Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Tetragrammaton (mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ahụ bụ́ aha Chineke) ọ̀ dị n’ihe odide Hibru nke Matiu nke onye Juu bụ́ ọgwọ ọrịa na narị afọ nke 14 bụ́ Shem-Tob ben Isaac Ibn Shaprut dere?
Ee e, ọ dịghị. Ka o sina dị, ihe odide Matiu nke a ji hash·Shem’ (e depụtazuru ma ọ bụ nke e debiiri) mee ihe ugboro 19, dị ka e gosipụtara na peji nke 13 nke Ụlọ Nche nke August 15, 1996.
Okwu Hibru bụ́ hash·Shem’ pụtara “Aha ahụ,” bụ́ nke o doro anya na ọ na-ezo aka n’ebe aha Chineke dị. Dị ka ihe atụ, n’ihe odide Shem-Tob, ụdị nke hash·Shem’ e debiiri edebi pụtara na Matiu 3:3, bụ́ akụkụ ihe odide ebe Matiu hotara Aịsaịa 40:3. Ezi uche dị na ya ikwubi na mgbe Matiu hotara otu amaokwu n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ebe a na-achọta Tetragrammaton, o tinyere aha Chineke n’Oziọma ya. Ya mere ọ bụ ezie na ihe odide Hibru nke Shem-Tob depụtara ejighị Tetragrammaton mee ihe, ojiji o ji “Aha ahụ” mee ihe, dị ka na Matiu 3:3, na-akwado iji “Jehova” mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
Shem-Tob depụtagharịrị ihe odide Hibru nke Matiu n’akwụkwọ ya kpatara esemokwu bụ́ ʼEʹven boʹchan. Otú ọ dị, olee ebe e si nweta ihe odide Hibru ahụ? Prọfesọ George Howard, onye mere oké nchọpụta n’okwu a, na-atụ aro na “Matiu Hibru nke Shem-Tob dị laa azụ n’ihe dị ka narị afọ anọ mbụ nke oge ndị Kraịst.”a Ndị ọzọ nwere ike ghara ikwenyere ya na nke a.
Howard na-arịba ama, sị: “Matiu Hibru ahụ e tinyekọrọ n’ihe odide a bụ nke a maara karịsịa site n’ọtụtụ ọdịiche ya site na Matiu Grik ọha nakweere.” Dị ka ihe atụ, dị ka ihe odide Shem-Tob gosiri, Jisọs kwuru banyere Jọn, sị: “N’ezie, asị m unu, n’etiti ndị nile ndị inyom mụrụ ọ dịghị onye biliworo nke ka Jọn Onye Na-eme Baptism ukwuu.” Ma ọ mafere okwu na-esonụ nke Jisọs: “Ma onye dị nta karị n’alaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya.” (Matiu 11:11) N’ụzọ yikwara nnọọ nke ahụ, e nwere ọtụtụ ọdịiche dị n’agbata ihe odide Hibru dị adị nke Akwụkwọ Nsọ Hibru na ihe e dere n’ihe odide ya na ya kwekọrọ nke nsụgharị Septuagint Grik. Ọ bụ ezie na anyị na-ekwenye na ha nwegasịrị ọdịiche, ihe odide ochie ndị dị otú ahụ nwetụrụ ọnọdụ n’ihe ọmụmụ e ji atụnyere ibe ya.
Dị ka e kwuworo, ihe odide Shem-Tob nke Matiu tinyere “Aha ahụ” n’ebe e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na Matiu ji Tetragrammaton mee ihe n’ezie. Ya mere, kemgbe 1950, e jiriwo ihe odide Shem-Tob mee ihe dị ka ihe nkwado maka itinye aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e zokwara aka na ya na The New World Translation of the Holy Scriptures—With References.b
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Leekwa New Testament Studies, Mpịakọta nke 43, Nọmba 1, January 1997, peji nke 58-71.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1984.