Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 10/1 p. 8-13
  • “Jehova, Chineke nke Nwere Obi Ebere, Onye Na-eme Amara”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Jehova, Chineke nke Nwere Obi Ebere, Onye Na-eme Amara”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwa Na-enupụ Isi Ahapụ Ụlọ
  • Obi Nkoropụ ná Mba Dị Anya
  • Nwa Mmefu ahụ Amara Onwe Ya
  • Nnabata Na-ekpo Obi Ọkụ
  • Ṅomie Ebere Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ezi Nnabata nye Ndị ahụ Lọghachiri
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Akụkọ Banyere Otu Nwa Furu Efu
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nyere Nwa “Mmefu” Aka?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 10/1 p. 8-13

“Jehova, Chineke nke Nwere Obi Ebere, Onye Na-eme Amara”

“Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.”—ỌPỤPỤ 34:6.

1. (a) Nkasi obi dị aṅaa ka Bible na-enye ndị ahụ hụworo ndị ha hụrụ n’anya ka ha na-esite n’ofufe dị ọcha kpafuo? (b) Olee otú Jehova si ele ndị na-ejehie ejehie anya?

“NWA m nwanyị gwara m na ya achọghịzi ịbụ akụkụ nke ọgbakọ ndị Kraịst,” ka otu onye Kraịst bụ́ nna na-ekwu. “Ruo ọtụtụ ụbọchị, ọtụtụ izu, ọbụna ọtụtụ ọnwa mgbe nke ahụ gasịrị, enwere m oké ihe mgbu n’ahụ m. Ọ dị njọ karịa ọnwụ.” Ọ bụ n’ezie ihe na-enye nsogbu n’obi ịhụ onye a hụrụ n’anya ka o si n’ụzọ nke ofufe dị ọcha kpafuo. Ì nwewo ahụmahụ dị otú ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-enweta nkasi obi ịmara na Jehova nwere mmetụta ọmịiko maka gị. (Ọpụpụ 3:7; Aịsaịa 63:9) Ma olee otú o si ele ndị mmehie dị otú ahụ anya? Bible na-egosi na Jehova na-eji obi ebere akpọ ha òkù ịbịaghachi iji nweta ihu ọma ya. Ọ rịọrọ ndị Juu na-enupụ isi nke ụbọchị Malakaị, sị: “Laghachikwutenụ m, Mụ onwe m ga-alaghachikwutekwa unu.”—Malakaị 3:7.

2. Olee otú Bible si egosi na ebere bụ akụkụ dị mkpa nke àgwà Jehova?

2 E mere ka ebere Chineke pụta ìhè nye Mosis n’Ugwu Saịnaị. N’ebe ahụ, Jehova kpughere onwe ya dị ka “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6) Nkwupụta a na-emesi ike na ebere bụ akụkụ dị mkpa nke àgwà Jehova. O ‘zubere ka mmadụ nile bịaruo nchegharị,’ ka onye Kraịst bụ́ Pita onyeozi dere. (2 Pita 3:9) Otú ọ dị, ebere Chineke abụghị nke na-enweghị ókè. “Ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị,” ka a gwara Mosis. (Ọpụpụ 34:7; 2 Pita 2:9) Ka o sina dị, “Chineke bụ ịhụnanya,” ebere bụkwa akụkụ buru ibu nke àgwà ahụ. (1 Jọn 4:8; Jemes 3:17) Jehova agaghị ‘ejigide iwe Ya ruo mgbe ebighị ebi,’ ọ bụkwa “onye ebere na-atọ ụtọ.”—Maịka 7:18, 19.

3. Olee otú ụzọ Jisọs si lee ebere anya si dị iche na nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii?

3 Jisọs bụ ngosipụta zuru okè nke Nna ya nke eluigwe. (Jọn 5:19) Mmeso o ji ebere emeso ndị mere ihe ọjọọ abụghị ịnabata mmehie ha kama ngosipụta nke otu mmetụta ọmịiko ahụ o gosipụtara n’ebe ndị ahụ na-esighị ike nọ. (Tụlee Mak 1:40, 41.) Ee, Jisọs gụnyere ebere n’ime ihe ndị “ka arọ” nke Iwu Chineke. (Matiu 23:23) N’ụzọ dị iche, tụlee ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, bụ́ ndị echiche ha nke ile ikpe ziri ezi anya site n’iwu na-ewepụkarị ebere kpam kpam. Mgbe ha hụrụ Jisọs ka o so ndị mmehie na-emekọrịta ihe, ha mere mkpesa: “Nwoke a na-anara ndị mmehie nke ọma, na-esokwa ha eri ihe.” (Luk 15:1, 2) Jisọs ji ihe atụ atọ zaghachi ndị na-ebo ya ebubo, nke ọ bụla n’ime ha na-emesi ebere Chineke ike.

4. Ihe atụ abụọ dị aṅaa ka Jisọs nyere, gịnị bụkwa isi ihe dị na nke ọ bụla?

4 Nke mbụ, Jisọs kọrọ banyere otu nwoke hapụrụ atụrụ 99 iji chọọ otu furu efu. Olee isi ihe ọ chọrọ iwepụta? “Ọṅụ ga-adị n’eluigwe n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị, karịa n’isi [ndị ezi omume iri itoolu na itoolu], ndị nchegharị na-adịghị mkpa.” Ọzọ, Jisọs kọrọ banyere otu nwanyị nke chọgharịrị otu shilling furu efu ma ṅụrịa ọṅụ mgbe ọ chọtara ya. Olee otú o si kọwaa ya? “Ọṅụ dị n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị.” Jisọs kọrọ ihe atụ ya nke atọ n’ụdị ilu.a Ọtụtụ ndị ewerewo ya dị ka akụkọ dị nkenke kasị mma a kọtụworo. Ịtụle ilu a ga-enyere anyị aka ịghọta na iṅomi ebere Chineke.—Luk 15:3-10.

Nwa Na-enupụ Isi Ahapụ Ụlọ

5, 6. Olee otú nwa ahụ bụ nwata nọ n’ilu nke atọ Jisọs si gosi ajọ enweghị ekele?

5 “Otu nwoke ji ụmụ ndị ikom abụọ: nke bụ́ nwata n’ime ha wee sị nna ya, Nna, nye m òkè nke ihe i nwere nke ruuru m. O wee kewaara ha ihe nile o ji biri. Mgbe ọtụtụ ụbọchị agabigaghị nwa ya nke nwata ahụ wee kporo ihe nile, jee ala ọzọ dị anya; n’ebe ahụ ka o mefuru ihe o nwere n’ịdị ndụ nke ịla n’iyi.”—Luk 15:11-13.b

6 Nwa nke nwata ahụ n’ebe a gosipụtara ajọ enweghị ekele. Nke mbụ, ọ sịrị ka e nye ya ihe nketa ya, e mesịa o rikpọrọ ya “site n’ịdị ndụ nke ịla n’iyi.” A sụgharịrị okwu bụ́ “ndụ nke ịla n’iyi” site n’okwu Grik pụtara “ibi ndụ aghara.” Otu ọkà mmụta sịrị na okwu ahụ “na-egosipụta mgbahapụ kasị elu nke ezi àgwà.” N’inwe ezi ihe kpatara ya, a na-akpọkarị nwa okorobịa ahụ nọ n’ilu Jisọs nwa mmefu, okwu nke na-akọwa onye na-emefu ihe gabiga ókè.

7. Olee ndị taa yiri nwa mmefu ahụ, n’ihi gịnịkwa ka ọtụtụ ndị dị otú ahụ ji achọ nnwere onwe ‘n’ala ọzọ dị anya’?

7 È nwere ndị yiri nwa mmefu ahụ taa? Ee. N’ụzọ dị mwute, ọnụ ọgụgụ dị nnọọ nta ahapụwo “ụlọ” dị nchebe nke Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova. (1 Timoti 3:15) Ụfọdụ n’ime ndị a na-eche na gburugburu ezinụlọ Chineke na-egbochi mmadụ gabiga ókè, na anya nlekọta Jehova bụ nke na-egbochi egbochi karịa ịbụ ihe nchebe. (Tụlee Abụ Ọma 32:8.) Tụlee otu nwanyị bụ́ onye Kraịst bụ́ onye e ji ụkpụrụ Bible zụlite ma bụrụ onye mesịrị tinye aka n’ịṅụbiga mmanya ókè na ịnụ ọgwụ ọjọọ. N’ileghachi anya azụ n’oge ahụ gbara ọchịchịrị ná ndụ ya, o kwuru, sị: “M chọrọ igosi na m pụrụ imere onwe m ndụ ka mma. M chọrọ ime ihe m chọrọ ime, achọghịkwa m ka onye ọ bụla gwa m ihe dị iche.” Dị ka nwa mmefu ahụ, nwa agbọghọ a chọrọ nnwere onwe. N’ụzọ dị mwute, a chụpụrụ ya n’ọgbakọ ndị Kraịst n’ihi omume ya ndị ha na Akwụkwọ Nsọ na-ekwekọghị.—1 Ndị Kọrint 5:11-13.

8. (a) Enyemaka dị aṅaa ka a pụrụ inye ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ megidere ụkpụrụ Chineke? (b) N’ihi gịnị ka mmadụ kwesịrị iji chebasiere nhọrọ ya n’ihe banyere ofufe echiche ike?

8 Ọ bụ n’ezie ihe na-agbawa obi mgbe onye kwere ekwe ibe anyị gosipụtara ọchịchọ ịdị ndụ n’ụzọ megidere ụkpụrụ Chineke. (Ndị Filipaị 3:18) Mgbe nke a mere, ndị okenye na ndị ọzọ nwere iru eru ime mmụọ na-agbalị ime ka onye ahụ na-ejehie ejehie guzozie. (Ndị Galetia 6:1) Ka o sina dị, ọ dịghị onye a na-amanye ịnara yoke nke ịbụ onye na-eso ụzọ ndị Kraịst. (Matiu 11:28-30; 16:24) Mgbe ha toruru ogo mmadụ, ọbụna ndị ntorobịa aghaghị ime nhọrọ onwe onye n’okwu banyere ofufe. Mee elu mee ala, onye ọ bụla n’ime anyị nweere onwe ya ime nhọrọ, bụ onye ga-aza Chineke ajụjụ banyere onwe ya. (Ndị Rom 14:12) N’ezie, anyị ‘ga-ewetakwa ihe anyị ghara n’ubi’—ihe nwa mmefu ahụ nọ n’ilu Jisọs ga-amụta n’oge na-adịghị anya.—Ndị Galetia 6:7, 8.

Obi Nkoropụ ná Mba Dị Anya

9, 10. (a) Mgbanwe dị aṅaa nke ọnọdụ ka nwa mmefu ahụ nwere, oleekwa otú o si meghachi omume nye ya? (b) Nye ihe atụ otú ụfọdụ ndị taa bụ́ ndị gbahapụrụ ezi ofufe si anọ n’ọnọdụ yiri nke nwa mmefu ahụ.

9 “Mgbe o mefusịrị ihe nile, oké ụnwụ siri ike dara n’ala ahụ; ya onwe ya wee malite ịnọ ná mkpa. O wee gaa were onwe ya rapara n’otu onye n’ime ndị a mụrụ n’ala ahụ; o wee ziga ya n’ubi ya ịzụ ezì. O wee na-agụ ya iwere mgbụgbọ nke ezì na-ata rijuo afọ ya: ma ọ dịghị onye ọ bụla na-enye ya.”—Luk 15:14-16.

10 Ọ bụ ezie na ọ nọ n’ụkọ, nwa mmefu ahụ echebeghị echiche ịlaghachi ụlọ. Kama nke ahụ, o jekwuuru nwa amaala bụ́ onye nyere ya ọrụ ịzụ ezì. Ebe ọ bụ na Iwu Mosis kwuru na ezì bụ anụ na-adịghị ọcha, ọrụ dị otú ahụ yiri ka ọ ga-abụ ihe onye Juu na-agaghị anabata. (Levitikọs 11:7, 8) Ma ọ bụrụ na akọ na uche nwa mmefu ahụ amaa ya ikpe, ọ ghaghị ịbịanyụ ya. E kwuwerị, ọ pụghị ịtụ anya ka onye were ya n’ọrụ, bụ́ nwa amaala, nwee nchegbu banyere mmetụta nke onye ala ọzọ nọ n’ụkọ. Ọnọdụ nwa mmefu ahụ yiri ahụmahụ nke ọtụtụ ndị bụ́ ndị gbahapụrụ ụzọ guzo kwem nke ofufe dị ọcha. Mgbe mgbe, ndị dị otú ahụ na-etinye aka n’omume ndị ha gaara ele anya na mbụ dị ka ndị na-eweda n’ala. Dị ka ihe atụ, n’afọ ndụ nke 17, otu nwa okorobịa nupụrụ isi megide nzụlite ya n’ụzọ ndị Kraịst. “Omume rụrụ arụ na ịṅụ ọgwụ ọjọọ hichapụrụ ọtụtụ afọ nke nkụzi dabeere na Bible,” ka ọ na-ekweta. N’oge na-adịghị anya, nwa okorobịa a chọtara onwe ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi iji égbè zuo ohi na igbu mmadụ. Ọ bụ ezie na o mesịrị gbakee n’ụzọ ime mmụọ, leenụ ụgwọ dị ukwuu ọ na-aghaghị ịkwụ maka “inwe ihe ụtọ nke mmehie na nwa oge”!—Tụlee Ndị Hibru 11:24-26.

11. Olee otú ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme nke nwa mmefu ahụ si jọwanye njọ, oleekwa otú ụfọdụ ndị taa siworo hụ ndọrọ nke ụwa a ịbụ “aghụghọ efu”?

11 Ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme nke nwa mmefu ahụ jọwanyere njọ n’ihi na “ọ dịghị onye ọ bụla na-enye ya.” Olee ebe ndị enyi ọ chọtara ọhụrụ nọ? Ugbu a ọ na-enwekwaghị afụ, ọ dịzi ha ka ‘onye a na-akpọ asị.’ (Ilu 14:20) N’otú aka ahụ, ọtụtụ ndị taa bụ́ ndị sitere n’okwukwe ahụ kpafuo na-achọpụta na ndọrọ na echiche nke ụwa a bụ “aghụghọ efu.” (Ndị Kọlọsi 2:8) “Enwetara m ihe mgbu na obi mgbu dị ukwuu n’ihi enweghị nduzi Jehova,” ka otu nwa agbọgbọ hapụrụ nzukọ Chineke ruo oge ụfọdụ, kwuru. “Agbalịrị m ikwekọ n’ụzọ nke ụwa, ma n’ihi na adịchaghị m ka ndị ọzọ, ha jụrụ m. Ọ dị m ka m bụ nwa furu efu nke chọrọ nna iduzi m. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na Jehova dị m mkpa. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ m chọrọ ibi ndụ nke adabereghị n’ebe ọ nọ.” Nwa mmefu ahụ nọ n’ihe atụ Jisọs ghọtakwara ihe yiri nke ahụ.

Nwa Mmefu ahụ Amara Onwe Ya

12, 13. Ihe ndị dị aṅaa nyewooro ụfọdụ ndị aka taa ịmara onwe ha? (Lee igbe.)

12 “Mgbe ọ maara onwe ya ọ sị, Ọtụtụ ndị e goro ọrụ ole nke nna m nwebigara ogbe achịcha ókè, ma mụ onwe m na-ala n’iyi n’oké agụụ n’ebe a! M ga-ebili jekwuru nna m, m ga-asịkwa ya, Nna, emehiewo m megide eluigwe, na n’ihu gị: ekwesịghị m ka a kpọọkwa m nwa gị ọzọ: mee m ka m dị ka otu onye n’ime ndị nke gị e goro ọrụ. O wee bilie, bịakwute nna ya.”—Luk 15:17-20.

13 Nwa mmefu ahụ “maara onwe ya.” Ruo oge ụfọdụ, ọ nọwo na-etinye aka n’ịchọ ihe ụtọ, dị ka a ga-asị na ọ nọ ná nrọ. Ma ugbu a ọ matara nnọọ kpọmkwem ọnọdụ ime mmụọ ya. Ee, ọ bụ ezie na ọ dahiewo, olileanya ka dịịrị nwa okorobịa a. A pụrụ ịhụ ihe dị mma n’ime ya. (Ilu 24:16; tụlee 2 Ihe E Mere 19:2, 3.) Gịnị banyere ndị hapụrụ ìgwè atụrụ Chineke taa? Ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na olileanya adịrịghị ha nile ọzọ, na n’akụkụ nile omume nnupụisi ha na-egosi na ha emehiewo megide mmụọ nsọ Chineke? (Matiu 12:31, 32) Ọ bụchaghị otú ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ụzọ ọjọọ ha na-emekpa ahụ, ka oge na-agakwa ọtụtụ n’ime ndị a na-amara onwe ha. “Ọ dịghị ọbụna otu ụbọchị m chezọrọ Jehova,” ka otu nwanna nwanyị na-ekwu, n’ichetaghachi oge ọ na-anọghị n’ime nzukọ Chineke. “Ekpere m ekpere mgbe nile na n’ụzọ ụfọdụ, otu ụbọchị, ọ ga-anabataghachi m n’eziokwu ahụ.”—Abụ Ọma 119:176.

14. Mkpebi dị aṅaa ka nwa mmefu ahụ mere, oleekwa otú o si gosi ịdị umeala n’obi n’ime n’otú ahụ?

14 Ma gịnị ka ndị kpafuworonụ pụrụ ime banyere ọnọdụ ha? N’ilu Jisọs nwa mmefu ahụ kpebiri ime njem laghachi ụlọ ma rịọ nna ya mgbaghara. “Mee m ka m dị ka otu onye n’ime ndị nke gị e goro ọrụ,” ka nwa mmefu ahụ kpebiri ikwu. Ohu e goro ọrụ bụ onye e goro ọrụ ụbọchị bụ́ onye a pụrụ ịchụ n’ọrụ nanị otu ụbọchị mgbe a gwasịrị ya. Nke a dị ala ọbụna karịa ohu, bụ́ onye dị ka onye òtù ezinụlọ, n’otu echiche. Ya mere nwa mmefu ahụ ebughị n’uche ịrịọ ka e weghachi ya n’ọkwá mbụ ya dị ka nwa. Ọ ga-adị nnọọ njikere ịnakwere ọnọdụ kasị ala iji gosipụta nguzosi ike n’ihe e mere ka ọ dị ọhụrụ nye nna ya kwa ụbọchị. Otú ọ dị, nwa mmefu ahụ na-aga inweta ihe ijuanya.

Nnabata Na-ekpo Obi Ọkụ

15-17. (a) Olee otú nna ahụ si meghachi omume mgbe ọ hụrụ nwa ya? (b) Gịnị ka uwe mwụda, mgbaaka, na akpụkpọ ụkwụ ndị nna ahụ wetaara nwa ya na-anọchi anya ha? (ch) Gịnị ka e gosipụtara site ná nna ahụ ime ndokwa maka oriri?

15 “Ma mgbe ọ nọ n’ebe dị anya ugbu a, nna ya hụrụ ya, o wee nwee ọmịiko n’ahụ ya, gbaa ọsọ, makụọ ya n’olu, sutukwa ya ọnụ nke ukwuu. Nwa ya wee sị ya, Nna, emehiewo m megide eluigwe, na n’ihu gị: ekwesịghị m ka a kpọọkwa m nwa gị ọzọ. Ma nna ya sịrị ndị ohu ya, Chịpụta uwe mwụda nke kachasị mma ọsọ ọsọ, were ya yikwasị ya; tinyekwa mgbaaka n’aka ya, na akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ ya: sekpụtakwa nwa ehi a zụrụ azụ, gbuo ya, ka anyị riekwa, ka obi tọọkwa anyị ụtọ: n’ihi na nwa m nke a nwụrụrịị anwụ, o wee dị ndụ ọzọ; o fururịị efu, e wee hụ ya. Ha wee malite ime ka obi tọọ ha ụtọ.”—Luk 15:20-24.

16 Nne ma ọ bụ nna ọ bụla nke na-ahụ n’anya ga-achọsi mgbake ime mmụọ nke nwa ya ike. N’ihi ya, anyị pụrụ nnọọ iji anya nke uche hụ ka nna nwa mmefu ahụ na-eleda anya kwa ụbọchị n’ụzọ dị n’ihu ụlọ ya, na-enwesi olileanya ike maka nlọghachite nke nwa ya nwoke. Ugbu a ọ hụrụ nwa ya ka ọ na-abịa n’ụzọ ahụ! O doro anya na ọdịdị nwa okorobịa ahụ gbanwere. Ma, nna ya matara ya mgbe ọ nọ “n’ebe dị anya.” Ọ hụrụ ihe karịrị nkịrịka uwe na nkụda mmụọ; ọ hụrụ nwa ya nwoke, o wee na-agba ọsọ izute ya!

17 Mgbe nna ahụ jekwutere nwa ya nwoke, ọ makụrụ nwa ya nwoke n’olu, sutukwa ya ọnụ nke ukwuu. O nyeziri ndị ohu ya iwu ka ha wetara nwa ya nwoke uwe mwụda, mgbaaka, na akpụkpọ ụkwụ. Uwe mwụda a abụghị ákwà ọnụ ala nkịtị, kama “nke kachasị mma”—ma eleghị anya uwe a chọrọ mma nke ukwuu, ụdị nke a na-enye onye ọbịa a na-asọpụrụ. Ebe ọ bụ na a dịghị ahụkarị mgbaaka na akpụkpọ ụkwụ n’ahụ ndị ohu, nna ahụ na-eme ka o doo anya na a na-anabataghachi nwa ya nwoke dị ka onye òtù ezinụlọ ahụ n’ụzọ nile. Ma nna ya ka mekwuru ihe. O nyere iwu ka e mee oriri iji mee ememe nlọghachi nke nwa ya nwoke. N’ụzọ doro anya, nwoke a agbagharaghị nwa ya nwoke n’ụzọ ibu ihe n’obi ma ọ bụ nanị n’ihi na nlọghachi nwa ya nwoke manyere ya ime otú ahụ; ọ chọrọ ịgbaghara. O mere ya obi ụtọ.

18, 19. (a) Gịnị ka ilu banyere nwa mmefu ahụ na-akụziri gị banyere Jehova? (b) Dị ka e gosipụtara ná mmekọrịta ya na Juda na Jerusalem, olee otú Jehova si ‘echere’ nlọghachi nke onye mmehie?

18 Ruo ókè anyị tụleworo, gịnị ka ilu banyere nwa mmefu ahụ na-akụziri anyị banyere Chineke bụ́ onye anyị nwere ihe ùgwù ife ofufe? Nke mbụ, na Jehova bụ onye “nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6) N’ezie, ebere bụ àgwà pụtara ìhè nke Chineke. Ọ bụ ụzọ ọ na-esi emeghachi omume n’ebe ndị nọ ná mkpa nọ. Ya mere, ilu Jisọs na-akụziri anyị na Jehova “na-agbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Ọ na-elepụ anya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ịhụ mgbanwe obi ọ bụla n’ebe ndị mmadụ na-emehie emehie nọ bụ́ nke ga-enye ya ihe ndabere ime ebere.—2 Ihe E Mere 12:12; 16:9.

19 Dị ka ihe atụ, chee banyere nmmekọrịta Chineke na Israel. Jehova mere ka Aịsaịa onye amụma kọwaa Juda na Jerusalem dị ka ndị ‘na-arịa ọrịa site n’ọbụ ụkwụ wee ruo n’isi.’ N’agbanyeghị nke ahụ, o kwukwara, sị: “Jehova ga-echere, imere unu amara, ọ bụkwa n’ihi nke a ka a ga-ebuli Ya, inwe obi ebere n’ahụ unu.” (Aịsaịa 1:5, 6; 30:18; 55:7; Ezikiel 33:11, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Dị ka nna ahụ nọ n’ilu Jisọs, Jehova ‘na-eleda anya n’ụzọ,’ dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọ na-atụsi anya ike maka nlọghachi nke onye ọ bụla hapụworo ụlọ ya. Nke a ọ́ bụghị ihe anyị ga-atụ anya ya n’aka nna nke na-ahụ n’anya?—Abụ Ọma 103:13.

20, 21. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ebere Chineke si adọta ọtụtụ ndị taa? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Kwa afọ, ebere Jehova na-eme ka ọtụtụ ndị mara onwe ha ma lọghachite n’ezi ofufe. Lee ọṅụ nke a na-ewetara ndị ha hụrụ n’anya! Were dị ka ihe atụ, onye Kraịst ahụ bụ́ nna nke a kpọtụrụ aha ná mmalite. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, nwa ya nwanyị gbakere n’ụzọ ime mmuọ ma na-eje ozi ugbu a dị ka onye ozi oge nile. “Obi dị m ụtọ ruo n’ókè mmadụ pụrụ inweru obi ụtọ n’usoro ihe a,” ka o kwuru. “A gbanwewo anya mmiri nke iru újú m gaa n’anya mmiri nke ọṅụ.” N’ezie, Jehova na-aṅụrịkwa ọṅụ!—Ilu 27:11.

21 Ma e nwekwuru ihe dị n’ilu banyere nwa mmefu ahụ. Jisọs kọrọ akụkọ ya gaa n’ihu ka o wee nwee ike igosi ọdịiche dị n’etiti ebere Jehova na àgwà na-adịghị nro nke ikpe mmadụ ikpe nke a na-ahụkarị n’etiti ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii. A ga-atụle ụzọ o si mee otú ahụ—na ihe nke a pụtaara anyị—n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ilu na ihe atụ ndị ọzọ a kọrọ na Bible emechaghị eme. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na nzube nke akụkọ ndị ahụ bụ iji kụzie ihe mmụta banyere omume, ọ dịghị mkpa ịchọ ịmara ihe ha pụtara n’ụzọ ihe atụ n’akụkụ nile.

b A tụlere ihe ilu a pụtara n’ụzọ amụma ná mbipụta Ụlọ Nche nke February 15, 1989, peji nke 16, 17.

Ná Ntụleghachi

◻ Olee otú àgwà Jisọs n’ebe ebere dị si dị iche n’ebe nke ndị Farisii dị?

◻ Olee ndị taa yiri nwa mmefu ahụ, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

◻ Ọnọdụ ndị dị aṅaa mere ka nwa mmefu ahụ mara onwe ya?

◻ Olee otú nna ahụ si meere nwa ya nwoke chegharịrịnụ ebere?

[Igbe dị na peeji nke 11]

HA MAARA ONWE HA

Gịnị nyewooro ụfọdụ ndị a chụpụtụworo n’ọgbakọ ndị Kraịst aka ịmara onwe ha? Okwu ndị na-esonụ na-eme ka okwu ahụ pụta ìhè.

“N’ime obi m, m ka maara ebe eziokwu ahụ dị. Ọtụtụ afọ nke ịmụ Bible na ije nzukọ ndị Kraịst enwewo mmetụta gbara ọkpụrụkpụ n’ahụ m. Olee otú m pụrụ isi nọgide na-agbakụta Jehova azụ? Ọ hapụbeghị m; ahapụwo m ya. N’ikpeazụ, ekwetara m otú m siworo hie ụzọ ma dị isi ike nakwa na Okwu Jehova ziri ezi mgbe nile—‘ị na-aghọrọ ihe ị kụrụ.’”—C.W.

“Nwa m nwanyị malitere ikwu okwu, nke ahụ metụkwara m n’obi ebe ọ bụ na m chọrọ ịkụziri ya ihe ndị dị ka onye Jehova bụ na otú e si ekpeku ya ekpere. Apụghị m ịrahụ ụra, n’otu ime abalị, akwọọrọ m ụgbọala gaa n’otu ogige ntụrụndụ ma kwaa nnọọ ákwá. Akwara m ákwá, kpekuokwa Jehova ekpere ná nke mbụ ya kemgbe ogologo oge. Nanị ihe m ma bụ na achọrọ m ka Jehova bịaghachi ná ndụ m, enwekwara m olileanya na ọ ga-agbaghara m.”—G.H.

“Mgbe okwu banyere okpukpe ga-ebilite, m ga-agwa ndị mmadụ na ọ bụrụ na m ga-ahọrọ okpukpe nke na-akụzi eziokwu ahụ, m ghaghị ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mgbe ahụ m ga-asị na abụbu m otu n’ime ha, ma apụghị m ibi ndụ kwekọrọ na ya, ya mere esiri m na ya pụọ. N’ịmara nke a, ana m enwekarị obi amamikpe na obi ilu. Emesịrị m kweta na, ‘ana m ahụsi anya. Ime mgbanwe ụfọdụ dị ngwa dị m mkpa.’”—C.N.

“Afọ iri atọ na ise gara aga a chụpụrụ mụ na di m n’ọgbakọ. E mesịa, na 1991, anyị nwere ihe ịtụnanya dị ụtọ nke ịbụ ndị ndị okenye abụọ letara bụ́ ndị gwara anyị banyere ikwe omume nke ịlaghachikwuru Jehova. Ọnwa isii mgbe e mesịrị, anyị nwere oké ọṅụ n’ịbụ ndị a nabataghachiri. Di m dị afọ 79, ebe mụ onwe m dị afọ 63.”—C.A.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya