Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 9/15 p. 26-29
  • Olee Ndị Bụ Ndị Masorete?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị Bụ Ndị Masorete?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezinụlọ Ben Asher
  • A Chọrọ Ike Ncheta Ihe Dị Ukwuu
  • Gịnị Ka Ha Kweere?
  • Irite Uru Site n’Ọrụ Ha
  • Gịnị Bụ Ihe Odide Masoret Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ihe Odide Nlereanya nke Bible n’Asụsụ Hibru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Mbọ A Gbara Ịgbanwe Ihe Dị na Baịbụl Kụrụ Afọ n’Ala
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ịhụnanya M Hụrụ Ụwa Ga-ezu Ezu Ruo Mgbe Ebighị Ebi
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 9/15 p. 26-29

Olee Ndị Bụ Ndị Masorete?

JEHOVA, “Chineke nke eziokwu,” echekwawo Okwu ya, bụ́ Bible. (Abụ Ọma 31:5) Ma ebe ọ bụ na Setan, bụ́ onye iro nke eziokwu, agbalịwo imebi na ibibi ya, olee otú Bible si rute anyị aka n’ụzọ bụ isi dị ka e si dee ya?—Lee Matiu 13:39.

A pụrụ ịchọta otu akụkụ nke azịza ya n’ihe Professor Robert Gordis kwuru, sị: “A ghọtabeghị n’ụzọ zuru ezu ihe ndị odeakwụkwọ [ahụ] bụ́ ndị Hibru rụzuru, bụ́ ndị a na-akpọ ndị masorete ma ọ bụ ‘ndị nchekwa ọdịnala.’ Ndị odeakwụkwọ ndị a a na-akpọghị aha ha jiri ezi nlezianya na nchegbu ịhụnanya depụtagharịa Akwụkwọ ahụ Dị Nsọ.” Ọ bụ ezie na anyị amaghị aha nke ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ndepụtagharị ndị a taa, e dekọwo aha nke otu ezinụlọ nke ndị Masorete n’ụzọ doro anya—Ben Asher. Olee ihe ndị anyị maara banyere ha na ndị Masorete ibe ha?

Ezinụlọ Ben Asher

Akụkụ Bible nke e dere na mbụ n’asụsụ Hibru, bụ́ nke a na-akpọkarị Agba Ochie, bụ nke ndị odeakwụkwọ bụ́ ndị Juu ji ikwesị ntụkwasị obi depụtagharịa. Malite na narị afọ nke isii ruo na nke iri O.A., a na-akpọ ndị ndepụtagharị ndị a ndị Masorete. Gịnị ka ọrụ ha gụnyere?

Ruo ọtụtụ narị afọ a na-eji nanị mgbochiume ede asụsụ Hibru, ọ bụ onye na-agụ ya ga na-etinye ụdaume. Otú ọ dị, ka ọ na-erule n’oge nke ndị Masorete, ụzọ ziri ezi e si akpọ okwu Hibru nọ na-efu n’ihi na ọtụtụ ndị Juu adịkwaghị asụ asụsụ ahụ n’ụzọ na-aga werewere n’ọnụ. Ìgwè dị iche iche nke ndị Masorete nọ na Babilọn na n’Israel mepụtara akara ndị a ga-ede gburugburu mgbochiume iji gosi akara maka ịkpọ mkpụrụ akwụkwọ na ụzọ mkpọpụta ziri ezi nke ụdaume. E wepụtara ma ọ dịkarịa ala usoro atọ dị iche iche, ma otu nke a kasị jiri mee ihe bụ nke ndị Masorete nọ na Taịbirias, n’akụkụ Osimiri Galili, bụ́ ebe ezinụlọ Ben Asher bi.

Ndị dị iche iche depụtara ọgbọ ise nke ndị Masorete site n’ezinụlọ a pụrụ iche, na-amalite n’Asher nke Okenye nke narị afọ nke asatọ O.A. Ndị ọzọ bụ Nehemiah Ben Asher, Asher Ben Nehemiah, Moses Ben Asher, na, n’ikpeazụ, Aaron Ben Moses Ben Asher nke narị afọ nke iri O.A.a Ndị ikom a bụ ndị na-ebute ụzọ ná ndị ahụ na-edezi akara ndị ahụ e dere ede bụ́ ndị ga-akasị kọwapụta ihe ha ghọtara dị ka mkpọpụta ziri ezi nke ihe odide nke Bible Hibru ahụ. Iji mezie akara ndị a, ha aghaghị ịchọpụta ebe usoro ụtọ asụsụ Hibru ahụ gbakwasịrị ụkwụ. E dekọtụbeghị otu usoro iwu ọ bụla kpọmkwem maka ụtọ asụsụ Hibru. Ya mere mmadụ pụrụ ikwu na ndị Masorete a so ná ndị mbụ bụ́ ndị ọkà n’ụtọ asụsụ Hibru.

Aaron, bụ́ onye Masorete ikpeazụ sitere n’ọdịnala nke ezinụlọ Ben Asher, bụ onye mbụ dekọrọ ma dezie ihe ọmụma nke a. O mere otú ahụ n’akwụkwọ a kpọrọ “Sefer Dikdukei ha-Te‘amim,” bụ́ akwụkwọ mbụ nwere iwu maka ụtọ asụsụ Hibru. Akwụkwọ a ghọrọ ebe mgbakwasị ụkwụ nye akwụkwọ nke ndị ọkà ndị ọzọ n’ụtọ asụsụ Hibru ruo ọtụtụ narị afọ n’ihu. Ma nke a bụ nanị ntakịrị ihe si n’ọrụ ka mkpa nke ndị Masorete pụta. Gịnị ka nke ahụ bụ?

A Chọrọ Ike Ncheta Ihe Dị Ukwuu

Nchegbu bụ isi nke ndị Masorete bụ ndepụta nke okwu ọ bụla n’ụzọ ziri ezi, ọbụna mkpụrụ akwụkwọ ọ bụla, nke ihe odide Bible. Iji hụ na ihe e dere ziri ezi, ndị Masorete jiri oghere ndị dị n’akụkụ peji ọ bụla mee ihe idetu ihe ọmụma ga-egosi ihe ọ bụla pụrụ ịbụ mgbanwe nke ihe odide bụ́ nke ndị ndepụtagharị ihe bu ha ụzọ na-elezighị anya mee ma ọ bụ nke ha leziri anya mee. N’okwu nkọwa ndị a dị n’akụkụ peji, ndị Masorete dekwara okwu ma ọ bụ njikọ okwu ndị pụtara n’ụdị a na-adịghị ahụkebe, na-edepụta ugboro ole okwu ndị a pụtara n’ime otu akwụkwọ ma ọ bụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dum. E ji okwu ndebiri ndị e gburu nkenke nke ukwuu dee okwu ndị a, ebe ọ bụ na oghere e nwere dị ntakịrị. Dị ka ihe enyemaka ọzọ iji mee nnyochagharị, ha kanyere akara n’okwu dị n’etiti na mkpụrụ akwụkwọ nke akwụkwọ ụfọdụ. Ha ruru n’ókè nke ịgụ mkpụrụ akwụkwọ ọ bụla nke Bible ọnụ iji hụ na e nwere ndepụtagharị ziri ezi.

N’oghere ndị dị n’elu na n’ala peji, ndị Masorete dekọrọ ihe ndị ka saa mbara banyere ụfọdụ n’ime nkọwa ndị e gburu nkenke ndị dị n’oghere ndị dị n’akụkụ peji.b Ndị a na-enye aka n’inyochagharị ọrụ ha. Ebe ọ bụ na amaokwu ndị ahụ enweghị nọmba mgbe ahụ, e nweghịkwa concordance ọ bụla nke Bible, olee otú ndị Masorete si zoo aka n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible iji mee nnyochagharị nke a? N’oghere ndị dị n’elu na n’ala peji, ha depụtara akụkụ nke amaokwu ya na ya yitewere iji chetara ha ebe ọzọ n’ime Bible ebe a hụrụ otu okwu ma ọ bụ karịa ndị e gosiri. N’ihi enweghị oghere buru ibu, ọtụtụ mgbe ha ga-ede nanị otu okwu bụ isi iji chetara ha amaokwu nke ọ bụla yiri ibe ha. Ka okwu nkọwa ndị a dị n’oghere dị n’akụkụ peji wee baa uru, ndị ndepụtagharị ihe ndị a ga-afọ nke nta ka ha buru Bible Hibru dum n’isi.

E bufere ihe ndepụta ndị ahụ na-agaghị abata n’oghere ndị dị n’akụkụ peji n’akụkụ ọzọ nke ihe odide ahụ. Dị ka ihe atụ, okwu nkọwa ndị Masorete deturu n’oghere dị n’akụkụ peji banyere Jenesis 18:3 na-egosi mkpụrụ akwụkwọ Hibru atọ, bụ́ קלד. Nke a bụ okwu Hibru maka ọnụ ọgụgụ bụ́ 134. N’akụkụ ọzọ nke ihe odide ahụ, e nwere ihe ndepụta nke na-egosi 134 ebe ndị ndepụtagharị dịrị tupu oge ndị Masorete leziri anya wepụ aha Jehova n’ime ihe odide Hibru ahụ, na-eji okwu bụ́ “Onyenwe anyị” edochi anya ya.c Ọ bụ ezie na ha maara banyere mgbanwe ndị a, ndị Masorete ahọrọghị ịgbanwe ihe odide ahụ e nyefere ha. Kama nke ahụ, ha depụtara mgbanwe ndị a n’okwu nkọwa ha ndị dị n’oghere dị n’akụkụ peji. Ma n’ihi gịnị ka ndị Masorete ji lezie nnọọ anya otú a ka ha ghara ịgbanwe ihe odide ahụ ebe ọ bụ na ndị ndepụtagharị bu ha ụzọ agbanweela ya? Ụdị nkwenkwe ha nke ndị Juu ọ̀ dị iche na nke ndị bu ha ụzọ?

Gịnị Ka Ha Kweere?

N’ime oge a nke ọganihu ndị Masorete, okpukpe ndị Juu mikpuru onwe ya na mgba miri emi nke echiche dị iche iche. Eri narị afọ mbụ O.A., okpukpe ndị Juu nke nwere ndị rabaị anọwo na-amụba nchịkwa ya. Site n’odide nke Talmud na nkọwa nke ndị rabaị, ihe odide Bible na-aghọ nke dị ala n’ebe nkọwa nke ndị rabaị na-akọwa iwu ahụ a na-edeghị ede.d Ya mere, nchekwa e ji nlezianya chekwaa ihe odide Bible pụrụ ịtụfuworị ịdị mkpa ya.

Na narị afọ nke asatọ, otu ìgwè a maara dị ka ndị Karaịt nupụrụ isi megide omume nke a. Iji mesie ịdị mkpa nke ọmụmụ Bible n’onwe onye ike, ha jụrụ ikike na nkọwa nile nke ndị rabaị na Talmud. Ha nakweere nanị ihe odide Bible dị ka o kwuchaa o bie ha. Nke a mere ka mkpa e nwere maka ndepụta ziri ezi nke ihe odide ahụ rịkwuo elu, ịmụ ihe nke ndị Masorete nwetara nkwali ọhụrụ.

Ruo n’ókè ha aṅaa ka nkweta ndị rabaị ma ọ bụ nke ndị Karaịt nweruru mmetụta n’ọrụ ndị Masorete ahụ? M. H. Goshen-Gottstein, bụ́ ọkachamara n’ihe odide Bible Hibru, na-ekwu, sị: “Ndị Masorete kwenyesiri ike . . . na ha na-edebe ọdịnala oge ochie, ilezi anya gbanweekwa ya ga-abụworị nye ha mpụ kasị njọ a pụrụ ime.”

Ndị Masorete lere idepụtagharị ihe odide Bible n’ụzọ ziri ezi anya dị ka ọrụ dị nsọ. Ọ bụ ezie na ha pụrụ ịbụworị ndị ihe ndị ọzọ metụtara okpukpe kwaliri nke ukwuu n’onwe ha, o yiri ka ọrụ ndị Masorete n’onwe ya bụ nke okwu metụtara echiche dị iche iche na-emetụtaghị. Okwu nkọwa dị nkenke ndị dị n’oghere dị n’akụkụ peji enyekebeghị ohere maka arụmụka nkà mmụta okpukpe. Ihe odide Bible n’onwe ya bụ nchegbu ha ná ndụ; ha agaghị agbanwe ya.

Irite Uru Site n’Ọrụ Ha

Ọ bụ ezie na ndị Israel anụ ahụ abụkwaghị ndị Chineke họọrọ, ndị ndepụtagharị a bụ́ ndị Juu bụ ndị raara onwe ha nye kpam kpam ná nchekwa ziri ezi nke Okwu Chineke. (Matiu 21:42-44; 23:37, 38) Ihe nile ezinụlọ Ben Asher na ndị Masorete ndị ọzọ rụzuru bụ nke Robert Gordis chịkọtara nke ọma, bụ́ onye dere, sị: “Ndị ọrụ ahụ dị umeala n’obi ma bụrụ ndị ike na-adịghị agwụ agwụ . . . rụrụ ọrụ ha tara akpụ nke ichebe Ihe Odide Bible ka ọ ghara ifu ma ọ bụ bụrụ nke a gbanwere n’anụghị mkpatụ ha.” (The Biblical Text in the Making) N’ihi ya, mgbe Ndị Mgbanwe nke narị afọ nke 16 ndị dị ka Luther na Tyndale nupụụrụ ịchịisi chọọchị isi wee malite ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ndị nkịtị ka mmadụ nile wee gụọ ya, ha nwere ihe odide Hibru e chekwara nke ọma ha ga-eji mee ihe dị ka ebe mgbakwasị ụkwụ maka ọrụ ha.

