Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Hà Bụ Ihe Ịrịba Ama Nke Oge Ndị A?
“MBA ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche. Ma ihe ndị a nile bụ mmalite ihe mgbu.” Site n’okwu ndị a, Jisọs Kraịst kọwaara ndị na-eso ụzọ ya na narị afọ nke 19 gara aga na ihe omume ọdachi ndị dị otú a, ha na ịba ụba nke ihe na-emebi iwu na nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma nke Alaeze Chineke, ga-ewebata ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara nke na-aka akara “ọgwụgwụ oge a.”—Matiu 24:3-14.
N’ihi nke ahụ, anyị aghaghị ịjụ sị, Ànyị na-ahụ ala ọma jijiji, ajọ ifufe, idei mmiri, ụkọ mmiri ozuzo, na ụnwụ nri, bụ́ ndị na-eweta mbibi karịa ka ọ dị n’ọgbọ ndị gara aga? N’agbanyeghịkwa ọganihu e nweworo na sayensị na nkà na ụzụ, ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ kanụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ hà na-ata ahụhụ n’ihi ya?
Nye ọtụtụ ndị, azịza ya bụ ee. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ New Scientist na-adọ aka ná ntị na “ụwa pụrụ ịtụ anya ọtụtụ ọdachi n’afọ ndị 1990 karịa ka ọ dị n’ịrị afọ ndị gara aga.” N’otu aka ahụ, n’ime akwụkwọ bụ́ UN Chronicle nke June 1991, onye ntụzi nke ụlọ ọrụ World Meteorological Organization kwuru, sị: “Ụzọ ihe si na-aga doro nnọọ anya. Site n’afọ ndị 1960 ruo ndị 1980 . . . , e nwewo mmụba okpukpu ise n’ọ̀tụ̀tụ̀ oké ọdachi ndị na-emere onwe ha ji ewere ọnọdụ, na mmụba okpukpu atọ ná ngụkọta mfu akụ na ụba.” Iji mee ka a ghọtatụ isiokwu a, World Health, magazin òtù ahụ ike UN World Health Organization, kwuru, sị: “A pụrụ inweta ihe atụ nke ọdachi ndị na-emere onwe ha na mmetụta mbibi ha n’akụkọ ihe mere eme nile. Otú ọ dị, ka narị afọ nke 21 na-erute, anyị na-eche ihu ngwakọta na-agbanwe agbanwe nke ọnọdụ ụba mmadụ, njikọ ihe ndị dị ndụ na ebe obibi na nkà na ụzụ nke na-eme ka ọtụtụ ụba mmadụ bụrụ dị e kpughepụrụ nye mmetụta nke ma ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ndị nke mmadụ na-akpata.”
Onye ọ bụla na-etinye uche n’ihe ndị na-eme n’oge a enweghị ijuanya n’okwu ndị dị otú a. Usoro mgbasa akụkọ enweghị ụkọ nke akụkọ ndị na-akpali akpali, ọ sọ ya bụrụ ntiwapụ nke ugwu na Philippines, ala ọma jijiji na California, idei mmiri na Bangladesh, ụkọ nri na Somalia, ajọ ifufe na Hawaii, ma ọ bụ njubiga ókè nke oké osimiri na Nicaragua. Ọ na-esi ike otu ọnwa ịgafe n’enweghị akụkọ nke otu ọdachi n’otu akụkụ nke ụwa ma ọ bụ ọzọ.
Ụfọdụ ndị na-asị na nke a abụghị oké ihe. Ha na-arụ ụka na mmụba o yiri ka e nwere n’ọdachi n’oge anyị bụ nanị n’ihi ịkọ akụkọ nke ọma karị ma ọ bụ idekọ ihe nke ọma karị. Ha na-arụkwa ụka na ọtụtụ mmadụ karị na-ata ahụhụ site n’ọdachi nanị n’ihi na e nwere ọtụtụ mmadụ karị n’oge a. Arụmụka ndị a hà agwụla ihe e nwere ike ikwu?
Rịba ama ihe e kwuru n’isiokwu New Scientist e hotara n’elu. “E nwere 523 ọdachi ndị a kọrọ akụkọ ha n’afọ ndị 1960 na 767 n’afọ ndị 1970. Ka ọ na-erule afọ ndị 1980, ọnụ ọgụgụ ahụ eruwo 1387.” Ọ gara n’ihu ịkọwa na “a pụrụ ikwu na ọ bụ ịkọkwu akụkọ ọdachi n’ezoghị ọnụ na China na Soviet Union kpatara akụkụ mmụba e chere na e nwere.” O kwukwasịzie, sị: “N’agbanyeghị nke ahụ, ọnụ ọgụgụ ahụ na-arị elu.” Oké ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ ahụ nke ọdachi bụ nke a na-apụghị iwere dị ka nke sitere n’ịkọ akụkọ nke ọma karị ma ọ bụ idekọ ihe nke ọma karị nanị.
Ọzọ, UN Chronicle nke March 1992 na-akọ, sị: “N’ime iri afọ abụọ gara aga, ihe dị ka nde mmadụ 3 atụfuwo ndụ ha, 800 nde mmadụ enwewokwa mmetụta nke ‘mbibi, ihe isi ike na nhụjuanya’ ọdachi ndị na-emere onwe ha kpatara.” Nke a pụtara na ihe dị ka 1 n’ime mmadụ 7 ọ bụla bi n’ụwa enwetawo mmetụta nke otu ụdị ọdachi ma ọ bụ ihe ọghọm. Nke ahụ na-ebu isi n’ezie, na-enyekwa ohere dị nta maka ịrụ ụka na nke anyị bụ ọgbọ nke oké mgbanwe na ọgba aghara.
Ebe ọ bụ na Bible na-ebu amụma oge dị otú ahụ nke oké ihe isi ike, ọ̀ pụtara na ọ̀ bụ Chineke na-akpata ọdachi ndị ahụ na nhụjuanya na-esite na ha? Ọtụtụ ndị na-eche otú ahụ. Ma gịnị ka ihe ndị mere eme na-egosi? Nke kakwa mkpa, gịnị ka Bible na-egosi?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
Ihu akwụkwọ: W. Faidley/Weatherstock
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Foto etiti: Mark Peters/Sipa Press
WHO/League of Red Cross