Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Ha?
“CHINEKE, gịnị ka i meworo anyị?”
Nke ahụ bụ nzaghachi a kọrọ akụkọ ya nke otu onye lanarịrị ọdachi, bụ́ onye legharịrị anya ná mbibi nke mgbawa ugwu snow kpuchiri elu ya bụ́ Nevado del Ruiz dị na Colombia kpatara na November 13, 1985. Pọtọpọtọ nke sitere na ya likpuru obodo Armero dum ma gbuo ihe karịrị 20,000 mmadụ n’otu abalị.
O kwere nghọta ihe mere onye ahụ lanarịrị pụrụ iji meghachi omume otú a. N’enweghị enyemaka n’ihu ike dị egwu nke ihe ndị sitere n’okike, ndị mmadụ n’oge kasị dị anya a sịwo na ọ bụ Chineke kpatara ihe omume ọdachi ndị dị otú ahụ. Ndị mgbe ochie nyere onyinye, ọbụna jiri mmadụ chụọ àjà, iji mejụọ chi ha dị iche iche nke osimiri, igwe, ala, ugwu, ugwu mgbọwa, na ihe ndị ọzọ na-eweta ihe ize ndụ, obi. Ọbụna taa, ụfọdụ na-anakwere nnọọ ihe ndị sitere n’ihe mbibi meere onwe ha dị ka akara aka ma ọ bụ ọrụ aka Chineke.
Ọ̀ bụ Chineke n’ezie na-akpata ọdachi ndị na-eweta oké nhụjuanya nke ụmụ mmadụ na mfu gburugburu ụwa? Ọ̀ bụ ya ka a ga-ata ụta? Iji chọta azịza, ọ dị anyị mkpa ilenyekwu anya n’ihe ọdachi ndị dị otú ahụ gụnyere. N’ezie, ọ dị anyị mkpa inyochagharị ihe ụfọdụ a ma ama.
Gịnị Bụ “Ọdachi Meere Onwe Ya”?
Mgbe ala ọma jijiji tikwasịrị Tangshan, China, dịkwa ka akụkọ ndị gọọmenti China si kwuo, gbuo 242,000 mmadụ, na mgbe Ajọ Ifufe Andrew febatara n’Ebe Ndịda Florida na Louisiana dị na United States ma kpata mbibi nke ọtụtụ ijeri dollar, ọdachi ndị dị otú ahụ meere onwe ha ghọrọ oké ihe akụkọ ná mba dị iche iche. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na ala ọma jijiji ahụ tikwasịrị Ọzara Gobi nke ọ na-adịghị onye bi na ya nke dị 1,100 kilomita n’ugwu ọdịda anyanwụ nke Tangshan, ma ọ bụ gịnị ma à sị na Ajọ Ifufe Andrew chigharịrị ihu ma fekasịa onwe ya n’elu oké osimiri, ghara imetu elu ala ma ọlị? Ọ ga-esi ike ịdị na-echeta ha ugbu a.
Mgbe ahụ, o doro anya na mgbe anyị na-ekwu banyere ọdachi ndị na-emere onwe ha, anyị adịghị ekwu nanị banyere ngosipụta ndị dị ịrịba ama nke ikike ndị sitere n’okike. Kwa afọ a na-enwe ọtụtụ puku ala ọma jijiji, ndị ukwu na ndị nta, na ọtụtụ oké ifufe, mgbọwa ugwu, na ihe ike ndị ọzọ na-emenụ ndị ọ na-adịghị ihe ọzọ ha na-eme e wezụga ịghọ ihe ndekọ n’akwụkwọ ndekọ ụfọdụ. Otú ọ dị, mgbe ihe omume ndị dị otú ahụ kpatara oké mbibi nke ndụ na ihe onwunwe na mkpaghasị nke ụzọ e si ebi ndụ, ha na-aghọ ọdachi.
E kwesịrị ịrịba ama na mbibi na mfu na-esochi adịghị eru mgbe nile ka ikike ndị sitere n’okike nke o metụtara. Ọ bụchaghị ngosipụta kasị ike nke ikike ndị sitere n’okike na-akpata ọdachi kasị ukwuu. Dị ka ihe atụ, na 1971 ala ọma jijiji ọ̀tụ̀tụ̀ ya bụ 6.6 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ Richter tikwasịrị San Fernando, California, United States, ma gbuo 65 mmadụ. N’otu afọ n’ihu, ala ọma jijiji nke ọ̀tụ̀tụ̀ 6.2 na Managua, Nicaragua, gburu 5,000 mmadụ!
Ya mere, mgbe a bịara n’ịrị elu nke ịkpata mbibi nke ọdachi ndị na-emere onwe ha, anyị aghaghị ịjụ sị, Ihe ndị sitere n’okike ha amalitewo ịkpa ike karị? Ka ihe ndị mmadụ kpatara hà etinyewo ihe ná nsogbu a?
Ònye Na-akpata Ha?
Bible na-akọwa Jehova Chineke dị ka Onye Okike Ukwu nke ihe nile, gụnyere ikike nile sitere n’okike nke ụwa a. (Jenesis 1:1; Nehemaịa 9:6; Ndị Hibru 3:4; Mkpughe 4:11) Nke a apụtaghị na ọ na-akpata nfegharị ọ bụla nke ikuku ma ọ bụ mwụsa ọ bụla nke mmiri ozuzo. Kama, o tinyewo n’ọrụ iwu ụfọdụ ndị na-achịkwa ụwa na gburugburu ya. Dị ka ihe atụ, n’Eklisiastis 1:5-7, anyị na-agụ banyere atọ n’ime usoro ọrụ ndị bụ isi na-eme ka o kwee omume ịdị ndụ n’elu ụwa—ọwụwa na ọdịda anyanwụ kwa ụbọchị, usoro na-adịghị agbanwe agbanwe nke ikuku, na nrugharị nke mmiri. Ma ihe a kpọrọ mmadụ ọ̀ maara ya ma ọ bụ na ọ maghị, ruo ọtụtụ puku afọ usoro ndị a dị n’okike, na ndị ọzọ dị ka ha, na-agụnye ihu igwe, ọnọdụ ala, na mbara ụwa anọwo na-arụ ọrụ. N’ezie, onye dere Eklisiastis na-adọrọ uche gaa n’oké ọdịiche dị n’etiti ụzọ ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị na-adịghị akwụsị akwụsị nke okike na ọdịdị na-agafe agafe na nke na-adịru nwa oge nke ndụ mmadụ.
Ọ bụghị nanị na Jehova bụ Onye Okike nke ikike ndị sitere n’okike kama o nwekwara ike ịchịkwa ha. N’ime Bible dum, anyị na-ahụ ihe ndekọ nke Jehova ịchịkwa ma ọ bụ iji ikike ndị dị otú ahụ mee ihe imezu nzube ya. Ndị a gụnyere ikewa Osimiri Uhie n’ụbọchị Mosis na ịkwụsị anyanwụ na ọnwa n’ụzọ ha si aga n’eluigwe n’oge Joshua. (Ọpụpụ 14:21-28; Joshua 10:12, 13) Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke na Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, gosipụtakwara ike o nwere n’elu ikike ndị sitere n’okike mgbe, dị ka ihe atụ, o mere ka ebili mmiri jụrụ n’Osimiri Galili. (Mak 4:37-39) Ihe ndekọ ndị dị ka ndị a na-eme ka a ghara inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na Jehova Chineke na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, pụrụ ịchịkwazu ihe nile na-emetụta ndụ n’elu ụwa ebe a.—2 Ihe Emere 20:6; Jeremaịa 32:17; Matiu 19:26.
Ebe ọ dị otú ahụ, ànyị pụrụ ịsị na ọ bụ Chineke na-akpata oké mbibi na ịtọgbọrọ n’efu nke siteworo n’ọdachi ndị na-emere onwe ha n’oge ndị a? Iji zaa ajụjụ a, anyị aghaghị ibu ụzọ tụlee ma e nwere ihe àmà nke na ikike ndị sitere n’ihe ndị e kere eke hà na-akpa ike karị n’ụzọ pụtara ìhè, ma eleghị anya ọbụna gharakwa ikwe nchịkwa.
Banyere nke a, rịba ama ihe akwụkwọ bụ́ Natural Disasters—Acts of God or Acts of Man? nwere ikwu: “E nweghị ihe àmà na-egosi na usoro ọrụ na-ahụ maka ihu igwe ndị e jikọrọ ha na ụkọ mmiri ozuzo, idei mmiri, na oké ifufe na-agbanwe. Ọ dịghịkwa onye ọkà ná mmụta ọnọdụ ala nke na-azọrọ na ụzọ ala si emegharị ahụ nke e jikọrọ ha na ala ọma jijiji, mgbọwa ugwu na tsunami (ịma jijiji nke ala ọma jijiji) na-adịwanye ike.” N’otu aka ahụ, akwụkwọ bụ́ Earthshock na-asị: “Oké nkume nke kọntinenti ọ bụla nwere ihe ndekọ nke ihe omume a na-apụghị ịgụta ọnụ nke ọnọdụ ala, ndị ukwu na ndị nta, nke nke ọ bụla n’ime ha ga-abụ ihe ọdachi nye ihe a kpọrọ mmadụ a sị na ha emee taa—ọ bụkwa ihe e ji n’aka ná nkà mmụta sayensị na ihe omume ndị dị otú ahụ ga-eme ugboro ugboro n’ọdịnihu.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ụwa na ikike ya ndị na-akpa ike anọgidewo na-abụ nnọọ otu ihe ahụ n’ọgbọ nile. N’ihi ya, ma ihe ndekọ ụfọdụ hà na-egosi ịrị elu n’ihe omume nke ụdị ụfọdụ nke ọnọdụ ala ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ma ọ bụ na ha adịghị egosi, ụwa amalitebeghị ịkpa ike n’ụzọ a na-apụghị ịchịkwa achịkwa n’oge ndị a.
Mgbe ahụ, gịnị na-akpata mmụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọdachi ndị na-emere onwe ha anyị na-agụ banyere ha ji eme na ọdachi ndị ha ha na-akpata? Ọ bụrụ na ụta adịghịrị ikike ndị sitere n’okike, o yiri ka mkpịsị aka ahụ nke ịta ụta ọ̀ na-atụ ụmụ mmadụ. N’eziekwa, ndị ọchịchị achọpụtawo na ihe ụmụ mmadụ na-eme ekpughekwuwo mbara ebe obibi anyị nye ọdachi ndị na-emere onwe ha, meekwa ka ọ nọrọ n’ihe ize ndụ ha karị. Ná mba ndị na-emepe emepe, mkpa na-arịwanye elu maka nri na-amanye ndị ọrụ ugbo ịkọbiga ala ha nwere ókè ma ọ bụ inwetaghachi ala site n’igbupịa oké ọhịa na-enye ndo dị mkpa. Nke a na-eduje n’oké nrichapụ nke ala. Ọnụ ọgụgụ mmadụ na-arị elu na-emekwa ka uto nke ebe ndị a na-ahazighị ahazi na ógbè nkịkara ụlọ ndị a rụrụ aghara aghara n’ebe ndị dị ize ndụ, dịwanye ngwa. Ọbụna ná mba ndị ka mepee emepe, ndị mmadụ, dị ka ọtụtụ nde ndị bi n’akụkụ San Andreas Fault na California, ekpughepụwo onwe ha nye ihe ize ndụ n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị ndị doro anya. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, mgbe ihe omume a na-atụghị anya ya—ajọ ifufe, idei mmiri, ma ọ bụ ala ọma jijiji—weere ọnọdụ, à pụrụ n’ezie ịkpọ ọdachi ọ ga-akpata nke “meere onwe ya”?
Ihe atụ pụtara ìhè bụ ụkọ mmiri ozuzo na Sahel nke Africa. Anyị na-echekarị banyere ụkọ mmiri ozuzo dị ka enweghị mmiri ozuzo ma ọ bụ mmiri nkịtị, na-eduje n’ụnwụ nri, ịnọ n’agụụ, na ọnwụ. Ma oké ụnwụ nri na ịnọ n’agụụ n’ógbè ahụ ọ̀ bụ nanị n’ihi ụkọ mmiri? Akwụkwọ bụ́ Nature on the Rampage na-asị: “Ihe àmà ndị mmụta sayensị na òtù ndị ọrụ enyemaka nwetara na-egosi na ụnwụ nri nke taa na-adịgide ọ bụchaghị n’ihi ụkọ mmiri ozuzo dị ogologo dị ka ọ bụ n’ihi iji ala na mmiri na-eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma ruo ogologo oge. . . . Mgbukpọsị ọhịa Sahel nke nọgidere na-aga n’ihu bụkarịrị ihe omume mmadụ kpatara.” Otu akwụkwọ akụkọ ndị South Africa bụ́ The Natal Witness, na-asị: “Ụnwụ nri abụghị banyere ụkọ nri; ọ bụ banyere enweghị ike iru n’ebe nri dị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụ banyere ịda ogbenye.”
A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ihe dị ukwuu n’ọdachi na-esite n’ihe ọghọm ndị ọzọ. Ihe ọmụmụ dị iche iche na-egosi na mba ndị dara ogbenye karị na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ọnwụ ka ukwuu gabiga ókè site n’ọdachi ndị na-emere onwe ha karịa mba ndị bara ọgaranya karị nke ụwa. Dị ka ihe atụ, malite 1960 ruo 1981, dị ka otu ihe ọmụma na-ekwu, Japan nwere 43 ala ọma jijiji na ọdachi ndị ọzọ, 2,700 mmadụ nwụkwara, na-enwe nkezi nke 63 ndị nwụrụ n’ọdachi ọ bụla. N’otu oge ahụ, Peru nwere 31 ọdachi na 91,000 mmadụ nwụrụ, ma ọ bụ 2,900 mmadụ n’ọdachi ọ bụla. Gịnị kpatara ọdịiche ahụ? Ikike ndị sitere n’okike pụrụ ịkpalitewo ha, ma ọ bụ ihe omume ụmụ mmadụ—mmekọrịta ọha na eze, akụ na ụba, ndọrọ ndọrọ ọchịchị—bụ ihe a na-aghaghị ịta ụta maka oké ọdịiche dị ná mfu nke ndụ na mbibi ihe onwunwe sitere na ya.
Gịnị Bụ Ihe Ngwọta Ndị E Nwere?
Ndị mmụta sayensị na ndị ọkachamara anwawo ruo ọtụtụ afọ ịchọpụta ụzọ isi nagide ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ha na-eleba anya n’ime ụwa ịhụ ma hà ga-aghọta otú ala ọma jijiji na ntiwapụ nke mgbọwa ugwu si eme. Site n’ígwè e ji enyocha mbara igwe, ha na-ekiri usoro ihu eluigwe iji mata ụzọ oké ifufe na ajọ ikuku si aga ma ọ bụ ibu amụma idei mmiri na ụkọ mmiri ozuzo. Nnyocha a nile enyewo ha ihe ọmụma nke na ha na-ele anya na ọ ga-eme ka ha nwee ike ibelata mmetụta nke ikike ndị a sitere n’okike.
Mgbalị ndị a hà arụpụtawo ihe? Banyere ụzọ nke a dị oké ọnụ ahịa, nke oké nkà na ụzụ, otu òtù na-ekiri ihe ndị na-emenụ kwuru, sị: “Ndị a nwere ọnọdụ ha. Ma ọ bụrụ na ha erie ọ̀tụ̀tụ̀ gabigara ókè nke ego na mgbalị—ọ bụrụ na ha ejee ozi dị ka ihe ngọpụ iji leghara anya ihe ize ndụ ndị e nwere n’ọha mmadụ nke ndị ọ dakwasịrị bụ́ ndị na-eme ka ọdachi dị iche iche ka njọ—mgbe ahụ ha pụrụ imebi ihe nke ukwuu karịa imezi ihe.” Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na ọ bara uru ịmara na ụsọ osimiri Bangladesh bụ nke idei mmiri na ifufe oké osimiri na-eyi egwu mgbe mgbe, ihe ọmụma ahụ adịghị egbochi ọtụtụ nde ndị Bangladesh ịbụ ndị a manyere ibi n’ebe ahụ. Ihe ọ na-akpata bụ ọdachi na-eme ugboro ugboro na ọnwụ nke ọnụ ọgụgụ mmadụ na-eru ọtụtụ narị puku.
N’ụzọ doro anya, ihe ọmụma nkà na ụzụ pụrụ ịba uru nanị ruo n’ókè ụfọdụ. Ihe ọzọ dị mkpa bụ ikike ibelata nrụgide na-eme ka ndị mmadụ ghara inwekebe nhọrọ ọzọ e wezụga ibiri n’ógbè ndị e kpughepụrụ karịsịa nye ihe ize ndụ ma ọ bụ ibiri n’ụzọ ndị na-ebibi mbara ebe obibi. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ịkwụsị mbibi nke ihe ndị a na-akpata ga-ewe nhazigharị zuru ezu nke usoro ọha na eze, akụ na ụba, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke anyị bi n’okpuru ya. Ònye pụrụ ịrụzu ọrụ dị otú ahụ? Nanị Onye ahụ nke pụrụ ịchịkwa ọbụna ikike ndị na-akpalite ọdachi ndị na-emere onwe ha.
Ọrụ Aka Chineke Ndị Dị n’Ihu
Jehova Chineke agaghị ahụ nanị maka ihe mgbaama ha, kama ọ ga-eru ná mkpọrọgwụ nke nhụjuanya ụmụ mmadụ. Ọ ga-eweta ná njedebe usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmahịa, na okpukpe anyaukwu na mmegbu bụ́ ndị ‘nweworo ike n’ahụ mmadụ imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9) Onye ọ bụla maara Bible aghaghị ịrịba ama na n’ime peji ya nile, e nwere ọtụtụ amụma na-atụ aka n’oge mgbe Chineke ga-eme ihe iji kpochapụ n’ụwa ajọ omume na nhụjuanya ma weghachite paradaịs elu ụwa nke udo na ezi omume.—Abụ Ọma 37:9-11, 29; Aịsaịa 13:9; 65:17, 20-25; Jeremaịa 25:31-33; 2 Pita 3:7; Mkpughe 11:18.
Nke ahụ, n’ezie, bụ ihe Jisọs Kraịst kụziiri ndị nile na-eso ụzọ ya ikpe ekpere maka ya, ya bụ, “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Alaeze Mesaịa ahụ ga-ewepụ ma nọchie ịchịisi nile nke mmadụ na-ezughị okè, dị ka Daniel onye amụma buru amụma ya, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Gịnị ka Alaeze Chineke ga-emezu nke mba nile taa na-apụghị ime? Bible na-enye anyị ọhụụ na-akpali akpali nke ihe na-abịanụ. Kama ọnọdụ e sere onyinyo ha na peji ndị a, dị ka ụnwụ nri na ịda ogbenye, “ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile,” na “osisi ọhịa ga-amịkwa mkpụrụ ya, ala ga-emekwa ihe omume ya, ha ga-anọkwa n’elu ala ha ná ntụkwasị obi.” (Abụ Ọma 72:16; Ezikiel 34:27) Banyere mbara ụwa dị ka e si kee ya, Bible na-agwa anyị: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. . . . N’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị. Mirage ga-aghọkwa ọdọ mmiri, ala mmiri na-adịghị ga-aghọkwa isi iyi jupụtara ná mmiri.” (Aịsaịa 35:1, 6, 7) Agha agaghị adịkwa ọzọ.—Abụ Ọma 46:9.
Ụzọ Jehova Chineke ga-esi mezuo ihe ahụ dum, na ụzọ ọ ga-esi hụ maka ikike nile sitere n’okike ka ha wee gharakwa ịkpata mmerụ ahụ, Bible ekwughị. Otú ọ dị, ihe e ji n’aka bụ na ndị nile ga-ebi n’okpuru ọchịchị ezi omume ahụ “agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri: n’ihi na mkpụrụ nke ndị Jehova gọziworo ka ha bụ, ha na ụmụ ga-esi n’ahụ ha pụta.”—Aịsaịa 65:23.
N’ọtụtụ peji nke magazin a, dịkwa ka n’akwụkwọ ndị ọzọ nke Watch Tower Society, Ndịàmà Jehova egosipụtawo ugboro ugboro na e guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe n’afọ 1914. N’okpuru nduzi nke Alaeze ahụ, a gbawo àmà zuru ụwa ọnụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 80 afọ, taakwa anyị nọ ná nsọtụ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ahụ e kwere ná nkwa. A ga-atọhapụ ihe a kpọrọ mmadụ ọ bụghị nanị pụọ ná oké mbibi nile nke ọdachi ndị na-emere onwe ha kamakwa pụọ n’ihe mgbu na nhụjuanya dum ndị nọworo na-eti ụmụ mmadụ ihe otiti na puku afọ isii gaworo aga. Banyere oge ahụ a pụrụ ikwu n’izi ezi sị, “ihe mbụ nile agabigawo.”—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:4.
Ma, gịnị banyere ugbu a? Chineke ọ̀ nọwo na-eme ihe maka ndị nọ n’ihe isi ike n’ihi ọnọdụ ndị ji aka ha dịrị ka ọ bụ na ọ dịghị eme? Ee kpọmkwem ọ nọwo na-eme ihe ma ọ bụchaghị n’ụzọ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ pụrụ ịtụ anya ya.
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Ihe ụmụ mmadụ na-eme emewo ka gburugburu ebe obibi anyị nọrọkwuo n’ihe ize ndụ nke ọdachi ndị na-emere onwe ha
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Laif/Sipa Press
Chamussy/Sipa Press
Wesley Bocxe/Sipa Press
Jose Nicolas/Sipa Press