Ha Mere Uche Jehova
Nna nke Dị Njikere Ịgbaghara
A KPỌWO ya akụkọ dị mkpirikpi nke kasịnụ e detụworo—e nwekwara ezi ihe kpatara ya. Ilu Jisọs nke ịhụnanya otu nna nwere n’ebe nwa ya furu efu nọ dị ka window anyị si na ya ahụ n’ụzọ dị ebube ọmịiko Chineke maka ndị mmehie chegharịrịnụ.
O Furu Efu E Wee Hụ Ya
Otu nwoke nwere ụmụ ndị ikom abụọ. Nke bụ nwata sịrị ya: ‘Achọrọ m ihe nketa m ugbu a, kama ichewe ruo mgbe ị ga-anwụ.’ Nna ya kwenyere, ikekwe na-enye ya otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe nile o nwere—òkè iwu kwadoro maka nke bụ nwata n’ime ụmụ ndị ikom abụọ. (Deuterọnọmi 21:17) Onye ntorobịa ahụ ji ọsọ ọsọ kwakọta ihe onwunwe ya wee jee otu ala dị anya ebe o mefusịrị ego ya nile n’ibi ndụ ịla n’iyi.—Luk 15:11-13.
E mesịa oké ụnwụ weere ọnọdụ. N’oké mkpa, nwa okoro ahụ nakweere ọrụ dị ka onye na-azụ ezì—ọrụ na-asọ oyi nye onye Juu. (Levitikọs 11:7, 8) Nri kọrọ oké ụkọ nke na ọ malitere na-enwe agụụ maka mgbụgbọ ndị bụụrụ ezì ihe oriri! N’ikpeazụ, anya foro nwa okoro ahụ. ‘A na-enyeju ndị ohu nke nna m afọ karịa m!’ ka o chere n’ime onwe ya. ‘M ga-alaghachi ụlọ, kwupụta mmehie m, ma rịọ arịrịọ ịdị ka otu n’ime ndị ikom e goro ọrụ nke nna m.’a—Luk 15:14-19.
Nwa okoro ahụ gara ogologo ije laghachi ụlọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọdịdị ahụ ya agbanwewo nke ukwuu. N’agbanyeghị ya, nna ya matara ya “mgbe ọ nọ n’ebe dị anya.” N’ịbụ onye obi ebere kwaliri, o ji ọsọ gbakwuru nwa ya, makụọ ya, “sutukwa ya ọnụ nke ukwuu.”—Luk 15:20.
Nnabata a kporo ọkụ mere ka ọ dịrị nwa okoro ahụ mfe karị izida ibu ya. “Nna,” ka o kwuru, “emehiewo m megide eluigwe, na n’ihu gị: ekwesịghị m ka a kpọọkwa m nwa gị ọzọ.” Nna ahụ kpọkọtara ndị ohu ya. O nyere iwu, sị: “Chịpụta uwe mwụda nke kachasị mma ọsọ ọsọ, were ya yikwasị ya; tinyekwa mgbaaka n’aka ya, na akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ ya: sekpụtakwa nwa ehi a zụrụ azụ, gbuo ya, ka anyị riekwa, ka obi tọọkwa anyị ụtọ: n’ihi na nwa m nke a nwụrụrịị anwụ, o wee dị ndụ ọzọ; o fururịị efu, e wee hụ ya.”—Luk 15:21-24.
Oké oriri wee malite, tinyere ịgụ na ite egwú. Nwa nke bụ okenye nụrụ mkpọtụ ahụ ka o si ubi na-alọta. Mgbe ọ nụrụ na nwanne ya alọtawo ụlọ nakwa na nke a bụ ihe kpatara oriri ahụ, iwe bịara ya. ‘Abụwo m ohu gị ruo ọtụtụ afọ, ọ dịghịkwa mgbe m nupụwooro gị isi, ma ọ dịghị mgbe i nyetụworo m nwa ewu ka obi wee tọọ mụ na ndị enyi m ụtọ,’ ka o kpesaara nna ya. ‘Ma ugbu a ozugbo nwa gị onye laworo akụ̀ na ụba gị n’iyi lọtara, i mewere ya oriri.’ ‘Nwa m,’ ka nna ya zaghachiri n’ụzọ dị nro, ‘mụ na gị nọ mgbe nile, ihe m nile bụkwa nke gị. Ma anyị aghaghị ịṅụrị ọṅụ n’ihi na nwanne gị nwụrụrịị anwụ, o wee dị ndụ ọzọ. O furu efu e wee mesịa hụ ya.’—Luk 15:25-32.
Ihe Mmụta Nye Anyị
Nna ahụ nke dị n’ilu Jisọs na-anọchite anya Chineke anyị dị ebere, bụ́ Jehova. Dị ka nwa ahụ furu efu, ụfọdụ na-ahapụ nchebe nke ezinụlọ Chineke ruo oge ụfọdụ ma mesịa lọghachi. Olee otú Jehova si ele ndị dị otú ahụ anya? A pụrụ imesi ndị ji ezi nchegharị lọghachikwute Jehova obi ike na “ọ bụghị ruo mgbe nile ka Ọ ga na-ese okwu; ọ bụghịkwa ruo mgbe ebighị ebi ka Ọ ga na-edebe iwe.” (Abụ Ọma 103:9) N’ilu ahụ, nna ahụ gbara ọsọ ịga nabataghachi nwa ya. N’otu aka ahụ, Jehova adịghị nanị njikere kama ọ na-anụ ya ọkụ n’obi ịgbaghara ndị mmehie chegharịrịnụ. Ọ “na-agbaghara mmehie,” ọ na-emekwa otú ahụ “n’ụba.”—Abụ Ọma 86:5; Aịsaịa 55:7; Zekaraịa 1:3.
N’ilu Jisọs, ezi ịhụnanya nke nna ahụ mere ka ọ dịrị nwa ahụ mfe karị inweta obi ike ịlaghachi. Ma chee echiche: Gịnị gaara eme ma ọ bụrụ na nna ahụ jụrụrịị nwata nwoke ahụ ma ọ bụ ná ntiwapụ nke iwe gwa ya ka ọ ghara ịlọghachi? Ikekwe àgwà dị otú ahụ gaara ekewapụ nwata ahụ n’ụzọ na-adịgide adịgide.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 2:6, 7.
Mgbe ahụ, n’otu echiche nna ahụ tọrọ ntọala maka nlọghachi nke nwa ya n’oge ahụ ọ pụrụ. N’oge ụfọdụ, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye taa aghaghị iwepụ onye mmehie na-enweghị nchegharị site n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:11, 13) N’ime nke ahụ, ha pụrụ ịmalite ịkwadebe ụzọ maka nlọghachi nke onye mmehie ahụ site n’iji ịhụnanya na-eme ka nzọụkwụ ndị ọ pụrụ iwere maka nnabataghachi n’ọdịnihu pụta ìhè. Ncheta nke arịrịọ sitere n’obi dị otú ahụ emesịwo kpalie ọtụtụ ndị furu efu n’ụzọ ime mmụọ ichegharị, ọ kpaliwokwa ha ịlọghachi n’ezinụlọ Chineke.—2 Timoti 4:2.
Nna ahụ gosikwara ọmịiko mgbe nwa ya lọtara. O weghị ya oge ịhụta ezi nchegharị nke nwata nwoke ahụ. Mgbe ahụ, kama isi ọnwụ ịmatacha njehie nile nke nwa ya, ọ gara ịhụ maka ịnabataghachi ya, o gosipụtakwara obi ụtọ dị ukwuu n’ime otú ahụ. Ndị Kraịst pụrụ iṅomi ihe nlereanya a. Ha kwesịrị ịṅụrị ọṅụ na a chọtawo onye furu efu.—Luk 15:10.
Omume nna ahụ adịghị ahapụ ihe ịrụ ụka ọ bụla na ọ dịwo anya ọ tụrụ anya nlọghachi nke nwa isi ike ya. N’ezie, nke ahụ bụ nanị onyinyo nke agụụ Jehova nwere maka ndị nile hapụworo ezinụlọ ya. O “zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere a pụrụ imesi ndị chegharịrị site ná mmehie ha obi ike na a ga-eji “oge inwe ume ndụ . . . si n’ihu Onyenwe anyị bịa” gọzie ha.—Ọrụ 3:19.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ ezie na a na-ele ohu anya dị ka onye bụ akụkụ nke ezinụlọ, onye na-eje ozi e goro ọrụ bụ onye ọrụ ụbọchị, onye a pụrụ ịchụ n’oge ọ bụla. Nwa okoro ahụ chere echiche na ya ga-adị njikere ịnakwere ọbụna ọnọdụ kasị dị ala n’ezinụlọ nna ya.