Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 8/1 p. 3-4
  • Akọ na Uche Ibu Arọ Ka Ọ̀ Bụ Uru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akọ na Uche Ibu Arọ Ka Ọ̀ Bụ Uru?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akọ na Uche—Echiche Bible
  • À Zụrụ Akọ na Uche Gị Azụ nke Ọma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Olee Otú Ị Ga-esi Na-enwe Ezi Akọnuche?
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Nụrụ Olu Na-agwa Gị Okwu n’Ime Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Akọnuche Gị Ọ̀ Na-eduzi Gị Nke Ọma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 8/1 p. 3-4

Akọ na Uche Ibu Arọ Ka Ọ̀ Bụ Uru?

‘AKỌ na uche m na-enye m nsogbu!’ Site n’oge ruo n’oge, ọ fọrọ nke nta ka anyị nile na-enweta ihe mgbu nke akọ na uche. Ụdị mmetụta ahụ pụrụ isite ná ntakịrị ahụ erughị ala gaa n’oké ihe mgbu. Akọ na uche ihe na-esogbu pụrụ ọbụna ịkpasu ịda mbà n’obi ma ọ bụ echiche dị ukwuu nke ọdịda.

Mgbe ahụ, e site n’echiche a lee ya anya, ọ̀ bụ na akọ na uche abụghị ibu arọ? Ụfọdụ pụrụ iche na ọ bụ. Ndị na-eche echiche nke ọgbọ ndị gara aga weere akọ na uche mgbe mgbe dị ka ikike dị n’ime, nke a mụnyere n’ime mmadụ. Ọtụtụ chere na ọ bụ ihe nduzi omume nke Chineke n’onwe ya ji aka ya nye. N’ihi ya a kpọwo akọ na uche “ọnụnọ Chineke n’ime mmadụ,” “ọdịdị mbụ anyị,” na ọbụna “olu Chineke.”

Otú ọ dị, n’afọ ndị a, ọ ghọwo ihe na-ewu ewu ikwu na akọ na uche bụ n’ụzọ kasị ukwuu ikike e nwetara enweta—ihe mmetụta nne na nna na ọha mmadụ na-arụpụta. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọkà n’ọrịa uche na-arụ ụka na nwatakịrị na-amụta ịjụ akparamàgwà na-adịghị mma n’ụzọ bụ isi n’ihi ụjọ inweta ntaramahụhụ, na-ekwere na ihe anyị na-akpọ akọ na uche bụ nanị mmịkọrọ nke ụkpụrụ na nkwenkwe onwe onye nke ndị mụrụ anyị. Ndị ọzọ na-ezo aka n’òkè ọha na eze na-ekere n’ozuzu ya n’inyefe ihe ndị bara uru na ụkpụrụ. Ụfọdụ na-ele ihe mgbu nke akọ na uche anya dị ka nanị mburịta agha dị n’etiti ihe anyị ga-achọ ime na ihe ọha na eze dị obi ọjọọ na-achọ ka anyị mee!

N’agbanyeghị nchepụta echiche dị iche iche, mgbe mgbe ndị mmadụ eguzogidewo ndị nne na nna, ezinụlọ dị iche iche, na ọha mmadụ nile n’ihi na akọ na uche ha gwara ha mee otú ahụ. Ọbụna ụfọdụ adịwo njikere iji ndụ ha chụọ àjà n’ihi akọ na uche! N’agbanyeghịkwa ọdịiche dị ukwuu dị n’etiti ọdịbendị ndị dị n’ụwa, omume ndị dị ka igbu ọchụ, izu ohi, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, ịtụ asị, na idina onye ikwu fọrọ nke nta ka ha bụrụ ihe a na-ewere dị ka ihe dị njọ n’ụwa nile. Ọ̀ bụ na nke a agaghị agba akaebe na akọ na uche bụ ihe e ketara eketa, ihe sitere n’ọmụmụ?

Akọ na Uche—Echiche Bible

Onye bụ n’ezie o kwusịa o bie n’okwu a bụ Jehova Chineke. E kwuwerị, “Ya onwe ya [Chineke] emewo anyị, ọ bụkwa Ya nwe anyị.” (Abụ Ọma 100:3) Ọ ghọtara nke ọma ihe e ji mee anyị. Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-akọwa na e mere mmadụ “n’onyinyo” Chineke. (Jenesis 1:26) E kenyere n’ime mmadụ echiche nke ezi ihe na ihe ọjọọ; site ná mmalite, akọ na uche bụ akụkụ ọdịdị mmadụ e ketara eketa.—Tụlee Jenesis 2:16, 17.

Pọl onyeozi na-akwado nke a n’akwụkwọ ozi ya o degaara ndị Rom, na-ede: “Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ ndị na-enweghị iwu [Chineke] na-eme ihe nile dị n’iwu site ka e si mụọ ha, ndị ahụ, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, ma ha onwe ha bụ iwu e nyere onwe ha; n’ihi na ha na-egosi ọrụ iwu na e dewo ya n’obi ha, akọ na uche ha na-esokwa ya na-agba àmà, ihe ha na-atụle n’obi ha n’etiti onwe ha na-ebokwa ha ebubo ma ọ bụ ma eleghị anya na-agọpụ ha.” (Ndị Rom 2:14, 15) Rịba ama na ọtụtụ ndị a na-azụlite n’okpuru Iwu Chineke nke e nyere ndị Juu ka na-agbaso ụfọdụ ụkpụrụ nke iwu Chineke, ọ bụghị site ná nrụgide ọha na eze, kama “site ka e si mụọ ha”!

Mgbe ahụ, n’ịbụ nke na-abụtụghị ibu arọ, akọ na uche bụ onyinye Chineke, ihe bara uru. N’eziokwu, ọ pụrụ ịkpatara anyị ihe mgbu. Ma mgbe a ṅara ya ntị n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ pụkwara iji mmetụta nke afọ ojuju dị ukwuu na udo nke ime nyeghachi anyị ụgwọ ọrụ. Ọ pụrụ iduzi, ichebe, na ịkpali anyị. Akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Bible na-ekwu, sị: “A pụrụ ichebe ahụ ike nke echiche na mmetụta echiche nanị mgbe onye ahụ na-agbalị imechi olulu dị n’agbata ihe ọ na-eme na ihe o chere na ya kwesịrị ime.” Olee otú mmadụ pụrụ isi mechie olulu ahụ? Ọ̀ ga-ekwe omume ịkpụzi na ịzụ akọ na uche anyị? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya