 26:14-16, 20-25) Ma nke a ọ̀ bụ ihe mere a ga-eji nwee nchegbu banyere Iso Ụzọ Kraịst n’onwe ya? Nke a ọ̀ na-eme ka ihe ịga nke ọma nke Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ izi ihe ha ghara ịdị irè? Ọ dịghị ma ọlị, ọbụna dị ka omume ịgba mgba okpuru nke Judas Iskarịọt na-emeghị ka nzube nile nke Chineke ghara ịga n’ihu.

Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ma Na-ahụ n’Anya

5. Olee otú anyị si mara na Jehova na Jisọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, oleekwa otú ha siworo gosipụta ịhụnanya nke a?

5 Jehova bụ Chineke ịhụnanya. Ọ na-eche banyere ndị mmadụ. (1 Jọn 4:7-11) N’agbanyeghị ọnọdụ ya dị elu, ọ na-enwe ọṅụ ime ka ụmụ mmadụ bụrụ ndị enyi ya. Banyere otu n’ime ndị ohu ya n’oge ochie, anyị na-agụ, sị: “Abraham wee kwere okwu Chineke, e wee gụọ ya nye ya n’ezi omume; e wee kpọọ ya enyi nke Chineke.” (Jemes 2:23; 2 Ihe Emere 20:7; Aịsaịa 41:8) Dị ka ndị enyi bụ mmadụ na-ekerịta izu nzuzo, ma ọ bụ ihe nzuzo, otú ahụkwa ka Jehova na ndị enyi ya si eme. N’akụkụ a Jisọs ṅomiri Nna ya, n’ihi na o mere ndị na-eso ụzọ ya enyi ma soro ha kerịta ihe nzuzo. “Akpọkwaghị m unu ndị ohu ọzọ site n’ugbu a,” ka ọ gwara ha, “n’ihi na ohu adịghị ama ihe onyenwe ya na-eme: ma akpọwo m unu ndị enyi; n’ihi na ihe nile M nụrụ site n’ọnụ Nna m ka M mere ka unu mara.” (Jọn 15:15) Ihe ọmụma dịịrị ha, ma ọ bụ “ihe nzuzo,” ndị Jehova, Ọkpara ya, na ndị enyi ha nwekọrọ ọnụ na-ejikọ ha ná nkekọ na-adịghị adọbi adọbi nke ịhụnanya na nraranye.—Ndị Kọlọsi 3:14.

6. Gịnị mere ọ na-adịghị mkpa ka Jehova zobe ihe ndị o bu n’obi?

6 Ihe aha Jehova pụtara, “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ,” na-egosipụta ikike ya ịghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịghọ iji mezuo nzube ya. N’adịghị ka ụmụ mmadụ, ọ dịghị Jehova mkpa izo ebumnobi ya n’ihi ịtụ egwu na ndị ọzọ nwere ike igbochi ya imezu ha. Ọ pụghị nnọọ ịda, ya mere ọ na-agba n’anwụ n’ime Okwu ya, bụ́ Bible, ọtụtụ n’ime ihe ndị o zubere ime. Ọ na-ekwe nkwa, sị: “Okwu m [agaghị] alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:11.

7. (a) Gịnị ka Jehova buru n’amụma n’Iden, oleekwa otú Setan si nwapụta na Chineke bụ onye eziokwu? (b) Olee otú ụkpụrụ dị ná 2 Ndị Kọrint 13:8 si bụrụ eziokwu mgbe nile?

7 Ná mkpirikpi oge mgbe nnupụisi n’Iden gasịrị, Jehova kpughere, ná nchịkọta, ihe ikpeazụ ga-esi n’esemokwu dị n’etiti ya na Onye Iro ya, bụ́ Setan pụta. A ga-echifịa Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa nke Chineke n’ụzọ na-egbu mgbu, ma ọ bụghị n’ụzọ na-eweta ọnwụ, ebe a ga-emesịa chifịa Setan n’ụzọ na-akpata ọnwụ. (Jenesis 3:15) Na 33 O.A., Ekwensu chifịara Mkpụrụ ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, n’ezie site n’ime ka ọ nwụọ. N’ụzọ dị otú a, Setan mezuru Akwụkwọ Nsọ, e wee sikwa otú ahụ nwapụta Jehova ịbụ Chineke nke eziokwu, ọ bụ ezie na o doro anya na nke a abụghị nzube Setan. Asị ọ kpọrọ eziokwu na ezi omume, tinyere àgwà nganga, nke enweghị nchegharị ya, dugara ya n’ime kpọmkwem ihe Chineke buru n’amụma na ọ ga-eme. Ee, nye ndị nile na-emegide eziokwu, ọbụna nye Setan n’onwe ya, ụkpụrụ ahụ na-anọgide bụrụ eziokwu: “Anyị apụghị ime ihe ọ bụla megide eziokwu, kama anyị na-emere eziokwu ihe nile.”—2 Ndị Kọrint 13:8.

8, 9. (a) Gịnị ka Setan maara, ma ihe ọmụma a ọ̀ na-egbochi mmezu nke nzube Jehova? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa doro anya ka ndị na-emegide Jehova na-ajụ, n’ihi gịnịkwa?

8 Ebe ọ bụ na e guzobere Alaeze Chineke n’ụzọ anya na-adịghị ahụ na 1914, Mkpughe 12:12 emezuwo: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” Ma, ịmara na oge ya dị mkpirikpi, ọ̀ na-eme ka Setan gbanwee ụzọ ya? Nke ahụ ga-abụ nnakwere n’akụkụ nke Setan na Jehova bụ Chineke nke eziokwu nakwa na dị ka Onye Ọchịchị Kasị Elu, nanị ya kwesịrị ofufe. Otú ọ dị, Ekwensu adịghị njikere ịnakwere mmeri, ọbụna n’agbanyeghị ihe ndị ọ maara.

9 Jehova na-agba n’anwụ ihe ga-eme mgbe Kraịst bịara ikpe usoro ụwa Setan ikpe. (Matiu 24:29-31; 25:31-46) N’ihe banyere nke a, Okwu ya na-ama ọkwa banyere ndị na-achị ụwa, sị: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3) Ndị na-eso idu ndú Setan na-ajụ ịdọ aka ná ntị a doro anya. A na-eme ka ha kpuo ìsì n’ihi obi ọjọọ ha, nke a na-egbochikwa ha ichegharị site n’atụmatụ na ụzọ ime ihe ha nke na-anwa ime ka nzube Jehova kụọ afọ n’ala.

10. (a) Ruo n’ókè hà aṅaa ka ọ pụrụ ịbụ na 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3 emezuwo, ma olee otú ndị Jehova kwesịrị isi meghachi omume? (b) N’ihi gịnị ka ndị na-enweghị okwukwe pụrụ iji na-egosikwu nlelị n’ọdịnihu n’imegide ndị Chineke?

10 Karịsịa eri 1986, mgbe Mba Ndị Dị n’Otu kpọsara Afọ Udo nke Mba Nile, ụwa ejupụtawo n’okwu banyere udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. E werewo nzọụkwụ ndị doro anya ná mgbalị inweta udo ụwa, bụ́ nke yiri ka ọ gawo nke ọma ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Nke a ọ̀ bụ mmezu dum nke amụma a, ka ànyị pụrụ ịtụ anya ụdị ụfọdụ nke ịma ọkwa na-eju anya n’ọdịnihu? Jehova ga-eme ka okwu ahụ doo anya mgbe oge ya ruru. Ka ọ dị ugbu a, ka anyị mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, “na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke Chineke.” (2 Pita 3:12) Ka oge nọgidere na-agafe na ka okwu udo na ịnọ ná ntụkwasị obi na-aga n’ihu, ụfọdụ ndị maara banyere ịdọ aka ná ntị a, ma bụrụ ndị họọrọ ịjụ ya, pụrụ igosikwu nlelị n’iche na Jehova agaghị, ma ọ bụ apụghị, imezu okwu ya. (Tụlee Eklisiastis 8:11-13; 2 Pita 3:3, 4.) Ma ezi ndị Kraịst maara na Jehova ga-emezu nzube ya!

Nkwanye Ùgwù Kwesịrị Ekwesị Maka Ngwá Ọrụ Ndị Jehova Ji Eme Ihe

11. Gịnị ka Daniel na Josef mụtara banyere Jehova?

11 Mgbe Eze Nebukadneza, onye ọchịchị nke Alaeze Ukwu Babilọn, rọrọ nrọ nyere ya nsogbu nke ọ na-enweghị ike icheta, ọ rịọrọ maka enyemaka. Ndị nchụàjà ya, ndị majik, na ndị dibịa afa ya enweghị ike ịkọrọ ya nrọ ya, ha enweghịkwa ike ịkọwa ihe ọ pụtara. Otú ọ dị, ohu Chineke bụ́ Daniel nwere ike ime nke ahụ, ọ bụ ezie na o kwenyere ozugbo na mkpughe nke nrọ ahụ na ihe ọ pụtara esighị n’amamihe ya pụta. Daniel sịrị: “Chineke dị, Onye nọ n’eluigwe, Nke na-ekpughe ihe nzuzo nile, O mewokwa ka eze, bụ́ Nebukadneza, mara ihe aghaghị ịdị n’ikpeazụ ụbọchị ndị a.” (Daniel 2:1-30) Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Josef, onye amụma ọzọ nke Chineke, enwewo ahụmahụ yiri nke ahụ na Jehova bụ Onye Na-ekpughe ihe nzuzo.—Jenesis 40:8-22; Emọs 3:7, 8.

12, 13. (a) Ònye bụ onye amụma kasị ukwuu nke Chineke, n’ihi gịnịkwa ka i ji aza otú ahụ? (b) Olee ndị taa na-eje ozi dị ka “ndị na-achị ezinụlọ n’ihe omimi nke Chineke,” oleekwa otú anyị kwesịrị isi were ha?

12 Onye amụma Jehova kasị ukwuu nke jeworo ozi n’elu ala bụ Jisọs. (Ọrụ 3:19-24) Pọl kọwara, sị: “Chineke, mgbe Ọ gwararịị nna anyị ha okwu n’oge ochie n’ime ndị amụma n’iberibe akwụkwọ dị iche iche na ụzọ dị iche iche, Ọ gwara anyị okwu n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a n’ime Ọkpara, Onye O doro onye nketa nke ihe nile, Onye O sitekwara n’aka Ya mee ụwa nile.”—Ndị Hibru 1:1, 2.

13 Jehova gwara ndị Kraịst oge mbụ okwu site n’Ọkpara ya, Jisọs, bụ́ onye mere ka ha mara ihe nzuzo Chineke. Jisọs gwara ha, sị: “Unu ka e nyeworo ịmara ihe omimi alaeze Chineke.” (Luk 8:10) Pọl mesịrị kwuo banyere ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka “ndị na-ejere Kraịst ozi, ndị bụkwa ndị na-achị ezinụlọ n’ihe omimi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 4:1) Taa, ndị Kraịst e tere mmanụ nọgidere na-eje ozi dị ka ndị dị otú ahụ, na-emejupụta ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke na-esite n’Òtù Na-achị Isi ya na-enye nri ime mmụọ n’oge ya. (Matiu 24:45-47) Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndị amụma Chineke e nyere ike mmụọ nsọ nke oge gara aga ùgwù dị ukwuu, karịsịakwa Ọkpara Chineke, ó kwesịghịkwa ka anyị kwanyere ngwá ọrụ ọ bụla bụ́ mmadụ ùgwù, ndị Jehova ji ekpughe ihe ọmụma Bible taa, bụ́ nke dị ndị ya oké mkpa n’oge ndị a dị oké egwu?—2 Timoti 3:1-5, 13.

Ịgba Ihe n’Anwụ Ka Ọ̀ Bụ Izobe Ihe?

14. Olee mgbe ndị Kraịst na-arụ ọrụ na nzuzo, wee si otú ahụ na-agbaso ihe nlereanya onye?

14 Ịgba ihe n’anwụ nke Jehova n’ikpughe ihe ọ̀ pụtara na ndị Kraịst kwesịrị mgbe nile na n’okpuru ọnọdụ nile ikpughe ihe nile ha maara? Ndị Kraịst na-agbaso ndụmọdụ Jisọs nyere ndị ozi ya ịbụ “ndị nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru.” (Matiu 10:16) Ọ bụrụ na a gwa ha na ha apụghị ife Chineke dị ka akọ na uche ha si chọọ, ndị Kraịst na-anọgide ‘na-ekwenyere Chineke,’ n’ihi na ha maara na ọ dịghị ngwá ọrụ bụ́ mmadụ nwere ikike igbochi ofufe Jehova. (Ọrụ 5:29) Jisọs n’onwe ya gosipụtara na nke a bụ ihe ziri ezi. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ihe ndị a gasịrị Jisọs wee na-ejegharị na Galili: n’ihi na Ọ chọghị ijegharị na Judia, n’ihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu Ya. Ma ememe ahụ nke ndị Juu, bụ́ ememe ụlọikwuu, dị nso. Ya mere Jisọs sị ha [ụmụnne anụ ahụ ya bụ́ ndị na-ekweghị ekwe], . . . Rịgoonụ onwe unu n’ememe a: Mụ onwe m agaghị arịgoro ememe a ugbu a; n’ihi na oge nke m aka-ezughị. Ma mgbe Ọ gwasịrị ha okwu ndị a, Ọ na-anọgide na Galili. Ma mgbe ụmụnne Ya rịgosịrị ememe ahụ, mgbe ahụ Ya onwe ya rịgokwara, ọ bụghị n’ihu ọha mmadụ, kama dị ka ọ̀ bụ na nzuzo.”—Jọn 7:1, 2, 6, 8-10.

Ịkọ Ka Ọ̀ Bụ Ịghara Ịkọ?

15. Olee otú Josef si gosi na idebe ihe nzuzo bụ mgbe ụfọdụ ihe ịhụnanya ime?

15 N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ bụghị nanị na izobe okwu bụ ihe amamihe kama ọ bụkwa ihe ịhụnanya. Dị ka ihe atụ, olee otú Josef, bụ́ nna kuchiri Jisọs, siri meghachi omume mgbe ọ nụrụ na nwa agbọghọ o kwere nkwa ịlụ, bụ́ Meri, dị ime? Anyị na-agụ, sị: “Ma Josef di ya, ebe ọ bụ onye ezi omume, ma ọ chọghị igosi ya n’ihu ọha, o zubere ịhapụ ya na nzuzo.” (Matiu 1:18, 19, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Lee ihe na-egosighị obiọma ọ gaara abụ ịgba ya n’anwụ!

16. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị okenye, tinyere ndị òtù ọzọ nke ọgbakọ, nwere banyere ihe nzuzo?

16 E kwesịghị ikpughe okwu nzuzo ndị pụrụ ịkpata nsogbu ma ọ bụ ihe mgbu nye ndị na-ekwesịghị ịnụ ha. Ndị okenye ndị Kraịst na-eburu nke a n’uche mgbe ha na-aghaghị inye ndị Kraịst ibe ha ndụmọdụ ma ọ bụ nkasi obi onwe onye, ma ọ bụ ikekwe ọbụna inye ha ahụhụ n’ihi imehie n’ụzọ dị oké njọ megide Jehova. Ime ihe banyere okwu ndị a n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ dị mkpa; ikpughe ihe nzuzo nile metụtara ya nye ndị ọ na-emetụtaghị adịghị mkpa, ọ bụghịkwa ihe ịhụnanya. N’ezie, ndị òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst agaghị agbalị igwupụta ihe ọmụma nzuzo site n’ọnụ ndị okenye kama ha ga-akwanyere ibu ọrụ ndị okenye nwere izobe ihe nzuzo ùgwù. Ilu 25:9 na-arịba ama, sị: “Gị na mmadụ ibe gị kwurịta okwu ikpe gị, ekpughekwala izu nzuzo nke onye ọzọ.”

17. Gịnị mere ndị Kraịst ji ezobekarị ihe nzuzo, ma gịnị mere ha na-apụghị ime otú ahụ mgbe nile?

17 Ụkpụrụ a bụkwa eziokwu n’ime ezinụlọ ma ọ bụ n’etiti ezi ndị enyi. Izobe okwu ụfọdụ dị mkpa iji zere nghọtahie na mmekọrịta nwere ihe isi ike. “Ifufe Ugwu na-amụpụta oké mmiri ozuzo: ọ bụkwa ihu oké iwe ka ire na-ekwu okwu azụ na-amụpụta.” (Ilu 25:23) Otú ọ dị, iguzosi ike n’ihe nye Jehova na ụkpụrụ ezi omume ya, tinyere ịhụnanya maka ndị mmadụ mere ihe ọjọọ, pụrụ mgbe ụfọdụ ime ka ọ dị mkpa ịkọrọ ndị mụrụ ụmụ, ndị okenye ndị Kraịst, ma ọ bụ ndị ọzọ kwesịrị ịnụ ọbụna ihe ndị e zoro ezo.a Ma n’ọnọdụ ka ukwuu, ndị Kraịst na-edebe ihe nzuzo ndị dịịrị ndị ọzọ n’akọsaghị ha, na-echekwa ha dị ka ha si echekwa nke ha.

18. Olee àgwà ndị Kraịst atọ pụrụ inyere anyị aka ikpebi ihe anyị kwesịrị ịkọ na ihe anyị na-ekwesịghị ịkọ?

18 Ná nchịkọta, onye Kraịst na-eṅomi Jehova site n’izobe okwu ụfọdụ mgbe ọ dị mkpa, na-ekpughe ha nanị mgbe o kwesịrị ekwesị. N’ikpebi ihe o kwesịrị na ihe ọ na-ekwesịghị ịkọ, ịdị umeala n’obi, okwukwe, na ịhụnanya na-eduzi ya. Ịdị umeala n’obi na-egbochi ya igosi ịdị mkpa ya gabiga ókè, na-agbalị ime ka obi dị ndị ọzọ ụtọ site n’ịkọrọ ha ihe nile ọ maara ma ọ bụ site n’iji ihe nzuzo ọ na-apụghị ịkọ na-akpali mmasị ndị ọzọ. Okwukwe n’Okwu Jehova na ọgbakọ ndị Kraịst na-akpali ya ikwusa ihe ọmụma Bible nke Chineke nyere ka ọ na-akpachara anya izere ikwu ihe ndị pụrụ iwute ndị ọzọ ná mmalite. Ee, ịhụnanya na-akpali ya n’ụzọ pụtara ìhè ikwu ihe ndị na-enye Jehova otuto, ndị dịkwa ndị mmadụ mkpa ịmara iji nweta ndụ. N’aka nke ọzọ, ọ na-echekwa okwu nzuzo ndị dịịrị onwe onye, na-aghọta na n’ọnọdụ kasị ukwuu ikpughe ha ga-apụta igosi enweghị ịhụnanya.

19. Ụzọ ime ihe dị aṅaa na-enyere anyị aka ịmata ezi ndị Kraịst, gịnịkwa ka ọ na-arụpụta?

19 Ụzọ a guzoziri eguzozi na-enye aka ime ka a mata ezi ndị Kraịst. Ha adịghị ezochi ihe e ji mara Chineke n’ime ihe na-enweghị aha ma ọ bụ na nkwenkwe Atọ n’Ime Otu dị omimi, nke na-ekweghị nkọwa. Chi ndị a na-amaghị ama bụ njimara okpukpe ụgha, ọ bụghị nke bụ ezie. (Lee Ọrụ 17:22, 23.) Ndịàmà Jehova e tere mmanụ nwere ekele n’ezie maka ihe ùgwù nke ịbụ “ndị na-achị ezinụlọ n’ihe omimi nke Chineke.” Site n’ikpughepụrụ ndị ọzọ ihe nzuzo ndị a, ha na-enye aka na-adọta ndị nwere obi eziokwu ịchọ ọbụbụenyi Jehova.—1 Ndị Kọrint 4:1; 14:22-25; Zekaraịa 8:23; Malakaị 3:18.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee “Ekerela Òkè ná Mmehie nke Ndị Ọzọ” n’Ụlọ Nche nke July 15, 1986.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka o ji ghara ịdị Jehova mkpa izobe ihe ndị o bu n’obi?

◻ Ole ndị ka Jehova na-ekpughere ihe nzuzo ya?

◻ Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị Kraịst nwere n’ihe metụtara ihe nzuzo?

◻ Olee àgwà atọ ga-enyere ndị Kraịst aka ịmara ihe ha ga-akọ na ihe ha na-agaghị akọ?

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Jehova na-ekpughe ihe nzuzo site n’Okwu ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya