Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 7/15 p. 3
  • Olee Otú I Si Ele Mmehie Anya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú I Si Ele Mmehie Anya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe Mmehie Na-adịkwaghị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Mmehie—Olee Ihe Gbanwere na Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Olee Otú I Si Ele Mmehie Anya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ụwa Mmehie Na-adịghị na Ya—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 7/15 p. 3

Olee Otú I Si Ele Mmehie Anya?

“E NWEGHỊ mmehie dị n’ime gị, e nweghị nhụsianya dị n’ime gị; ị bụ ebe nkwakọba nke ike kasịnụ.” Ọ bụ ọkà ihe ọmụma ndị Hindu a ma ama, bụ́ Vivekananda, kwuru okwu a mgbe ọ na-akọwa otu akụkụ ihe odide sitere n’akwụkwọ dị nsọ nke ndị Hindu, bụ́ Bhagavad Gita. N’izo aka na Vedanta, ọ na-azọrọ, sị: “Mmejọ kasịnụ bụ ikwu na ị dịghị ike, na ị bụ onye mmehie.”a

Otú ọ dị, ọ̀ bụ eziokwu na mmehie adịghị n’ime mmadụ? Gịnịkwa, ma ọ bụrụ na ọ dị, ka mmadụ na-eketa n’ọmụmụ? Nanị “àgwà elu ahụ ka ihe e ketara eketa na-ekpebi,” ka Nikhilananda, bụ́ onye nkụzi okpukpe ndị Hindu, na-ekwu. ‘Omume mmadụ n’ụwa mbụ’ na-akwadebe njimara ndị ọzọ. Dị ka Vivekananda si kwuo, “ị bụ onye okike nke akara aka gị.” Okpukpe Hindu adịghị akụzi ihe ọ bụla banyere mmehie e ketara eketa.

Echiche nke mmehie e ketara eketa adịghịkwa n’etiti ndị Zoroaster, ndị Shinto, ndị Confucius, na ndị Buddha. Ọbụna ná ngwakọta okpukpe ndị Kraịst na ndị Juu, bụ́ nke kụziworo nkwenkwe nke mmehie e ketara eketa, àgwà e nwere banyere mmehie na-agbanwe agbanwe. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa adịghị ele onwe ha anya dị ka ndị na-eme mmehie.

“Nghọta ọgbara ọhụrụ adịghị akwado ịkatọ omume; nke ka nke, ọ dịghị akwado ịkatọ onwe onye,” ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ Cornelius Plantinga, Jr., na-ekwu. A ga-ata chọọchị nile nke Krisendọm ụta maka iwere mmehie dị ka ihe dị nnọọ nta. “Agala chọọchị ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịnụ banyere mmehie,” ka otu ụkọchukwu nke Mahadum Duke na-ekwu. Dịkwa ka Plantinga si kwuo, chọọchị ụfọdụ na-ekwukarị banyere mmehie nanị n’isiokwu ndị metụtara ọha mmadụ.

N’eziokwu, ahụhụ ọha mmadụ nke oge a dị ọtụtụ. Ime ihe ike, mpụ, agha, esemokwu agbụrụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, emeghị ihe n’eziokwu, mmegbu, na imeso ụmụaka ihe ike juru ebe nile. N’ezie, a kpọwo narị afọ nke 20 otu n’ime narị afọ ndị kasị jupụta n’ọbara nke ihe a kpọrọ mmadụ hụtụworo. Tụkwasị na nke a e nwere ihe mgbu na nhụjuanya nke ọrịa, ịka nká, na ọnwụ. Olee onye ntọhapụ pụọ n’ọtụtụ nsogbu ndị dị n’ụwa taa na-adịghị agụsi agụụ ike?

Mgbe ahụ, olee otú i si ele mmehie anya? È ketara mmehie eketa? Ọ̀ dị mgbe anyị ga-enwere onwe anyị pụọ n’ihe mgbu na nhụjuanya? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nkà ihe ọmụma Vedanta na-adabere n’ihe odide Upanishad, bụ́ nke dị ná ngwụsị nke akwụkwọ nsọ ndị Hindu, bụ́ Veda.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya