Ndụ M Na-akwaghị Ụta Ya Ma Ọlị
DỊ KA PAUL OBRIST SI KỌỌ
Na 1912, mgbe m dị afọ isii, mama m nwụrụ mgbe ọ na-amụ nwa nke ise ya. Ihe dị ka afọ abụọ n’ihu, nwa agbọghọ na-arụ ọrụ ilekọta ụlọ, bụ́ Berta Weibel, malitere ilekọta ezinụlọ anyị. Mgbe nna m lụrụ ya n’afọ na-esonụ, anyị bụ́ ụmụaka nwere obi ụtọ inwe nne ọzọ.
ANYỊ biri na Brugg, obere obodo dị n’akụkụ Switzerland ebe a na-asụ German. Berta bụ nnọọ onye Kraịst n’ezie, m nwekwara mmasị dị ukwuu n’ebe ọ nọ. Ọ maliteworị ịmụ mbipụta Ndị Mmụta Bible (Ndịàmà Jehova) na 1908, ọ na-esokwa ndị ọzọ ekerịta ihe ọ mụtara.
Na 1915, n’oge na-adịghị anya mgbe papa m lụsịrị Berta, m sooro Berta gaa n’ebe e gosiri “Foto Ihe Nkiri nke Okike.” Ihe nkiri slide a na ngosi ihe nkiri nke Òtù Mba Nile nke Ezi Ndị Mmụta Bible nwere mmetụta miri emi n’uche na n’obi m. O metụkwara ndị ọzọ n’ahụ. Ụlọ nzukọ dị na Brugg juru n’ọnụ nke na ndị uwe ojii mechiri ọnụ ụzọ ma chụghachi ndị ọzọ bịaranụ. Mgbe ahụ ndị ọzọ nwara iji ubube ma site na window ghere oghe bata, ole na ole nwekwara ihe ịga nke ọma.
Ezi Ihe Ilereanya Nne M
Agha Ụwa Mbụ kpụ ọkụ n’ọnụ mgbe ahụ na Europe, egwu jikwa ndị mmadụ banyere ọdịnihu. N’ihi ya, iji ozi Alaeze Chineke na-akasi obi aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, dị ka nne m mere, bụ ọrụ magburu onwe ya. Mgbe ụfọdụ ọ na-ekwe ka m sonyere ya, nke a tọkwara m ụtọ nke ukwuu. Na 1918, nne m mesịrị nwee ike igosipụta nrara ọ raara onwe ya nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri.
Nna m egbochibeghị ofufe nne m ruo na baptism ya, ma mgbe ahụ ọ malitere imegide ya. Otu ụbọchị ọ pụnaara akwụkwọ ndị o ji amụ Bible ma tụnye ha na stoovu. Nne m nwere ike ịgụpụta nanị Bible ya n’ọkụ ahụ. Ma ihe ọzọ o mere dị ịtụnanya. Ọ gakwuuru nna m ma makụọ ya. O bughị iwe ọ bụla n’obi megide ya.
N’ịbụ onye nwere oké ijuanya, iwe nna m dajụrụ. Otú ọ dị, site n’oge ruo n’oge, mmegide ya na-enwuru ọkụ, anyị aghaghịkwa ịnagide ntiwapụ ya.
Ọrụ na Ọganihu Ime Mmụọ
Na 1924, mgbe m gbasịrị odibo afọ atọ dị ka onye na-edozi isi, ahapụrụ m ụlọ ma chọta ọrụ n’akụkụ Switzerland ebe a na-asụ French. Nke a nyere m ohere inwe ọganihu n’asụsụ French. Ọ bụ ezie na nkwagharị ahụ gbochitụrụ ọganihu ime mmụọ m, ọ dịghị mgbe m tụfuru ịhụnanya m nke eziokwu Bible. Ya mere mgbe m laghachiri ụlọ afọ isii n’ihu, amalitere m ịga nzukọ ọgbakọ ndị Kraịst na Brugg.
Ná mkpirikpi oge ka e mesịrị akwagara m Rheinfelden, obere obodo dị ihe dị ka kilomita 40 site n’ebe ahụ. Arụrụ m ọrụ n’ebe ahụ n’ebe nwanne m nwanyị na-edozi isi ma nọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ m site n’iso otu ìgwè nta nke Ndị Mmụta Bible na-ezukọ. Otu ụbọchị mgbe ọ na-emechi ọmụmụ Bible etiti izu anyị, Nwanna Soder, bụ́ onye okenye na-enye nduzi, jụrụ, sị: “Olee ndị na-eme atụmatụ ikere òkè n’ozi ubi na Sunday?” Ewepụtara m onwe m, na-eche na m ga-eso otu onye gaa ka o gosikwa m otú e si arụ ọrụ ahụ.
Mgbe o ruru Sunday, anyị eruokwa ókèala anyị, Nwanna Soder sịrị, “Maazị Obrist ga-arụ ebe ahụ.” Ọ bụ ezie na obi otiti m rịrị elu karịa mgbe ọ bụla ọzọ, amalitere m ịkpọtụrụ ndị mmadụ n’ebe obibi ha na ịgwa ha okwu banyere Alaeze Chineke. (Ọrụ 20:20) Site n’oge ahụ gaa n’ihu, ọ dịbeghị mgbe m dara mbà n’ịga n’ihu n’ọrụ nkwusa ahụ nke Jisọs sịrị na a ghaghị ịrụzu tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a abịa. (Matiu 24:14) Na March 4, 1934, mgbe m dị afọ 28, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri.
Afọ abụọ n’ihu achọtara m ọrụ dị ka onye na-edozi isi na Lugano, bụ́ obodo dị n’akụkụ Switzerland ebe a na-asụ Italian. Amalitere m ozugbo ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ, n’agbanyeghị na m maara Italian nke nta. N’agbanyeghị nke ahụ, na Sunday mbụ m n’ozi, etinyere m akwụkwọ nta 20 m ji gaa. Ka oge na-aga, enwere m ike ịkpọkọta mmadụ ole na ole nwere mmasị iji guzobe otu ìgwè na-amụ Ụlọ Nche. E mesịa e mere ọtụtụ n’ime ndị a baptism, na February 1937 kwa anyị guzobere otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova na Lugano.
Ọnwa abụọ n’ihu, n’April 1937, anatara m akwụkwọ ozi nke gbanwere ndụ m n’ụzọ dị egwu. Ọ bụ òkù ije ozi na Betel, dị ka a na-akpọ ihe owuwu alaka nke Ndịàmà Jehova ná mba. Azara m òkù ahụ ozugbo—mkpebi ọ na-adịbeghị mgbe m kwara ụta ya. Otú ahụ ka m si malite ihe ghọworo ọrụ afọ 60 n’ozi oge nile.
Ozi Betel n’Oge Jupụtara ná Nsogbu
N’oge ahụ Betel Swiss dị n’obodo Bern, bụ́ isi obodo Switzerland. N’ebe ahụ anyị biri akwụkwọ, akwụkwọ nta, na magazin n’asụsụ 14, e bugakwara ha na Europe nile. N’otu oge, eji m baro buga akwụkwọ e biri ebi n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị, ebe ọ bụ na n’oge ahụ anyị adịghị enwekebe ụgbọala. Ọrụ mbụ e kenyere m na Betel bụ ná Ngalaba Nhazi Edemede, ebe anyị haziri lead type nke e si na ya ebi akwụkwọ. N’oge na-adịghị anya amalitere m ịrụ ọrụ n’ebe nnabata, n’eziekwa, ejekwara m ozi dị ka onye na-akpa isi maka ezinụlọ Betel.
Na September 1939, Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ, ajọ mwakpo ndị Nazi gbasakwara ụjọ na Europe nile. Switzerland bụ mba nọpụrụ iche n’etiti mba ndị ahụ na-eburịta agha. Ná mmalite, anyị gara n’ihu n’ọrụ ndị Kraịst anyị n’enweghị mgbochi. E mesịa, na July 5, 1940, n’elekere anya abụọ nke ehihie, ka m nọ n’oche m n’ebe nnabata, otu onye nkịtị batara, otu onye agha bu égbè a kwụnyere mma nwa ntí na-esokwa ya n’azụ.
“Olee Zürcher?” ka onye nkịtị ahụ bigbọrọ. Franz Zürcher bụ onye nlekọta alaka nke ọrụ nkwusa anyị na Switzerland n’oge ahụ.
“Ònye ka m ga-agwa ya na ị bụ?” ka m jụrụ. Ha kpụụrụ m ozugbo ma dọkpụrụ m na-agbago na steepụ, na-agwa m ka m duga ha n’ọfịs Zürcher.
Ezinụlọ Betel dum—anyị dị ihe dị ka 40 mgbe ahụ—ka e nyere iwu izukọta n’ọnụ ụlọ iri ihe. A kwụwara égbè anọ na-awụpụ mgbọ n’èzí iji gbochie onye ọ bụla ịnwa ịgbapụ. N’ime, ihe dị ka ndị agha 50 malitere inyocha ụlọ ahụ. N’ụzọ dị iche n’ihe a tụrụ anya, a chọtaghị ihe àmà ọ bụla na Ndịàmà Jehova na-etinye aka n’ịkwado imegide ije ozi agha. N’agbanyeghị nke ahụ, e jichiri akwụkwọ buru nnọọ ịbụ ma jiri gwongworo ndị agha ise bupụ ha.
Mgbe anyị na-ekweghị ka ndị ọrụ gọọmenti na-ekpebi ihe a ga-ebi n’Ụlọ Nche, a kwụsịrị mbipụta ya na Switzerland. Nke a pụtara na a chọrọ ndị ọrụ ka nta maka ọrụ a na-arụ na Betel, a gbakwara ndị òtù ezinụlọ ahụ na-emechabeghị okenye ume ịpụ ma ghọọ ndị ọsụ ụzọ, dị ka e si akpọ Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ nkwusa oge nile.
Ịsụ Ụzọ n’Oge Agha
Na July 1940, alaghachiri m n’ógbè Switzerland dị nso na Lugano ebe a na-asụ Italian, ebe m biworo tupu mụ abịa Betel. Ókèala a gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na Katọlik, bụ́ nke nọkwa n’okpuru mmetụta siri ike nke Ọchịchị Aka Ike Fascist, ghọrọ ebe e kenyere m ọrụ ịsụ ụzọ.
Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na otu ụbọchị adịghị agafe n’enweghị ndị uwe ojii kwụsịrị m, bụ́ ndị na-ekwu ka m kwụsị ọrụ nkwusa m. Otu ụbọchị ka m na-agwa otu nwanyị okwu n’ụzọ mbata nke otu ubi, otu nwoke yi uwe ndị nkịtị si n’azụ jide m, kpụga m n’ụgbọala mkpagharị nke ndị ọrụ nchebe, ma buru m gaa Lugano. N’ebe ahụ o nyefere m n’aka ndị uwe ojii. Mgbe a gbara m ajụjụ, akọwara m na Jehova Chineke enyewo anyị iwu ime nkwusa.
“N’elu ala ebe a, ọ bụ anyị na-enye iwu,” ka onye uwe ojii ahụ ji nganga zaghachi. “Chineke nwere ike inye iwu n’eluigwe!”
N’oge agha ahụ, ọ dị mkpa karịsịa na anyị rubere isi na ndụmọdụ Jisọs ịbụ ndị “nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru.” (Matiu 10:16) Ya mere, ana m ezo ihe ka ọtụtụ n’ime akwụkwọ m n’akpa ndị dị n’ime efe m. Ijikwa jide n’aka na agaghị m atụfu ihe ọ bụla, m na-eyi nịka ndị ọnụ ya tagidesiri ike ná mgbada ikpere.
Ka oge na-aga, anatara m ntụziaka ịkwaga na ndagwurugwu Engadine, ebe ọsọ nwamba na òké nke mụ na ndị uwe ojii gara n’ihu. Nke a bụ ndagwurugwu mara mma n’ebe ọwụwa anyanwụ Swiss Alps, bụ́ nke ikpo ice na-erikpu n’oge oyi, ya mere m mere ka e wetara m mkpara snow m iji nyere m aka isi n’otu ebe gaa ebe ọzọ n’ókèala ahụ.
Ihe a na-ekpunye n’aka na-achụ oyi dị mkpa mgbe e ji mkpara ice na-eme ihe n’oge oké oyi. N’ihi iji ya eme ihe ugboro ugboro, n’oge na-adịghị anya nke m malitere ịka nká. Lee ekele m nwere otu ụbọchị ịnata site n’ebe nzite ozi otu ngwugwu m na-atụghị anya ya ma ọlị bụ́ nke e tinyere uwe oyi e ji aka kpaa ya na ihe a na-ekpunye n’aka na-achụ oyi! Otu nwanna nwanyị onye Kraịst nọ n’ọgbakọ m nọbu na Bern meere m ha. Ọbụna mgbe m chere echiche banyere ya ugbu a, m na-ejupụta n’obi ekele.
Ọtụtụ Ihe Ùgwù Na-enye Ọṅụ
Na 1943, ọnọdụ malitere ịkwụsi ike na Switzerland, a kpọghachitekwara m ije ozi na Betel. N’ihi nsogbu ụfọdụ dị n’ọgbakọ French dị na Lausanne, nke dị ihe dị ka kilomita 100 site n’ebe ahụ, e kenyere m ọrụ ileta obodo ahụ mgbe mgbe iji nyere ndị nkwusa aka inwe echiche ziri ezi banyere nzukọ Chineke.
N’ikpeazụ ejere m ozi ruo oge ụfọdụ dị ka onye nlekọta sekit maka ọgbakọ French nile dị na Switzerland. Ná mmalite izu, ana m arụ ọrụ na Betel, ma ana m eji Friday, Saturday, na Sunday na-eleta ọgbakọ dị iche kwa izu ná mgbalị inye aka n’ụzọ ime mmụọ. Tụkwasị na nke a, mgbe e guzobere ọgbakọ na-asụ French na Bern na 1960, aghọrọ m onye isi oche ndị nlekọta ya. Ejere m ozi n’ọnọdụ a ruo 1970, mgbe e bugharịrị Betel site na Bern gaa n’ọmarịcha ebe ọ dị ugbu a n’obodo Thun.
Enwere m obi ụtọ ịhụ obere ìgwè Ndịàmà na-asụ Italian bi na Thun, amalitekwara m iso ha arụ ọrụ. Ka oge na-aga e guzobere otu ọgbakọ, ejekwara m ozi dị ka onye isi oche ndị nlekọta ya ruo ọtụtụ afọ ruo mgbe ụmụnna ndị na-akatabeghị ahụ ka m ruru eru iburu ibu ọrụ ahụ.
Ihe m werewooro dị ka ihe ùgwù kasị enye ọṅụ bụ ịga mgbakọ mba nile nke ndị Jehova. Dị ka ihe atụ, na 1950 e nwere Mgbakọ Ịba Ụba Ọchịchị Chineke kwesịrị ncheta na Yankee Stadium, New York. Ileta isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na Brooklyn, New York, nwere mmetụta na-adịgide adịgide n’ahụ m. Ọ dịghịkwa mgbe m ga-echefu okwu Nwanna Milton G. Henschel kwuru n’afọ na-esonụ ná Mgbakọ Ofufe Dị Ọcha e nwere na London, England, bụ́ nke mesiri ike okwu Jisọs bụ́, “Asị m unu na, ọ bụrụ na ndị a ekpuchie ọnụ ha, nkume ga-eti mkpu.” (Luk 19:40) Nwanna Henschel jụrụ sị, “Ùnu chere na nkume ga-etirịrị mkpu?” M ka pụrụ ịnụ ná ntị m oké ụda, bụ́ “Ee e!” nke si n’olu ọtụtụ iri puku mmadụ pụta.
Mgbe m laghachiri Betel na 1937, nna m, onye matara na anyị na-anata nanị obere ego mmachi akpa, ji nchekasị jụọ, “Nwa m nwoke, olee otú ị ga-esi dịgide ndụ n’agadi?” Azaghachiri m site n’ihota okwu ọbụ abụ bụ́ Devid: “Ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Abụ Ọma 37:25) E mezuwo okwu ndị a n’ezie n’ọnọdụ m.
Lee obi ụtọ m nwere na n’ihe karịrị afọ 80 gara aga, nna m lụrụ Berta Weibel, sitekwa n’ihe ilereanya na nduzi ya abịara m mara Jehova na àgwà ya! Ọ bụ ezie na ndị òtù ezinụlọ anyị ndị ọzọ chịrị ya ọchị, o ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ruo n’oge ọnwụ ya na 1983. Ọ dịbeghị mgbe o kwupụtara ịkwa ụta n’ozi o jeere Chineke ya, bụ́ Jehova; ọ dịbeghịkwa mgbe m kwara ụta ịnọ n’alụghị nwunye na itinye ndụ m nile n’ozi Jehova.
[Foto dị na peeji nke 25]
Ịrụ ọrụ na Betel