Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 12/1 p. 2-4
  • Mgbe Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Mere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Mere
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị ka Baịbụl Kwuru Banyere Ọdachi Ndị na-Emere Onwe Ha?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Gịnị Mere E Ji Enwekarịzi Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Hà Bụ Ihe Ịrịba Ama Nke Oge Ndị A?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 12/1 p. 2-4

Mgbe Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Mere

Accra, Ghana, July 4, 1995: Mmiri ozuzo kasị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 60 kpatara oké idei mmiri. Ihe dị ka 200,000 tụfuru ihe ha nwere, 500,000 enweghị ike ịbanye n’ebe obibi ha, 22 nwụkwara.

San Angelo, Texas, U.S.A., May 28, 1995: Ajọ ifufe na akụ́ mmiri igwe bibiri obodo ukwu a nwere 90,000 ndị bi n’ime ya, na-akpata mbibi e mere atụmatụ ya ịbụ nde $120 (U.S.).

Kobe, Japan, January 17, 1995: Ala ọma jijiji nke were nanị sekọnd 20 gburu ọtụtụ puku mmadụ, merụọ ọtụtụ iri puku ahụ, hapụ ọtụtụ narị puku na-enweghị ebe obibi.

ANYỊ na-ebi n’ihe a pụrụ ịkpọ ọgbọ ọdachi. Otu akụkọ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-ekpughe na n’ime oge dị afọ 30 malite na 1963-1992, ọnụ ọgụgụ ndị ọdachi gburu, merụọ ahụ, ma ọ bụ chụpụ n’ụlọ ha mụbara ná nkezi nke 6 pasent kwa afọ. Ọnọdụ enweghị olileanya ahụ emewo ka òtù UN kpọọ afọ ndị 1990 “Iri Afọ Mba Nile Maka Mbelata Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha.”

N’ezie, ike okike—dị ka oké ifufe, mgbawa ugwu, ma ọ bụ ala ọma jijiji—adịghị eweta ọdachi mgbe nile. Ọtụtụ narị na-eme kwa afọ n’emerụghị ụmụ mmadụ ahụ. Ma mgbe o wetara oké mbibi ná ndụ na n’ihe onwunwe, n’ụzọ ziri ezi a na-akpọ ya ọdachi.

Mmụba nke ọdachi ndị na-emere onwe ha yiri ka a pụghị izere ha ezere. Akwụkwọ bụ́ Natural Disasters—Acts of God or Acts of Man? na-ekwu, sị: “Ndị mmadụ na-agbanwe gburugburu ebe obibi ha ime ka ọdachi ụfọdụ nwekwuo ike ime, na-emekwa omume ime ka ha bụrụ ndị e kpughere karị nye ọdachi ndị ahụ.” Akwụkwọ ahụ na-enye otu ihe atụ e chepụtara echepụta: “Ntakịrị ala ọma jijiji mere n’ógbè jupụtara ná nkịkara ụlọ e ji ájá nkịtị wuo nke dị n’akụkụ ndagwurugwu dị mkpọda pụrụ nnọọ ịbụ ọdachi n’ihe banyere ọnwụ na ịta ahụhụ ụmụ mmadụ. Ma ọdachi ahụ ọ̀ bụkarị n’ihi ịma jijiji nke ala ka ọ̀ bụ n’ihi eziokwu ahụ bụ na ndị mmadụ na-ebi n’ụdị ụlọ ahụ dị ize ndụ n’ụdị ala ahụ dị ize ndụ?”

Nye ndị na-amụ Bible, e nwekwara ihe ọzọ mere na mmụba nke ọdachi ndị na-emere onwe ha abụghị ihe ijuanya. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, Jisọs Kraịst buru amụma na, tinyere ihe ndị ọzọ, ‘oké ụnwụ na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche’ ga-aka “ọgwụgwụ oge a” akara. (Matiu 24:3, 6-8) Bible bukwara amụma na na “mgbe ikpeazụ,” mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, na ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.a (2 Timoti 3:1-5) Àgwà ndị a na-emekarị ka mmadụ na-eme ihe megidere gburugburu ebe obibi ya, na-ekpughe ụmụ mmadụ karị nye ike okike. Ọdachi ndị mmadụ kpatara bụkwa ihe ndị sitere n’ọha mmadụ na-adịghị ahụ n’anya bụ́ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-aghaghị ibi n’ime ya.

Ka mbara ụwa anyị na-ejupụtakwu na mmadụ, ka omume ụmụ mmadụ na-etinye ndị mmadụ n’ihe ize ndụ dị elu karị, nakwa ka a na-ejiwanye akụ̀ na ụba ụwa eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọdachi ga-anọgide na-eti mmadụ ihe otiti. Inye enyemaka na-eweta ihe ịma aka, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Maka inwetakwu ihe ọmụma banyere ihe ịrịba ama nke mgbe ikpeazụ, lee akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, peji nke 98-107, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 3]

N’elu: Information Services Department, Ghana; n’aka nri: San Angelo Standard-Times

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

IHU AKWỤKWỌ: Maxie Roberts/Site n’ikike THE STATE

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya