Onye A Zọpụtara n’Oge Ọdachi
ỤLỌ ahịa ukwu elu ya dị okpukpu ise dị na Seoul, Korea, dakasịrị na mberede, na-ejibido ọtụtụ narị mmadụ n’ime ya! Ndị ọrụ nzọpụta ndụ rụsiri ọrụ ike ehihie na abalị iji zọpụta ọtụtụ mmadụ dị ka ọ pụrụ ikwe mee. Ka ọtụtụ ụbọchị gafere, ohere ndị e nwere ịchọtakwu ndị lanarịrịnụ bụ́ ndị ikpo kọnkrị na ígwè kpuchigidere malitere ibelata.
Kpọmkwem ka a hapụsịworo inwe olileanya ọ bụla, ihe na-eju anya weere ọnọdụ. A nụrụ ntakịrị ákwá, nke na-egosi onye nọ n’ahụhụ site n’okpuru ihe ndị ahụ dakasịrị adakasị. Ndị nzọpụta ndụ jiri aka nkịtị ha gwuo ala n’ike n’ike iji zọpụta otu nwanyị dị afọ 19 bụ́ onye e liworo ná ndụ ruo ogologo ụbọchị 16. Otu oghere ebe ígwè mbugo si agafere nke dara ada emeworo ya oghere nchebe n’elu isi ya, o kpuchiwokwa ya pụọ n’ọtụtụ tọn kọnkrị na-ada ada. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye mmiri gwụrụ n’ahụ na onye merụrụ ahụ nke ọjọọ ya, ọ lanarịwo ọnwụ!
N’ụbọchị ndị a, o siri ike otu ọnwa ịgafe n’enweghị akụkọ banyere otu ọdachi, ma ọ bụ ala ọma jijiji, ajọ oké ifufe, mgbawa ugwu, ihe ọghọm, ma ọ bụ ụnwụ nri. Akụkọ ndị dị ịrịba ama nke ndị a zọpụtara na ndị lanarịrịnụ na-akpalikwa ma na-adọrọ mmasị nke ọtụtụ nde ndị na-eso akụkọ ahụ. Otú ọ dị, n’ozuzu ya e legharawo ịdọ aka ná ntị maka ọdachi na-abịa abịa anya—nke karịrị nke ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme mmadụ. (Matiu 24:21) Bible na-akọwa ihe omume a na-abịanụ n’okwu ndị a: “Lee, ihe ọjọọ na-apụ si n’otu mba jeruo mba ọzọ, a ga-akpọtekwa oké ifufe site ná nsọtụ nile nke ụwa. Ndị Jehova gburu ga-adịzukwa n’ụbọchị ahụ site n’otu nsọtụ ụwa wee ruo nsọtụ ọzọ nke ụwa: a gaghị etiri ha aka n’obi, a gaghị achịkọtakwa ha, a gaghị elikwa ha; nsị anụ n’elu ala ka ha ga-aghọ.”—Jeremaịa 25:32, 33.
Okwu ndị na-atụ ụjọ! Ma n’adịghị ka ọdachi ndị na-emere onwe ha na ihe ọghọm, ọdachi a agaghị abụ igbu ndị mmadụ aghara aghara. N’eziokwu, nlanarị—nlanarị gị—pụrụ ikwe mee!
Oge Ime Ihe Ngwa Ngwa
Iji ghọtazuo eziokwu a, mmadụ aghaghị ibugodị ụzọ ghọta ihe mere ọdachi a zuru ụwa ọnụ ga-eji were ọnọdụ. N’ezie, ọ bụ ezi ihe ngwọta e nwere nanị ya nye nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Mmadụ ole na ole taa na-enwe mmetụta ịnọ ná nchebe na ntụkwasị obi. N’agbanyeghị mgbalị ndị kasị mma nke sayensị, ọrịa ndị na-efe efe nọgidere na-eripịa ndị bi n’ụwa. Agha ndị na-esite n’esemokwu okpukpe, agbụrụ, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ewere ọtụtụ puku ndụ ndị mmadụ. Ụnwụ nri na-atụkwasị ihe ná nhụsianya na nhụjuanya nke ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka aka ha dị ọcha. Nretọ nke omume na-erichapụ kpọmkwem ntọala nke ọha na eze; ọbụna na e mebiwo ụmụaka.
N’izi ezi n’ụzọ dị ịrịba ama, otu amụma Bible e dere ihe karịrị afọ 1,900 gara aga na-akọwa ọnọdụ anyị. Ọ na-asị: “Ị ghaghị ịmata na na mgbe ikpeazụ na oge ga-ejupụta n’ihe ize ndụ.”—2 Timoti 3:1, The New Testament in Modern English, nke J. B. Phillips dere; tụlee Matiu 24:3-22.
Ò yiri gị ihe ezi uche dị na ya na Chineke nke na-ahụ n’anya agaghị enwe mmasị n’ọnọdụ anyị? Bible na-asị: “Ya onwe ya bụ Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya; . . . ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Aịsaịa 45:18) Ee, kama ikwe ka e bibie mbara ụwa a mara mma na ndị nile bi n’ime ya ịbịa ná njedebe, Chineke ga-abata n’okwu ahụ. Ajụjụ bụ, N’ụzọ dị aṅaa ka ọ ga-esi mee otú ahụ?
Họrọ Ndụ!
Bible na-aza n’Abụ Ọma 92:7: “Mgbe ndị na-emebi iwu na-ama akwụkwọ dị ka ihe ọkụkụ, mgbe ndị nile nke na-arụ ajọ ihe na-awakwa okooko osisi; ọ bụ ka e wee kpochapụ ha ruo mgbe nile ebighị ebi.” Ihe ngwọta Chineke nwere maka nsogbu ụwa bụ iwepụ ajọ omume n’onwe ya. N’ụzọ na-eme obi ụtọ, nke a apụtaghị na ọ dị mkpa ikpochapụ mmadụ nile. Abụ Ọma 37:34 na-emesi anyị obi ike, sị: “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ Ya, Ọ ga-ebulikwa gị inweta ala: mgbe a na-ebipụ ndị na-emebi iwu, ị ga-ahụ.”
Okwu ndị a na-egosi na ohere dị maka ịbụ onye a zọpụtara gabiga ọdachi kasịnụ nke ga-adakwasị ihe a kpọrọ mmadụ mgbe ọ bụla. Chineke enyewo anyị nhọrọ. Okwu ndị Mosis jiri dụọ ụmụ Israel ọdụ ka ha na-ejikere ịba n’Ala Nkwa ahụ dịkwaara anyị taa: “Ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị.” (Deuterọnọmi 30:19) Ma kpọmkwem n’ụzọ dị aṅaa ka mmadụ si ‘ahọrọ ndụ’ wee bụrụ onye a zọpụtara? Gịnị ka ezi nzọpụta pụtara n’ezie?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
IHU AKWỤKWỌ: Mgbawa: Copyright © Gene Blevins/Los Angeles Daily News
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Yunhap News Agency/Sipa Press