Ọrụ ndị Masorete nọgidere na-abara anyị uru taa. Ihe odide ha nke Hibru ghọrọ ebe mgbakwasị ụkwụ maka Akwụkwọ Nsọ Hibru nke nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures. A nọgidewo na-eji otu mmụọ ahụ nke nraranye na nchegbu maka izi ezi bụ nke ndị Masorete oge ochie gosipụtara na-asụgharị nsụgharị nke a gaa n’ọtụtụ asụsụ. Anyị kwesịrị igosi mmụọ yiri nke ahụ site n’ịṅa ntị n’Okwu Jehova Chineke.—2 Pita 1:19.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’asụsụ Hibru “ben” pụtara “nwa nwoke.” Ya mere Ben Asher pụtara “nwa nwoke nke Asher.”

b A na-akpọ okwu nkọwa ndị ahụ dị n’oghere dị n’akụkụ peji bụ nke ndị Masorete dere Masora Ntakịrị. A na-akpọ okwu nkọwa ndị dị n’oghere dị n’elu na n’ala peji Masora Ukwu. A na-akpọ ihe ndepụta ndị dị n’ebe ndị ọzọ n’ihe odide ahụ Masora Ikpeazụ.

c Lee Appendix 1B ná nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures With References.

d Maka inwetakwu ihe ọmụma n’iwu ahụ a na-edeghị ede na okpukpe ndị Juu nke nwere ndị rabaị, lee peji nke 8-11 nke broshuọ bụ́ Will There Ever Be a World Without War?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]

Usoro Maka Mkpọpụta Okwu Hibru

ỌCHỊCHỌ a na-achọ ụzọ kasị mma nke isi na-edekọ akara ụdaume na akara ịkpọ mkpụrụ akwụkwọ ya dịgidere ruo ọtụtụ narị afọ n’etiti ndị Masorete. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya ịhụ mmeziwanye na-aga n’ihu n’ọgbọ ọ bụla nke ezinụlọ Ben Asher. Ihe odide ndị dị adị na-anọchite anya otú na ụzọ nke nanị ndị Masorete abụọ ikpeazụ n’ezinụlọ Ben Asher, bụ́ Moses na Aaron ji mee ihe.e Ihe ọmụmụ nke iji otu ihe tụnyere ọzọ nke e mere n’ihe odide ndị a na-egosi na Aaron mepụtara iwu n’ụmụ irighiri ihe ụfọdụ dị ná mkpọpụta okwu na ụzọ ide ihe bụ ndị dị iche na nke nna ya, bụ́ Moses.

Ben Naphtali biri ndụ n’oge Aaron Ben Asher. Cairo Codex nke Moses Ben Asher nwere ọtụtụ nkọwa ndị a sị na ọ bụ Ben Naphtali mere. Ya mere, ma ọ́ bụghị na Moses Ben Asher kụziiri Ben Naphtali n’onwe ya ihe ọ bụrụ na ha abụọ chekwara ọdịnala mere ochie karị nke a maara ebe nile. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu banyere ọdịiche ndị dị n’etiti usoro nke Ben Asher na nke Ben Naphtali, ma M. H. Goshen-Gottstein na-ede, sị: “Ọ gaghị abụcha ihie ụzọ ikwu okwu banyere usoro abụọ ahụ dị ala karị ndị dị n’ime ezinụlọ Ben Asher na ịkpọ ndịrịta iche ndị dị ná nkọwa ndị ahụ: Ben Asher megide Ben Asher.” Ya mere ọ ga-abụ ihie ụzọ ikwu banyere otu usoro nanị nke Ben Asher. Ọ bụghị n’ihi ịdị mma nke ihe e dere ka ụzọ ide ihe nke Aaron Ben Asher ji ghọọ ụdị e mesịrị nakwere. Ọ bụ nanị n’ihi na onye ọkà mmụta Talmud nke narị afọ nke 12, bụ́ Moses Maimonides jara ihe odide nke Aaron Ben Asher mma mere e ji nwee mmasị na ya karị.

[Artwork—Hebrew Characters]

Akụkụ nke Ọpụpụ 6:2 nke nwere na nke na-enweghị kpọm na akara mkpọpụta ụdaume

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

e Cairo Codex (895 O.A.), nke nwere ihe ndekọ nke nanị ndị amụma dịrị tupu mgbe ahụ na ndị dịrị n’ikpeazụ, na-enye ihe atụ nke ụzọ ide ihe nke Moses. Codex nke Aleppo (ihe dị ka 930 O.A.) na Leningrad (1008 O.A.) bụ ndị a na-ele anya dị ka ihe atụ nke ụzọ ide ihe nke Aaron Ben Asher.

[Foto dị na peeji nke 26]

Taịbirias, ebe bụ́ isi maka ọrụ nke ndị Masorete malite na narị afọ nke asatọ ruo nke iri

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya