Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Alala Azụ n’Ikwusa Ozi Ọma Ahụ
MGBE ndị Europe na-eme nchọpụta bịara n’Ọwara Oké Osimiri nke Venezuela nakwa Ọdọ Mmiri Maracaibo na nke mbụ ya, ikpéré mmiri ahụ jupụtara n’ụmụ obere ụlọ akịrịka ndị e wukwasịrị n’osisi e gwunyere n’ala mmiri ahụ na-adịghị omimi. Ihe ahụ ha hụrụ na-echetara ha Venice, Italy, bụ́ ebe ndị mmadụ wuru ụlọ ha n’akụkụ mmiri. Ndị a na-eme nchọpụta bụ́ ndị na-asụ Spanish si otú a nye ógbè ahụ aha bụ́ Venezuela, nke pụtara “Obere Venice.”
Taa, mba a mara mma na-arụ ụdị ọrụ ihe owuwu ọzọ, nke ime mmụọ. N’ebe ahụ Ndịàmà Jehova ji ọrụ n’aka n’ịgha mkpụrụ Alaeze n’ọnọdụ ọ bụla kwesịrị ekwesị. Owuwe ihe ubi ime mmụọ nke ọ na-arụpụta na-ewetara “Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ,” bụ́ Jehova Chineke, otuto dị ukwuu.—Matiu 9:37, 38.
Mgbe otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị letara otu ọgbakọ dị na steeti bụ́ Zulu n’ebe ugwu nke ọdịda anyanwụ Venezuela, Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ mere ndokwa ka ya na nwunye ya gaa leta otu obere àgwàetiti dị nso nke a na-akpọ Toas. Ka ha kwụ n’ahịrị na-eche inweta ụgbọ mmiri isi ụtụtụ ga-ebuga ha n’àgwàetiti ahụ, nwunye onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị, bụ́ Mery, tụụrụ onye ya na ya so, bụ́ nwanna nwanyị na-asụ ụzọ oge nile aro, ka ha kpanyere ụfọdụ ndị ọrụ nọ n’ụgbọ mmiri ụka. Nwanna nwanyị onye ọsụ ụzọ ahụ kwere.
N’ijekwuru otu onye mekanik, Mery nyefere ya akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. O gosiri ya isiakwụkwọ bụ́ “Iwulite Ezinụlọ nke Na-asọpụrụ Chineke,” bụ́ nke o yiri ka ọ ghọtara ịdị mkpa ya. Mgbe ahụ Mery kọwara na site n’iji mbipụta a mee ihe, ọ pụrụ inwe ọmụmụ Bible n’ebe obibi ya. Ọ naara akwụkwọ ahụ, e mekwara ndokwa ka mmadụ kpọtụrụ ya n’ebe obibi ya.
N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, e nwere mgbakọ pụrụ iche nke were otu ụbọchị n’ógbè ahụ. Lee ihe ijuanya ọ bụụrụ Mery ịhụ onye mekanik ahụ, bụ́ Senor Nava, n’ebe ahụ, tinyere nwunye ya na ụmụntakịrị nwanyị ya abụọ! Mery jụrụ nwunye nwoke ahụ ihe o chere banyere ọmụmụ Bible ezinụlọ ha. Azịza ya kasị bụrụ ihe ijuanya.
“Ana m enye Jehova ekele na anyị amụtawo eziokwu ahụ,” ka ọ sịrị. Mgbe ahụ ọ kọwara. “Mgbe ị gwara di m okwu, ọ ka hapụrụ m gaa kpọrọ nwanyị ọzọ. Ọ bụkwa onye na-aṅụ oké mmanya. Mgbe ụfọdụ, ọ ṅụbiga mmanya ókè, ọ na-akparị ndị mmadụ, bụ́ nke na-adịghị amasị ndị bi n’ógbè nta ahụ dị n’àgwàetiti a. Ọ na-emekwa mgbaasị. Otú ọ dị, ihe ọmụma Bible nke o nwetara site n’ọmụmụ ihe a enyeworo ya aka ime mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ya. Ọ kwụsịwo omume ya nile ndị na-adịghị ọcha. Obi dị nne na nna ya, bụ́ ndị Katọlik, ụtọ maka mgbanwe ndị a. Ha nwere obi ụtọ na ọ bụzi di na nna nke na-elekọta ibu ọrụ ya nke ọma.”
E mere Senor Nava baptism na 1996, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye ozi oge nile. E mere nwunye ya, bụ́ Jenny, baptism na 1997. Onyeisi nke obodo ahụ nwere obi ụtọ maka mgbanwe onye mekanik ụgbọ mmiri a mere nke na ọ rịọkwara ka e duziere ya ọmụmụ Bible. Lee ọṅụ ụmụnna nwanyị a nwere na ha alaghị azụ n’ikwusa ozi ọma ahụ ebe ha kwụ n’ahịrị na-eche ụgbọ mmiri n’ụtụtụ ahụ!
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Isoro onye mekanik ụgbọ mmiri kerịta ozi ọma ahụ rụpụtara ihe obi ụtọ