Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 5/15 p. 26-28
  • Gịnị Bụ Ihe Odide Masoret Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Ihe Odide Masoret Ahụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwu Jehova
  • E Meghetụ Ụzọ Maka Ezighị Ezi
  • Mgbalị Imechi Ụzọ Ahụ
  • Ànyị Pụrụ Ịchọta Ihe Odide Masoret “Dị Ọcha”?
  • Olee Ndị Bụ Ndị Masorete?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ihe Odide Nlereanya nke Bible n’Asụsụ Hibru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Olee Otú Akwụkwọ Ahụ Si Lanarị?
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Mbọ A Gbara Ịgbanwe Ihe Dị na Baịbụl Kụrụ Afọ n’Ala
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 5/15 p. 26-28

Gịnị Bụ Ihe Odide Masoret Ahụ?

N’ASỤSỤ ọ bụla ị gụrụ Bible, akụkụ nke akwụkwọ ahụ ma eleghị anya bụ nke a sụgharịtara kpọmkwem ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ site n’ihe odide Masoret, bụ́ nke nwere Akwụkwọ Nsọ Hibru, ma ọ bụ “Agba Ochie.” N’ezie, e nwere ihe karịrị otu ihe odide Masoret. Ya mere olee nke a họọrọ, n’ihi gịnịkwa? N’ezie, gịnị bụ ihe odide Masoret, oleekwa ụzọ anyị si mara na a pụrụ ịdabere na ya?

Okwu Jehova

Odide Bible malitere n’Ugwu Saịnaị na 1513 T.O.A. Ọpụpụ 24:3, 4 na-agwa anyị, sị: “Mosis wee bịa, kọọrọ ndị Israel okwu Jehova nile, na ikpe Ya nile; ndị Israel nile wee zaa n’otu olu, sị, Okwu nile Jehova kwuworo, anyị ga-eme ha. Mosis wee dee okwu Jehova nile n’akwụkwọ.”

A nọgidere na-edekọ Akwụkwọ Nsọ Hibru ruo ihe karịrị otu puku afọ, malite na 1513 T.O.A. ruo n’ihe dị ka na 443 T.O.A. Ebe ọ bụ Chineke nyere ndị deturu ihe ndị ahụ mmụọ ya, ezi uche dị ya na ọ ga-eduzi ihe ndị na-emenụ ka e wee chekwaa ozi ya n’ikwesị ntụkwasị obi. (2 Samuel 23:2; Aịsaịa 40:8) Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na Jehova ga-egbochi ndahie nile nke mmadụ ka a ghara ịgbanwe ọbụna otu mkpụrụ okwu ka a na-edepụtaghachi ọtụtụ n’ime ya?

E Meghetụ Ụzọ Maka Ezighị Ezi

Ọ bụ ezie na ndị ikom nwere nkwanye ùgwù dị omimi maka Okwu Chineke depụtaghachiri ya site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ndahie mmadụ mesịrị gbebata n’ihe odide ndị ahụ. E nyere ndị dere Bible ike mmụọ nsọ, ma ndị ndepụtaghachi ahụ arụghị ọrụ ha n’okpuru ike mmụọ nsọ.

Mgbe ha si ná ndọrọ n’agha na Babilọn lọta na 537 T.O.A., ndị Juu nakweere ụdị ọhụrụ nke ide ihe nke iji mkpụrụ akwụkwọ ndị dị nkuku anọ nkuku anọ a mụtara na Babilọn mee ihe. Oké mgbanwe nke a wetara nsogbu ndị nke ya nke na a pụrụ ịghọtahie mkpụrụ akwụkwọ ụfọdụ yiri ibe ha. Ebe Hibru bụ asụsụ dabeere n’okwu mgbochi ume, nke onye na-agụ na-etinye ụdaume dị ka nghọta ya nke ihe a na-ekwu si dị, mgbanwe nke otu mgbochi ume pụrụ n’ụzọ dị mfe ịgbanwe nghọta nke otu okwu. Otú ọ dị, n’ọnọdụ ka ukwuu, a gaara achọpụtawo ndehie ndị dị otú ahụ ma dezie ha.

Ihe ka nnọọ ukwuu ná ndị Juu alaghachighị Israel mgbe Babilọn dasịrị. N’ihi ya, ụlọ nzukọ ghọrọ ebe bụ isi n’ihe ime mmụọ maka ógbè ndị Juu n’Ebe Etiti Ọwụwa Anyanwụ na Europe nile.a Ụlọ nzukọ nke ọ bụla nwere mkpa maka mpịakọta akwụkwọ nke Akwụkwọ Nsọ. Ka ọnụ ọgụgụ akwụkwọ ahụ na-amụba, otú ahụ ka ohere maka ndehie ihe ndị ndepụtaghachi na-amụba.

Mgbalị Imechi Ụzọ Ahụ

Na-amalite na narị afọ nke mbụ O.A., ndị odeakwụkwọ na Jerusalem nwara iguzobe otu ihe odide bụ́ isi nke a pụrụ iji dezie mpịakọta akwụkwọ ndị ọzọ nile nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ma, e nweghị usoro ọ bụla a kpọrọ aha maka ịmata ọdịiche n’etiti nke mbụ nke otu ihe odide na ihe odide ndị nwere ndehie ihe nke onye ndepụtaghachi. Malite na narị afọ nke abụọ O.A. gaa n’ihu, ihe odide mgbochi ume nke Akwụkwọ Nsọ Hibru yiri ka e dezitụwo ya nnọọ nke ọma, ọ bụ ezie na e guzobeghị ya dị ka ebe a ga na-elere anya. Nhota Akwụkwọ Nsọ Hibru na-apụta na Talmud (nke a chịkọtara n’agbata narị afọ nke abụọ na nke isii O.A.) na-egosikarị isi iyi dị iche n’ihe nke e mesịrị mata dị ka ihe odide Masoret.

Okwu ahụ bụ “ọdịnala” na Hibru bụ ma·soh·rahʹ ma ọ bụ ma·soʹreth. Ka ọ na-erule narị afọ nke isii O.A., ndị chekwara ọdịnala ahụ nke idepụtaghachi Akwụkwọ Nsọ Hibru n’izi ezi ghọrọ ndị a maara dị ka ndị Masoret. A na-ezo aka n’akwụkwọ ndị ha depụtaghachiri dị ka ihe odide Masoret. Gịnị pụrụ iche banyere ọrụ ha na ihe odide ndị ha kwadebere?

Hibru apụwo n’anya dị ka asụsụ mba ji eme ihe, ọtụtụ ndị Juu amazịghịkwa ya. N’ihi ya, nghọta nke ihe odide Bible nke mgbochi ume nọ n’ihe ize ndụ. Iji chebe ya, ndị Masoret welitere usoro nke ụdaume ndị e ji kpọm na dash nọchite anya ha. E dekwasịrị ndị a n’elu ma ọ bụ n’okpuru mgbochi ume ndị ahụ. Ndị Masoret wepụtakwara usoro dị mgbagwoju anya nke akara ndị jere ozi ma dị ka ụdị nke nkebi okwu ma dị ka ihe nduzi maka mkpọpụta okwu n’ụzọ ziri ezi karị.

N’ebe ndị Masoret chere na ọgbọ ndị gara aga nke ndị ndepụtaghachi gbanwere ihe odide ma ọ bụ depụtaghachiri ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, kama ịgbanwe ihe odide ahụ, ha denyere ihe n’akụkụ ya. Ha rịbara ụdị na njikọ okwu ndị pụrụ iche ama na ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a ji pụta n’ime otu akwụkwọ nke ọ bụla ma ọ bụ n’ime Akwụkwọ Nsọ Hibru dum. E detukwara okwu ndị ọzọ iji nyere ndị ndepụtaghachi aka inyochagharị ihe. E wepụtara otu usoro nke “okwu ndebiri” iji dekọọ ihe ọmụma a n’ụzọ dị nnọọ nkenke. N’akụkụ dị n’elu na n’ala, ụdị nke ntakịrị ndepụta okwu depụtara akụkụ nke amaokwu ndị e kwuru okwu banyere ha n’okwu ịrịba ama ndị dị n’akụkụ peji.

Ndị Masoret nọ na Taịberiọs, n’akụkụ Osimiri Galili, mere ka usoro nke kasị wuo ewu ka mma n’ọdịdị ikpeazụ ya. Ezinụlọ Ben Asher na Ben Naphtali nke narị afọ nke itoolu na iri O.A., ma eleghị anya ndị Karait, ghọrọ ndị a ma nnọọ ama.b Ọ bụ ezie na e nwere ọdịiche n’ụzọ ịkpọpụta okwu na okwu ịrịba ama nke ìgwè abụọ a, e nwere ọdịiche ná mgbochi ume ndị dị n’ihe odide ha n’ihe na-erughị ebe iri n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dum.

Ìgwè abụọ ahụ nke ndị Masoret, nke Ben Asher na nke Ben Naphtali, tinyere ihe dị ukwuu ná nkà mmụta ihe odide n’oge ha. Mgbe Maimonides (ọkà mmụta Talmud nwere oké mmetụta nke narị afọ nke 12) tosịrị ihe odide nke Ben Asher, ndị ọzọ họọrọ nanị ya. Nke a dị otú ahụ ruo n’ókè nke na a pụghị ịchọta otu mkpụrụ ihe odide Ben Naphtali ugbu a. Nanị ihe fọrọ bụ ndepụta nke ọdịiche ndị e nwere n’etiti ìgwè abụọ ahụ. N’ụzọ na-eju anya, ihe Maimonides kwuru metụtara ntụle nhazi, dị ka ohere dị n’etiti paragraf na ibe ya, ọ bụghị banyere akụkụ ndị ka mkpa nke idepụtaghachi ihe n’ụzọ ziri ezi.

Ànyị Pụrụ Ịchọta Ihe Odide Masoret “Dị Ọcha”?

E nwere oké ịrụ ụka n’etiti ndị ọká mmụta banyere codex e nwere taa nke bụ ihe odide Ben Asher nke “dị ọcha,” dị ka a ga-asị na nke a ga-enye anyị ihe odide Masoret nke bụ “ezie.” N’ezie, ọ dịghị mgbe e nwere otu ihe odide Masoret nke pụrụ iche, nke “dị ọcha,” na nke bụ okwuchaa ọgwụ. Kama nke ahụ, e nwere ọtụtụ ihe odide Masoret, nke ọ bụla dịtụ iche n’ebe ibe ya dị. Codex nile ka dịnụ bụ ngwakọta ihe odide dị iche iche, na-enwe usoro ọgụgụ ihe ma nke Ben Asher ma nke Ben Naphtali.

Ọrụ na-eche onye nsụgharị ọ bụla nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ihu taa abụghị ihe nta. Ọ bụghị nanị na ọ ghaghị ịmata ihe odide Hibru nke ọma kamakwa nhọrọ nile ezi uche dị na ha n’ebe ọ pụrụ ịbụ na a gbanwewo ihe site ná ndehie ihe nke onye ndepụtaghachi ma ọ bụ n’ụzọ ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ezie na ihe odide dị iche iche nke ndị Masoret ga-eje ozi dị ka ebe ndabere, ọ dị ya mkpa ịtụle isi iyi ndị ọzọ pụrụ ịnọchite anya nsụgharị ndị ka ochie na ndị ka zie ezie nke ihe odide mgbochi ume ahụ n’ụzọ ezi uche dị na ya.

N’okwu mmeghe nke akwụkwọ ya bụ́ The Text of the Old Testament, Ernst Würthwein na-akọwa, sị: “Mgbe akụkụ ihe odide siri ike chere anyị ihu, anyị apụghị nanị ịchịkọta usoro ọgụgụ ihe dị iche iche ma họrọ otu nke yiri ka ọ na-enye ihe ngwọta kasị mfe, mgbe ụfọdụ na-ahọrọ ihe odide Hibru, n’oge ndị ọzọ Septuagint, n’oge ndị ọzọ kwa nsụgharị Targum nke Aramaic. Akaebe ihe odide dị iche iche ahaghị nhata n’ikwesị ndabere. Nke ọ bụla nwere ọdịdị nke ya na akụkọ nke ya pụrụ iche. Anyị aghaghị ịmata ihe ndị a ma ọ bụrụ na anyị nwere olileanya izere ihe ngwọta ndị na-ezughị ezu ma ọ bụ ndị nke ụgha.”

Anyị nwere ihe ndabere siri ike maka obi ike na Jehova echekwawo Okwu ya. Site ná mgbalị e jikọrọ ọnụ nke ọtụtụ ndị ikom nwere obi eziokwu n’ọtụtụ narị afọ, isi ihe, ihe ndị dị n’ime ya, na ọbụna ụmụ irighiri ihe ọmụma nke ozi Bible dị nso ebe aka anyị na-eru. Ntakịrị mgbanwe ọ bụla ná mkpụrụ okwu ma ọ bụ okwu emetụtabeghị ikike anyị ịghọta Akwụkwọ Nsọ. Ugbu a, ajụjụ dị mkpa bụ, Ànyị ga-ebi ndụ n’ikwekọ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ebe ọtụtụ ndị Juu na-anọghị n’Israel na-abụkwaghị ndị na-agụ Hibru werewere, ógbè ndị Juu dị otú ahụ dị ka nke dị n’Alexandria, Ijipt, hụrụ n’oge na-adịghị anya mkpa ọ dị ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ala ahụ. Iji gboo mkpa a, a kwadebere nsụgharị Septuagint nke Grik na narị afọ nke atọ T.O.A. Nsụgharị nke a ga-emesịa ghọọ isi iyi dị mkpa maka iji otu ihe odide tụlee ibe ya.

b N’ihe dị ka n’afọ 760 O.A., otu ìgwè ndị Juu a maara dị ka ndị Karait chọrọ ka e nwee nrapagide siri ike karị n’Akwụkwọ Nsọ. N’ịjụ ikike nke ndị rabaị, “Iwu E Nyere n’Ọnụ,” na Talmud, ha nwere ihe ka ukwuu mere ha ga-eji jiri oké nlezianya chebe ihe odide Bible. Ezinụlọ ụfọdụ site n’ìgwè a ghọrọ ndị Masoret bụ́ ọkà n’idepụtaghachi ihe.

[Foto dị na peeji nke 26]

Aleppo Codex nwere ihe odide Masoret

[Ebe E Si Nweta Foto]

Bibelmuseum, Münster

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya