Ọgwụgwọ Ọrụ Ebube Hà Ka Na-eme?
“NABATA Jisọs ka a gwọọ gị!” Okwu ndị yiri nke a dujere Alexandre, onye chọọchị Evangelical, ikwere na ịṅụ ọgwụ maka nrịanrịa ya ga-egosi enweghị okwukwe. O kwetara na nanị okwukwe ya ga-eweta ọgwụgwọ ọrụ ebube dị ya mkpa. O metụrụ Benedita, onye na-ekpesi Katọlik ike, n’ahụ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ banyere ọrụ ebube ịgwọ ọrịa n’ebe nsọ nke Aparecida do Norte, na steti São Paulo, Brazil. N’iji okwu majik ụfọdụ nke dada ya kụziiri ya eme ihe, Benedita kpegaara Our Lady of Aparecida, Anthony, na “ndị sentị” ndị ọzọ ekpere maka ike ịgwọ ndị ọrịa.
N’ụzọ pụtara ìhè, ọbụna ná ngwụsị nke narị afọ nke 20, ọtụtụ mmadụ ka kweere n’ọgwụgwọ ọrụ ebube—n’ihi gịnị? Eleghị anya, ụfọdụ na-enwe obi nkoropụ mgbe ndị dọkịta na-enweghị ike ime ihe dị ukwuu iji wepụ ọrịa, ahụ mgbu, na nhụjuanya nke ndị ha hụrụ n’anya, karịsịa ụmụ ha. Ndị nrịanrịa na-adịghị ala ala na-eti ihe otiti pụrụ iche na n’ihi oké ọnụ nke ọgwụ ọgbara ọhụrụ, ọ dịghị ihe dị njọ n’ịchọ iji okwukwe agwọ ọrịa. Ụfọdụ na-ahụ na TV ka chọọchị na ndị dị iche iche na-asị na ha ga-agwọ AIDS, ịda mbà n’obi, ọrịa cancer, isi ezughị okè, ọbara mgbali elu, na ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ. Ma hà nwere obi ike n’ụdị nzọrọ ndị ahụ ma ọ bụ na ha enweghị, ha pụrụ ichigharịkwuru ha dị ka ihe ikpeazụ a ga-eme. Ndị ọzọkwa bụ́ ndị na-ekwere na mmụọ ọjọọ kpatara ọrịa ha pụrụ iche na ọgwụ ọdịnala enweghị ike inyere ha aka.
N’aka nke ọzọ, e nwere ndị na-emegide, ọbụna na-akatọ, echiche nke ọgwụgwọ ọrụ ebube site n’aka “ndị sentị” nwụrụ anwụ ma ọ bụ ndị dị ndụ na-agwọ ọrịa. Dị ka akwụkwọ bụ́ Jornal da Tarde si kwuo, ọkà ná mmụta ahụ ịlụso ọrịa ọgụ bụ́ Dráusio Varella na-eche na nkwenkwe ahụ “na-eduhie okwukwe nke ndị na-amụghị anya na ndị na-enweghị olileanya.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “N’inwe olileanya n’ọrụ ebube, ọtụtụ pụrụ ịgbahapụ ọgwụgwọ dị oké mkpa e ji ọgwụ enye n’ihi ndị nduhie a.” Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-akọwakwa, sị: “N’oge gara aga e jikọwo ọgwụgwọ ọdịnala na ebe ndị dị nsọ na ihe omume okpukpe, sayensị ọgwụ na-ekwukarịkwa na ọ bụ usoro ekwube o rebe nke na-arụ ọrụ n’okpuru ọnọdụ ndị dabara adaba na-agwọ ọrịa ndị dị otú ahụ.” Ma, e nwere ọtụtụ ndị kwere na ọ bụ ọrụ ebube gwọrọ ha n’ezie. Nye ha, ọgwụgwọ ahụ dị irè!
Ndị maara Bible nke ọma maara na Jisọs Kraịst gwọrọ ndị ọrịa n’ọtụtụ mgbe, na-eme nke a site “n’ike Chineke.” (Luk 9:42, 43) N’ihi ya ha pụrụ iche n’echiche, sị: ‘Ike Chineke ọ̀ ka na-arụ ọrụ ma na-akpata ọgwụgwọ ọrụ ebube taa?’ Ọ bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka mgbalị ndị a na-eme iji gwọọ ọrịa ji ghara ịdị na-arụpụta ihe e kwere ná nkwa? Ọ̀ bụ n’ihi na onye ọrịa ahụ enweghị okwukwe zuru ezu ka ọ̀ bụ n’ihi na onyinye ya ezughị ezu? Ò ziri ezi onye Kraịst ịchọ ọgwụgwọ ọrụ ebube mgbe ọ na-arịa ọrịa na-egbu mgbu ma ọ bụ ikekwe nke a na-apụghị ịgwọta? Ọ̀ dịkwa mgbe ọgwụgwọ ọrụ ebube na-adịghị ada ada ụdị ndị Jisọs rụrụ ga-ewere ọnọdụ ọzọ? Ị pụrụ inweta azịza nye ajụjụ ndị a dị mkpa n’isiokwu na-esonụ.