Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 6/1 p. 18
  • Ịgbaga ná Nzukọ Ọchịchị Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgbaga ná Nzukọ Ọchịchị Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Nọgide Na-ekwusa Eziokwu Bible n’Ireland
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Madagaska
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ọrụ Afọ Ofufo nke Nwere Abamuru Na-adịgide Adịgide
    Teta!—2001
  • Ịkpọsa Alaeze Chineke n’Àgwàetiti Ndị Dị na Fiji
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 6/1 p. 18

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ịgbaga ná Nzukọ Ọchịchị Jehova

OGOLOGO oge gara aga a kwaliri Aịsaịa onye amụma ikwupụta, sị: ‘Ha aghaghị ịsọpụrụ Jehova n’ala nile nke dị oké osimiri gburugburu.’ (Aịsaịa 24:15) Ndịàmà Jehova na-ele ala nile nke dị oké osimiri gburugburu anya dị ka akụkụ nke ‘elu ụwa dum mmadụ bi’ ebe Jisọs sịrị na ‘a ghaghị ikwusa ozi ọma ahụ.’—Matiu 24:14; Mak 13:10.

Àgwàetiti Marquesas dị n’ebe dị ka kilomita 1,400 n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke Tahiti. Ha bụ akụkụ nke ìgwè àgwàetiti dịpụrụ adịpụ na Ndịda Pacific a kpọrọ French Polynesia. N’inwe ala na-eme nri nke ọma, nke na-agbawa agbawa nakwa ihu igwe na-ekpo ọkụ, nke ikuku ọkụ, ihe ọkụkụ na-eme nke ọma n’àgwàetiti ndị a. Otú ọ dị, Marquesas na-amịkwa ụdị mkpụrụ ọzọ. Tụlee ihe metụtara otu ezinụlọ natara ozi Alaeze n’àgwàetiti Hiva Oa.

Jean na nwunye ya, Nadine, enweghị obi ụtọ banyere ihe ahụ a na-asị na ọ bụ ọha mmadụ mepere anya nke Ọdịda Anyanwụ Europe ebe ha biri. Ya mere ha kpebiri ịhapụ ụzọ ndụ gbalụ gbalụ ahụ ma kpọrọ nwa ha kwaga n’Àgwàetiti Marquesas. Ụlọ ọhụrụ ha, nke e jiri achara wuo, zobanyere na ndagwurugwu dịpụrụ adịpụ. Iji ruo ndị agbata obi ha dịkarịrị ha nso, ha aghaghị isi n’ụzọ ugwu jupụtara na nkume gafee ruo hour abụọ. Obodo nta kasị ha nso nke nwere otu dọkịta, ụlọ akwụkwọ, na ụlọ ahịa dị ebe a ga-eji ụgbọala jeep gbaa hour atọ.

Jean na Nadine enweghị mmasị n’okpukpe. Otú ọ dị, ha nwere nkwurịta okwu banyere mmalite nke ndụ. Ọtụtụ mgbe, ha ga-enye nkọwa sara mbara banyere nchepụta ndị dị mgbagwoju anya nke evolushọn. Ma ọ dịghị nchepụta ha wetaara ha afọ ojuju.

Mgbe ha bisịrị n’ebe dịpụrụ adịpụ ruo afọ isii, o juru ha anya ịbụ ndị Ndịàmà Jehova abụọ bịara leta. Ndịàmà ahụ anụwo banyere ebe Jean na Nadine nọ site na ndị obodo bi nso. Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, mkparịta ụka ahụ dujere ná ntụle nke nchepụta evolushọn. Dị ka ihe obi ụtọ nye di na nwunye ahụ, Ndịàmà ahụ ji otu akwụkwọ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Jean na Nadine nwere obi ụtọ inweta akwụkwọ nke nyere nnyocha sara mbara banyere otú ndụ si bịa ebe a.

Ntakịrị oge mgbe nke a gasịrị, a malitere ọmụmụ Bible. N’ime oge dị ka afọ atọ, Jean na Nadine nọgidere na-enwe ọganihu. O mesịrị doo ha anya na n’oge na-adịghị anya a ga-eme ka ụwa nile bụrụ paradaịs. Mgbe ezinụlọ ha mụbara ruo ụmụ atọ, ime njem ruo hour anọ iji gaa nzukọ ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ghọrọ ezigbo ihe ịma aka. Otú ọ dị, nke ahụ egbochighị ha ịga. N’ikpeazụ Jean na Nadine gosipụtara nrara ha nye Jehova site na baptism ime mmiri. Nke a ka ha mere n’otu mgbakọ e nwere n’obodo nta bụ isi, ebe ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara bụ 38!

Iji nyere ìgwè nta nke ndị nkwusa Alaeze aka, ezinụlọ ahụ kpebiri ịhapụ ebe obibi ha dịpụrụ adịpụ. Ha kwagara n’otu obodo nke ihe dị ka otu puku mmadụ bi, ebe Jean na-eje ozi dị ka ohu na-eje ozi n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Ezinụlọ a, bụ́ nke gbagaburu n’àgwàetiti ndị ahụ iji gbanahụ mmepeanya, na-ewere ya dị ka ihe ùgwù ịbụ ndị chọtaworo nanị ezi ebe nsọ, nzukọ ọchịchị Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya