Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 10/1 p. 4-6
  • Ife Chineke n’Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ife Chineke n’Eziokwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmara Eziokwu Na-ewepụ Egwu
  • N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Nnọọ Iche?
  • Ndị Na-eto Eto Ndị ‘Tụkwasịrị Jehova Obi’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ezigbo Ndị Kraịst?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Eziokwu Ahụ’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 10/1 p. 4-6

Ife Chineke n’Eziokwu

Ka ofufe wee bụrụ nke Chineke na-anara nke ọma, ọ ghaghị ịdabere n’eziokwu. (Jọn 4:23) Bible na-akọwa ndị na-efe ezi ofufe dị ka ndị nọ ná “nzukọ nke Chineke dị ndụ, bụ́ idé na ntọala nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15) Ọ bụghị nanị na ndị ahụ mejupụtara nzukọ Chineke na-ekwere eziokwu nke Okwu Chineke kamakwa ha na-ebi ndụ kwekọrọ na ya ma na-agbachitere ya, na-eme ka a mara ya n’ụwa nile.—Matiu 24:14; Ndị Rom 10:9-15.

A MAARA Ndịàmà Jehova nke ọma maka ọrụ izi Bible ha, bụ́ nke a na-eme ugbu a n’ihe karịrị ala 200. Ha na-amụ Bible ma na-akụzi ya dị ka eziokwu, n’ejikọtaghị ya na mmetụta na-agwagbu agwagbu nke nkà ihe ọmụma mmadụ. Ị̀ maara ozizi ha ndị dabeere na Bible? Ọtụtụ na-ala azụ ige Ndịàmà Jehova ntị n’ihi ihe na-adịghị mma nke a na-agbasa megide ha. Ma a na-akpọ ndị nwere obi eziokwu òkù ikpebi n’onwe ha ma ihe Ndịàmà na-ekwusa ọ̀ bụ eziokwu ka ọ̀ bụ na ọ bụghị. Ụdị mkpebi ahụ dị mkpa ekwesịghị ịdabere n’asịrị. Ọtụtụ ndị meworo nchọpụta nke ha banyere ozizi nke Ndịàmà Jehova eritewo uru dị ukwuu.

Ịmara Eziokwu Na-ewepụ Egwu

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Eugenia. A zụlitere ya n’ezinụlọ ji okpukpe Katọlik kpọrọ oké ihe. Nna ya so ná ndị haziri nleta popu letara Mexico na 1979. Ka ọ na-eleta ndị enyi ya, Eugenia zutere Ndịàmà Jehova. Site n’enyemaka ha ọ malitere ijikwu nlezianya na-atụle ihe Bible na-ekwu. Ọ na-echeta, sị: “Ná mmalite, egwu malitere ịtụ m. Achọtawo m eziokwu! Ma nke a pụtara na ihe ka ọtụtụ n’ime nkwenkwe ndị m nwere mbụ ezighị ezi. Ezinụlọ m, ndị enyi m, ndị m hụrụ n’anya—ha bụcha ndị hiere ụzọ. Ahụ erughị m ala. Anọgidere m na-ajụ onwe m otú ezinụlọ m ga-esi meghachi omume banyere ihe m chọpụtaworo ọhụrụ. Ka oge na-aga, sitekwa n’enyemaka Jehova, amalitere m ime mgbanwe iji kwekọọ n’ahụmahụ nke a na-eri ọnụ. Otu ụbọchị ekpebiri m ịkọtụrụ otu enyi ezinụlọ anyị, onye bụ́ prọfesọ nke nkà mmụta okpukpe. Agwara m ya ihe nile banyere ọchịchọ m ịchọta eziokwu. Mgbe ahụ o kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmara eziokwu, chọwa Ndịàmà Jehova.’”

Dị ka Eugenia tụworo ụjọ ya, ezinụlọ ya chụpụrụ ya n’ụlọ. Otú ọ dị, Ndịàmà nọgidere na-enyere ya aka n’ụzọ ime mmụọ. Ọ na-ekwu, sị: “E wusiri m ike iguzosi ike maka eziokwu. Aghọtara m na ọ bụ ihe ruru ka a lụọrọ ya ọgụ. Nnabata Ndịàmà Jehova nabatara m dị mkpa nke ukwuu. Enwere m mmetụta nke ịbụ onye a hụrụ n’anya n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Irute nzukọ Chineke nso nyeere m aka imeri egwu nke ịkwụrụ nanị m.”

Tụlee ihe atụ ọzọ. Sabrina tolitere dị ka onye inwe nkwurịta okwu ezinụlọ mgbe nile banyere Bible maara ahụ. N’ezie, ha wulitere ihe dị ka ‘okpukpe ezinụlọ.’ O mere ka ọ bụrụ omume ya isoro ndị òtù nke okpukpe dị iche iche na-akpakọrịta iji kpughee njehie ha. Mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova wepụtara onwe ya iduziri ya ọmụmụ Bible, ọ nakweere ya ngwa ngwa n’ebumnobi nke igosipụta nkwenkwe ha dị ka ụgha. Ọ na-echeta, sị: “Mgbe m mụsịrị ihe ruo ihe karịrị otu afọ, egwu ịtụfu ‘eziokwu m’ tụrụ m. Ọ dịworo m mfe ikpughe aghụghọ nke ọtụtụ okpukpe ndị mụ na ha mekọworo ihe, ma ọ dịghị mfe otú ahụ na nke ugbu a.”

Egwu na-atụ Sabrina mere ha ọ kwụsị iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ma mgbe ahụ o nwere mmetụta nke ịbụ onye tọgbọ chakoo n’ụzọ ime mmụọ. O kpebiri ịmaliteghachi ọmụmụ ihe ahụ, o mesịkwara bịa nata eziokwu a ọ chọtara ọhụrụ. Sabrina nwere ọganihu ruo n’ókè nke ịchọ isoro ndị ọzọ kerịta ihe ọ na-amụta. Ọbụna ọ rịọrọ ka o soro Ndịàmà n’ozi ụlọ n’ụlọ ha. Sabrina na-akọwa, sị: “Tupu mụ anata nkwado isoro Ndịàmà Jehova mee nkwusa, a jụrụ m: ‘Ị̀ chọrọ n’ezie ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?’ ‘Ee e!’ ka m zaghachiri. Egwu jidekwara m ọzọ.” N’ikpeazụ, mgbe ọ nọgidesiri ike na-abịa nzukọ nile ma na-ekiri ndị Chineke na otú ha si etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, Sabrina kpebiri na ọ bụ eziokwu n’ezie. E mere ya baptism, ọ bụkwa onye na-ezisa ozi ọma oge nile ugbu a.

N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Nnọọ Iche?

Mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘N’ihi gịnị ka nkụzi Ndịàmà Jehova ji dị nnọọ iche n’ebe okpukpe ndị ọzọ dị?’ Ilenyetụ anya n’ihe Ndịàmà kweere ga-enyere gị aka ịhụ na ha bụ ndị Kraịst nwere obi eziokwu, ndị mmụta Bible ji akọ na uche eme ihe. Anyị na-agba gị ume ịsapete akụkụ Bible gị ndị dị ná nchịkọta nke nkwenkwe ha ndị bụ́ isi e gosiri n’elu.

Site n’ilerukwu anya n’ihe Ndịàmà Jehova kweere na otú ha si araparasi ike n’ihe Bible na-akụzi, ị pụrụ ịbụ onye e ji nnwere onwe nke eziokwu na-enye gọzie. (Jọn 17:17) E nweghị ihe mere ị ga-eji atụ eziokwu egwu. Cheta nkwa Jisọs kwere: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—Jọn 8:32.

[Igbe dị na peeji nke 6]

NKWENKWE ỤFỌDỤ BỤ́ ISI NKE NDỊÀMÀ JEHOVA

◯ Jehova bụ Chineke nke pụrụ ime ihe nile. Aha aka ya pụtara ihe karịrị ugboro 7,000 n’ihe odide ndị kasị ochie nke Bible.—Abụ Ọma 83:18.

◯ Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke, onye bịara n’ụwa inye ndụ ya maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Jọn 3:16, 17) Ndịàmà Jehova na-agbaso nkụzi Jisọs Kraịst dị ka a na-achọta ha n’Oziọma ndị ahụ.

◯ Aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova dabeere n’Aịsaịa 43:10, nke na-asị: “Unu onwe unu bụ ndịàmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”

◯ Alaeze nke ụmụ mmadụ na-ekpe ekpere maka ya n’ekpere “Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe” bụ ọchịchị eluigwe nke ga-ewepụ nhụjuanya na ihe mgbu nile dị n’ụwa n’isi nso iji nye ohere maka Paradaịs nke Bible na-ekwe ná nkwa.—Aịsaịa 9:6, 7; Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:3, 4.

◯ Onye ọ bụla nke na-eme ihe Chineke na-achọ nwere ohere irite uru ná ngọzi Alaeze ahụ ruo mgbe ebighị ebi.—Jọn 17:3; 1 Jọn 2:17.

◯ Ndị Kraịst aghaghị iji ihe Bible na-ekwu kpụzie akparamàgwà ha. Ha aghaghị ịgbalịsi ike ịbụ ndị na-eme ihe n’eziokwu, ibi ndụ dị ọcha, nke omume ọma, na igosi ndị agbata obi ha ịhụnanya.—Matiu 22:39; Jọn 13:35; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ndịàmà Jehova na-eme ka ndị mmadụ mara eziokwu Bible n’ihe karịrị 200 ala

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya